Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Na-ezi Ha Ka Ha Debe Ihe Nile M Nyeworo Unu n’Iwu”

“Na-ezi Ha Ka Ha Debe Ihe Nile M Nyeworo Unu n’Iwu”

“Na-ezi Ha Ka Ha Debe Ihe Nile M Nyeworo Unu n’Iwu”

“Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m . . . , na-ezi ha ka ha debe ihe nile m nyeworo unu n’iwu.”—MATIU 28:19, 20.

1. Mkparịta ụka dị aṅaa weere ọnọdụ n’etiti Filip onye na-eso ụzọ na otu nwoke si Etiopia?

NWOKE ahụ si Etiopia emewo ogologo njem gaa Jeruselem. N’ebe ahụ, o fere Chineke ọ hụrụ n’anya, bụ́ Jehova ofufe. O doro anya na o nwekwara mmasị n’Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ. Ka o ji ụgbọ ịnyịnya ya na-ala, ọ nọ na-agụ ihe odide nke Aịzaịa onye amụma mgbe Filip, bụ́ onye na-eso ụzọ Kraịst, zutere ya. Filip jụrụ onye Etiopia ahụ, sị: “Ị̀ maara n’ezie ihe ị na-agụ?” Nwoke ahụ zara, sị: “Olee nnọọ otú m ga-esi mara, ma ọ́ bụghị ma mmadụ ò duziri m?” Filip gara n’ihu inyere onye a ji ezi obi na-amụ Akwụkwọ Nsọ aka ịghọ onye na-eso ụzọ Kraịst.—Ọrụ 8:26-39.

2. (a) Olee otú azịza onye Etiopia ahụ nyere si nwee ihe dị ukwuu ọ pụtara? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa metụtara iwu Kraịst nyere ka e mee ndị na-eso ụzọ ka anyị ga-atụle?

2 Ihe onye Etiopia ahụ zaghachiri kwesịrị ịrịba ama. Ọ sịrị: ‘Olee otú m ga-esi mara, ma ọ́ bụghị ma mmadụ ò duziri m?’ Ee, ọ chọrọ onye ga-eduzi ya ịghọta ihe ọ na-agụ. Azịza a n’onwe ya na-egosi ịdị mkpa nke otu ntụziaka a kapịrị ọnụ Jizọs nyere mgbe ọ na-enye iwu ka e mee ndị na-eso ụzọ. Gịnị bụ ntụziaka ahụ? Iji nweta azịza ya, ka anyị gaa n’ihu n’ịtụle okwu Jizọs ndị a na-achọta na Matiu isi 28. Isiokwu bu ụzọ tụlere ajụjụ ndị bụ́ n’ihi gịnị? na ebee? Ugbu a, anyị ga-atụle ajụjụ abụọ ọzọ metụtara iwu Kraịst nyere ka e mee ndị na-eso ụzọ—gịnị? na ole mgbe?

“Na-ezi Ha Ka Ha Debe Ihe Nile”

3. (a) Olee otú mmadụ si aghọ onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst? (b) Ime ndị na-eso ụzọ na-agụnye izi gịnị?

3 Gịnị ka anyị na-aghaghị izi iji nyere ndị ọzọ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst? Jizọs nyere ụmụazụ ya iwu, sị: “Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ, na-ezi ha ka ha debe ihe nile m nyeworo unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) Ya mere, anyị aghaghị izi ihe Kraịst nyere n’iwu. * Otú ọ dị, gịnị ga-enyere anyị aka ịhụ na ọ bụghị nanị na onye e ziri iwu Jizọs ga-aghọ onye na-eso ụzọ kamakwa, ọ ga-anọgide na-abụ onye na-eso ụzọ? A na-ahụ otu ihe bụ́ isi ga-enyere anyị aka ime nke a n’okwu Jizọs ji nlezianya họrọ. Rịba ama, ihe o kwuru abụghị nanị: ‘Na-ezi ha ihe nile m nyere unu n’iwu.’ Kama nke ahụ, ọ sịrị: “Na-ezi ha ka ha debe ihe nile m nyeworo unu n’iwu.” (Matiu 19:17) Gịnị ka nke ahụ pụtara?

