Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-ele Onyinye nke Ndụ E Nyere Gị Anya n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị

Na-ele Onyinye nke Ndụ E Nyere Gị Anya n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị

Na-ele Onyinye nke Ndụ E Nyere Gị Anya n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị

“Ọbara nke Kraịst ahụ . . . ga-eme ka akọ na uche anyị dị ọcha pụọ n’ọrụ nwụrụ anwụ ka anyị wee na-ejere Chineke ahụ dị ndụ ozi dị nsọ.”—NDỊ HIBRU 9:14.

1. Olee ihe àmà e nwere nke na-egosi na anyị ji ndụ kpọrọ ihe nke ukwuu?

ASỊ gị kwuo ego ole ndụ gị ruru, gịnị ka ị ga-ekwu? Anyị ji ndụ—nke anyị na nke ndị ọzọ—kpọrọ ihe nke ukwuu. Iji gosipụta nke ahụ, anyị pụrụ ịgakwuru onye dọkịta maka nlekọta mgbe anyị na-arịa ọrịa, ma ọ bụ na-aga ele ahụ́ mgbe nile. Anyị chọrọ ịnọgide na-adị ndụ ma na-enwe ezi ahụ́ ike. Ọbụna ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị meworo agadi ma ọ bụ ndị nwere nkwarụ achọghị ịnwụ; ha chọrọ ịnọgide na-adị ndụ.

2, 3. (a) Ibu ọrụ dị aṅaa ka Ilu 23:22 mere ka ọ pụta ìhè? (b) Olee otú ibu ọrụ ahụ e kwuru banyere ya n’Ilu 23:22 si metụta Chineke?

2 Otú i si ele ndụ anya na-emetụta mmekọrịta gị na ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, Okwu Chineke na-enye ntụziaka, sị: “Gee nna gị, bụ́ onye mụrụ gị, ntị, eledakwala nne gị anya mgbe o mere agadi.” (Ilu 23:22) ‘Ige ntị’ pụtara ihe karịrị nnọọ ịnụ ihe; ilu a na-apụta ịnụ ihe, mgbe ahụzi rube isi. (Ọpụpụ 15:26; Deuterọnọmi 7:12; 13:18; 15:5; Joshua 22:2; Abụ Ọma 81:13) Gịnị ka Okwu Chineke kwuru na ọ bụ ya mere a ga-eji na-ege ntị? Ọ bụghị nanị na nne gị na nna gị tọrọ gị ma ọ bụ nwee ahụmahụ karịa gị. O kwuru na ọ bụ n’ihi na ‘ọ bụ ha mụrụ gị.’ Nsụgharị Bible ụfọdụ si otú a sụgharịa amaokwu a: “Gee nna gị, bụ́ onye nyere gị ndụ, ntị.” O kwere nghọta na ọ bụrụ na i ji ndụ gị kpọrọ ihe, ị ga-enwe mmetụta nke iji onye nyere gị ndụ ahụ ụgwọ.

3 N’ezie, ọ bụrụ na ị bụ ezi Onye Kraịst, i kwenyere na Jehova bụ Isi Iyi kasịnụ nke ndụ gị. Ọ bụ site n’aka ya ka i “nwere ndụ” n’onwe ya; nwee ike ‘ijegharị,’ na-akpa àgwà dị ka ihe e kere eke nwere mmetụta; ị ‘dịkwa adị’ ugbu a, nweekwa ike iche echiche ma ọ bụ ime atụmatụ maka ọdịnihu, gụnyere ndụ ebighị ebi. (Ọrụ 17:28; Abụ Ọma 36:9; Eklisiastis 3:11) N’ikwekọ n’Ilu 23:22, o ziri ezi iji nrubeisi ‘na-ege Chineke ntị,’ na-achọ ịghọta otú o si ele ndụ anya ma na-eme ihe kwekọrọ na nke ahụ kama ile ndụ anya n’ụzọ ọ bụla ọzọ.

