Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ha Sikwa n’Ebe ahụ Jiri Ụgbọ Mmiri Gaa Saịprọs”

“Ha Sikwa n’Ebe ahụ Jiri Ụgbọ Mmiri Gaa Saịprọs”

“Ha Sikwa n’Ebe ahụ Jiri Ụgbọ Mmiri Gaa Saịprọs”

Ọ BỤ otú a ka akwụkwọ Ọrụ Ndịozi si malite ihe ndekọ ya nke ahụmahụ ndị ozi ala ọzọ bụ́ Ndị Kraịst bụ́ Pọl, Banabas, na Jọn Mak nwere mgbe ha letara Saịprọs n’ihe dị ka 47 O.A. (Ọrụ 13:4) N’oge ahụ, dịkwa ka ọ dị n’oge a, Saịprọs dị nnọọ n’ebe dị mkpa n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ nke Mediterenian.

Ndị Rom chọsiri ike inweta agwaetiti a, ọ batakwara n’aka ha na 58 T.O.A. Tupu mgbe ahụ, Saịprọs enwewo akụkọ ihe mere eme nke jupụtara n’ihe omume ndị dị mkpa. Ọ bụ ndị Fonishia, ndị Gris, ndị Asiria, ndị Peasia, na ndị Ijipt bi na ya. Ndị Agha Ntụte, ndị Frank, na ndị Venice bikwara na ya Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya, ndị Ottoman mesịkwara bie na ya. Na 1914, ndị Britain weghaara agwaetiti ahụ ma chịa ya ruo mgbe ọ malitere chịwa onwe ya na 1960.

Njem nleta bụ isi ihe na-ewetara ya ego ugbu a, ma n’oge Pọl akụ̀ ndị sitere n’okike jupụtara na Saịprọs, bụ́ nke ndị Rom wekọọrọ iji mejupụta ụlọ akụ̀ Rom. A chọtara ọla kọpa n’agwaetiti ahụ ná mmalite nke akụkọ ihe mere eme ya, e mekwara atụmatụ na ka ọ na-erule ná ngwụsị nke oge ndị Rom, e gwupụtawo ọla kọpa dị tọn 250,000 n’ebe ahụ. Otú ọ dị, ụlọ ọrụ na-egwupụta ọla kọpa weghaara akụkụ ka ukwuu nke oké ọhịa ya maka ịnụcha ọla kọpa. Ọtụtụ oké ọhịa nke agwaetiti ahụ apụwo n’anya ka ọ na-erule oge Pọl bịara.

Saịprọs n’Okpuru Ndị Rom

Dị ka akwụkwọ nkà ihe ọmụma bụ́ Encyclopædia Britannica si kwuo, Julius Caesar, e mesịakwa Mark Antony, nyere Ijipt Saịprọs. Otú ọ dị, n’okpuru ọchịchị Ọgọstọs, e nyeghachiri ya ndị Rom—dị ka Luk, bụ́ onye dere Ọrụ Ndịozi, kwuru n’ụzọ ziri nnọọ ezi—onye ọchịchị ógbè, bụ́ onye nọ n’okpuru Rom, chịkwara ya. Ọ bụ Sajiọs Pọlọs bụ onye ọchịchị ógbè ahụ mgbe Pọl mere nkwusa n’ebe ahụ.—Ọrụ 13:7.

Pax Romana, bụ́ udo mba nile nke Rom mere ka e nwee, mere ka ebe ndị a na-egwupụta ọla kọpa na ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ihe mụbaa na Saịprọs, na-eweta ọganihu n’azụmahịa. E nwetakwuru ego site n’aka ndị agha Rom na ndị njem ala nsọ bụ́ ndị na-enubata na ya iji sọpụrụ Aphrodite, bụ́ chi nchebe nke agwaetiti ahụ. N’ihi ya, a rụrụ okporo ụzọ ndị ọhụrụ, ọdụ ụgbọ mmiri, na ụlọ ọha na eze ndị a chọrọ mma. A nọgidere na-asụ asụsụ Grik dị ka asụsụ obodo ahụ—tinyekwara ife eze ukwu Rom—ọtụtụ ndị fere Aphrodite, Apollo, na Zus. Ndị obodo ahụ nwere ihe ịga nke ọma ma nwee ememe na ọdịnala ndị na-adọrọ mmasị.