4. (a) Gịnị ka idebe iwu pụtara? (b) Mee ihe atụ otú anyị si ezi mmadụ idebe iwu Kraịst.

4 Idebe iwu pụtara “mmadụ ime ka omume ya kwekọọ” n’iwu—irube isi na ya. Oleezi otú anyị si ezi ndị mmadụ idebe, ma ọ bụ irube isi n’ihe ndị Kraịst nyere n’iwu? Ọ dị mma, chee banyere otú onye na-akụzi ịnya ụgbọala si akụziri ụmụ akwụkwọ ya idebe iwu na-achịkwa okporo ụzọ. Onye nkụzi ahụ pụrụ ịkụziri ụmụ akwụkwọ ya iwu na-achịkwa okporo ụzọ mgbe ha nọ na klas. Otú ọ dị, iji kụziere ụmụ akwụkwọ ya otú e si erube isi n’ụkpụrụ ndị ahụ, ọ ghaghị iduzi ụmụ akwụkwọ ndị ahụ ka ha na-anya ụgbọala n’okporo ụzọ ma na-agbalị itinye ihe ndị ha mụtaworo n’ọrụ. N’otu aka ahụ, mgbe anyị na-amụrụ ndị mmadụ Bible, anyị na-ezi ha iwu Kraịst. Otú ọ dị, ọ dịkwa mkpa ka anyị na-eduzi ndị anyị na-amụrụ ihe ka ha na-agbalị itinye ntụziaka Kraịst n’ọrụ ná ndụ ha na-adị kwa ụbọchị na n’ozi. (Jọn 14:15; 1 Jọn 2:3) Ya mere, imezu iwu Kraịst nke ime ndị na-eso ụzọ na-achọ ka anyị bụrụ ma ndị nkụzi ma ndị nduzi. N’ụzọ dị otú ahụ, anyị na-eṅomi ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ na nke Jehova n’onwe ya.—Abụ Ọma 48:14; Mkpughe 7:17.

5. Gịnị pụrụ ime ka onye anyị na-amụrụ Bible na-ala azụ irube isi n’iwu Kraịst nke ime ndị na-eso ụzọ?

5 Izi ndị ọzọ idebe iwu Jizọs na-agụnye inyere ha aka ịṅa ntị n’iwu ime ndị na-eso ụzọ. Nye ụfọdụ ndị anyị na-amụrụ Bible, nke ahụ pụrụ iyi ihe siri ike omume. Ọ bụrụgodị na ha bụbu ndị òtù na-anụ ọkụ n’obi nke chọọchị ụfọdụ nke Krisendọm, o yikarịghị ka ndị ziri ha ihe n’okpukpe mbụ ha hà kụziiri ha ịga mee ndị na-eso ụzọ. Ụfọdụ ndị ndu chọọchị na-ekwu na mgbe a bịara n’izi ìgwè atụrụ ha ka ha na-agbasa ozi ọma, chọọchị dị iche iche nke Krisendọm kụrụ afọ n’ala. N’ikwu banyere iwu Jizọs bụ́ ka a gaa n’ime ụwa ma nyere ụdị mmadụ nile aka ịghọ ndị na-eso ụzọ, ọkà mmụta Bible bụ́ John R. W. Stott kwuru, sị: “Ọdịda anyị dara n’irube isi n’iwu a bụ adịghị ike kasịnụ nke Ndị Kraịst na-ekwu okwuchukwu n’ọrụ mgbasa ozi ọma taa.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Anyị na-achọ ịnọ n’ebe dị anya na-akpọsa ozi anyị. Mgbe ụfọdụ anyị na-adị ka ndị nọ n’ụsọ oké osimiri dị nchebe na-etiri ndị mmiri na-eri mkpu ihe ha ga-eme. Anyị adịghị amaba n’ime mmiri iji gụpụta ha. Anyị na-atụ egwu na mmiri ga-emetụ anyị n’ahụ́.”

