Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Bible Ọ̀ Pụrụ Inyere Gị Aka Ịzụ Ụmụ Gị?

Bible Ọ̀ Pụrụ Inyere Gị Aka Ịzụ Ụmụ Gị?

Bible Ọ̀ Pụrụ Inyere Gị Aka Ịzụ Ụmụ Gị?

OKOOKO osisi orchid bụ okooko osisi mara nnọọ mma, ma ịzụlite ya na-esi ike. Iji mee nke ahụ n’ụzọ gara nke ọma, ọ dị gị mkpa ịchịkwa ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ, ịchịkwa ìhè, na iji ite há otú kwesịrị ekwesị kụọ ya. Okooko osisi orchid na-ahọ ájá na fatịlaịza, ọrịa na ụmụ ahụhụ na-egbukwa ya ngwa ngwa. N’ihi ya, orchid na-anwụkarị ná mgbalị nke mbụ mmadụ mere ịzụlite ya.

Ịzụlite ụmụaka siri nnọọ ike ma gụnye ọtụtụ ihe karị, ọ na-achọkwa ezi nlebara anya. N’ihi ya, ọ bụghị ihe ọhụrụ ndị nne na nna iche na ha erughị eru mgbe a bịara n’ihe banyere ịzụ ụmụ. Ọtụtụ na-eche na enyemaka dị ha mkpa, dị nnọọ ka ọ dị onye na-azụ okooko osisi orchid bụ́ onye ndụmọdụ sitere n’aka ọkachamara dị mkpa. N’ụzọ doro anya, nne na nna ọ bụla chọrọ inweta nduzi kasị mma. Ebee ka a pụrụ ịchọta nduzi dị otú ahụ?

Ọ bụ ezie na Bible abụghị akwụkwọ nduzi maka ịzụlite ụmụaka, Onye Okike ji ike mmụọ nsọ duzie ndị dere ya idenye ndụmọdụ ndị dị irè banyere okwu ahụ n’ime ya. Bible na-emesi ịzụlite àgwà ndị dị mma ike, bụ́ ndị ọtụtụ na-eche na a na-elegharakarị ha anya. (Ndị Efesọs 4:22-24) N’akụkụ a, ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ na-atụnye ụtụ dị mkpa n’agụmakwụkwọ kwesịrị ekwesị. Ndụmọdụ dị otú ahụ abaworo ọtụtụ puku mmadụ bụ́ ndị tinyere ya n’ọrụ uru, n’agbanyeghị oge ha biri ndụ ma ọ bụ ọdịbendị nke ebe a zụlitere ha. Ya mere, ịgbaso ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ pụrụ inyere gị aka inwe ihe ịga nke ọma n’ịzụ ụmụ gị.

Ihe Nlereanya nke Ndị Nne na Nna —Ụdị Ọzụzụ Kasị Mma

“Otú ọ dị, gị onye na-akụziri onye ọzọ ihe, ị́ dịghị akụziri onwe gị? Gị, onye na-ekwusa ‘Ezula ohi,’ ị̀ na-ezu ohi? Gị, onye na-asị ‘Akwala iko,’ ị̀ na-akwa iko?”—Ndị Rom 2:21, 22.

