Ndị Gụsịrị Akwụkwọ na Gilead Apụọ Dị Ka Ndị Ọrụ Owuwe Ihe Ubi Na-anụ Ọkụ n’Obi!
Ndị Gụsịrị Akwụkwọ na Gilead Apụọ Dị Ka Ndị Ọrụ Owuwe Ihe Ubi Na-anụ Ọkụ n’Obi!
“IHE ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Nna Nwe owuwe ihe ubi ahụ ka o ziga ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya.” (Matiu 9:37, 38) Okwu ndị ahụ nwere ihe pụrụ iche ha pụtara nye ndị na-agụsị akwụkwọ na klas nke 116 nke Watchtower Bible School of Gilead ka ha na-akwadebe ịga n’ebe ndị e kenyere ha ozi ala ọzọ.
Na Saturday, March 13, 2004, ngụkọta nke mmadụ 6,684 gbakọtara n’Ebe Agụmakwụkwọ Watchtower dị na Patterson, New York, na n’ebe ndị ọzọ e gosiri usoro ihe omume ngụsị akwụkwọ ahụ na telivishọn, bụ́ mgbe ndị klas ahụ natara ndụmọdụ na agbamume e ji sị ha gaa nke ọma. Anyị nile pụrụ irite uru site na ndụmọdụ ndị e nyere ha ka anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ owuwe ihe ubi ime mmụọ ahụ.
Okwu mmeghe nke Theodore Jaracz, onye so n’Òtù Na-achị Isi, bụ́kwa onye gụsịrị akwụkwọ na klas nke asaa nke Gilead, mere ka okwu Jizọs ndị a pụta ìhè: “Gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.” (Matiu 28:19, 20) Lee ka nke ahụ si kwesị ekwesị ebe ọ bụ na a na-eziga ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ ije ozi ná mba 20 dị iche iche! O chetaara ụmụ akwụkwọ ahụ na ntụziaka sitere n’Okwu Chineke akwadebewo ha n’ụzọ zuru ezu ịbụ ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ n’owuwe ihe ubi ime mmụọ ahụ dị oké mkpa.—Matiu 5:16.
Ụzọ Isi Bụrụ Ndị Ọrụ Owuwe Ihe Ubi Na-arụpụta Ihe
Ọkà okwu mbụ n’usoro ihe omume ahụ bụ Robert Wallen, onye ọrụ ya metụtaworo nnọọ Ụlọ Akwụkwọ Gilead ruo ọtụtụ afọ. N’ikwu okwu n’isiokwu bụ́ “Ịma Mma nke Ọmịiko,” ọ gwara ụmụ akwụkwọ ahụ, sị: “Ọmịiko bụ asụsụ nke ọbụna ndị ntị chiri pụrụ ịnụ na nke ndị ìsì pụrụ ịhụ.” Jizọs maara nchegbu nke ndị ọzọ nke ọma ma chọọ ibelata ya. (Matiu 9:36) Ụmụ akwụkwọ ahụ ga-ahụ ọtụtụ ohere iji mee otú ahụ—n’ọrụ nkwusa, n’ọgbakọ, n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ, na n’alụmdi na nwunye nke ha. Ọkà okwu ahụ gbara ha ume, sị: “Kwenụ ka ịma mma nke ọmịiko pụta ìhè ná ndụ unu ka unu na-ejere ndị ọzọ ozi. Ọ bụ nanị àgwà kasị mma ga-eme ka unu nwee ihe ịga nke ọma ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ. Ya mere, kpebisienụ ike iyikwasị onwe unu ọmịiko.”—Ndị Kọlọsi 3:12.
Mgbe nke ahụ gasịrị, Gerrit Lösch, onye so n’Òtù Na-achị isi na onye gụsịrị akwụkwọ na klas nke 41 nke Gilead, kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eme Ka A Nụrụ Okwu Nzọpụta.” (Aịsaịa 52:7) Ka e wee nwee ike ịzọpụta ndị mmadụ mgbe a ga-ebibi usoro ihe dị ugbu a, ha aghaghị inweta ezi ihe ọmụma sitere n’Okwu Chineke, mee nkwupụta ihu ọha nke okwukwe ha, e meekwa ha baptizim. (Ndị Rom 10:10; 2 Timoti 3:15; 1 Pita 3:21) Otú ọ dị, isi ihe mere anyị ji eme ka a nụrụ okwu nke nzọpụta, abụghị iji zọpụta ụmụ mmadụ, kama iji wetara Chineke otuto. N’ihi ya, Nwanna Lösch dụrụ ndị ahụ na-aga ịghọ ndị ozi ala ọzọ ọdụ, sị: “Werenụ ozi Alaeze ahụ gaa ná nsọtụ nile nke elu ụwa mmadụ bi, bụrụkwanụ ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-eme ka a nụrụ okwu nke nzọpụta, na-eme ihe nile iji wetara Jehova otuto.”—Ndị Rom 10:18.
