Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kapadoshia—Ebe Ndị Mmadụ Biri n’Ebe Obibi Ndị Ifufe na Mmiri Wapụtara

Kapadoshia—Ebe Ndị Mmadụ Biri n’Ebe Obibi Ndị Ifufe na Mmiri Wapụtara

Kapadoshia—Ebe Ndị Mmadụ Biri n’Ebe Obibi Ndị Ifufe na Mmiri Wapụtara

PITA onyeozi kwuru okwu banyere Kapadoshia. “Ndị na-ebi nwa oge a chụsasịrị gaa na . . . Kapadoshia,” so ná ndị o degaara akwụkwọ ozi mbụ ya. (1 Pita 1:1) Ala dị aṅaa ka Kapadoshia bụ? N’ihi gịnị ka ndị biri na ya ji bie n’ebe obibi ndị a wapụtara na nkume? Olee otú Iso Ụzọ Kraịst si rute ebe ahụ?

“Anyị hụrụ onwe anyị na mberede n’etiti ọtụtụ nnukwu nkume ndị yiri okoso na ogidi,” ka onye Britain na-eme njem bụ́ W. F. Ainsworth, bụ́ onye letara Kapadoshia n’afọ ndị 1840 kwuru. Ọdịdị pụrụ iche nke ala a ka na-eju ọtụtụ ndị na-eleta ógbè a dị na Turkey n’oge a anya. Nkume “ndị a tụrụ atụ” pụrụ iche kwụcha dị ka ndị nche na-adịghị ekwu okwu na ndagwurugwu ndị dị na Kapadoshia. Ụfọdụ yiri nnukwu mpio anwụrụ ọkụ ndị dị mita 30 ma ọ bụ karịa n’ogologo. Ndị ọzọ yiri nnukwu okoso ma ọ bụ ero.

Lee nnọọ ka anyanwụ si eme ka ihe ndị a a tụrụ atụ na-enwe àgwà dịgasị iche iche mara mma n’otu ụbọchị! N’isi ụtụtụ, ha na-acha pinki pinki. N’etiti ehihie, ha na-acha ka ọdụ́, mgbe anyanwụ na-adakwa ha na-acha ọlaedo ọlaedo. Gịnị mepụtara ‘ọtụtụ nnukwu nkume ndị a yiri okoso na ogidi’? Gịnịkwa mere ndị biri n’ógbè ahụ ji jiri ime ha mere ebe obibi?

Ndị Ifufe na Mmiri Wapụtara

Kapadoshia nọ n’etiti Ala Dịịrị Banye na Mmiri nke Anatolia, bụ́ nke jikọtara Eshia na Europe. Ógbè a gaara abụ ala dị larịị ma e wezụga ugwu abụọ na-agbọpụ ọkụ dị na ya. Ọtụtụ puku afọ gara aga, nnukwu mgbawa ugwu mere na ha ji ụdị nkume abụọ kpuchie ógbè ahụ—nkume ojii siri ike na nke ọcha na-esighị ike nke ntụ kpụkọrọ akpụkọ si ná mgbawa ugwu mepụtara.

Ka osimiri, mmiri ozuzo, na ifufe malitere iripụsị nkume ọcha ahụ, o mere ka e nwee nnukwu oghere dị iche iche. Ka oge na-aga, ụfọdụ ọnụ ọnụ nkume dị n’agbata oghere ndị a jiri nwayọọ nwayọọ richapụsịa ma yie ọtụtụ ogidi ndị yiri okoso, na-eme ka ala ahụ nwee ihe ndị a tụrụ atụ a na-adịghị ahụ n’ebe ọzọ n’ụwa. Ụfọdụ n’ime okwute ndị a dị ka okoso yiri ụgbụgbọ mmanụ aṅụ. Ndị bi ebe ahụ wapụtagasịrị ọnụ ụlọ na nkume ahụ na-esighị ike ma na-awapụtakwu ọnụ ụlọ ka ezinụlọ ha na-ebuwanye ibu. Ha chọpụtakwara na ebe obibi ndị ahụ na-ajụ oyi n’ọkọchị ma na-ekpo ọkụ n’udu mmiri.

Ibi n’Ebe Ụzọ Ndị E Si Aga Ebe Ndị Mepere Anya Gaferịtara

O yiri ka ndị ahụ bi n’ọgba na Kapadoshia hà gaara anọpụrụ onwe ha ma a sị na ha ebighị n’ebe ụzọ ndị e si aga ebe ndị mepere anya gaferịtara. Ụzọ Silk a ma ama, ụzọ azụmahịa dị kilomita 6,500 nke jikọrọ Alaeze Ukwu Rom na China, si na Kapadoshia gafee. E wezụga ndị ahịa, ndị agha Peasia, Gris, na ndị nke Rom mere njem n’ụzọ a. Ndị njem a webatara echiche okpukpe ọhụrụ dị iche iche.

Ka ọ na-erule narị afọ nke abụọ T.O.A., e nweela ógbè ndị Juu na Kapadoshia. Ndị Juu sikwa n’ógbè a nọ na Jeruselem n’afọ 33 O.A. Ha bịara ebe ahụ iji mee Ememe Pentikọst. N’ihi ya, Pita onyeozi meere ndị Juu si Kapadoshia bịa nkwusa mgbe mwụpụ nke mmụọ nsọ gasịrị. (Ọrụ 2:1-9) Ihe ama na-egosi na ụfọdụ nabatara ozi ya ma were okpukpe ọhụrụ ha laa. Ya mere, Ndị Kraịst bụ́ ndị Kapadoshia so ná ndị Pita degaara akwụkwọ ozi mbụ ya.

Otú ọ dị, ka ọtụtụ afọ gafesịrị, nkà ihe ọmụma ndị ọgọ mmụọ malitere imetụta Ndị Kraịst nọ na Kapadoshia. Ndị ndú chọọchị atọ a ma ama na Kapadoshia na narị afọ nke anọ ọbụna gbachiteere nnọọ nkwenkwe Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị bụ́ Atọ n’Ime Otu. Ha bụ Gregory nke Nazianzus, Basil Onye Ukwu, na nwanne ya nwoke bụ́ Gregory nke Nyssa.

Basil Onye Ukwu gbakwara ume ibi ndụ dị ka ndị mọnk. Obere ebe obibi ndị Kapadoshia ndị a wapụtara na nkume dị nnọọ mma maka ụzọ ndụ ịnapụ onwe onye ihe bụ́ nke ọ tụrụ aro ya. Ka ìgwè ndị mọnk ahụ na-ebukwu ibu, a wapụtara ụlọ chọọchị zuru ezu n’ime ụfọdụ nkume ndị ahụ yiri okoso bụ́ ndị ka buo ibu. Ka ọ na-erule narị afọ nke 13, a wapụtawo ihe dị ka ụlọ chọọchị narị atọ n’ime nkume. E chebewo ọtụtụ n’ime ha ruo taa.

Ọ bụ ezie na a dịghịzi eji chọọchị na ebe obibi ndị mọnk ndị ahụ eme ihe ugbu a, ụzọ ndụ ndị bi ebe ahụ agbanwechabeghị kemgbe ọtụtụ narị afọ ndị a. A ka na-eji ọtụtụ ọgba ndị a eme ihe dị ka ebe obibi. Ọ na-eju ọtụtụ ndị na-eleta Kapadoshia anya otú ndị bi ebe ahụ bụ́ ndị ji ọgụgụ isi eme ihe si jiri ihe ndị sitere n’okike mepụta ụlọ obibi.

[Map dị na peeji 24, 25]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

KAPADOSHIA

CHINA (Cathay)