Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Onye Ọ Bụla nke Nwere Ezi Uche Ji Ihe Ọmụma Arụ Ọrụ”

“Onye Ọ Bụla nke Nwere Ezi Uche Ji Ihe Ọmụma Arụ Ọrụ”

“Onye Ọ Bụla nke Nwere Ezi Uche Ji Ihe Ọmụma Arụ Ọrụ”

NDUZI sitere n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, ‘bụ ihe a na-achọsi ike karịa ọlaedo—karịa ọtụtụ ọlaedo a nụchara anụcha.’ (Abụ Ọma 19:7-10) N’ihi gịnị? N’ihi na “iwu onye maara ihe [Jehova] bụ isi iyi nke ndụ, isi n’ọnyà nile nke ọnwụ wezụga onwe gị.” (Ilu 13:14) Mgbe e tinyere ya n’ọrụ, ndụmọdụ sitere n’Akwụkwọ Nsọ abụghị nanị na ọ na-eme ka ndụ anyị ka mma kamakwa ọ na-enyere anyị aka izere ọnyà ndị na-etinye ya n’ihe ize ndụ. Lee otú o si dị mkpa na anyị ga-achọ ihe ọmụma nke Akwụkwọ Nsọ ma mee omume kwekọrọ n’ihe anyị na-amụta!

Dị ka e dekọrọ n’Ilu 13:15-25, Eze Solomọn nke Izrel oge ochie nyere ndụmọdụ na-enyere anyị aka iji ihe ọmụma rụọ ọrụ ka anyị wee nwee ike ibi ndụ ka mma ma dịkwuo ogologo. * N’iji ilu ndị a kapịrị ọnụ mee ihe, o gosiri otú Okwu Chineke pụrụ isi nyere anyị aka inweta ihu ọma ndị ọzọ, ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi n’ozi anyị, inwe àgwà ziri ezi n’ebe ịdọ aka ná ntị dị, na iji amamihe họrọ ndị anyị na ha na-akpakọ. Ọ tụlekwara amamihe nke ịhapụrụ ụmụ anyị ihe nketa tinyere iji ịhụnanya nye ha ịdọ aka ná ntị.

Ezi Uche Na-eweta Amara

“Ezi uche na-enye amara,” ka Solomọn na-ekwu, “ma ụzọ ndị nghọgbu bụ nanị nkume.” (Ilu 13:15) Okwu mbụ e ji mee ihe maka “ezi uche,” ma ọ bụ ezi nghọta, “na-akọwa inwe ike iji ezi uche eme ihe, ime ezi mkpebi, na ịtụ aro ndị amamihe dị na ha,” ka otu akwụkwọ ntụaka na-ekwu. Ọ naghị esiri onye nwere àgwà ndị dị otú ahụ ike inweta ihu ọma nke ndị ọzọ.

Tụlee ụzọ ezi uche dị na ya Pọl onyeozi si mesoo Onye Kraịst ibe ya bụ́ Faịlimọn ihe mgbe ọ na-ezighachiri ya Onesịmọs bụ́ ohu Faịlimọn gbara ọsọ, bụ́ onye ghọworo Onye Kraịst. Pọl gbara Faịlimọn ume iji obiọma nabata Onesịmọs, ọbụna dị ka ọ pụrụ isi nabata onyeozi ahụ n’onwe ya. N’ezie, Pọl kwere nkwa ịkwụ Faịlimọn ụgwọ ma ọ bụrụ na Onesịmọs ji ya ụgwọ ọ bụla. Ee, Pọl pụrụ ijiworị ikike ya nye Faịlimọn iwu ime ihe ziri ezi. Ma onyeozi ahụ họọrọ iji akọ na ịhụnanya soo okwu ahụ. N’ime otú ahụ, Pọl nwere obi ike na Faịlimọn ga-ekwe, na-akpali ya ọbụna ime karịa ihe ọ rịọrọ ya ka o mee. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịdị na-emesokwa ndị kwere ekwe ibe anyị ihe n’otu ụzọ a?—Faịlimọn 8-21.