Onyeisi oche nke Bọọdụ Na-ahụ Maka Agụmakwụkwọ na Seoul kwuru, sị: “Isetịpụ ihe nlereanya n’okwu na n’omume bụ agụmakwụkwọ kasị mma a ga-enye nwatakịrị.” Ọ bụrụ na ndị nne na nna adịghị egosi ezi ihe nlereanya n’okwu na n’omume ma na-enye ụmụ ha ntụziaka a kapịrị ọnụ, n’oge na-adịghị anya, ụmụ ha ga-ewere ha dị ka ndị ihu abụọ. Ha agaghịzi na-eji ihe ndị nne na nna ha na-agwa ha akpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ndị nne na nna chọrọ ịkụziri ụmụ ha ime ihe n’eziokwu, ha onwe ha aghaghị ịbụ ndị na-eme ihe n’eziokwu. Ihe ụfọdụ ndị nne na nna na-emekarị ma ọ bụrụ na ha achọghị ịza telifon bụ ịgwa nwa ha ka ọ sị, “Biko, papa m (ma ọ bụ mama m) anọghị ya.” Nwata e nyere ntụziaka dị otú ahụ agaghị enwe ahụ́ iru ala, ọ ga-anọkwa ná mgbagwoju anya. Ka oge na-aga, ọ pụrụ ịmalite ịgha ụgha n’enweghị obi amamikpe ma ọ bụrụ na ọ nọrọ n’ọnọdụ siri ike. N’ihi ya, ọ bụrụ na ndị nne na nna chọrọ n’ezie ka nwa ha na-eme ihe n’eziokwu, ha onwe ha aghaghị ịdị na-ekwu eziokwu ma na-eme ihe n’eziokwu.

Ị̀ chọrọ ịzụ nwa gị ka ọ na-ekwu okwu n’ụzọ na-egosi nkwanye ùgwù? Mgbe ahụ ị ghaghị igosi ezi ihe nlereanya. Nwa gị ga-adị ngwa iṅomi gị. Sung-sik, bụ́ nna nke ụmụ anọ, na-ekwu, sị: “Mụ na nwunye m kpebiri ịghara ịdị na-eji okwu na-adịghị mma eme ihe. Anyị na-akwanyere ibe anyị ùgwù, olu anyị adịghịkwa ala elu ọbụna mgbe iwe na-ewe anyị. Ezi ihe nlereanya na-adị nnọọ irè karịa okwu ọnụ nkịtị. Anyị na-enwe obi ụtọ mgbe ụmụ anyị na-eji nkwanye ùgwù na nsọpụrụ agwa ndị ọzọ okwu.” Bible na-ekwu ná Ndị Galeshia 6:7, sị: “Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke a ka ọ ga-aghọrọkwa.” Ndị nne na nna bụ́ ndị chọrọ ka ụmụ ha nwee ụkpụrụ omume ndị dị elu aghaghị igosi na ha onwe ha na-ebi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị dị otú ahụ.

Mee Ka Ụzọ Nkwurịta Okwu Ghere Oghe

“Ị ga-ejisikwa ike izi ụmụ gị [iwu Chineke], ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.”Deuterọnọmi 6:7.

Ọtụtụ ndị karị na-enwe omume nke ịrụ ọrụ ma a gbasaa ọrụ. Mgbe ma di ma nwunye na-arụ ọrụ ego, ọ na-emetụta ụmụ ha n’ụzọ siri ike. Oge ọtụtụ ndị nne na nna ji eso ụmụ ha anọkọ na-ebelata ebelata. Mgbe ha nọ n’ụlọ, ndị nne na nna na-arụ ọrụ ụlọ na ọrụ ndị ọzọ, n’ihi ya, ike pụrụ ịgwụ ha. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, olee otú gị na ụmụ gị pụrụ isi nọgide na-enwe ezi nkwurịta okwu? Ohere inwe nkwurịta okwu pụrụ ibilite ma ọ bụrụ na gị na ụmụ gị na-arụkọ ọrụ ụlọ ọnụ. Otu onyeisi ezinụlọ ọbụna bupụrụ TV ya, nzube bụ́kwa isi o ji mee ya bụ iji na-enwekwu oge iso ụmụ ya na-enwe mkparịta ụka. O kwuru, sị: “Ná mmalite, ụmụ m enweghị mmasị na nke ahụ, ma ka m na-eso ha na-egwu egwuregwu nke ijikọta akụkụ dị iche iche nke ihe osise ma na-eso ha ekwurịta banyere akwụkwọ ndị na-adọrọ mmasị, ha bịara nabata mgbanwe ahụ.”