Gosi Nkwanye Ùgwù Maka Ndụ

4. Ná mmalite nke akụkọ ihe mere eme mmadụ, olee otú nkwanye ùgwù maka ndụ si ghọọ okwu dị mkpa?

4 Ná mmalite akụkọ ihe mere eme nke mmadụ, Jehova mere ka o doo anya na ya enyeghị ụmụ mmadụ ohere iji ndụ eme ihe n’ụzọ ọ bụla (ma ọ bụ iji ya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi). N’ịbụ onye ọnụma ekworo juru obi, Ken napụrụ onye aka ya dị ọcha, bụ́ nwanne ya bụ́ Ebel ndụ ya n’ike. Ì chere na Ken nwere ikike ime mkpebi dị otú ahụ banyere ndụ? Chineke echeghị otú ahụ. Ọ jụrụ Ken ajụjụ banyere ya: “Gịnị ka i meworo? gee ntị! olu ọbara nwanne gị na-etiku m site n’ala.” (Jenesis 4:10) Rịba ama na ọbara Ebel nke dị n’ala nọchiri anya ndụ ya, bụ́ nke a napụrụ ya n’ike, o tikukwara Chineke mkpu maka ịbọ ọ́bọ̀.—Ndị Hibru 12:24.

5. (a) Mmachibido iwu dị aṅaa ka Chineke kwupụtara n’ụbọchị Noa, oleekwa ndị o metụtara? (b) N’echiche dị aṅaa ka mmachibido iwu a bụ nzọụkwụ dị mkpa?

5 Mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, ihe a kpọrọ mmadụ maliteghachiri site n’aka nanị mkpụrụ obi asatọ. N’otu ihe o kwuru nke metụtara ụmụ mmadụ nile, Chineke kpughekwuru otú o si ele ndụ na ọbara anya. O kwuru na ụmụ mmadụ pụrụ iri anụmanụ, ma o tinyere ihe mgbochi na-esonụ: “Ihe nile ọ bụla nke na-akpụ akpụ, nke dị ndụ, ga-abụrụ unu ihe oriri; dị ka akwụkwọ ihe ọkụkụ ka M nyeworo unu ha nile. Nanị anụ ahụ́ nke ndụ ya, bụ́ ọbara ya, dị n’ime ya ka unu na-agaghị eri.” (Jenesis 9:3, 4) Ụfọdụ ndị Juu na-akọwa nke ahụ ịpụta na ụmụ mmadụ agaghị eri anụ ahụ́ ma ọ bụ ọbara nke anụmanụ ka dị ndụ. Ma ka oge na-aga, e mere ka o doo nnọọ anya na ihe Chineke na-amachibido iwu n’ebe a bụ iri ọbara iji dị ndụ. Ọzọkwa, iwu Chineke nyere site n’aka Noa bụ nzọụkwụ dị mkpa ná mmezu nke nzube Ya dị elu nke metụtara ọbara—nzube nke ga-eme ka o kwe ụmụ mmadụ omume inweta ndụ ebighị ebi.

6. Site n’aka Noa, olee otú Chineke si mesie ike otú o si ele uru ndụ bara anya?

6 Chineke gara n’ihu ikwu, sị: “Ọbara unu, bụ́ nke dịịrị ndụ unu, ka M ga-ajụtakwa; n’aka anụ nile ọ bụla dị ndụ ka M ga-ajụta ya: ọ bụkwa n’aka mmadụ, n’aka nwanne mmadụ ọ bụla, ka M ga-ajụta ndụ mmadụ. Onye na-awụsị ọbara mmadụ, site n’aka mmadụ ka a ga-awụsị ọbara ya: n’ihi na ọ bụ n’onyinyo Chineke ka O mere mmadụ.” (Jenesis 9:5, 6) Ị pụrụ ịhụ site n’ihe a a gwara ezinụlọ dum nke mmadụ na Chineke na-ele ọbara mmadụ anya dị ka ndụ onye ahụ. Ọ bụ Onye Okike nyere onye ahụ ndụ, ọ dịghịkwa onye kwesịrị iwepụ ndụ ahụ nke ọbara na-anọchi anya ya. Ọ bụrụ na, dị ka Ken, mmadụ egbuo mmadụ, o kwesịrị ekwesị ka Onye Okike ‘jụta’ ndụ nke ogbu mmadụ ahụ.

7. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị inwe mmasị n’ihe Chineke gwara Noa banyere ọbara?

7 Site n’ihe o kwuru, Chineke na-enye ụmụ mmadụ iwu ka ha ghara iji ọbara eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Ì chetụla ihe mere o ji mee otú ahụ? Ee, gịnị mere Chineke ji ele ọbara anya otú a? N’ezie, azịza ya metụtara otu n’ime ozizi ndị kasị mkpa dị na Bible. Ọ bụ akụkụ bụ́ isi nke ozizi Ndị Kraịst, ọ bụ ezie na ọtụtụ chọọchị họọrọ ileghara ya anya. Gịnị bụ ozizi ahụ, oleekwa otú o si metụta ndụ, mkpebi, na omume gị?

Ọbara—Gịnị Ka A Pụrụ Iji Ya Mee?

8. N’Iwu ahụ, ihe mgbochi dị aṅaa ka Jehova tinyere n’iji ọbara eme ihe?

8 Jehova nyekwuru nkọwa banyere ndụ na ọbara mgbe o nyere Izrel ụkpụrụ Iwu ya. Ka ọ na-eme nke ahụ, o weere nzọụkwụ ọzọ ná mmezu nke nzube ya. Eleghị anya ị maara na Iwu ahụ chọrọ ka e nye Chineke onyinye, dị ka ọka, mmanụ, na mmanya. (Levitikọs 2:1-4; 23:13; Ọnụ Ọgụgụ 15:1-5) E nwekwara àjà ụmụ anụmanụ. Chineke kwuru banyere ha, sị: “Ndụ nke anụ ahụ́, n’ọbara ka ọ dị: Mụ onwe m enyewokwa unu ya n’elu ebe ịchụàjà ikpuchiri mkpụrụ obi unu mmehie ha: n’ihi na ọbara ka ọ bụ nke na-ekpuchi mmehie n’ime mkpụrụ obi. N’ihi nke a ka M sịrị ụmụ Izrel, Ọ dịghị mmadụ ọ bụla n’etiti unu ga-eri ọbara.” Jehova gbakwụnyere na ọ bụrụ na mmadụ, dị ka dinta ma ọ bụ onye na-akpa anụ, egbuo anụmanụ maka oriri, ọ ghaghị ịgbapụsị ọbara ya n’ala ma were ájá kpochie ya. Ụwa bụ ebe mgbakwasị ụkwụ Chineke, sitekwa n’ịwụsị ọbara ahụ n’ala, onye ahụ na-ekweta na a na-eweghachiri Onye Na-enye Ndụ ndụ ahụ.—Levitikọs 17:11-13; Aịsaịa 66:1.

9. Gịnị bụ nanị ihe a chọrọ ka e jiri ọbara na-eme dị ka e gosiri n’Iwu ahụ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

