Ndụ Na-eju Afọ n’Agbanyeghị Ihe Ndị Na-agbawa Obi
Akụkọ Ndụ
Ndụ Na-eju Afọ n’Agbanyeghị Ihe Ndị Na-agbawa Obi
DỊ KA AUDREY HYDE SI KỌỌ
N’ileghachi anya azụ n’ihe karịrị afọ 63 m jeworo ozi oge nile—59 n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova—apụrụ m ikwu na ndụ m abụwo nke na-eju afọ. N’eziokwu, ịhụ ka di m nke mbụ jiri nwayọọ nwayọọ nwụọ n’ihi ọrịa cancer, nakwa ka nke abụọ tara ahụhụ n’ihi mmetụta ndị na-emenye ụjọ nke ọrịa Alzheimer bụ ihe na-agbawa obi. Ma, ka m kọọrọ gị otú m siworo nọgide na-enwe ọṅụ n’agbanyeghị ọdachi ndị a.
ETOLITERE M n’ubi dịdewere obere obodo bụ́ Haxtun nke dị n’ala dị larịị n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Colorado, na nso nso ókè ya na Nebraska. Abụ m nwa nke ise n’ime ụmụ isii nke Orille and Nina Mock. A mụrụ Russell, Wayne, Clara, na Ardis n’agbata 1913 na 1920, a mụkwara m n’afọ sochirinụ. A mụrụ Curtis na 1925.
Na 1913, mama m ghọrọ Onye Mmụta Bible, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ. Ka oge na-aga, anyị nile fọrọ n’ezinụlọ anyị ghọkwara.
Ndụ Dị Mma n’Ala Dị Larịị
Papa m bụ nnọọ onye na-anabata echiche ọhụrụ. Anyị nwere ọkụ eletrik n’ụlọ anyị nile dị n’ubi ahụ, ihe a na-adịghị nnọọ ahụkebe n’oge ahụ. Anyị rikwara ihe ndị a na-enweta n’ọrụ ubi—àkwá ọkụkọ anyị na-eyi, na mmiri ara ehi, mmiri ara ehi yiri bọta, na bọta site n’ehi anyị. Anyị na-eji ịnyịnya akọ ubi, na-akụkwa mkpụrụ osisi strawberry na poteto, tinyere ọka wit na ọka nkịtị.
Papa m kweere na anyị nile bụ́ ụmụaka kwesịrị ịmụta ịrụ ọrụ. Ọbụna tupu mụ
amalite ịga ụlọ akwụkwọ, a kụziiri m otú e si arụ ọrụ n’ubi. Ana m echeta oge okpomọkụ, mgbe m na-anọ n’anwụ na-abọchasị ahịrị ndị toro ogologo n’ubi anyị. ‘M̀ ga-abọchakwa ihe a abọcha?’ ka m na-eche. Ọsụsọ na-esu m, aṅụ na-agbakwa m. Mgbe ụfọdụ, ana m emetere onwe m ebere n’ihi na ndị na-eto eto ndị ọzọ adịghị arụsi ọrụ ike otú anyị si arụ. Otú ọ dị, mgbe m leghachiri anya azụ n’oge m bụ nwata, ana m enwe ekele n’ezie na a kụziiri anyị ịrụ ọrụ.Anyị nile nwere ihe anyị na-arụ. Ardis maara ka e si apịpụta mmiri ara ehi karịa m, n’ihi ya, ọrụ m bụ ịzachasị ụlọ ịnyịnya, na-eji shọvel ekpopụ nri ala. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị na-ekpori ndụ ma na-egwuri egwu. Mụ na Ardis na-egwu egwuregwu a na-eji bọl eme ihe na ya. Mụ na Ardis na-anọ n’akụkụ dịgasị iche.