Ọ dị mkpa ka ọ mara ụmụaka ahụ́ iso ndị nne na nna ha na-ekwurịta okwu site na mgbe ha ka dị obere. Ma ọ́ bụghị ya, mgbe ụmụaka ahụ ruru n’afọ ndị iri na ụma ha ma na-eche nsogbu ihu, ha agaghị na-ele ndị nne na nna ha anya dị ka ndị enyi ha pụrụ iso kwurịta okwu. Olee otú ị pụrụ isi nyere ha aka ikwupụta ihe dị ha n’obi? Ilu 20:5 na-ekwu, sị: “Mmiri nke miri emi ka ndụmọdụ n’obi mmadụ bụ; ma onye nghọta ga-adọpụta ya.” Site n’iji ajụjụ mmata echiche dị ka “Gịnị ka i chere?” eme ihe, ndị nne na nna pụrụ ịgba ụmụ ha ume ikwupụta echiche na mmetụta ha.

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na nwa gị emejọọ nnọọ ihe? Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ dị ya mkpa ka e jiri obiọma lebara ya anya. Chịkwaa iwe gị ka ị na-ege nwa gị ntị. Otu nna kwuru nke a banyere otú o si eme ihe banyere ọnọdụ dị otú ahụ: “Mgbe ụmụaka mejọrọ ihe, ana m agbalị ịghara imeghachi omume n’iwe. Ana m anọdụ ala ma gee ntị n’ihe ha nwere ikwu. Ana m agbalị ịghọta ọnọdụ ahụ. Mgbe o siiri m ike ịchịkwa iwe m, ana m echeretụ ka iwe m dajụọ.” Ọ bụrụ na ị chịkwaa iwe gị, ọ ga-adịkwu mfe ịnakwere mgbazi i nyere.

Ịdọ Aka ná Ntị Dabeere n’Ịhụnanya Dị Oké Mkpa

“Ndị bụ́ nna, unu adịkwala na-eme ụmụ unu ihe iwe, kama nọgidenụ na-azụlite ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.”—Ndị Efesọs 6:4.

Iji rụpụta ihe dị mma, otú i si enye ịdọ aka ná ntị n’ụzọ ịhụnanya dị oké mkpa. Olee otú o si bụrụ na ndị nne na nna pụrụ ‘ime ụmụ ha ihe iwe’? Ọ bụrụ na ịdọ aka ná ntị e nyere ekwekọghị n’ịdị njọ nke ihe e mehiere ma ọ bụ ọ bụrụ na e jiri nnọọ nkatọ nye ya, ụmụaka ga-ajụ ya. E kwesịrị inye ndụmọdụ n’ụzọ ịhụnanya mgbe nile. (Ilu 13:24) Ọ bụrụ na i soro ụmụ gị tụgharịa uche, ha ga-aghọta na ị na-enye ha ndụmọdụ n’ihi na ị hụrụ ha n’anya.—Ilu 22:15; 29:19.

N’aka nke ọzọ, ọ dị mma ka ụmụaka taa ahụhụ ihe ndị na-adịghị mma si n’àgwà ọjọọ ha kpara pụta. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwatakịrị emejọọ onye ọzọ, ị pụrụ ịgwa ya na ọ ga-arịọrịrị onye ahụ mgbaghara. Ọ bụrụ na ọ dara iwu ezinụlọ, ị pụrụ ịnapụ ya ihe ùgwù ụfọdụ iji mesie ike mkpa ọ dị idebe iwu.