9 Iwu ahụ abụghị nanị ihe omume okpukpe nke na-enweghị ihe ọ pụtara nye anyị. Ị̀ rịbara àmà ihe mere na ndị Izrel agaghị eri ọbara? Chineke kwuru, sị: “N’ihi nke a ka M sịrị ụmụ Izrel, Ọ dịghị mmadụ ọ bụla n’etiti unu ga-eri ọbara.” N’ihi gịnị? “Mụ onwe m enyewokwa unu [ọbara] n’elu ebe ịchụàjà ikpuchiri mkpụrụ obi unu mmehie ha.” Ị̀ chọpụtara na nke a na-eme ka a ghọtakwuo ihe mere Chineke ji gwa Noa na ụmụ mmadụ ekwesịghị iri ọbara? Onye Okike kpebiri ile ọbara anya dị ka ihe dị oké mkpa, na-edebe ya maka iji ya mee otu ihe pụrụ iche nke pụrụ ịzọpụta ndụ ọtụtụ mmadụ. Ọ ga-ekere òkè dị mkpa n’ikpuchi mmehie. N’ihi ya, n’okpuru Iwu ahụ, nanị ebe Chineke nyere ikike ka e jiri ọbara na-eme ihe bụ n’elu ebe ịchụàjà maka mkpuchi mmehie maka ndụ nke ndị Izrel, bụ́ ndị na-achọ mgbaghara nke Jehova.

10. Gịnị mere ọbara anụmanụ apụghị iweta mgbaghara mmehie zuru ezu, ma gịnị ka àjà ndị a chụrụ n’okpuru Iwu ahụ chetaara ndị ahụ?

10 Echiche a abụghị ihe ọhụrụ n’Iso Ụzọ Kraịst. N’izo aka n’akụkụ a nke Iwu ahụ, bụ́ nke Chineke mere ndokwa ya, Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na a na-eji ọbara eme ka ihe nile dị ọcha dị ka Iwu ahụ si dị, ọ gwụkwala ma à wụsịrị ọbara, a dịghị enwe mgbaghara ọ bụla.” (Ndị Hibru 9:22) Pọl mere ka o doo anya na àjà ndị a chọrọ ka a chụọ emeghị ka ndị Izrel bụrụ ụmụ mmadụ zuru okè, ndị na-enweghị mmehie. O dere, sị: “Site n’àjà ndị a, a na-echeta mmehie site n’afọ ruo n’afọ, n’ihi na ọ dịghị ekwe ọbara ụmụ oké ehi na nke ewu omume iwepụ mmehie.” (Ndị Hibru 10:1-4) Otú o sina dị, àjà ndị dị otú ahụ bara uru. Ha chetaara ndị Izrel na ha bụ ndị mmehie, na ọ dịkwa ihe ọzọ dị ha mkpa iji nweta mgbaghara zuru ezu. Ọ bụrụ na ọbara nke nọchiri anya ndụ ụmụ anụmanụ apụghị ikpuchi mmehie mmadụ kpam kpam, è nwere ọbara ndụ ọzọ nke pụrụ ime otú ahụ?

Ihe Ngwọta nke Sitere n’Aka Onye Na-enye Ndụ

11. Olee otú anyị si mara na ọ dị ihe àjà ụmụ anụmanụ na-adọrọ uche gaa na ya?

11 N’ezie, Iwu ahụ na-adọrọ uche gaa n’ihe ga-emezu uche Chineke n’ụzọ dị nnọọ irè karị . Pọl jụrụ, sị: “N’ihi gịnịzi ka e ji nwee Iwu ahụ?” Ọ zara, sị: “A tụkwasịrị ya iji mee ka mmebi iwu pụta ìhè, ruo mgbe mkpụrụ ahụ ga-abịarute, bụ́ onye e kweworo nkwa ahụ; e sitekwara n’aka ndị mmụọ ozi nye ya site n’aka onye ogbugbo [Mozis].” (Ndị Galeshia 3:19) N’ụzọ yiri nke ahụ, Pọl dere, sị: “Iwu ahụ nwere onyinyo nke ihe ọma ndị gaje ịbịa, ma ọ bụghị ọdịdị nke ihe ndị ahụ kpọmkwem.”—Ndị Hibru 10:1.