Nke a bụ ọnọdụ Pọl zutere ka ọ na-agagharị na Saịprọs ma na-akụziri ndị mmadụ banyere Kraịst ahụ. Otú ọ dị, Iso Ụzọ Kraịst erutewo Saịprọs tupu Pọl abịa ebe ahụ. Ihe ndekọ nke Ọrụ Ndịozi na-agwa anyị na mgbe ọnwụ nke Onye Kraịst mbụ nwụrụ n’ihi okwukwe ya, bụ́ Stivin, gasịrị, ụfọdụ Ndị Kraịst oge mbụ gbagara Saịprọs. (Ọrụ 11:19) Banabas, bụ́ onye ibe Pọl, bụ onye Saịprọs, n’ịbụkwa onye maara agwaetiti ahụ nke ọma, obi abụọ adịghị ya na ọ bụụrụ Pọl onye nduzi bụ́ ịgba na njem nkwusa a.—Ọrụ 4:36; 13:2.

Ịtụleghachi Njem Pọl

Ọ dịghị mfe ikwu ụzọ ndị Pọl si mee njem na Saịprọs. Otú ọ dị, ndị ọkà mmụta ihe ochie ghọtatụrụ ruo n’ókè ụfọdụ ebe ọmarịcha ụzọ ndị dị n’oge ndị Rom si gafee. N’ihi ọdịdị ala nke agwaetiti ahụ, o yiri ka ọbụna okporo ụzọ ndị nke oge a hà gbasoro ụzọ ndị ozi ala ọzọ oge mbụ ahụ pụrụ isiwo gafee.

Pọl, Banabas, na Jọn Mak ji ụgbọ mmiri si Seliushia gaa ọdụ ụgbọ mmiri Salamis. N’ihi gịnị ka ha ji gaa Salamis ebe isi obodo na ọdụ ụgbọ mmiri bụ́ isi dị na Pefọs? Otu ihe kpatara ya bụ na Salamis dị n’ụsọ oké osimiri nke akụkụ ọwụwa anyanwụ, nanị kilomita 200 site na Seliushia, nke na-adịdebeghị mmiri. Ọ bụ ezie na n’okpuru ọchịchị Rom, e jiri Pefọs dochie anya Salamis dị ka isi obodo, Salamis nọgidere bụrụ ebe ọdịbendị, agụmakwụkwọ, na azụmahịa nke agwaetiti ahụ hiwere isi. Ọnụ ọgụgụ butụrụ ibu nke ndị Juu bi na Salamis, ndị ozi ala ọzọ ahụ malitekwara “ikwusa okwu Chineke n’ụlọ nzukọ ndị Juu.”—Ọrụ 13:5.

Taa, Salamis bụzi mkpọmkpọ ebe. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ochie e gwupụtara n’ebe ahụ na-agba akaebe na obodo ahụ dị ebube ma nwee akụ̀ na ụba n’oge gara aga. A maara ọma ahịa ya, bụ́ ebe ndọrọ ndọrọ ọchịchị na okpukpe ya hiwere isi, nke ọma dị ka ebe pụrụ ịbụwo ámá nzukọ ndị Rom kasị ibu e gwupụtatụrụla n’ógbè Mediterenian. A chọtawo ná mkpọmkpọ ebe ya, nke dịwara site n’oge Ọgọstọs Siza, ala ụlọ ndị e ji nkume ndị a chọrọ nnọọ mma mee, ụlọ mmega ahụ́, ebe ịsa ahụ́ magburu onwe ha, ámá egwuregwu na ọgbọ egwuregwu, ebe olili ozu ndị a chọrọ nnọọ mma, na nnukwu ebe a na-eme ihe nkiri nke na-aba mmadụ 15,000! N’ebe na-adịghị anya site n’ebe ahụ, e nwere mkpọmkpọ ebe nke ụlọ nsọ mara mma nke Zus.

Ma Zus egbochilighị ala ọma jijiji ibibi obodo ahụ. Otu oké ala ọma jijiji e nwere na 15 T.O.A. bibiri akụkụ ka ukwuu nke Salamis, ọ bụ ezie na Ọgọstọs mesiri wughachi ya. Ala ọma jijiji bibiri ya ọzọ na 77 O.A., e wughachikwara ya ọzọ. Na narị afọ nke anọ, ọtụtụ ala ọma jijiji bibiri Salamis, ọ dịkwaghị mgbe o nwetaghachiri ebube mbụ ya. Ka ọ na-erule n’agbata 500 na 1500 O.A., ájá agbachiwo ọdụ ụgbọ mmiri ya, a gbahapụkwara ya.