N’aka nke ọzọ, ụzọ ndị nghọgbu, bụ nanị nkume ma ọ bụ “ihe siri ike.” (New International Version) N’echiche dị aṅaa? Dị ka otu ọkà mmụta si kwuo, okwu e ji mee ihe ebe a pụtara “ihe siri ike ma ọ bụ ihe na-adịghị nro, na-ezo aka n’omume obi ịkpọ nkụ nke ndị na-emebi iwu. . . . Mmadụ nke kpebisiri ike ịnọgide n’ụzọ ọjọọ ya, kpọọ obi nkụ ma bụrụ onye na-adịghị achọ ịnara ntụziaka amamihe dị na ha sitere n’aka ndị ọzọ, nọ n’ụzọ na-eduga ná mbibi.”

Solomọn gara n’ihu na-ekwu, sị: “Onye ọ bụla nke nwere ezi uche ji ihe ọmụma arụ ọrụ: ma onye nzuzu na-agbasa uche gbagọrọ agbagọ.” (Ilu 13:16) Ezi uche e ji mee ihe ebe a na ihe ọmụma nwere njikọ, a na-ejikọtakwa ya na onye dị akọ, bụ́ onye na-eche echiche nke ọma tupu ya emee ihe. Mgbe a katọrọ ya n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị ma ọ bụ ọbụna kparịa ya, onye nwere ezi uche na-eche egbugbere ọnụ ya nche. Ọ na-eji ekpere agbalị igosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ iji ghara iwebiga iwe ókè. (Ndị Galeshia 5:22, 23) Onye dị akọ adịghị ekwe ka onye nke ọzọ ma ọ bụ ọnọdụ dị mgbe ahụ chịkwaa ya. Kama nke ahụ, ọ na-anọgide na-ejide onwe ya ma na-ezere ọgụ na-adapụtakarịrị onye na-ewe iwe ọsọ ọsọ mgbe a kpasuru ya iwe.

Onye nwere ezi uche na-ejikwa ihe ọmụma eme ihe mgbe ọ na-eme mkpebi. Ọ maara na omume amamihe dị na ya adịghị esite n’ịkọ nkọ, ime ihe ná mkpali, ma ọ bụ na nanị ịgbaso ìgwè mmadụ. N’ihi ya, ọ na-ewepụta oge inyocha ọnọdụ ọ bụla ọ nọ na ya. Ọ na-atụle ihe nile metụtara ọnọdụ ahụ ma mara ihe ndị ọ pụrụ ime. Mgbe ahụ ọ na-enyocha Akwụkwọ Nsọ ma kpebie iwu Bible ma ọ bụ ụkpụrụ ndị metụtara ọnọdụ ahụ. Okporo ụzọ onye dị otú ahụ ga-anọgide na-ezi ezi.—Ilu 3:5, 6.

“Ụkọ nke Kwesịrị Ntụkwasị Obi Bụ Ihe Na-agwọ Mmadụ”

Dị ka Ndịàmà Jehova, e nyere anyị ọrụ nke ịkpọsa ozi sitere n’aka Chineke. Ilu na-esonụ na-enyere anyị aka ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi n’ịrụzu ọrụ anyị. Ọ na-ekwu, sị: “Onye ozi nke na-emebi iwu na-adaba n’ihe ọjọọ: ma ụkọ nke kwesịrị ntụkwasị obi bụ ihe na-agwọ mmadụ.”Ilu 13:17.

Ihe e mesiri ike n’ebe a bụ àgwà onye ozi ahụ. Gịnị ma ọ bụrụ na onye na-eweta ozi ahụ ejiri obi ọjọọ gwagbuo ma ọ bụ gbanwee ozi ahụ? Ọ̀ bụ na ọ gaghị anata ikpe ọmụma? Cheedị banyere Gihezi bụ́ onye na-ejere Ịlaịsha onye amụma ozi, onye ji anyaukwu zie Neeman onyeisi usuu ndị agha Siria ozi ụgha. Ekpenta a gwọrọ Neeman gafeere Gihezi. (2 Ndị Eze 5:20-27) Gịnị ma ọ bụrụ na ụkọ ahụ aghọọ onye na-ekwesịghị ntụkwasị obi ma kwụsị ikwusa ozi ahụ kpam kpam? “[Ọ bụrụ na] i kwughịkwa okwu ịdọ onye na-emebi iwu aka ná ntị ka o si n’ụzọ ya pụta,” ka Bible na-ekwu, “onye ahụ nke na-emebi iwu ga-anwụ n’ajọ omume ya; ma n’aka gị ka M [Jehova] ga-ajụta ọbara ya.”—Ezikiel 33:8.