Ihu igwe gbachapụrụ agbachapụ n’abalị na-ama nnọọ mma n’ala ahụ dị larịị. Ọtụtụ puku kpakpando chetaara m Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke. Ọbụna dị ka nwatakịrị, ana m echeta Abụ Ọma 147:4, bụ́ nke na-agụ, sị: “Ọ [Jehova] na-agụta ọnụ ọgụgụ kpakpando; ha nile ka Ọ na-akpọ aha.” N’ọtụtụ abalị ndị a ihu igwe gbachapụrụ agbachapụ, nkịta anyị bụ́ Judge, na-anọnyere m ma na-edewe isi ya n’apata m. Ana m anọkarị n’ihu ụlọ anyị n’ehihie ma na-eji mmasị ekiri ubi ọka wit na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ ka ifufe na-ebugharị ya, na-eme ka o yie ọlaọcha n’ìhè anyanwụ.
Ezi Ihe Nlereanya Mama M
Mama m bụ nwanyị ji nnọọ ọrụ ya kpọrọ ihe. Papa m bụ mgbe nile onyeisi ezinụlọ, mama m kụzikwaara anyị irubere ya isi. Na 1939, papa m ghọkwara otu n’ime Ndịàmà Jehova. Anyị maara na papa m hụrụ anyị n’anya ọ bụ ezie na ọ na-eme ka anyị na-arụsi ọrụ ike, ọ paghịkwa anyị apa. Mgbe ụfọdụ, n’oge oyi, ọ na-akwadebe ụgbọ ịnyịnya ma mee ka anyị gbagharịa na snow. Lee nnọọ ka mgbukepụ nke snow si masị anyị!
Otú ọ dị, ọ bụ mama m bụ onye zụlitere anyị ịhụ Chineke n’anya na irubere Bible isi. Anyị mụtara na aha Chineke bụ Jehova, nakwa na ọ bụ ya bụ Isi Iyi nke ndụ. (Abụ Ọma 36:9; 83:18) Anyị mụtakwara na o nyewo anyị ụkpụrụ nduzi, ọ bụghị iji napụ anyị ihe ụtọ, kama maka abamuru anyị. (Aịsaịa 48:17) Mama m mere ka anyị mara na anyị nwere ọrụ pụrụ iche anyị ga-arụ. Anyị mụtara na Jizọs gwara ụmụazụ ya, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”—Matiu 24:14.
N’oge ahụ m ka bụ nwata, mgbe ọ bụla m si ụlọ akwụkwọ lọta ya abụrụ na mama m anọghị n’ụlọ, ana m aga chọọ ya. N’otu oge, mgbe m dị ihe dị ka afọ isii ma ọ bụ asaa, achọtara m ya n’ọba. Mgbe ahụ mmiri malitere izosi ike. Anyị nọ n’elu ebe a na-akwakọba nri anụ, ajụkwara m ya ma Chineke ọ̀ na-eweta Iju Mmiri ọzọ. O mesiri m obi ike na Chineke kwere nkwa na ya agaghị eji iju mmiri ebibi ụwa ọzọ. Ana m echetakwa ọtụtụ ugboro m na-agbara ọsọ gbaba n’ụlọ dị n’okpuru ala, ebe ọ bụ na a na-enwekarị oké ifufe.
Mama m anọwo na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa ọbụna tupu a mụọ m. Otu ìgwè na-ezukọ n’ụlọ anyị, ha nile nwere olileanya iso Kraịst biri n’eluigwe. Ọ bụ ezie na ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ bụụrụ mama m ihe ịma aka, o kwere ka ịhụnanya o nwere n’ebe Chineke nọ merie ụjọ ya. Ọ nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi ruo ụbọchị ọ nwụrụ, November 24, 1969, mgbe ọ gbara afọ 84. “Mama, ị na-aga eluigwe, gị na ndị gị na ha maara ga-anọkwa,” ka m gbanyeere ya n’izu. Lee ka m si nwee obi ụtọ na m pụrụ ịnọnyere mama m n’ụbọchị ahụ ma soro ya kerita obi ike m! O kwuru n’ụzọ dị nwayọọ, sị, “I mesowo m nnọọ mmeso ọma.”
