Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ole Ndị Bụ Ndị Anabaptist?

Ole Ndị Bụ Ndị Anabaptist?

Ole Ndị Bụ Ndị Anabaptist?

NDỊ na-eleta etiti obodo Münster dị na Westphalia, Germany, nke mbụ ha na-akwụsịkarị iji kirie ngịga ígwè atọ e kowere n’elu otu ụlọ chọọchị. E wezụga oge ole na ole e kopụrụ ha, ngịga ndị ahụ anọwo ebe ahụ ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 500. Ihe nọbu n’ime ha bụ ozu mmadụ atọ bụ́ ndị a tara ahụhụ ma gbuo n’ihu ọha. Ndị ikom a bụ ndị okpukpe Anabaptist, ngịga atọ ndị ahụ bụkwa ihe ncheta nke alaeze ha.

Ole ndị bụ ndị Anabaptist? Oleekwa otú òtù a si malite? Gịnị bụ ozizi ha ndị bụ́ isi? Gịnị mere e ji gbuo ndị ikom ahụ? Oleekwa njikọ dị n’etiti ngịga atọ ahụ na otu alaeze?

Dozigharịa Chọọchị Ahụ— Ma Ọ̀ Bụ n’Ụzọ Dị Aṅaa?

Ná ngwụsị nke narị afọ nke 15 na ná mmalite nke narị afọ nke 16, nkatọ a na-akatọ Chọọchị Roman Katọlik na ndị ụkọchukwu mụbara. Àgwà ọjọọ na omume rụrụ arụ jupụtara na chọọchị ahụ; n’ihi ya, ọtụtụ chere na ọ dị mkpa ka a gbanwee ọtụtụ ihe. Na 1517, Martin Luther kwuru n’ihu ọha ka e nwee ndozigharị, ka ndị ọzọ na-esonyekwa n’arụmụka ahụ, Ndozigharị Ndị Protestant malitere n’oge na-adịghị anya.

Ma ndị ndozigharị ahụ enweghị otu atụmatụ ha kwekọrịtara na ya banyere ihe e kwesịrị ime ma ọ bụ ebe mgbanwe ahụ kwesịrị iru. Ọtụtụ ghọtara na ọ dị mkpa ịgbaso ụkpụrụ Bible n’okwu ndị metụtara ofufe. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị ndozigharị ahụ apụdịghị ikwekọrịta n’otu nkọwa nke ozizi Bible. Ụfọdụ chere na Ndozigharị ahụ na-egbu nnọọ oge. Ọ bụkwa n’etiti ndị ndozigharị a ka okpukpe Anabaptist si malite.

“N’ezie, ọ bụghị nanị otu òtù baptist ka e nwere; e nwere ọtụtụ,” ka Hans-Jürgen Goertz dere n’akwụkwọ ya bụ́ Die Täufer—Geschichte und Deutung. Dị ka ihe atụ, na 1521, ndị ikom anọ a maara dị ka ndị amụma Zwickau kpalitere ọgba aghara site n’ikwusa ozizi ndị Anabaptist na Wittenberg. Na 1525 kwa, e guzobere òtù ọzọ dị iche nke Anabaptist na Zurich, Switzerland. Òtù dị iche iche nke Anabaptist malitekwara na Moravia—nke bụzi Czech Republic—na n’obodo Netherlands.

Baptizim—Maka Ụmụaka Ka Ọ̀ Bụ Maka Ndị Toro Eto?

Òtù ndị Anabaptist na-adịkarị ntakịrị, ndị òtù ha na-abụkarịkwa ndị udo. Ndị òtù ha adịghị ezochi nkwenkwe ha; n’ezie, ha na-ekwusara ndị ọzọ ozi ọma. A kọwara nkwenkwe ndị bụ́ isi nke okpukpe Anabaptist n’Ụkpụrụ Okwukwe Schleitheim na 1527. Gụnyere ihe ndị ọzọ, ha jụrụ ịlụ agha, ha nọpụrụ iche site n’ụwa, ma na-achụpụ ndị na-eme ihe ọjọọ. Ma ihe e ji mara nkwenkwe ha karịa ihe ọ bụla ọzọ, bụ́ nke na-eme ka òtù Anabaptist dị iche pụọ n’okpukpe ndị ọzọ, bụ nkwenye ha kwenyesiri ike na baptizim bụ maka ndị toro eto, ọ bụghị maka ụmụaka. *

Ime ndị toro eto baptizim abụghị nanị okwu metụtara nkwenkwe okpukpe; ọ bụ okwu metụtara ikike. Ọ bụrụ na e chere ka mmadụ too tupu e mee ya baptizim—si otú a na-enye onye ahụ ohere ime mkpebi dabere n’okwukwe ya—ụfọdụ agaghịzi eme baptizim. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ruo n’ókè ụfọdụ, ndị a na-emeghị baptizim anọghị n’okpuru nchịkwa nke chọọchị. Nye chọọchị ụfọdụ, ime nanị ndị toro eto baptizim pụtara ibelata ikike chọọchị.