E kwughị otú ndị Salamis si meghachi omume ná nkwusa Pọl. Ma Pọl aghaghịkwa ime nkwusa n’obodo ndị ọzọ. Mgbe ha na-apụ na Salamis, ndị ozi ala ọzọ ahụ nwere ụzọ atọ bụ́ isi ha pụrụ isiwo: otu nke gawara n’ụsọ oké osimiri nke ebe ugwu, na-agafe usoro ugwu Kyrenia; ọzọ gawara n’ebe ọdịda anyanwụ, na-agafe ala dị larịị nke Mesaoria site n’etiti agwaetiti ahụ; na nke atọ bụ́ nke dị n’akụkụ ụsọ oké osimiri nke ebe ndịda.

Akụkọ oge ochie gosiri na Pọl sooro ụzọ nke atọ ahụ. Ọ si n’ala a na-akọ ugbo na ya nke na-emepụta nri bụ́ nke nwere ájá pụrụ iche na-acha uhie uhie gafee. Ịga ihe dị ka kilomita 50 n’akụkụ ọdịda anyanwụ nke ebe ndịda, ụzọ ahụ rutewere obodo Larnaca tupu ya echigharịa n’ike gawa n’ebe ugwu ịbawa n’ime ime agwaetiti ahụ.

“N’agwaetiti ahụ Dum”

Okporo ụzọ awara awara ahụ ruru obodo oge ochie nke Ledra n’egbughị oge. Ọ bụ Nicosia, bụ́ isi obodo nke oge a, dị n’ebe a taa. Ihe àmà ọ bụla nke obodo oge ochie ahụ apụwo n’anya. Ma n’ime obodo Nicosia nke mgbidi Venice e wuru na narị afọ nke 16 gbara etiti ya gburugburu, e nwere okporo ámá na-ekwo ekwo dị warawara nke a na-akpọ Okporo Ámá Ledra. Anyị amaghị ma Pọl ọ̀ gara Ledra ma ọ bụ na ọ gaghị. Nanị ihe Bible gwara anyị bụ na ha gara “n’agwaetiti ahụ dum.” (Ọrụ 13:6) Akwụkwọ bụ́ The Wycliffe Historical Geography of Bible Lands na-ekwu na “ikekwe nke a pụtara na ọ gazutụrụ ógbè ndị Juu dị na Saịprọs.”

Pọl chọrọ nnọọ ijekwuru ọtụtụ mmadụ dị ka o kwere ya mee na Saịprọs. N’ihi ya, ọ pụrụ ịbụ na o si ụzọ dị n’ebe ndịda nke sitere na Ledra gafee Amathus na Kourion—obodo abụọ na-ekwo ekwo, ndị ọnụ ọgụgụ mmadụ buru ibu bi na ha.

Kourion dị n’ọnụ ọnụ ugwu nke fọrọ nke nta ka ọ kpọnye ọnụ n’ụsọ oké osimiri ndị dị n’okpuru. Ala ọma jijiji ahụ bibiri Salamis na 77 O.A. dakwasịkwara ọmarịcha obodo a nke ndị Gris na Rom. E nwekwara mkpọmkpọ ebe nke ụlọ nsọ a raara nye Apollo bụ́ nke dịwara site na 100 O.A. Ámá egwuregwu ya pụrụ ịba mmadụ 6,000. A pụrụ ịhụ ụzọ ndụ okomoko nke ọtụtụ ndị Kourion biri n’ala ụlọ ndị e jiri nkume ndị a chọrọ mma mee ọbụna n’ụlọ ndị oké ozu ndị nkịtị nwe.

Ịga Pefọs

Site na Kourion, ọmarịcha ụzọ ahụ nke na-aga n’akụkụ ebe ọdịda anyanwụ gafere obodo a na-emepụta mmanya na ya, jiri nwayọọ nwayọọ na-agbagokwu elu, ruo mgbe ọ kpọdara na mberede ma gbagọrọ gaa n’ụsọ oké osimiri ndị ajịrịja jupụtara na ha. Dị ka akụkọ ifo ndị Gris si kwuo, nke a bụ nnọọ ebe oké osimiri mụpụtara chi nwanyị bụ́ Aphrodite.