Anyị Amalite Ime Nkwusa
Na 1939, Russell ghọrọ ọsụ ụzọ, dị ka a na-akpọ ndị na-ezisa ozi ọma oge nile n’etiti Ndịàmà Jehova. Ọ sụrụ ụzọ n’Oklahoma na Nebraska ruo 1944 bụ́ mgbe a kpọrọ ya ije ozi n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova (a na-akpọ Betel), na Brooklyn, New York. Amalitere m ịsụ ụzọ na September 20, 1941, ejekwara m ozi n’akụkụ dịgasị iche iche na Colorado, Kansas, na Nebraska. Afọ ndị ahụ m jiri sụọ ụzọ bụ afọ ndị na-enye obi ụtọ ọ bụghị nanị n’ihi na m pụrụ inyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere Jehova kamakwa n’ihi na amụtara m ịdabere n’ebe ọ nọ.
N’ihe dị ka mgbe Russel malitere ịsụ ụzọ, Wayne nọ na kọleji n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ ụsọ oké osimiri mgbe ọ rụsịrị ọrụ ego ruo oge ụfọdụ. Ka e mesịrị, a kpọrọ ya na Betel. O jere ozi nwa oge n’Ugbo Alaeze, nke dịdewere Ithaca, New York. A na-akọpụta nri n’ebe ahụ maka obere ezinụlọ na-arụ ọrụ n’ugbo ahụ, nakwa maka ndị ọrụ Betel Brooklyn ruru ihe dị ka mmadụ 200. Wayne jiri nkà na ahụmahụ ya mee ihe n’ozi Jehova ruo mgbe ọ nwụrụ na 1988.
Nwanne m nwanyị bụ́ Ardis lụrụ James Kern, ha mụkwara ụmụ ise. Ọ nwụrụ na 1997. Nwanne m nwanyị nke ọzọ, bụ́ Clara, nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova ruo taa, m ka na-agakwa eleta ya n’ụlọ ya dị na Colorado n’oge ezumike m. Nwanne anyị nwoke nke kasị nta, bụ́ Curtis, bịara na Betel Brooklyn n’etiti afọ ndị 1940. Ọ na-eji nnukwu ụgbọala ebuga ma na-ebupụ ihe dị iche iche n’Ugbo Alaeze. Ọ lụghị nwanyị, ọ nwụkwara na 1971.
Ọchịchọ M—Ozi Betel
Ụmụnne m ndị nwoke tọrọ m gara Betel n’oge, ọ bụkwa ọchịchọ m ijekwa ozi
n’ebe ahụ. Eji m n’aka na ọ bụ ezi ihe nlereanya ha mere e ji kpọọ m. Ige mama m ntị ka ọ na-akọ akụkọ ihe mere eme nke nzukọ Chineke na ịhụ n’onwe m ka amụma Bible ndị metụtara ụbọchị ikpeazụ na-emezu mere ka m nwee ọchịchọ ije ozi na Betel. Ekwere m Jehova nkwa n’ekpere na ọ bụrụ na o kwe ka m jee ozi na Betel, m gaghị apụ ọ gwụla ma m nwere ibu ọrụ Ndị Kraịst m ga-elekọta.Abịara m Betel na June 20, 1945, e kenyekwara m ịrụ ọrụ dị ka onye na-elekọta ụlọ. Ana m edebe ọnụ ụlọ 13 ọcha ma na-edozi àkwà 26 kwa ụbọchị, tinyere ịzacha paseeji, steepụ, na ihicha windo. Ọrụ ahụ siri ike. Kwa ụbọchị ka m na-arụ ọrụ, m na-agwa onwe m, sị, ‘Ọ bụ ezie na ike gwụrụ gị, ma ị nọ na Betel, ụlọ Chineke!’