N’ihi ya, ma ndị Katọlik ma ndị òtù Luther chọrọ ịkwụsị omume nke ime nanị ndị toro eto baptizim. Ka 1529 gasịrị, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ n’ebe ụfọdụ, ndị mere ndị toro eto baptizim ma ọ bụ ndị e mere baptizim mgbe ha toworo eto, nwere ike inweta amamikpe ọnwụ. Odeakụkọ bụ́ Thomas Seifert na-akọwa na “Alaeze Ukwu Rom Dị Nsọ nke Obodo Germany ji obi ọjọọ kpagbuo” ndị Anabaptist. Mkpagbu ahụ ruru n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu na Münster.

Münster nke Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya Achọọ Mgbanwe

E nwere ihe dị ka mmadụ 10,000 bi na Münster nke mgbe ụwa na-emepechabeghị anya, e jikwa mgbidi siri nnọọ ike gbaa ya gburugburu, bụ́ nke dị ihe dị ka mita 90 n’obosara, gburugburu ya dịkwa ihe dị ka kilomita 5. Otú ọ dị, ọnọdụ dị n’ime ya akwụsirutụghị ike ka mgbidi ya. Akwụkwọ bụ́ The Kingdom of the Anabaptists, nke Ụlọ Ndebe Ihe Ochie nke Obodo Münster bipụtara na-ekwu banyere “esemokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị n’ime obodo, nke dị n’etiti Ndị Omeiwu na Ndị Nkịtị.” Ọzọkwa, obi adịghị ndị bi n’obodo ahụ mma n’ihi omume nke ndị ụkọchukwu. Münster mesịrị nabata Ndozigharị ahụ, na 1533 kwa, ọ gbanwere site n’ịbụ obodo ndị Katọlik gaa n’ịbụ nke ndị òtù Luther.

Otu n’ime ndị kasị kwusaa banyere ndozigharị na Münster bụ Bernhard Rothmann bụ́ onye na-emekarị nnọọ ihe ike ike. Onye edemede bụ́ Friedrich Oehninger kọwara na ‘echiche Rothmann ghọrọ nnọọ nke ndị Anabaptist; ya na ndị òtù ya ndị ọzọ jụrụ ime ụmụaka baptizim.’ O nwetara nkwado nke ọtụtụ ndị na Münster, ọ bụ ezie na echiche ya bụ́ ndị gbapụrụ nnọọ iche siiri ụfọdụ ndị ike ịnakwere. “Ọnụ ọgụgụ na-ebuwanye ibu nke ndị nwere mmasị n’okpukpe mbụ ha hapụrụ obodo ahụ, na-atụ ụjọ na nsogbu na-eche obodo ahụ ihu. Ndị Anabaptist si n’ebe nile nubatajuo na Münster, na-enwe olileanya na atụmanya ha na-aga imezu.” Njupụta a nke ndị Anabaptist na Münster dugara n’ihe omume na-awụ akpata oyi n’ahụ́.

A Nọchibido Jeruselem Ọhụrụ

Mmadụ abụọ si Netherlands kwabata na Münster—Jan Mathys, bụ́ onye na-eme achịcha nke si Haarlem, na Jan Beuckelson, onye a maara dị ka John nke Leiden—ga-ekere òkè pụtara ìhè n’ihe ndị ga-eme n’ebe ahụ. Mathys zọọrọ na ya bụ onye amụma ma kpọsaa April 1534 dị ka oge ọbịbịa nke abụọ nke Kraịst. A kpọsara na obodo ahụ bụ Jeruselem Ọhụrụ ahụ e kwuru okwu ya na Bible, ọtụtụ ndị n’obodo ahụ nọkwa na-atụ anya ọgwụgwụ ụwa. Rothmann kpebiri na a ga-enwekọ ihe onwunwe nile ọnụ. Ndị toro eto bi n’obodo ahụ aghaghị ime mkpebi: Ikwe ka e mee ha baptizim ma ọ bụ isi n’obodo ahụ kwapụ. Baptizim ọha e mere gụnyere nke ụfọdụ ndị kweere ka e mikpuo ha na mmiri nanị iji ghara ịhapụ ụlọ na ihe onwunwe ha.

Ọ tụrụ obodo ndị ọzọ n’anya ịhụ ka Münster ghọrọ obodo mbụ ebe ndị Anabaptist nwere ikike okpukpe na nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị kasịnụ. Dị ka akwụkwọ bụ́ Die Täufer zu Münster si kọọ, nke a wetaara “Münster iro nke Alaeze Ukwu Rom Dị Nsọ nke Obodo Germany.” Otu onye a na-akwanyere ùgwù n’ógbè ya, Eze bụ́ Bishọp bụ́ Count Franz von Waldeck, kpọọrọ ndị agha gaa nọchibido obodo Münster. Ọ bụ ndị òtù Luther na ndị Katọlik mejupụtara ndị agha ahụ. Okpukpe abụọ a, bụ́ ndị busorịtara onwe ha agha n’oge Ndozigharị ahụ, bụrụkwa ndị ga-ebusorịta onwe ha agha n’oge na-adịghị anya n’Agha Iri Afọ Atọ ahụ, gbakọtara aka megide ndị Anabaptist.