Ọ dị mma inye ndụmọdụ n’oge kwesịrị ekwesị. Eklisiastis 8:11 kwuru, sị: “N’ihi na e meghị ihe e kpere n’ikpe megide ọrụ ọjọọ ọsọ ọsọ, n’ihi nke a obi ụmụ mmadụ juru eju n’ime ha ime ihe ọjọọ.” N’otu aka ahụ, ọtụtụ ụmụaka ga-agbalị ịnwale ma hà pụrụ ịgbanahụ ntaramahụhụ mgbe ha kpasịrị àgwà ọjọọ. Ya mere, ọ bụrụhaala na i buwo ụzọ kwuo na ị ga-enye onye kpara otu agwa ọjọọ ntaramahụhụ, jide n’aka na i mezuru ihe i kwuru.

Ntụrụndụ Kwesịrị Ekwesị Bara Uru

“Ihe ọ bụla nwere oge, . . . mgbe ịchị ọchị . . . na mgbe ite egwu.”—Eklisiastis 3:1, 4.

Oge ntụsara ahụ́ na ntụrụndụ dị mma a haziri ahazi dị mkpa iji mee ka uche na ahụ́ nwata tolite nke ọma. Mgbe ndị nne na nna na-eso ụmụ ha enwe ntụrụndụ, a na-eme ka nkekọ nke ezinụlọ sikwuo ike, ụmụaka na-enwekwa mmetụta nke ịnọ ná nchebe. Ụdị ntụrụndụ ndị dị aṅaa ka ndị òtù ezinụlọ pụrụ inwekọ ọnụ? Ọ bụrụ na i chebara ya echiche, ị pụrụ icheta ọtụtụ ihe ndị dị mma a pụrụ ime. E nwere egwuregwu ndị a na-eme n’èzí ndị dị ka ịgba ịnyịnya ígwè, na egwuregwu ndị a na-eji bọl eme, dị ka egwuregwu tennis, badminton, na volleyball. Cheekwa echiche oge ọṅụ ndị a pụrụ inwe mgbe ndị ezinụlọ na-akpọkọ ngwá egwú ọnụ. A pụrụ inwe oge ndị dị mma a pụrụ icheta site n’ịga n’ebe ndị dị nso iji kirie ihe okike.

N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ndị nne na nna pụrụ ịkụnye n’ime ụmụ ha echiche ziri ezi banyere ntụrụndụ. Otu nwoke bụ́ Onye Kraịst nke nwere ụmụ nwoke atọ kwuru, sị: “M na-eso ụmụ m enwe ntụrụndụ mgbe ọ bụla o kwere m omume. Dị ka ihe atụ, mgbe ha na-egwu egwuregwu kọmputa, ana m ajụ ha otú ha si egwu ha. Mgbe ha jiri obi ụtọ kọwaara m, ana m eji ohere ahụ agwa ha banyere ihe ize ndụ nke ntụrụndụ ndị na-adịghị mma. Achọpụtawo m na ha na-ajụ ntụrụndụ ndị na-ekwesịghị ekwesị.” Ee, ụmụaka ndị na-enwe obi ụtọ ná ntụrụndụ ezinụlọ adịkarịghị enwe mmasị n’ihe omume telivishọn, vidio, ihe nkiri sinima, na n’egwuregwu Intanet ndị na-egosi ime ihe ike, omume rụrụ arụ, na ọgwụ ọjọọ.

Nyere Ụmụ Gị Aka Imete Ezi Ndị Enyi

“Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.”—Ilu 13:20.

Otu nna bụ́ Onye Kraịst nke nwere ihe ịga nke ọma n’ịzụlite ụmụ anọ na-ekwu, sị: “A pụghị ikwubiga okwu ókè banyere ịdị mkpa nke ụdị ndị enyi ha na-ahọrọ. Otu enyi ọjọọ pụrụ imebi ọzụzụ nile i nyere.” Iji nyere ụmụ ya aka imete ezi ndị enyi, ọ na-eji amamihe ajụ ajụjụ ndị dị ka: Ònye bụ ezigbo enyi gị? Olee ihe mere i ji nwee mmasị n’ebe ọ nọ? Olee ihe ọ na-eme nke ị chọrọ iṅomi? Nna ọzọ na-eme ndokwa ka ụmụ ya kpọrọ ezi ndị enyi ha bịa n’ụlọ. Mgbe ahụ, ọ pụrụ ịmata ha ma nye ụmụ ya nduzi kwesịrị ekwesị.