12. N’ihe banyere ọbara, olee otú anyị pụrụ isi hụ mkpughe nke nzube Chineke?

12 Ná nchịkọta, cheta na n’ụbọchị Noa, Chineke nyere iwu na ụmụ mmadụ pụrụ iri anụ ahụ́ nke anụmanụ iji dị ndụ, ma ha agaghị eri ọbara. Ka oge na-aga, Chineke kwuru na “ndụ nke anụ ahụ́, n’ọbara ka ọ dị.” Ee, ọ họọrọ ile ọbara anya dị ka ihe na-anọchi anya ndụ ma kwuo, sị: “Mụ onwe m enyewokwa unu ya n’elu ebe ịchụàjà ikpuchiri mkpụrụ obi unu mmehie ha.” Otú ọ dị, a ka ga-ekpughekwu nzube Chineke n’ụzọ dị ebube. Iwu ahụ bụ onyinyo nke ezi ihe ndị gaje ịbịa. Gịnị ka ha bụ?

13. N’ihi gịnị ka ọnwụ Jizọs ji dị mkpa?

13 Ọdịdị nke ihe ahụ gaje ịbịa hiwere isi n’ọnwụ Jizọs Kraịst. Ị maara na a tara Jizọs ahụhụ ma kpọgide ya n’osisi. Ọ nwụrụ dị ka omempụ. Pọl dere, sị: “Mgbe anyị ka bụ ndị na-adịghị ike, Kraịst nwụrụ n’oge a kara aka maka ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. . . . Chineke mere ka anyị mata ịhụnanya nke ya n’ihi na, mgbe anyị ka bụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ maka anyị.” (Ndị Rom 5:6, 8) Site n’ịnwụ n’ihi anyị, Kraịst nyere ihe mgbapụta iji kpuchie mmehie anyị. Ihe mgbapụta ahụ bụ akụkụ bụ́ isi nke ozi Ndị Kraịst. (Matiu 20:28; Jọn 3:16; 1 Ndị Kọrint 15:3; 1 Timoti 2:6) Gịnị gbasara nke a na ọbara na ndụ, oleekwa otú o si metụta ndụ gị?

14, 15. (a) Olee otú nsụgharị ụfọdụ nke Ndị Efesọs 1:7 si kwusie okwu ike banyere ọnwụ Jizọs? (b) Eziokwu dị aṅaa banyere Ndị Efesọs 1:7 ka ọ dị mfe ileghara anya?

14 Chọọchị ụfọdụ na-ekwukarị banyere ọnwụ Jizọs, ndị òtù ha na-ekwu ihe dị ka “Jizọs nwụrụ n’ihi m.” Tụlee otú nsụgharị Bible ụfọdụ si sụgharịa Ndị Efesọs 1:7: “N’ime ya na site n’ọnwụ ya ka anyị nwere nnapụta, ya bụ, mwepụ nke mmejọ anyị.” (The American Bible, nke Frank Scheil Ballentine sụgharịrị, 1902) “Site n’ọnwụ Kraịst e mere ka anyị nwere onwe anyị, a na-agbagharakwa anyị mmehie anyị.” (Today’s English Version, 1966) “Ọ bụ n’ime na site na Kraịst na àjà nke o ji ndụ ya chụọ ka a tọhapụworo anyị, ntọhapụ nke pụtara mgbaghara nke mmehie.” (The New Testament, nke William Barclay sụgharịrị, 1969) “Ọ bụ site n’ọnwụ Kraịst ka a na-agbaghara anyị mmehie anyị, ka a na-emekwa ka anyị nwere onwe anyị.” (The Translator’s New Testament, 1973) Ị pụrụ ịhụ na ná nsụgharị ndị ahụ, e kwusiri okwu ike banyere ọnwụ Jizọs. ‘Ma,’ ka ụfọdụ pụrụ ikwu, ‘ọnwụ Jizọs dị mkpa n’ezie. N’ihi ya, olee ihe na-adịghị ná nsụgharị ndị a?’