Ịlụ Nathan Knorr
Kemgbe afọ ndị 1920, a na-achọ ka ndị ezinụlọ Betel chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye hapụ Betel ma jee ozi ndị metụtara Alaeze n’ebe ọzọ. Ma ná mmalite afọ ndị 1950, e nyere mmadụ ole na ole jeworo ozi na Betel ruo oge ụfọdụ ohere ịlụ di na nwunye ma nọgide na-eje ozi. Ya mere, mgbe Nathan H. Knorr, bụ́ onye nọ na-eduzi ọrụ Alaeze n’ụwa nile gosiri mmasị n’ebe m nọ, echere m, sị, ‘Ehee, onye nke a ga-anọ!’
Nathan nwere ọtụtụ ibu ọrụ n’ilekọta ọrụ zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova. Ya mere, o zoghịrị m ihe ọ bụla, na-agwa m ọtụtụ ihe mere m kwesịrị iji chee echiche nke ọma tupu mụ ekweta ịlụ ya. N’oge ndị ahụ, ọ na-eme ọtụtụ njem ịga leta alaka Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa, ọ na-anọkwa ọtụtụ izu n’otu oge. N’ihi ya, ọ kọwara na anyị ga-anọ iche iche ruo ogologo oge mgbe ụfọdụ.
Dị ka nwata nwanyị na-eto eto, ana m arọ nrọ ịlụ di n’oge opupu ihe ubi ma gaa ezumike nke ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ n’agwaetiti Pacific bụ́ Hawaii. Anyị lụrụ n’oge oyi, na January 31, 1953, anyị nwekwara ezumike nke di na nwunye ọhụrụ n’ehihie Saturday ahụ na Sunday na New Jersey. Anyị malitere ọrụ na Monday. Otú ọ dị, mgbe otu izu gasịrị, anyị jiri otu izu gaa ezumike nke di na nwunye ọhụrụ.
Onye Ibe Na-arụsi Ọrụ Ike
Nathan dị afọ 18 mgbe ọ bịara Betel na 1923. Ọ natara ọzụzụ bara uru site n’aka ndị jeworo ozi ruo ogologo oge dị ka Joseph F. Rutherford, bụ́ onye na-eduzi ọrụ Ndịàmà, na onye na-elekọta ebe obibi akwụkwọ bụ́ Robert J. Martin. Mgbe Nwanna Martin nwụrụ na September 1932, Nathan ghọrọ onye na-elekọta ebe obibi akwụkwọ. N’afọ na-eso ya, Nwanna Rutherford kpọọrọ Nathan mgbe o letara alaka dị iche iche nke Ndịàmà Jehova na Europe. Na January 1942 mgbe Nwanna Rutherford nwụsịrị, e nyere
Nathan ibu ọrụ nke ilekọta ọrụ zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova.Nathan na-elepụ anya n’ihu, na-eme atụmatụ mgbe nile maka uto n’ọdịnihu. Ụfọdụ lere nke a anya dị ka ihe na-ekwesịghị ekwesị, ebe ọ bụ na e lere anya na ọgwụgwụ nke usoro ihe a na-eru nnọọ nso. N’ezie, otu onye hụrụ atụmatụ Nathan jụrụ ya, sị: “À ga-akpọkwanụ nke a gịnị, Nwanna Knorr? Í nwetụghị nnọọ okwukwe?” Ọ zaghachiri, sị: “Ee, enwere m, ma ọ bụrụ na ọgwụgwụ abịaghị nnọọ ngwa ngwa dị ka anyị tụrụ anya ya, anyị ga-adị njikere.”