“Ruo n’Ókè Ha Aṅaa Ka Ị Na-enwupụ Enwupụ”? bụ ajụjụ onye nkụzi Gilead, bụ́ Lawrence Bowen, jụrụ. O zoro aka n’okwu Jizọs e dekọrọ na Matiu 6:22 ma gbaa ụmụ akwụkwọ ahụ na-agụsị akwụkwọ ume ka anya ha “na-elegide otu ebe” iji wee “na-egbukepụ ìhè nke ihe ọmụma ime mmụọ nke na-enye Jehova otuto ma na-abara mmadụ ibe anyị uru.” Site ná mmalite nke ozi ya, Jizọs setịpụrụ ihe nlereanya zuru okè na nke a site n’ịnọgide na-elekwasị anya n’ime uche Chineke. Ịtụgharị uche n’ihe ndị dị ebube Nna ya kụziwooro ya n’eluigwe nyeere Jizọs aka ịtachi obi n’ule ndị Setan lere ya n’ịkpa. (Matiu 3:16; 4:1-11) Jizọs gosipụtara na ya dabeere kpam kpam n’ebe Jehova nọ site n’ịrụzu ọrụ Chineke nyere ya. N’otu aka ahụ, iji wee nagide ihe ịma aka ndị dị n’ihu, ndị ozi ala ọzọ ahụ aghaghị ịnọgide na-enwe ezi àgwà nke ịmụ Bible na ịtụkwasị Jehova obi kpam kpam.
Mark Noumair, bụ́ onye nkụzi Gilead na onye gụsịrị akwụkwọ na klas nke 77 nke Gilead, mechiri usoro okwu a, na-ekwu okwu n’isiokwu bụ́ “Anyị Nọ n’Aka Gị.” (Joshua 9:25) Ọ gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume iṅomi àgwà nke ndị Gibiọn oge ochie. Ọ bụ ezie na Gibiọn bụ “obodo ukwu . . . ndị ikom ya nile bụkwa ndị dike,” ndị Gibiọn achọghị ka e were ha dị ka ndị a ma ama ma ọ bụ tụọ anya ka e mee ihe otú ha si chọọ. (Joshua 10:2) Ha ji ọchịchọ obi jee ozi dị ka “ndị ọwa nkụ na ndị ose mmiri” n’okpuru ndị Livaị iji kwadoo ofufe Jehova. (Joshua 9:27) Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ndị so na klas ahụ na-agụsị akwụkwọ agwawo Jọshụa ahụ Ka Ukwuu, bụ́ Jizọs Kraịst, sị, “Anyị nọ n’aka gị.” Ugbu a, ka ha na-amalite ozi ala ọzọ ha, ọ dị ha mkpa ịnakwere ọrụ ọ bụla Jọshụa ahụ Ka Ukwuu nyere ha ịrụ.
Ahụmahụ na Ajụjụ Ọnụ
“Na-emepenụ Akwụkwọ Nsọ nke Ọma” bụ isiokwu nke nkwurịta okwu Wallace Liverance, bụ́ onye gụsịrị akwụkwọ na klas nke 61 nke Gilead, bụ́kwa otu n’ime ndị nkụzi ha, so otu ìgwè nke ụmụ akwụkwọ ahụ nwee. Ha kọrọ ma mee ihe ngosi nke ahụmahụ ndị ha nwere n’ozi ubi n’oge ha nọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ. O doro anya na ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ kpụ ọkụ n’ọnụ ha nwere n’ime ọnwa ise nke ọzụzụ ha ruru ha n’obi ma kpalie ha iso ndị ọzọ kerịta ihe ndị ha mụtaworo. (Luk 24:32) N’oge ihe ọmụmụ ahụ nke were ọnwa ise, otu nwa akwụkwọ sooro nwanne ya nwoke kerịta ihe ndị ọ nọworo na-amụta. Nke a gbara nwanne ya ahụ ume ịchọpụta ọgbakọ dị n’ógbè ha ma malite ọmụmụ Bible nke ya. Ugbu a, o ruwo eru ịbụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim.
Mgbe ahụmahụ ndị a gasịrị, Richard Ashe na John Gibbard gbara ọtụtụ ndị ohu Jehova kwesịworo ntụkwasị obi ruo ogologo oge ajụjụ ọnụ, gụnyere ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị bụ́ ndị nọ na-enweta ọzụzụ pụrụ iche n’Ebe Agụmakwụkwọ Watchtower. Ha bụ ndị gụsịworo akwụkwọ na klas nke ụlọ akwụkwọ Gilead ndị bu ụzọ. Otu n’ime ha chetara na Nwanna Knorr kwuru n’oge klas nke ha, sị: “Ị ga-amụ ọtụtụ ihe na Gilead. Ma, ọ bụrụ na ị pụta bụrụ onye mpako juru isi, ọ ga-apụta na anyị akụwo afọ n’ala. Anyị chọrọ ka ị pụta bụrụ onye ịhụnanya jupụtara obi.” Ụmụnna ahụ na-ejegharị ejegharị dọrọ ndị klas a aka ná ntị ka ha bụrụ ndị nwere mmasị n’ebe ndị mmadụ nọ, ka ha na-emeso ndị ọzọ ihe dị ka Kraịst mere, ka ha jirikwa obi umeala nakwere ọrụ ọ bụla e nyere ha. Obi abụọ adịghị ya na itinye ndụmọdụ ndị a n’ọrụ ga-enyere ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ a aka ịbụ ndị na-arụpụta ihe n’ọrụ ha.