15 N’ezie, ọ bụrụ na ị dabere ná nsụgharị ndị dị otú a, ị pụrụ ileghara isi ihe dị oké mkpa anya, nke a pụkwara ime ka ị ghara ịghọtacha ozi Bible. Nsụgharị ndị ahụ zochiri eziokwu ahụ bụ́ na ihe odide mbụ nke Ndị Efesọs 1:7 nwere okwu Grik nke pụtara “ọbara.” N’ihi ya, ọtụtụ Bible, dị ka Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, sụgharịrị ihe odide mbụ ahụ n’ụzọ ziri ezi karị: “Site n’aka ya ka e ji ihe mgbapụta tọhapụ anyị site n’ọbara nke onye ahụ, ee, mgbaghara nke njehie anyị, dị ka ịba ụba nke obiọma ya na-erughịrị mmadụ si dị.”

16. Okwu bụ́ ‘ọbara nke onye ahụ’ kwesịrị ichetara anyị gịnị?

16 Okwu bụ́ ‘ọbara nke onye ahụ’ nwere ihe dị ukwuu ọ pụtara, ọ pụkwara ime ka anyị chee banyere ọtụtụ ihe. A chọrọ ihe karịrị ọnwụ nke otu mmadụ, ọbụna ọnwụ nke mmadụ zuru okè bụ́ Jizọs. O mezuru ihe Iwu ahụ sere onyinyo ya, karịsịa n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie. N’ụbọchị ahụ pụrụ iche, a na-achụ anụmanụ ndị Iwu ahụ kwuru ka e jiri mee ihe n’àjà. E mesịa, nnukwu onye nchụàjà na-ewere ụfọdụ n’ime ọbara ha banye n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile nke ụlọikwuu ma ọ bụ ụlọ nsọ, na-eche ya n’ihu Chineke n’ebe ahụ, dị ka à ga-asị na ọ nọ n’ihu ya.—Ọpụpụ 25:22; Levitikọs 16:2-19.

17. Olee otú Jizọs si mezuo ihe Ụbọchị Mkpuchi Mmehie sere onyinyo ya?

17 Jizọs mezuru ihe Ụbọchị Mkpuchi Mmehie ahụ sere onyinyo ya, dị ka Pọl kọwara. Nke mbụ, o kwuru na nnukwu onye nchụàjà n’Izrel ji ọbara a na-awụsị “maka onwe ya nakwa maka mmehie nke ndị Izrel mere n’amaghị ama” abanye n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ otu ugboro n’afọ. (Ndị Hibru 9:6, 7) N’ikwekọ n’usoro ahụ, mgbe a kpọlitesịrị ya n’ọnwụ dị ka mmụọ, Jizọs banyere n’eluigwe n’onwe ya. Dị ka mmụọ, nke na-enweghị ahụ́ nke ọbara na anụ ahụ́, ọ pụrụ ịga “n’ihu Chineke n’onwe ya maka anyị.” Gịnị ka o chere n’ihu Chineke? Ọ bụghị ihe nkịtị kama ihe dị oké mkpa. Pọl gara n’ihu ikwu, sị: “Mgbe Kraịst bịara dị ka nnukwu onye nchụàjà . . . , ee e, o jighị ọbara ewu na nke ụmụ oké ehi banye, kama o ji ọbara nke ya, nanị otu ugboro n’ime ebe nsọ ahụ wee nwetara anyị mgbapụta ebighị ebi. N’ihi na ọ bụrụ na ọbara ewu na nke oké ehi . . . na-edo nsọ ruo n’ókè nke ime ka anụ ahụ́ dị ọcha, ruo ókè ka ukwuu há aṅaa ka ọbara nke Kraịst ahụ, bụ́ onye sitere na mmụọ ebighị ebi chụọ onwe ya n’àjà nye Chineke n’enweghị mmerụ, ga-eme ka akọ na uche anyị dị ọcha pụọ n’ọrụ nwụrụ anwụ ka anyị wee na-ejere Chineke ahụ dị ndụ ozi dị nsọ?” Ee, Jizọs chere n’ihu Chineke uru nke ọbara ndụ ya.—Ndị Hibru 9:11-14, 24, 28; 10:11-14; 1 Pita 3:18.