Otu echiche Nathan nwere nnọọ bụ iguzobe ụlọ akwụkwọ maka ndị ozi ala ọzọ. Ya mere, na February 1, 1943, ụlọ akwụkwọ ndị ozi ala ọzọ malitere n’Ugbo Alaeze bụ́ ebe nwanne m nwoke bụ́ Wayne na-eje ozi mgbe ahụ. Ọ bụ ezie na ụlọ akwụkwọ ahụ bụ ọmụmụ Bible siri ike nke ga-ewe ihe dị ka ọnwa ise, Nathan hụrụ na ụmụ akwụkwọ ahụ na-enwetụ ntụrụndụ. Ná malite nke ihe ọmụmụ ha, o sonyeere ha n’egwuregwu ndị e ji bọl eme ihe na ha, ka e mesịrị ọ kwụsịrị iso ha n’ihi ụjọ nke imeru ahụ́ bụ́ nke pụrụ ime ka ọ ghara ịga mgbakọ distrikti ndị a ga-enwe n’oge okpomọkụ. Ọ họrọziiri ịbụ ogbu pịọm. Ụmụ akwụkwọ ahụ nwere obi ụtọ mgbe ọ gbanwere ụkpụrụ na-achịkwa egwuregwu ahụ kpam kpam iji menyere ụmụ akwụkwọ si mba ọzọ.
Njem Ndị Mụ na Nathan Mere
Ka e mesịrị, amalitere m iso Nathan eme njem gaa mba ndị ọzọ. Ọ na-amasị m iso ndị ọrụ afọ ofufo na ndị ozi ala ọzọ nọ n’alaka ndị ahụ akọrịta ahụmahụ. Apụrụ m ịhụ n’onwe m ịhụnanya na nrụsi ọrụ ike ha, amatakwara m otú ha si arụ ọrụ ha na ọnọdụ obibi ndụ e nwere ná mba ndị e kenyere ha ọrụ. N’ọtụtụ afọ ndị a, anọgidewo m na-anata akwụkwọ ozi ekele maka nleta ndị dị otú ahụ.
Ileghachi anya azụ na njem ndị anyị mere, ana m echeta ọtụtụ ahụmahụ. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị letara Poland, ụmụnna nwanyị abụọ nọ na-agbanyere ibe ha izu n’ihu m. Ajụrụ m ha, sị, “Gịnị mere unu ji agba izu?” Ha rịọrọ mgbaghara, na-akọwa na ha na-adị na-agba izu mgbe a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu na Poland, e zookwa teepu n’ụlọ ha.
Nwanna Nwanyị Adach bụ otu n’ime ọtụtụ ndị jere ozi na Poland n’oge mmachibido iwu ahụ. O nwere ntutu isi gbakụrụ agbakụ nke ụfọdụ ya pụtara ya n’ihu. N’otu oge, ọ chịlitere ntutu isi ya ma gosi m àpà miri emi nke o nwetara n’ihi ihe otu onye mmegide kụrụ ya. Akpata oyi wụrụ m iji anya m hụ ihe si ná mmeso obi ọjọọ nke ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị tachiri obi na ya pụta.
E wezụga Betel, Hawaii bụ ebe kasị masị m. Echetara m mgbakọ e nwere n’ebe ahụ n’obodo Hilo na 1957. Ọ bụ ihe omume kwesịrị ncheta, ọnụ ọgụgụ nke ndị bịara ya karịrị ọnụ ọgụgụ Ndịàmà bi ebe ahụ. Ọbụna onyeisi obodo ahụ nyere Nathan mkpịsị ugodi nke obodo ahụ. Ọtụtụ ndị bịara ikele anyị, jiri ihe olu e ji okooko osisi mee chọọ anyị mma.