Gaanụ n’Ihu Dị Ka Ndị Ọrụ Owuwe Ihe Ubi Na-anụ Ọkụ n’Obi!
Ndị na-ege ntị nwere ohere nke igere okwu Stephen Lett, onye ọzọ so n’Òtù Na-achị Isi. O kwuru okwu bụ́ isi nke usoro ihe omume ahụ, nke isiokwu ya bụ “Gaanụ n’Ihu Dị Ka Ndị Ọrụ Owuwe Ihe Ubi Na-anụ Ọkụ n’Obi!” (Matiu 9:38) N’owuwe ihe ubi nkịtị, oge e ji ewe ihe ubi na-epe mpe. Ọ dị mkpa ka ndị na-ewe ihe ubi rụsie ọrụ ike. Lee ka nke ahụ si dị mkpa karị n’oge ọgwụgwụ nke usoro ihe a! Ná nnukwu owuwe ihe ubi ime mmụọ ahụ, ndụ ndị mmadụ nọ n’ihe ize ndụ. (Matiu 13:39) Nwanna Lett gbara ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ ume ịghara ‘ịdị umengwụ n’ihe ha na-eme’ kama ‘ịdị na-anụ ọkụ na mmụọ’ ma bụrụ “ndị ohu Jehova” n’ọrụ owuwe ihe ubi a a na-agaghị arụghachi ọzọ. (Ndị Rom 12:11) Ọkà okwu ahụ hotara okwu Jizọs, bụ́: “Welienụ anya unu lee ubi, na ha achawo maka owuwe ihe ubi.” (Jọn 4:35) Ọ gbaziri ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ ume igosipụta ịnụ ọkụ n’obi ha maka ọrụ owuwe ihe ubi ahụ site n’itinye ezi mgbalị iji jekwuru ndị mmadụ mgbe ọ bụla na n’ebe ọ bụla a pụrụ ịchọta ha site n’iji ohere ọ bụla dapụtaranụ mee ihe iji gbaa àmà n’oge ha na-anọghị n’ozi. Ịmụrụ anya iji ohere ọ bụla dapụtaranụ mee ihe pụrụ ime ka ọ dịkwuo mfe ịgba àmà dị irè. Jehova bụ Chineke nke na-anụ ọkụ n’obi, ọ na-atụkwa anya ka anyị nile na-eṅomi ya ma na-arụsi ọrụ ike n’ọrụ owuwe ihe ubi ime mmụọ ahụ.—2 Ndị Eze 19:31; Jọn 5:17.
N’imechi usoro ihe omume ahụ, onyeisi oche, bụ Nwanna Jaracz, gụrụ ozi ekele sitere n’ọtụtụ alaka ụlọ ọrụ ma nye ụmụ akwụkwọ ahụ diplọma ha. Otu n’ime ndị ahụ gụsịrị akwụkwọ gụpụtara akwụkwọ ozi sitere n’aka ndị klas ahụ, na-egosi ekele miri emi ha nwere maka ọzụzụ ha nwetaworo. N’ụzọ doro anya, usoro ihe omume ngụsị akwụkwọ nke klas nke 116 mere ka ndị nile bịaranụ kpebisikwuo ike ịga n’ihu dị ka ndị ọrụ owuwe ihe ubi na-anụ ọkụ n’obi.
[Igbe dị na peeji nke 25]
IHE BANYERE KLAS AHỤ
Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 6
Ọnụ ọgụgụ mba e zigara ha: 20
Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 46
Nkezi afọ ndụ ha: 34.2
Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 17.2
Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 13.9
[Foto dị na peeji nke 26]
Klas nke 116 Na-agụsị Akwụkwọ nke Watchtower Bible School of Gilead
Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.
(1) Ceansu, R.; Sparks, T.; Piña, C.; Turner, P.; Cheney, L. (2) Suardy, M.; Sjöqvist, Å.; Amadori, L.; Smith, N.; Jordan, A.; Boissonneault, L. (3) Matlock, J.; Ruiz, C.; Dular, L.; Vigneron, M.; Henry, K. (4) Sjöqvist, H.; Laux, J.; Ruzzo, J.; Gustafsson, K.; Boissonneault, R.; Jordan, M. (5) Henry, D.; Turner, D.; Kirwin, S.; Florit, K.; Ceansu, S. (6) Amadori, S.; Cheney, J.; Ross, R.; Nelson, J.; Ruiz, J.; Vigneron, M. (7) Florit, J.; Matlock, D.; Ross, B.; Laux, C.; Ruzzo, T.; Dular, D.; Kirwin, N. (8) Gustafsson, A.; Nelson, D.; Suardy, W.; Piña, M.; Smith, C.; Sparks, T.