18. N’ihi gịnị ka ihe Bible na-ekwu banyere ọbara ji dị Ndị Kraịst mkpa taa?

18 Eziokwu a sitere n’aka Chineke na-enyere anyị aka ịghọta akụkụ nile dị ebube nke ihe Bible na-ekwu banyere ọbara—ihe mere Chineke ji ele ya anya otú o si ele ya, otú anyị kwesịrị isi na-ele ya anya, na ihe mere anyị ji kwesị ịkwanyere ihe mgbochi Chineke tinyere n’iji ọbara eme ihe ùgwù. Mgbe ị na-agụ akwụkwọ dị iche iche nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ị ga-ahụ ọtụtụ ebe e zoro aka n’ọbara nke Kraịst. (Lee igbe.) Nke a mere ka o doo anya na Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị inwe okwukwe “n’ọbara ya [Jizọs].” (Ndị Rom 3:25) Anyị inweta mgbaghara mmehie na iso Chineke dịrị n’udo ga-ekwe omume nanị ‘site n’ọbara ahụ Jizọs wụsịrị.’ (Ndị Kọlọsi 1:20) Nke a bụ nnọọ eziokwu banyere ndị ha na Jizọs nọ n’ọgbụgba ndụ pụrụ iche iso ya chịa n’eluigwe. (Luk 22:20, 28-30; 1 Ndị Kọrint 11:25; Ndị Hibru 13:20) Ọ bụkwa eziokwu banyere “oké ìgwè mmadụ” ahụ taa, bụ́ ndị ga-alanarị ‘oké mkpagbu’ na-abịanụ ma dị ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. N’ụzọ ihe atụ, ha ‘sara uwe mwụda ha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ.’—Mkpughe 7:9, 14.

19, 20. (a) N’ihi gịnị ka Chineke ji họrọ itinye ihe mgbochi n’iji ọbara eme ihe, mmetụta dịkwa aṅaa ka anyị kwesịrị inwe banyere nke a? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị inwe mmasị ịmara?

19 N’ụzọ doro anya, ọbara nwere ihe pụrụ iche ọ pụtara n’anya Chineke. O kwesịkwara ịdị otú ahụ nye anyị. Onye Okike, bụ́ onye nwere nchegbu banyere ndụ, nwere ikike ịkpara ihe ụmụ mmadụ ji ọbara eme ókè. N’ihi nchegbu dị ukwuu o nwere ọbụna banyere ndụ anyị, o kpebiri ka e jiri ọbara mee ihe nanị n’otu ụzọ dị oké mkpa, nanị ụzọ nke na-eme ka ndụ ebighị ebi kwe omume. Ụzọ ahụ metụtara ọbara dị oké ọnụ ahịa nke Jizọs. Lee ka anyị pụrụ isi nwee ekele na Jehova Chineke mere ihe maka ọdịmma anyị site n’iji ọbara—ọbara Jizọs—eme ihe n’ụzọ dị otú a na-azọpụta ndụ! Leekwa ka anyị si kwesị inwe ekele nye Jizọs maka ịwụsị ọbara ya dị ka àjà n’ihi anyị! N’ezie, anyị pụrụ ịghọta mmetụta Jọn onyeozi kwupụtara: “Nye onye ahụ nke hụrụ anyị n’anya, onye tọpụkwara anyị ná mmehie anyị site n’ọbara nke ya—o mekwara ka anyị bụrụ otu alaeze, ndị nchụàjà nye Chineke ya na Nna ya—ee, ka ebube na ike dịrị ya ruo mgbe ebighị ebi. Amen.”—Mkpughe 1:5, 6.

20 Ọ dịwo anya Chineke anyị nke maara ihe nile na Onye Na-enye Ndụ bu ọrụ a na-azọpụta ndụ n’uche. Ya mere, anyị pụrụ ịjụ, sị, ‘Olee otú nke a kwesịrị isi metụta mkpebi na omume anyị?’ Isiokwu na-esonụ ga-atụle ajụjụ a.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta banyere otú Chineke si ele ọbara anya site n’ihe ndekọ metụtara Ebel na Noa?