E nwere mgbakọ ọzọ na-akpali akpali na Nuremberg, Germany, na 1955, bụ́ nke e mere n’ebe Hitler jibu azụ ndị agha ya. A maara ebe nile na Hitler ṅụrụ iyi ikpochapụ ndị Jehova na Germany, ma ámá egwuregwu a jupụtaziri ná Ndịàmà Jehova! Ejichilighị m anya mmiri m. Ikpo okwu ya buru nnọọ ibu ma nwee nnukwu ákwà e sere ogidi 144 buru ibu. Agbagoro m n’elu ikpo okwu ahụ ma nwee ike ilepụ anya hụ ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị bịaranụ bụ́ ndị karịrị 107,000. Ha buru
nnọọ ibu nke na o siiri m ike ịhụ ndị nọ n’oche azụ.Anyị pụrụ ịhụ iguzosi ike n’ezi ihe nke ụmụnna anyị ndị Germany na ike ha nwetaworo site n’aka Jehova n’oge mkpagbu ha n’okpuru ọchịchị Nazi. O wusiri mkpebi anyị mere ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Jehova ike. Nathan kwuru okwu mmechi, mgbe o kwuchara, o feere ndị ahụ bịaranụ aka ka ha nọọ nke ọma. Ha zaghachiri ozugbo site n’ifegharị hankachif ha iji sị anyị gaa nke ọma. O yiri ubi okooko osisi mara mma.
Ihe ọzọ m na-agaghị echefu echefu bụ nleta anyị letara Portugal na December 1974. Anyị gara nzukọ mbụ nke Ndịàmà e nwere na Lisbon mgbe ọrụ ịgba àmà anyị nwetasịrị nkwado iwu. A machibidowo ya iwu ruo afọ 50! Ọ bụ ezie na ọ bụ nanị ndị nkwusa Alaeze 14,000 nọ ná mba ahụ n’oge ahụ, ihe karịrị mmadụ 46,000 bịara nzukọ abụọ ahụ e nwere. Anya mmiri pụrụ m n’anya mgbe ụmụnna ahụ kwuru, sị: “Ọ dịghịzi anyị mkpa izo ezo. Anyị enwerela onwe anyị.”
Site na mgbe m na-eso Nathan eme njem ruo taa, ana m enwe mmasị n’ịgba àmà n’oge a na-anọghị n’ozi—n’ụgbọelu, n’ụlọ nri—na ịgba àmà okporo ámá. Ana m eji akwụkwọ mgbe nile ka m wee nwee ike ịgba àmà. N’otu oge anyị na-eche ụgbọelu nke na-abịaghị n’oge, otu nwanyị jụrụ m ebe m na-arụ ọrụ. Nke ahụ dubara mụ na ya na ndị ọzọ nọ anyị gburugburu ná nkwurita okwu. Ozi Betel na ọrụ nkwusa emewo ka m jiri ọrụ n’aka ma nwee obi ụtọ.
Ọrịa na Agbamume Ikpeazụ
Na 1976, Nathan malitere ịrịa ọrịa cancer, mụ na ndị ezinụlọ Betel nyekwaara ya aka ịnagide ya. N’agbanyeghị na ahụ́ ike ya na-akawanye njọ, anyị na-akpọ ndị òtù alaka ụlọ ọrụ si gburugburu ụwa bụ́ ndị nọ na Brooklyn n’oge ahụ maka ọzụzụ òkù ịbịa n’ụlọ anyị. Ana m echeta nleta nke Don na Earlene Steele, Lloyd na Melba Barry, Douglas na Mary Guest, Martin na Gertrud Poetzinger, Pryce Hughes na ọtụtụ ndị ọzọ. Mgbe mgbe, ha na-akọrọ anyị ụfọdụ ahụmahụ sitere ná mba ha. Ahụmahụ ndị metụtara iguzosi ike n’ihe nke ụmụnna anyị n’okpuru mmachibido iwu na-akasị amasị m.
