Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Iji Kpọsaa Aha Jehova”

“Iji Kpọsaa Aha Jehova”

“Iji Kpọsaa Aha Jehova”

GBURUGBURU ỤWA, e ji Ụlọ Nche na magazin a na-ebipụtakọ ya na ya bụ́ Teta! kpọrọ ihe n’ihi ihe ọmụma ime mmụọ dị n’ime ha na otú ha si akụzi ihe. N’igosi nke a, otu onye na-agụ magazin ndị a na France detara akwụkwọ ozi na-esonụ na nso nso a:

“Abụ m nwa agbọghọ nke si Africa, onye na-agụchaghị akwụkwọ. N’oge na-adịbeghị anya, amalitere m ịgụ magazin unu. N’ịbụ onye isiokwu ndị a na-ebipụta na ya dọtara, ana m achọpụta uru ịgụ ihe bara. N’ihi enyemaka unu, amụtawo m ọtụtụ okwu ndị ọhụrụ, apụkwara m ide akwụkwọ ozi n’edehieghị ọtụtụ ihe.

“Ọ na-atụ m n’anya na unu na-ede ihe nile metụtara ụmụ mmadụ, ụwa, na Onye Okike. Isiokwu ndị a na-adị nnọọ mfe nghọta nke na ha na-eme ka mmadụ chọọ ịghọ onye na-enwe mmasị ịgụ ihe. Ọ dịghị onye ọzọ nwere ike ịkụziri ụdị mmadụ nile ihe n’otu oge.

“Ọ na-atụkwa m n’anya mgbe m na-ahụ na a dịghị eme ihe a nile maka uru ahịa kama nanị iji kpọsaa aha Jehova. Amaara m na unu nwere nkwado ya, ana m ekelekwa unu. Biko nọgidenụ na-enweta ume site n’aka Onye Okike iji na-akụzi ihe.”

Ndịàmà Jehova na-arụ ọrụ nkụzi Bible ha zuru ụwa ọnụ ugbu a n’ala 235. A na-ebipụta Ụlọ Nche n’asụsụ 148, Teta! kwa n’asụsụ 87. A naghị ebipụta akwụkwọ ndị a iji wetara mmadụ ọ bụla otuto. A kwadoro ndụmọdụ ndị dabeere na Bible na ihe ọmụma ndị kasị ọhụrụ a na-ahụ n’ime ha iji wetara Onye Okike otuto, bụ́ onye na-ekwu, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova, . . . Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru.” (Aịsaịa 48:17) Rite uru n’onwe gị site n’iji akwụkwọ ndị a e ji amụ Bible na-agụchi Akwụkwọ Nsọ anya.