Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Ozi E Degaara Noa

Akwụkwọ Ozi E Degaara Noa

Akwụkwọ Ozi E Degaara Noa

“EZIGBO Noa M Hụrụ n’Anya, agụwo m banyere gị na otú ị si wuo ụgbọ ahụ e ji zọpụta gị na ndị ezinụlọ gị n’Iju Mmiri ahụ ọtụtụ ugboro na Bible.”

Otú a ka otu akwụkwọ ozi si malite bụ́ nke otu nwata nwanyị dị afọ 15 aha ya bụ Minnamaria nyere n’asọmpi edemede maka ụmụ akwụkwọ ndị nọ n’agbata afọ 14 na 21. Ọ bụ ụlọ ọrụ Finland na-ahụ maka nzipụ akwụkwọ ozi, Òtù Ndị Nkụzi Na-akụzi Asụsụ Finnish, na Òtù Finland Na-ahụ Maka Edemede haziri asọmpi ahụ. A chọrọ ka ndị so n’asọmpi ahụ dee otu akwụkwọ ozi dabeere n’otu akwụkwọ. A pụrụ idegara ya onye dere akwụkwọ ahụ ma ọ bụ otu onye a kọrọ banyere ya n’ime akwụkwọ ahụ. Ndị nkụzi ahụ họọrọ ihe karịrị 1,400 n’ime akwụkwọ ozi nke ụmụ akwụkwọ ha ma wegara ha ndị ikpe nke asọmpi ahụ. Mgbe ahụ, ndị ikpe ahụ họpụtara otu nke kasị mma, iri ndị na-esote nke kasị mma, na iri ndị na-esote ha. Minnamaria nwere obi ụtọ na nke ya so ná ndị nke atọ ahụ.

N’ihi gịnị ka Minnamaria, nwa akwụkwọ dị afọ iri na ụma, ji degara Noa, nwoke biri ndụ ihe dị ka afọ 5,000 gara aga, akwụkwọ ozi ya? Ọ na-ekwu, sị: “Bible bụ ihe mbụ gbatara m n’obi. Abịawo m mara ndị a kọrọ akụkọ ha na Bible nke ọma. Agụwo m banyere ha ọtụtụ mgbe nke na ọ fọrọ nke nta ka o yie m ka hà dị ndụ. Ahọọrọ m Noa n’ihi na ndụ ya na-akpali nnọọ mmasị ma dị iche na nke m.”

Akwụkwọ ozi Minnamaria degaara Noa ji okwu ndị a mechie: “Ị ka bụ ihe nlereanya nke okwukwe na nrubeisi. Ndụ gị na-agba ndị nile na-agụ Bible ume iji okwukwe ha mee ihe.”

Akwụkwọ ozi a onye na-eto eto na-agụ Bible dere na-egosi na Bible “dị ndụ [n’ezie] ma na-akpa ike” n’ebe ndị mmadụ nọ, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi.—Ndị Hibru 4:12.