Mgbe Nathan ghọtara na ọnwụ ya na-eru nso, o nyere m ezi ndụmọdụ ga-enyere m aka ịnagide ọnọdụ nke ịbụ onye di ya nwụrụ. O kwuru, sị: “Anyị enwewo alụmdi na nwunye obi ụtọ. Ọtụtụ ndị enwetụbeghị nke ahụ.” Otu ihe mere alụmdi na nwunye anyị ji bụrụ nke obi ụtọ bụ na Nathan nwere ezi uche. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị zutere ndị dịgasị iche iche na njem anyị, ọ na-asị m: “Audrey, ọ bụrụ na akọwaghịrị m gị ndị ha bụ, ọ bụ n’ihi na echefuwo m aha ha.” Obi dị m ụtọ na o bu ụzọ gwa m nke ahụ.
Nathan chetaara m, sị: “Mgbe anyị nwụsịrị, olileanya anyị na-abụ nke e ji n’aka, anyị agaghịkwa enwe ihe mgbu ọzọ.” Mgbe ahụ, ọ gbara m ume, sị: “Na-elepụ anya n’ihu, n’ihi ọ bụ ebe ahụ ka ụgwọ ọrụ gị dị. Anọgidela na-eche banyere ihe ndị gara aga—ọ bụ ezie na ị ga na-echeta ha. Ị ga-echefu ha ka oge na-aga. Ewesola onwe gị iwe ma ọ bụ mewere onwe gị ebere. Nwee obi ụtọ na i nwere ọṅụ na ngọzi ndị a. Ka oge na-aga, ị ga-achọpụta na ihe ndị gara aga ị na-echeta ga na-ewetara gị ọṅụ. Ikike icheta ihe bụ onyinye sitere n’aka Chineke.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Nọgide na-eji ọrụ n’aka—gbalịa ịdị na-eji ndụ gị emere ndị ọzọ ihe. Nke a ga-enyere gị aka ịchọta ọṅụ ná ndụ.” N’ikpeazụ, na June 8, 1977, Nathan nwụrụ ma pụọ n’ụwa.
Ịlụ Glenn Hyde
Nathan gwara m na m pụrụ ịnọrọ na-eche ihe ndị gara aga ma ọ bụ bie ndụ ọhụrụ. Ya mere, na 1978, mgbe m kwafesịrị n’Ugbo Watchtower na Wallkill, New York, alụrụ m
Glenn Hyde, nwa amadị mara mma ma dị nwayọọ. Tupu ya aghọọ Onyeàmà, o jere ozi n’Òtù Ndị Agha Mmiri mgbe ndị United States na ndị Japan na-alụ agha.Glenn rụrụ ọrụ n’ụgbọ mmiri ndị nche, e kenyekwara ya ịrụ n’ụlọ injin ụgbọ ahụ. N’ihi mkpọtụ nke injin ahụ, ọ naghịzi anụcha ihe. Mgbe agha ahụ biri, ọ ghọrọ onye na-agbanyụ ọkụ. Ruo ọtụtụ afọ, ọ rọrọ nrọ ọjọọ n’ihi ihe ndị ọ hụrụ n’agha. Ọ mụtara eziokwu Bible site n’aka odeakwụkwọ ya, bụ́ onye gbaara ya àmà n’oge ọ na-anọghị n’ozi.
Ka e mesịrị, na 1968, a kpọrọ Glenn ije ozi na Betel dị ka onye na-agbanyụ ọkụ na Brooklyn. Ya mere, mgbe Ugbo Watchtower nwetara injin mgbanyụ ọkụ nke ya, a kpọfere ya ebe ahụ na 1975. Ka oge na-aga, ọ malitere ịrịa ọrịa Alzheimer. Mgbe anyị lụsịrị di na nwunye ruo afọ iri, Glenn nwụrụ.
Olee otú m ga-esi nagide ya? Okwu amamihe ndị Nathan gwara m mgbe ọ maara na ọ na-aga ịnwụ bụụrụ m ihe nkasi obi ọzọ. Anọgidere m na-agụ ihe o deere m banyere ịnagide ịbụ onye di ya nwụrụ. M ka na-eso ndị di ma ọ bụ nwunye ha nwụnahụrụ ekerịta ihe ndị ahụ, ndụmọdụ Nathan akasiwokwa ha onwe ha obi. Ee, ọ dị mma ịdị na-elepụ anya n’ihu dị ka ọ gbara m ume ime.