6. (a) Mgbe anyị na-enyere onye anyị na-amụrụ Bible aka, olee otú anyị pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya Filip? (b) Olee otú anyị pụrụ isi gosi nchegbu anyị mgbe onye anyị na-amụrụ Bible malitere ikere òkè n’ọrụ nkwusa?

6 Ọ bụrụ na onye anyị na-amụrụ Bible nọbu n’okpukpe nke ndị nọ n’ime ya “na-atụ egwu na mmiri ga-emetụ [ha] n’ahụ́,” ọ pụrụ ịbụ ihe ịma aka nye ya ịkwụsị ịtụ ụjọ mmiri, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ma rube isi n’iwu Kraịst nke ime ndị na-eso ụzọ. Enyemaka ga-adị ya mkpa. Ya mere, ọ dị anyị mkpa inwe ndidi ka anyị na-enye ya ụdị ntụziaka na nduzi nke ga-enyere ya aka inwekwu nghọta miri emi ma kpalie ya ime ihe, dị nnọọ ka izi ihe Filip mere ka onye Etiopia ahụ nwekwuo ihe ọmụma ma kpalie ya ịbụ onye e mere baptizim. (Jọn 16:13; Ọrụ 8:35-38) Tụkwasị na nke ahụ, ọchịchọ anyị izi ndị anyị na-amụrụ Bible idebe iwu nke ime ndị na-eso ụzọ na-akpali anyị ịnọ ha n’akụkụ iji duzie ha mgbe ha na-ewere nzọụkwụ ndị mbụ ha n’ime nkwusa Alaeze.—Eklisiastis 4:9, 10; Luk 6:40.

“Ihe Nile”

7. Izi ndị ọzọ ‘idebe ihe nile’ gụnyere izi ha iwu ndị dị aṅaa?

7 Ihe anyị na-eme abụghị nanị izi ndị na-eso ụzọ ọhụrụ ime ndị na-eso ụzọ. Jizọs nyere anyị ntụziaka izi ndị ọzọ ka ha “debe ihe nile” o nyere n’iwu. N’ezie, nke ahụ na-agụnye iwu abụọ kasịnụ—ịhụ Chineke na ndị agbata obi n’anya. (Matiu 22:37-39) Olee otú a pụrụ isi zi onye ọhụrụ na-eso ụzọ idebe iwu ndị ahụ?

8. Mee ihe atụ otú a pụrụ isi zi onye ọhụrụ na-eso ụzọ iwu nke igosi ịhụnanya.

8 Were uche gaghachi n’ihe atụ ahụ nke onye na-amụ ịkwọ ụgbọala. Ka nwa akwụkwọ ahụ na-agba n’okporo ụzọ ka onye nkụzi ya nọ ya n’akụkụ, nwa akwụkwọ ahụ na-amụta ihe, ọ bụghị nanị site n’ige onye nkụzi ya ntị kamakwa site n’ikiri ndị ọkwọ ụgbọala ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, onye nkụzi ya pụrụ ịtụrụ ya onye ọkwọ ụgbọala nke ji obiọma kwe ka ọkwọ ụgbọala ọzọ gbafeta ya n’ihu aka; ma ọ bụ onye ọkwọ ụgbọala nke ji obiọma gbatulata ọkụ ihu ya ka ọ ghara ịchachi ọkwọ ụgbọala ndị na-abịa ya n’ihu anya; ma ọ bụ ọkwọ ụgbọala nke ji ọchịchọ obi ya nyere onye ụgbọala ya mebiri emebi aka. Ihe atụ ndị dị otú ahụ na-akụziri nwa akwụkwọ ahụ ọtụtụ ihe bara uru ndị ọ pụrụ itinye n’ọrụ mgbe ọ na-akwọ ụgbọala. N’ụzọ yiri nke ahụ, onye ọhụrụ na-eso ụzọ, bụ́ onye na-eje ije n’okporo ụzọ nke na-eduga ná ndụ na-amụta ihe, ọ bụghị nanị site n’aka onye nkụzi ya kamakwa site n’ezi ihe nlereanya nke ọ na-ahụ n’ọgbakọ.—Matiu 7:13, 14.