Mbibi nke Alaeze Anabaptist

Ikike nke ndị agha ahụ nọchibidoro obodo ahụ emenyeghị ndị nọ n’ime obodo ahụ ụjọ. N’April 1534, mgbe a tụrụ anya ọbịbịa nke ugboro abụọ nke Kraịst, Mathys nọkwasịrị n’elu ịnyịnya ọcha ma pụọ n’obodo ahụ, na-atụ anya nchebe Chineke. Cheedị banyere oké egwu jidere ndị na-akwado Mathys ka ha na-enyopụ anya site n’elu mgbidi nke obodo ahụ ma hụ ka usuu ndị agha ahụ nọchibidoro ha gburisịrị Mathys ma konye isi ya n’osisi.

John nke Leiden nọchiri Mathys, a kpọkwara ya Eze Jan nke ndị Anabaptist na Münster. Ọ chọrọ idozi ahaghị nhata nke ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị—obodo ahụ nwere ọtụtụ ụmụ nwanyị karịa ụmụ nwoke—site n’ịgba ụmụ nwoke ume ịlụ ụmụ nwanyị ole ha chọrọ. Iji gosi imebiga ihe ókè nke alaeze Anabaptist nọ na Münster, a na-egbu onye ọ bụla kwara iko, ma na-anakwere ịlụ karịa otu nwunye, ọbụna na-agba ndị mmadụ ume ime otú ahụ. Eze Jan n’onwe ya lụrụ ụmụ nwanyị 16. Mgbe otu n’ime ha, bụ́ Elisabeth Wandscherer, rịọrọ ka o kwe ka ya hapụ obodo ahụ, e gbupụrụ ya isi n’ihu ọha.

Nnọchibido ahụ were ọnwa 14, ruo na June 1535 bụ́ mgbe obodo ahụ mechara daa. E bibiri Münster ụdị mbibi a na-ebibighị ya ọzọ ruo n’Agha Ụwa nke Abụọ. Rothmann gbalagara, ma e jidere Eze Jan na mmadụ abụọ ndị ọzọ nọ n’isi òtù Anabaptist, taa ha ahụhụ ma gbuo ha. E tinyere ozu ha ná ngịga ma kowe ha n’elu Ụlọ Chọọchị St. Lambert. Nke ahụ ga-abụ “ihe ịdọ aka ná ntị na-emenye ụjọ nye ndị nile ga-achọ inye nsogbu n’ọdịnihu,” ka Seifert na-akọwa. Ee, itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị kpatara oké ọdachi.

Gịnị mere òtù Anabaptist ndị ọzọ? Mkpagbu gara n’ihu ruo ọtụtụ afọ na Europe nile. Ọtụtụ n’ime ndị Anabaptist jụwara isi ịga agha, ọ bụ ezie na ha nwere obere òtù nnupụisi. Ka oge na-aga, onye bụbu ụkọchukwu, bụ́ Menno Simons, ghọrọ onyeisi ndị òtù Anabaptist, e mesịkwara mara òtù ahụ dị ka òtù okpukpe Menno ma ọ bụ jiri aha ndị ọzọ mara ha.

Ngịga Atọ Ahụ

N’ụzọ bụ́ isi, ndị òtù Anabaptist bụ okpukpe gbalịrị ịgbaso ụkpụrụ Bible. Ma ndị isi ike e nwere na Münster kpaliri ndị Anabaptist ịhapụ ụkpụrụ ahụ ma tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ozugbo nke ahụ mere, okpukpe ahụ ghọrọ òtù ndị agha mgbanwe. Nke a kpataara ndị Anabaptist na obodo Münster nke mgbe ụwa na-emepechabeghị anya ọdachi.

A ka na-echetara ndị letara etiti obodo ahụ ihe omume ahụ jọgburu onwe ya nke mere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 500 gara aga. N’ụzọ dị aṅaa? Site ná ngịga atọ ahụ e kowere n’elu ụlọ chọọchị ahụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Isiokwu a adịghị atụle arụmụka na-akwado ma ọ bụ na-emegide ime ụmụaka baptizim. Iji nwetakwuo nkọwa n’okwu a, lee isiokwu bụ́ “È Kwesịrị Ime Ụmụaka Baptism?” n’Ụlọ Nche nke September 15, 1986.

[Foto ndị dị na peeji nke 13]

A tara Eze Jan ahụhụ, gbuo ya ma kowe ya n’elu Ụlọ Chọọchị St. Lambert