Òtù Ụmụnna Dị Oké Ọnụ Ahịa
Ihe kasị mee ka ndụ m bụrụ nke obi ụtọ na nke na-eju afọ bụ ezigbo ndị enyi m nwere n’ezinụlọ Betel. Otu onye n’ime ha bụ Esther Lopez, bụ́ onye gụsịrị akwụkwọ na klas nke atọ nke Watchtower Bible School of Gilead na 1944. Ọ lọghachiri Brooklyn na February 1950 iji jee ozi dị ka onye nsụgharị nke akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Bible gaa n’asụsụ Spanish. Ọtụtụ mgbe, mgbe Nathan na-anọghị ya, Esther na-abụrụ m onye ibe. Ya onwe ya kwa nọ n’Ugbo Watchtower. Ugbu a ọ nọ n’afọ ndị 90 ya, ahụ́ ike ya na-akawanye njọ, a na-elekọtakwa ya n’ebe a na-elekọta ndị ahụ́ na-adịghị ike.
N’ezinụlọ a mụrụ m, ọ bụ nanị Russell na Clara ka dị ndụ. Russell akarịala afọ 90, o jikwa ikwesị ntụkwasị obi na-eje ozi na Betel Brooklyn. O so ná ndị mbụ e kwere ka ha nọgide na Betel mgbe ha lụsịrị di na nwunye. Na 1952, ya na onye òtù ezinụlọ Betel ibe ya bụ́ Jean Larson gbara akwụkwọ. Nwanne nwoke Jean bụ́ Max bịara Betel na 1939, ọ nọchikwara Nathan dị ka onye na-elekọta ebe obibi akwụkwọ na 1942. Max nọgidere na-ebu ibu ọrụ na Betel, gụnyere ilekọta nwunye ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ Helen, onye na-arịa ọrịa na-ebibi akwara bụ́ multiple sclerosis.
N’ileghachi anya azụ n’ihe karịrị afọ 63 m jiworo jeere Jehova ozi oge nile, apụrụ m ikwu na ndụ m abụwo nke na-eju afọ n’ezie. Betel ghọrọ ebe obibi m, anọgidewo m na-eji ọṅụ nke obi eje ozi. Ekele dịrị ndị mụrụ m maka ịkụnye n’ime anyị ịdị mkpa nke ịrụ ọrụ na ọchịchọ nke ijere Jehova ozi. Ma ihe kasị eme ka ndụ na-eju afọ bụ òtù ụmụnna anyị magburu onwe ya na olileanya nke iso ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị biri na paradaịs elu ala, na-ejere Onye Okike anyị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, ozi ruo mgbe nile ebighị ebi.
[Foto dị na peeji nke 24]
Ndị mụrụ m n’ụbọchị agbamakwụkwọ ha na June 1912
[Foto dị na peeji nke 24]
Site n’aka ekpe gaa n’aka nri: Russell, Wayne, Clara, Ardis, mụ, na Curtis na 1927
[Foto dị na peeji nke 25]
Eguzo m n’etiti Frances na Barbara McNaught, mgbe m na-asụ ụzọ na 1944
[Foto dị na peeji nke 25]
Na Betel na 1951. Site n’aka ekpe gaa n’aka nri: Mụ, Esther Lopez, na nwunye nwanne m, bụ́ Jean
[Foto dị na peeji nke 26]
Mụ na Nathan na ndị mụrụ ya
[Foto dị na peeji nke 26]
Mụ na Nathan na 1955
[Foto dị na peeji nke 27]
Mụ na Nathan na Hawaii
[Foto dị na peeji nke 29]
Mụ na di m nke abụọ, bụ́ Glenn