Aphrodite bụ chi a kasị mara amara na chi ndị Gris ndị a na-efe na Saịprọs, e jikwara ịdị uchu fee ya ofufe ruo na narị afọ nke abụọ O.A. Pefọs bụ ebe ofufe nke Aphrodite hiwere isi. N’oge opupu ihe ubi ọ bụla, a na-eme nnukwu ememe n’ebe ahụ iji sọpụrụ ya. Ndị njem ala nsọ si Asia Minor, Ijipt, Gris, na ebe ndị dị anya dị ka Peasia na-abịa na Pefọs n’ihi ememe ndị ahụ. Mgbe Saịprọs nọ n’okpuru ọchịchị ndị Ptolemy, ndị Saịprọs malitere ife Fero.

Pefọs bụ obodo ndị Rom ji mere isi obodo Saịprọs na ebe onye ọchịchị ógbè na-anọ achị, o nwekwara ihe ùgwù nke ịbụ ebe a na-ebi mkpụrụ ego ọla kọpa. Ala ọma jijiji ahụ e nwere na 15 T.O.A. bibikwara ya, dịkwa ka o bibiri Salamis, Ọgọstọs nyere ego ka e wughachi obodo ahụ. Ihe ndị e gwupụtara n’ala ekpughewo ndụ okomoko nke ndị bara ọgaranya biri na narị afọ nke mbụ na Pefọs—okporo ámá obodo ndị sara mbara, ụlọ ndị oké ozu a chọrọ mma, ụlọ akwụkwọ na-akụzi egwú, ụlọ mmega ahụ́, na ọgbọ egwuregwu.

Nke a bụ Pefọs nke Pọl, Banabas, na Jọn Mak letara, ọ bụkwa ebe a ka onye ọchịchị ógbè bụ́ Sajiọs Pọlọs—“nwoke nwere ọgụgụ isi”—“chọsiri ike ịnụ okwu Chineke” n’agbanyeghị mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ nke dibịa afa bụ́ Elimas. ‘Ozizi Jehova juru onye ọchịchị ógbè ahụ anya.’—Ọrụ 13:6-12.

Mgbe ha rụzuru ọrụ nkwusa ha na Saịprọs n’ụzọ gara nke ọma, ndị ozi ala ọzọ ahụ gara n’ihu n’ọrụ ha n’Asia Minor. Njem ozi ala ọzọ mbụ ahụ Pọl mere bụ nzọụkwụ dị mkpa ná mgbasa ezi Iso Ụzọ Kraịst. Akwụkwọ bụ́ St. Paul’s Journeys in the Greek Orient na-akpọ ya “ezigbo mmalite nke ozi Ndị Kraịst na nke . . . ọrụ ozi ala ọzọ Pọl.” Ọ na-agbakwụnye, sị: “N’ịbụ nke dị n’ebe ụzọ ụgbọ mmiri ndị na-eduga na Siria, Asia Minor, na Gris, zutere onwe ha, Saịprọs yiri ka ọ̀ bụ ebe kwesịrị ekwesị ịmalite njem ozi ala ọzọ.” Ma, nke ahụ bụ nanị nzọụkwụ mbụ. Narị afọ iri abụọ ka e mesịrị, ozi ala ọzọ nke Ndị Kraịst ka na-aga n’ihu, a pụkwara ikwu n’ezie na ozi ọma nke Alaeze Jehova eruwo “n’akụkụ kasị anya n’ụwa” n’ụzọ nkịtị.—Ọrụ 1:8.

[Map ndị dị na peeji 20]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

SAỊPRỌS

NICOSIA (Ledra)

Salamis

Pefọs

Kourion

Amathus

Larnaca

UGWU KYRENIA

ALA DỊ LARỊỊ NKE MESAORIA

UGWU TROODOS

[Foto dị na peeji nke 21]

N’ịbụ onye jupụtara na mmụọ nsọ, Pọl mere ka dibịa afa bụ́ Elimas kpuo ìsì mgbe ọ nọ na Pefọs