• N’Iwu ahụ, ihe mgbochi dị aṅaa ka Chineke tinyere n’iji ọbara eme ihe, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

• Olee otú Jizọs si mezuo ihe Ụbọchị Mkpuchi Mmehie ahụ sere onyinyo ya?

• Olee otú ọbara Jizọs pụrụ isi zọpụta ndụ anyị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe dị na peeji nke 18]

OLEE ỌBARA NKE NA-AZỌPỤTA NDỤ?

“Na-elezinụ onwe unu na ìgwè atụrụ ahụ dum anya, bụ́ nke mmụọ nsọ họpụtaworo unu ịbụ ndị nlekọta n’etiti ya, ka unu na-azụ ọgbakọ Chineke dị ka atụrụ, bụ́ nke o ji ọbara nke Ọkpara ya zụta.”—Ọrụ 20:28.

“Ya mere, ebe a kpọworo anyị ndị ezi omume ugbu a site n’ọbara ya, a ga-esite n’aka ya zọpụta anyị n’ọnụma.”—Ndị Rom 5:9.

“Unu enweghịkwa olileanya, unu bụkwa ndị na-enweghị Chineke n’ụwa. Ma ugbu a n’ịdị n’otu nke unu na Kraịst Jizọs, unu ndị nọbu n’ebe dị anya abịawo nọrọ nso site n’ọbara nke Kraịst ahụ.”—Ndị Efesọs 2:12, 13.

“Chineke hụrụ na ọ dị mma ka izu ezu nile biri n’ime ya, na isite n’aka ya mee ka ya na ihe ndị ọzọ nile dịghachi ná mma site n’iji ọbara ahụ ọ wụsịrị n’osisi ịta ahụhụ mee udo.”—Ndị Kọlọsi 1:19, 20.

“Ya mere, ụmụnna m, . . . anyị nwere nkwuwa okwu maka ụzọ e si abanye n’ebe nsọ ahụ site n’ọbara Jizọs.”—Ndị Hibru 10:19.

“Ọ bụghị ihe ndị pụrụ ire ure . . . ka e ji gbapụta unu n’ụdị omume unu nke na-adịghị amị mkpụrụ bụ́ nke unu natara site n’ọdịnala sitere n’aka ndị nna ochie unu. Kama ọ bụ ọbara dị oké ọnụ ahịa, dị ka nke nwa atụrụ na-enweghị mmerụ, nke na-enweghịkwa ntụpọ, ọbụna nke Kraịst.”—1 Pita 1:18, 19.

“Ọ bụrụ na anyị na-eje ije n’ìhè ahụ dị ka ya onwe ya nọ n’ìhè ahụ, anyị so ibe anyị na-ekerịta òkè, ọbara nke Jizọs bụ́ Ọkpara ya na-emekwa ka anyị dị ọcha pụọ ná mmehie nile.”—1 Jọn 1:7.

“I ruru eru ịnara akwụkwọ mpịakọta ahụ ma meghee akara ya, n’ihi na e gburu gị egbu, i jikwa ọbara gị zụtara Chineke ndị mmadụ site n’ebo na asụsụ na ndị na mba ọ bụla.”—Mkpughe 5:9.

“A chụdawo onye ahụ nke na-ebo ụmụnna anyị ebubo . . . Ha merikwara ya n’ihi ọbara Nwa Atụrụ ahụ na n’ihi okwu nke àmà ha na-agba.”—Mkpughe 12:10, 11.

[Foto dị na peeji nke 16]

Site n’Iwu ahụ, Chineke mere ka o doo anya na ọbara pụrụ ịrụ ọrụ n’ịgbaghara mmehie

[Foto dị na peeji nke 17]

Site n’ọbara Jizọs, a pụrụ ịzọpụta ndụ ọtụtụ ndị