Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ekpere Gị Ọ̀ Pụrụ Ịgbanwe Ihe Ga-esi n’Ọnọdụ Pụta?

Ekpere Gị Ọ̀ Pụrụ Ịgbanwe Ihe Ga-esi n’Ọnọdụ Pụta?

Ekpere Gị Ọ̀ Pụrụ Ịgbanwe Ihe Ga-esi n’Ọnọdụ Pụta?

Ọ̀ DỊ onye n’ime anyị nke na-echetụbeghị ọnọdụ tara akpụ bụ́ nke ọ na-amaghị ihe ọ ga-eme banyere ya ihu? Bible na-egosi na Pọl onyeozi maara na ekpere pụrụ ịgbanwe ihe pụrụ isi n’ọnọdụ dị otú ahụ tara akpụ pụta.

Mgbe a tụrụ Pọl mkpọrọ n’ụzọ na-ezighị ezi na Rom, ọ rịọrọ ndị kwere ekwe ibe ya ka ha na-ekpere ya ekpere, na-agbakwụnye, sị: “Ma m na-agba unu ume ime nke a karịsịa, ka e wee weghachi m n’ebe unu nọ n’isi nso karị.” (Ndị Hibru 13:18, 19) N’oge ọzọ, Pọl kwupụtara obi ike o nwere na Chineke ga-aza ekpere ndị e ekpere ka e wee tọhapụ ya n’oge. (Faịlimọn 22) N’oge na-adịghị anya, a tọhapụrụ Pọl, ọ maliteghachikwara ọrụ ozi ala ọzọ ya.

Ma ekpere ọ̀ pụrụ n’ezie ịgbanwe ihe ga-esi ná nsogbu gị pụta? Ma eleghị anya. Ka o sina dị, cheta na ekpere abụghị ihe omume okpukpe nkịtị. Ọ bụ n’ezie iso Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya ma dị ike na-ekwurịta okwu. Anyị kwesịrị inwere onwe anyị ịkpọ okwu aha n’ekpere anyị ma werezie ndidi na-echere ịhụ otú Jehova ga-esi zaa ya.

Chineke nwere ike ghara ịza ekpere nile n’ụzọ pụtara ìhè, ma ọ bụ ghara ịza ya otú ma ọ bụ n’oge anyị tụrụ anya ya. Dị ka ihe atụ, Pọl kpere ekpere ugboro ugboro banyere “ogwu n’anụ ahụ́” ya. Chineke ewepụghị nsogbu Pọl, ihe ọ bụla ọ bụ, ma o ji okwu ndị na-ewusi ike kasie Pọl obi: “Obiọma m na-erughịrị mmadụ ezuworo gị; n’ihi na a na-eme ka ike m zuo okè n’adịghị ike.”—2 Ndị Kọrint 12:7-9.

Anyị onwe anyị pụkwara inwe obi ike na ọ bụrụgodị na Chineke ewepụghị otu nsogbu kpọmkwem, ọ pụrụ ‘ime ụzọ mgbapụ ka anyị wee nwee ike idi ya.’ (1 Ndị Kọrint 10:13) Otu ụbọchị n’isi nso, Chineke ga-ewepụ ahụhụ nile nke ihe a kpọrọ mmadụ nọ na ya. Ka ọ dịgodị, ijekwuru “Onye na-anụ ekpere” pụrụ ịgbanwe ihe ga-esi n’ọnọdụ pụta.—Abụ Ọma 65:2.