Ọ dịkwa mkpa ịkụziri ụmụaka na ha pụrụ imete ma ndị toro eto ma ndị ọgbọ ha enyi. Bum-sun, bụ́ nna nwere ụmụ nwoke atọ, na-ekwu, sị: “M na-enyere ụmụ m aka ịghọta na ọ bụghị iwu na ndị enyi ha ga-abụrịrị ndị ọgbọ ha, dị ka ọ dị n’ihe banyere Devid na Jonatan n’ime Bible. N’ezie, ana m akpọ Ndị Kraịst nọ n’afọ ndụ dịgasị iche iche iso ụmụ m na-akpakọrịta. N’ihi ya, ụmụ m na-eso ọtụtụ ndị na-abụghị ndị ọgbọ ha akpakọrịta.” Iso ndị toro eto bụ́ ezi ihe nlereanya akpakọrịta na-enye ụmụaka ohere nke ịmụta ọtụtụ ihe.

Ị Pụrụ Inwe Ihe Ịga nke Ọma n’Ịzụ Ụmụ

Dị ka otu nnyocha e mere na United States si kwuo, ọtụtụ ndị nne na nna bụ́ ndị gbalịrị ịkụnye àgwà ndị dị ka njide onwe onye, ọzụzụ onwe onye, na ime ihe n’eziokwu n’ime ụmụ ha enwechaghị ihe ịga nke ọma. N’ihi gịnị ka nke ahụ ji esi oké ike? Otu nne bụ́ onye zara ajụjụ ná nnyocha ahụ kwuru, sị: ‘Ihe dị mwute bụ na nanị ụzọ isi chebe ụmụ anyị bụ ịkpọchibido ha ụzọ n’ime ụlọ ma ghara ikwe ka ha pụọ n’ụwa.’ Ihe ọ na-ekwu bụ na gburugburu ebe ụmụaka na-etolite ugbu a dị njọ karịa ka ọ dịtụrụla. N’ọnọdụ dị otú a, ọ̀ ga-ekwe nnọọ omume ịzụlite ụmụaka n’ụzọ gara nke ọma?

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịzụlite okooko osisi orchid ma na-echegbu onwe gị na ọ pụrụ ịnwụ, ị pụrụ inwe nkụda mmụọ. Ọ bụrụ na ọkachamara n’ihe banyere ịzụlite okooko osisi orchid abịa gwa gị otú ị ga-esi mee nke ahụ ma jiri obi ike kwuo, sị, “Ị ga-enwe ihe ịga nke ọma ma ọ bụrụ na i mee ya otú a,” lee nnọọ ka obi ga-esi ruo gị ala! Jehova, bụ́ Ọkachamara Kasị Elu n’ihe banyere ọdịdị mmadụ, na-enye ndụmọdụ banyere otú kasị mma isi zụlite ụmụaka. Ọ na-ekwu, sị: “Zụlite nwata dị ka ụzọ ya si dị, ọbụna mgbe o mere okenye ọ gaghị esi n’ime ya wezụga onwe ya.” (Ilu 22:6) Mgbe ị zụrụ ụmụ gị n’ụzọ kwekọrọ na ndụmọdụ Bible, o yikarịrị ka ị̀ ga-enwe ọṅụ nke ịhụ ka ụmụ gị tolitere ma ghọọ ndị toro eto ji ihe akpọrọ ihe, ndị na-echebara ndị ọzọ echiche ma nwee omume ọma. Mgbe ahụ, ha ga-abụ ndị ndị mmadụ hụrụ n’anya ma karịsịa bụrụ ndị Jehova, bụ́ Nna anyị nke eluigwe, hụrụ n’anya.