Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị ka ndokwa nke afọ Jubile e kwuru okwu ya n’isi nke 25 nke Levitikọs sere onyinyo ya?

Iwu Mozis kwuru na “n’afọ nke asaa ụbọchị izu ike nke idebe ụbọchị izu ike ga-adịrị ala ahụ.” Banyere afọ ahụ, e nyere ndị Izrel iwu, sị: “Aghala mkpụrụ n’ubi gị, akwachakwala osisi ubi vaịn gị. Ewela ihe ubi gị nke na-epu n’onwe ya, aghọrọkwala mkpụrụ nke osisi vaịn gị nke a na-akwachaghị akwacha: afọ nke idebe ụbọchị izu ike ka ọ ga-abụrụ ala ahụ.” (Levitikọs 25:4, 5) N’ihi ya, afọ asaa ọ bụla ga-abụ afọ Izu Ike maka ala ahụ. Afọ nke 50 ọ bụlakwa, nke na-esote afọ Izu Ike nke asaa, ga-abụ Jubile. Gịnị ga-eme n’afọ ahụ?

Jehova gwara ndị Izrel site n’aka Mozis, sị: “Unu ga-edokwa afọ nke [iri ise] ahụ nsọ, kpọsaakwa n’ala ahụ nile sị na ndị nile bi n’ime ya nweere onwe ha: jubile ka afọ ahụ ga-abụrụ unu; unu ga-alaghachikwa, onye ọ bụla n’ihe onwunwe ya, laghachikwa, onye ọ bụla n’agbụrụ ya. Jubile ka afọ nke [iri ise] ahụ ga-abụrụ unu: unu aghala mkpụrụ, unu ewekwala ihe ubi na-epu n’onwe ya n’ime ya, unu aghọrọkwala mkpụrụ nke osisi vaịn nile a na-akwachaghị akwacha.” (Levitikọs 25:10, 11) Jubile bụ afọ nke abụọ nke Izu Ike na-esochi ibe ya maka ala ahụ. Ma nye ndị bi n’ala ahụ, o wetaara ha nnwere onwe. A ga-atọhapụ ndị Juu ọ bụla e renyere n’ịbụ ohu. A ga-enyeghachi ndị ezinụlọ mmadụ ihe nketa ọ pụrụ ịbụwo na a manyere ya ire. Jubile ahụ ga-abụ afọ mweghachi na ntọhapụ maka Izrel oge ochie. Gịnị ka ọ na-ese onyinyo ya maka Ndị Kraịst?

Nnupụisi nke nwoke mbụ, bụ́ Adam, webatara ihe a kpọrọ mmadụ n’ịbụ ohu nke mmehie. Ndokwa Chineke mere iji gbapụta ihe a kpọrọ mmadụ n’agbụ nke mmehie bụ àjà mgbapụta Jizọs Kraịst. * (Matiu 20:28; Jọn 3:16; 1 Jọn 2:1, 2) Olee mgbe a na-atọhapụ Ndị Kraịst n’agbụ iwu nke mmehie? Mgbe ọ na-agwa Ndị Kraịst e tere mmanụ okwu, Pọl onyeozi kwuru, sị: “Iwu nke mmụọ nsọ ahụ bụ́ nke na-enye ndụ n’ihe metụtara Kraịst Jizọs emewo ka i nwere onwe gị pụọ n’iwu nke mmehie na nke ọnwụ.” (Ndị Rom 8:2) Ndị nwere olileanya nke ndụ n’eluigwe na-enweta nnwere onwe a mgbe e ji mmụọ nsọ tee ha mmanụ. Ọ bụ ezie na ahụ́ ha bụ anụ ahụ́ nkịtị, nke na-ezughịkwa okè, Chineke na-akpọ ha ndị ezi omume ma na-edo ha dị ka ụmụ ime mmụọ ya. (Ndị Rom 3:24; 8:16, 17) Nye ndị ahụ e tere mmanụ dị ka otu ìgwè, Jubile Ndị Kraịst malitere na Pentikọst 33 O.A.

Gịnị banyere “atụrụ ọzọ” ahụ, bụ́ ndị nwere atụmanya nke ndụ ebighị ebi n’elu ala? (Jọn 10:16) Nye atụrụ ọzọ ahụ, Ọchịchị Puku Afọ Kraịst ga-abụ oge mweghachi na ntọhapụ. N’ime oge Jubile Narị Afọ Iri a, Jizọs ga-eji abamuru ndị sitere n’àjà mgbapụta ya mee ihe maka ihe a kpọrọ mmadụ kwere ekwe ma megharịa ihe nile mmehie mebiri. (Mkpughe 21:3, 4) Ka ọ na-erule ná ngwụsị nke Ọchịchị Narị Afọ Iri Kraịst, ihe a kpọrọ mmadụ ga-abịaru izu okè mmadụ, ha ga-enwerekwa onwe ha kpam kpam pụọ ná mmehie e ketara eketa na ọnwụ. (Ndị Rom 8:21) Mgbe e mezuru nke ahụ, Jubile Ndị Kraịst ga-agwụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 N’ezie, e zipụrụ Jizọs “ịkpọsa ọhịha gwa ndị a dọtara n’agha.” (Aịsaịa 61:1-7; Luk 4:16-21) Ọ kpọsara ntọhapụ ime mmụọ.

[Foto dị na peeji nke 26]

Jubile Narị Afọ Iri ahụ—oge mweghachi na ntọhapụ maka “atụrụ ọzọ” ahụ