Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Bụ Chineke Na-akpata Nsogbu Anyị?

Ọ̀ Bụ Chineke Na-akpata Nsogbu Anyị?

Ọ̀ Bụ Chineke Na-akpata Nsogbu Anyị?

MGBE nwa nwanyị Marion toworo eto nwere nnukwu mmerụ ahụ́ n’ụbụrụ, Marion mere ihe ọtụtụ n’ime anyị ga-eme. * O kpegaara Chineke ekpere maka enyemaka. “Apụghị m icheta mgbe ọzọ m nọ n’amaghị ihe m ga-eme na n’owu ọmụma otú ahụ,” ka Marion na-ekwu. Ka e mesịrị, ọnọdụ nwa ya nwanyị bịara ka njọ, Marion malitekwara ịjụ Chineke ajụjụ. “N’ihi gịnị ka nke a ji na-eme?” ka ọ jụrụ. Ọ pụghị ịghọta otú Chineke na-ahụ n’anya ma na-eche banyere ụmụ mmadụ pụrụ isi gbahapụ ya.

Ahụmahụ Marion abụtụghị ihe ọhụrụ. Imerime ụmụ mmadụ n’ụwa nile echewo na Chineke agbahapụwo ha n’oge mkpa. “‘Ajụjụ banyere ihe mere CHINEKE ji kwe ka ihe ọjọọ na-eme,’ ka na-enye m nsogbu,” ka Lisa na-ekwu ka e gbusịrị nwa nwa ya. “Okwukwe m nwere na Chineke adachabeghị, ma n’ezie, ọ gbanweela.” N’ụzọ yiri nke ahụ, ka ọdachi na-agbawa obi nke metụtara nwa ya nwoke ọ mụrụ ọhụrụ dakwasịchara ya, otu nwanyị kwuru, sị: “Chineke akasighị m obi n’ihe ahụ merenụ. O lebatụbeghịrị m anya ma ọ bụ gosi m ọmịiko.” Ọ gbakwunyere, sị: “Ọ dịghị ihe ga-eme ka m gbaghara Chineke.”

Ndị ọzọ na-ewesa Chineke iwe mgbe ha na-ele ụwa gbara ha gburugburu anya. Ha na-ahụ ọtụtụ mba ndị bụ́ ogbenye ọnụ ntụ na ndị agụụ na-agụgbu, ndị gbara ọsọ agha na-enweghị olileanya, ụmụaka a na-apụghị ịgụta ọnụ bụ́ ndị ọrịa AIDS mere ụmụ mgbei, na ọtụtụ nde ndị ọrịa ndị ọzọ na-emekpọ ọnụ. Mgbe ha hụrụ ọnọdụ ndị a na ọdachi ndị yiri ha, ọtụtụ ndị na-ata Chineke ụta n’ihi ihe yiri ịgba nkịtị n’akụkụ ya.

Otú ọ dị, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị Chineke na-akpata nsogbu ndị na-adakwasị ihe a kpọrọ mmadụ. N’ezie, e nwere ezi ihe ndị mere anyị ga-eji kwere na n’oge na-adịghị anya Chineke ga-ewepụ nsogbu ndị na-adakwasị ezinụlọ mmadụ. Anyị na-agba gị ume ịsafe n’isiokwu na-esonụ ma hụ na Chineke na-eche banyere anyị n’ezie.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 A gbanwewo aha ndị ahụ.