9. Olee otú onye ọhụrụ na-eso ụzọ si amụta ihe ọ pụtara bụ́ idebe iwu nke igosipụta ịhụnanya?

9 Dị ka ihe atụ, onye a na-amụrụ Bible pụrụ ịhụ onye nanị ya na-azụ ụmụ nke na-eme mgbalị dị ukwuu ịchị ụmụaka ya abịa Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ pụrụ ịhụ onye nwere nkụda mmụọ nke na-abịachi nzukọ anya n’agbanyeghị na ya na nkụda mmụọ na-alụ, onye agadi di ya nwụrụ nke na-akwọta ndị agadi ndị ọzọ ná nzukọ nke ọ bụla nke ọgbakọ, ma ọ bụ onye nọ n’afọ iri na ụma nke na-ekere òkè n’ịzachasị Ụlọ Nzukọ Alaeze. Onye ahụ a na-amụrụ Bible pụrụ ịhụ okenye ọgbakọ nke ji ikwesị ntụkwasị obi na-ebute ụzọ n’ozi ubi n’agbanyeghị ọtụtụ ibu ọrụ o nwere n’ọgbakọ. Ọ pụrụ izute Onyeàmà nwere nkwarụ onye na-adịghịkwa apụta èzí ma bụrụ isi iyi nke agbamume nye ndị nile na-abịa eleta ya. Onye ahụ a na-amụrụ ihe pụrụ ịdị na-ahụ di na nwunye na-eme mgbanwe dị ukwuu ná ndụ ha iji na-elekọta ndị nne na nna ha meworo agadi. Site n’ikiri Ndị Kraịst dị otú ahụ nwere obiọma ndị na-enyere ndị ọzọ aka ma na-ekwesị ntụkwasị obi, onye ọhụrụ ahụ na-eso ụzọ na-amụta site n’ihe nlereanya, ihe ọ pụtara bụ́ irube isi n’iwu Kraịst bụ́ ka a hụ Chineke na ndị agbata obi n’anya, karịsịa ndị kwere ekwe ibe ya. (Ilu 24:32; Jọn 13:35; Ndị Galeshia 6:10; 1 Timoti 5:4, 8; 1 Pita 5:2, 3) N’ụzọ dị otú a, onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst, pụrụ—kwesịkwa—ịbụ onye nkụzi na onye nduzi.—Matiu 5:16.

“Ruo Ọgwụgwụ nke Usoro Ihe”

10. (a) Ruo ole mgbe ka anyị ga-anọgide na-eme ndị na-eso ụzọ? (b) Ihe nlereanya dị aṅaa ka Jizọs setịpụrụ n’ihe banyere ịrụzu ọrụ?

10 Ruo ole mgbe ka anyị kwesịrị ịnọgide na-eme ndị na-eso ụzọ? Ruo ọgwụgwụ nke usoro ihe. (Matiu 28:20) Ànyị ga-enwe ike irube isi n’akụkụ a nke iwu Jizọs? Dị ka ọgbakọ zuru ụwa ọnụ, anyị kpebisiri ike ime otú ahụ. N’afọ ndị gara aga, anyị ejiwo obi ụtọ jiri oge, ume, na ihe onwunwe anyị chọọ ndị “nwere ezi ọchịchọ obi maka ndụ ebighị ebi.” (Ọrụ 13:48) Ka ọ dị ugbu a, Ndịàmà Jehova na-etinye ná nkezi ihe karịrị nde awa atọ kwa ụbọchị n’afọ n’ọrụ nkwusa Alaeze na nke ime ndị na-eso ụzọ n’ụwa nile. Anyị na-eme otú ahụ n’ihi na anyị na-agbaso ihe nlereanya Jizọs. O kwuru, sị: “Ihe oriri m bụ ka m mee uche nke onye ahụ zitere m nakwa ka m rụchaa ọrụ ya.” (Jọn 4:34) Nke ahụ bụkwa ọchịchọ anyị sitere n’obi. (Jọn 20:21) Anyị chọrọ ime ihe karịrị ịmalite ọrụ ahụ e nyere anyị; anyị chọrọ ịrụcha ya.—Matiu 24:13; Jọn 17:4.

11. Gịnị meworo ụfọdụ ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ Ndị Kraịst, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

11 Otú ọ dị, ọ na-ewute anyị ịhụ na ụfọdụ ndị kwere ekwe ibe anyị aghọwo ndị na-adịghị ike n’ụzọ ime mmụọ, n’ihi ya kwa, kwụsịlata ma ọ bụ kwụsịchaa irube isi n’iwu Kraịst nke ime ndị na-eso ụzọ. Ọ̀ dị ụzọ ọ bụla anyị pụrụ isi nyere ha aka ịmaliteghachi iso ọgbakọ na-akpakọrịta ma maliteghachi ikere òkè n’ime ndị na-eso ụzọ? (Ndị Rom 15:1; Ndị Hibru 12:12) Ụzọ Jizọs si nyere ndịozi ya aka mgbe ha na-adịchaghị ike na-egosi ihe anyị pụrụ ime taa.

Gosi Mmetụta

12. (a) Obere oge tupu Jizọs anwụọ, gịnị ka ndịozi ya mere? (b) Olee otú Jizọs si mesoo ndịozi ya ihe n’agbanyeghị nnukwu adịghị ike ha?

12 Ná ngwụsị nke ozi Jizọs n’ụwa, mgbe ọnwụ ya na-eru nso, ndịozi ya ‘gbahapụrụ ya gbalaga.’ Dị ka Jizọs buworo n’amụma, ha ‘gbasara onye ọ bụla gaa n’ụlọ ya.’ (Mak 14:50; Jọn 16:32) Olee otú Jizọs si mesoo ndị enyi ya na-adịghị ike n’ụzọ ime mmụọ ihe? Nwa oge ka o bilitesịrị n’ọnwụ, Jizọs gwara ụfọdụ ụmụazụ ya, sị: “Unu atụla egwu! Gaanụ, kọọrọ ụmụnna m, ka ha wee gaa Galili; n’ebe ahụ ka ha ga-ahụkwa m.” (Matiu 28:10) Ọ bụ ezie na ndịozi ahụ gosipụtara nnọọ adịghị ike, Jizọs ka kpọrọ ha “ụmụnna m.” (Matiu 12:49) Ọ kwụsịghị ịtụkwasị ha obi. N’ụzọ dị otú a, Jizọs nwere obi ebere ma na-agbaghara mmejọ, dị nnọọ ka Jehova nwere obi ebere ma na-agbaghara. (2 Ndị Eze 13:23) Olee otú anyị pụrụ isi na-eṅomi Jizọs?

13. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ndị na-adịghịzi ike n’ụzọ ime mmụọ anya?

13 Anyị kwesịrị inwe nchegbu miri emi maka ndị kwụsịlataworo ma ọ bụ kwụsịchaa ikere òkè n’ozi. Anyị ka na-echeta ọrụ ndị kwere ekwe ibe anyị dị otú ahụ ji ịhụnanya rụọ n’oge ndị gara aga—ụfọdụ ma eleghị anya ruo ọtụtụ iri afọ. (Ndị Hibru 6:10) Mkpakọrịta anyị na ha na-agụsi anyị agụụ ike n’ezie. (Luk 15:4-7; 1 Ndị Tesalonaịka 2:17) Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi gosipụta nchegbu anyị nwere maka ha?

14. N’iṅomi Jizọs, olee otú anyị pụrụ isi nyere onye na-adịghị ike aka?

14 Jizọs gwara ndịozi ya nwere nkụda mmụọ ka ha gaa Galili na ha ga-ahụ ya n’ebe ahụ. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, Jizọs kpọrọ ha òkù ịga nzukọ pụrụ iche. (Matiu 28:10) N’ụzọ yiri nke ahụ taa, anyị na-agba ndị na-adịghị ike n’ụzọ ime mmụọ ume ịga nzukọ ọgbakọ Ndị Kraịst, ọ pụrụ ịdị mkpa ka anyị gbaa ha ume karịa otu ugboro ime otú ahụ. N’ọnọdụ nke ndịozi ahụ, ọkpụkpọ òkù ahụ mịpụtara mkpụrụ, n’ihi na “ndị na-eso ụzọ iri na otu ahụ banyere Galili gaa n’ugwu, bụ́ ebe Jizọs meworo ndokwa ka ha gaa.” (Matiu 28:16) Lee ka anyị si enwe ọṅụ mgbe ndị na-adịghị ike si otú ahụ zaa òkù anyị ji ịnụ ọkụ n’obi kpọọ ha ma maliteghachi ịga nzukọ Ndị Kraịst!—Luk 15:6.

15. Olee otú anyị pụrụ isi gbasoo ihe nlereanya Jizọs n’ịnabata ndị na-adịghị ike bịara n’ebe anyị na-ezukọ?

15 Olee otú anyị ga-esi emeghachi omume mgbe Onye Kraịst na-adịghị ike rutere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze? Ọ dị mma, gịnị ka Jizọs mere mgbe ọ hụrụ ndịozi ya, bụ́ ndị okwukwe ha belatatụworo, n’ebe ọ gwara ha zute ya? Jizọs ‘bịaruru nso ma gwa ha okwu.’ (Matiu 28:18) Ọ nọghị na-enyo ha site n’ebe dị anya kama ọ gakwuuru ha. Cheedị ụdị ahụ́ iru ala ndịozi ahụ na-aghaghị inwewo mgbe Jizọs buru ụzọ bịakwute ha! Ka anyị bute ụzọ n’ime ihe ma jiri ịnụ ọkụ n’obi nabata ndị na-adịghị ike n’ụzọ ime mmụọ bụ́ ndị na-eme mgbalị ịlọghachi n’ọgbakọ Ndị Kraịst.

16. (a) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ụzọ Jizọs si mesoo ụmụazụ ya ihe? (b) Olee otú anyị pụrụ isi na-ele ndị na-adịghị ike anya dị ka Jizọs mere? (Lee ihe odide ala ala peeji.)

16 Gịnị ọzọ ka Jizọs mere? Nke mbụ, ọ mara ọkwa, sị: “E nyewo m ikike nile.” Nke abụọ, o nyere ọrụ a ga-arụ: “Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.” Nke atọ, o kwere nkwa, sị: “M nọnyeere unu ụbọchị nile.” Ma ị̀ rịbara ama ihe Jizọs na-emeghị? Ọ baghịrị ndị na-eso ụzọ ya mba n’ihi ọdịda na obi abụọ ha. (Matiu 28:17) Ụzọ o si mee ihe ọ̀ dị irè? Ee. N’oge na-adịghị anya, ndịozi ahụ maliteghachiri ‘izi ihe na ịkpọsa ozi ọma.’ (Ọrụ 5:42) Site n’ịgbaso ihe nlereanya Jizọs nke ụzọ isi na-ele ndị na-adịghị ike anya ma na-emeso ha ihe, anyị pụrụ ịhụ ihe ndị na-enye obi ụtọ yiri nke ahụ ọ ga-arụpụta n’ọgbakọ anyị. *Ọrụ 20:35.

“M Nọnyeere Unu Ụbọchị Nile”

17, 18. Echiche dị aṅaa na-agba ume dị n’okwu Jizọs bụ́, “m nọnyeere unu ụbọchị nile”?

17 Okwu ikpeazụ nke iwu Jizọs nyere, bụ́ “m nọnyeere unu ụbọchị nile,” nwere echiche na-agba ume nye ndị nile na-agbalịsi ike imezu iwu Kraịst nke ime ndị na-eso ụzọ. N’agbanyeghị mmegide ọ bụla ndị iro ga-eweta megide ọrụ nkwusa Alaeze anyị, n’agbanyeghịkwa nkwutọ ha pụrụ ikwutọ anyị, ọ dịghị ihe mere anyị ga-eji tụọ egwu. N’ihi gịnị? Jizọs, bụ́ onye ndu anyị, onye nwere “ikike nile n’eluigwe na n’elu ụwa,” nọnyeere anyị ịkwado anyị!

18 Nkwa Jizọs bụ́ “m nọnyeere unu ụbọchị nile” bụkwa ihe na-agba ume nke ukwuu. Ka anyị na-agbalị idebezu iwu Kraịst nke ime ndị na-eso ụzọ, anyị na-enwe, ọ bụghị nanị ụbọchị ọṅụ kamakwa, ụbọchị mwute. (2 Ihe E Mere 6:29) Ụfọdụ n’ime anyị na-enwe oge mwute mgbe anyị na-eru újú ọnwụ nke onye anyị hụrụ n’anya nke ukwuu. (Jenesis 23:2; Jọn 11:33-36) Ndị ọzọ na-anagide ime agadi, bụ́ mgbe ahụ́ ike na ume na-adalata adalata. (Eklisiastis 12:1-6) Ndị ọzọ na-enwe ụbọchị mgbe ha na-enwe oké ịda mbà n’obi. (1 Ndị Tesalonaịka 5:14) Ọtụtụ n’ime anyị na ajọ ọnọdụ akụ̀ na ụba na-alụkwa. Otú o sina dị, n’agbanyeghị ihe ịma aka ndị dị otú a, anyị na-enwe ihe ịga nke ọma n’ozi anyị n’ihi na Jizọs nọnyeere anyị “ụbọchị nile,” gụnyere oge ihe kasị dịrị anyị njọ.—Matiu 11:28-30.

19. (a) Ntụziaka dị aṅaa dị n’iwu Jizọs nyere ka e mee ndị na-eso ụzọ? (b) Gịnị na-enyere anyị aka irube isi n’iwu Kraịst nyere anyị?

19 Dị ka anyị hụworo n’isiokwu a na nke bu ya ụzọ, iwu Jizọs nyere ka e mee ndị na-eso ụzọ metụtara ọtụtụ ihe. Jizọs gwara anyị ihe mere anyị ji kwesị irube isi n’iwu ya na ebe anyị kwesịrị ime otú ahụ. Ọ gwakwara anyị ihe anyị kwesịrị izi na mgbe anyị kwesịrị iziru ya. N’eziokwu, ịrụzu nnukwu ọrụ a bụ ihe ịma aka. Ma ebe Kraịst ji ikike ya na-akwado anyị ma nọnyere anyị, anyị pụrụ ịrụzu ya! Í kweghị nke ahụ?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Otu akwụkwọ na-ekwu na Jizọs kwuru, sị “na-eme ha baptizim . . . na-ezi ha ihe,” ọ bụghị ‘na-eme ha baptizim ma na-ezi ha ihe.’ N’ihi ya, iwu ahụ bụ́ ka a na-eme baptizim na ka a na-ezi ihe “abụchaghị . . . ihe abụọ na-esochi ibe ha.” Kama nke ahụ, “izi ihe bụ usoro na-aga n’ihu n’ihu, bụ́ nke na-amalite tupu baptizim . . . na nke na-aga n’ihu mgbe baptizim gasịrị.”

^ par. 16 A ga-enwetakwu ihe ọmụma banyere ụzọ isi lee ndị na-adịghị ike anya na ụzọ isi mesoo ha ihe n’Ụlọ Nche nke February 1, 2003, peeji nke 15-18.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee otú anyị si ezi ndị ọzọ idebe ihe Jizọs nyere n’iwu?

• Ihe ndị dị aṅaa ka onye ọhụrụ na-eso ụzọ pụrụ ịmụta site n’aka ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ?

• Gịnị ka anyị pụrụ ime iji nyere ndị na-adịghị ike n’ụzọ ime mmụọ aka?

• Ume na nkasi obi dị aṅaa ka anyị na-enweta ná nkwa Jizọs bụ́ “m nọnyeere unu ụbọchị nile”?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Ọ dị anyị mkpa ịbụ ma ndị nkụzi ma ndị nduzi

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Onye ọhụrụ na-eso ụzọ na-amụta ihe ndị bara uru site n’ihe nlereanya nke ndị ọzọ setịpụrụ