N’aka nke ọzọ, ụkọ na-ekwesị ntụkwasị obi bụ ihe na-agwọ ma onwe ya ma ndị na-ege ya ntị. Pọl gbara Timoti ume, sị: “Na-elezi onwe gị nakwa ozizi gị anya mgbe nile. Nọgide n’ihe ndị a, n’ihi na site n’ime nke a, ị ga-azọpụta ma onwe gị ma ndị na-ege gị ntị.” (1 Timoti 4:16) Cheedi banyere ọgwụgwọ iji ikwesị ntụkwasị obi ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ na-arụpụta. Ọ na-akpali ndị mmadụ nwere ezi obi ma na-eduga ha n’eziokwu ahụ nke na-eme ka ha nwere onwe ha. (Jọn 8:32) Ọbụna ma ọ bụrụ na ndị mmadụ ajụ ige ozi ahụ, onye ozi na-eguzosi ike n’ihe ‘ga-anapụtawo mkpụrụ obi ya.’ (Ezikiel 33:9) Ka anyị ghara ileghara ịrụzu ọrụ nkwusa anyị anya mgbe ọ bụla. (1 Ndị Kọrint 9:16) Ka anyị leziekwa anya mgbe nile ‘ikwusa okwu ahụ,’ ghara ibelata ịdị ike ya ma ọ bụ tinye ya nnu ka o wee masị ndị mmadụ.—2 Timoti 4:2.

“Onye Na-arịba Ịba Mba Ama Ka A Ga-asọpụrụ”

Ò kwesịrị ka onye dị akọ wee iwe maka ndụmọdụ ọ bụla bara uru e nyere ya? Ilu 13:18 na-ekwu, sị: “Ịnọ n’ogbenye na nlelị ga-adịrị onye na-ezere ịdọ aka ná ntị: ma onye na-arịba ịba mba ama ka a ga-asọpụrụ.” Anyị ga-abụ ndị maara ihe ịnara ọbụna ịdọ aka ná ntị anyị na-arịọghị ka e nye anyị. Ezi ndụmọdụ pụrụ ịkasị baa uru mgbe anyị na-amataghị na ọ dị anyị mkpa. Irubere ndụmọdụ dị otú ahụ isi pụrụ ime ka anyị ghara inwe obi mgbawa ma nyere anyị aka izere ọdachi. Ileghara ya anya ga-eweta nlelị.

Ịja mma, mgbe o kwesịrị ekwesị, na-akwalite mmụọ ma bụrụ n’ezie ihe na-agba ume. Ma ọ dịkwa anyị mkpa ịtụ anya na ịnabata ịdọ aka ná ntị. Tụlee akwụkwọ ozi abụọ ahụ Pọl onyeozi degaara Timoti. Ọ bụ ezie na ha jara ya mma maka ikwesị ntụkwasị obi ya, akwụkwọ ozi ndị ahụ jupụtara na ndụmọdụ nye Timoti. Pọl nyere nwa okorobịa ahụ ọtụtụ ndụmọdụ banyere inwe okwukwe na ezi akọ na uche, imeso ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ihe, ịzụlite nsọpụrụ Chineke na inwe afọ ojuju, ịkụziri ndị ọzọ ihe, iguzogide ndapụ n’ezi ofufe, na ije ozi ya. Ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ na-eme nke ọma ịchọ na ịnabata ndụmọdụ sitere n’aka ndị ka ha nwee ahụmahụ.

“Na-ejeso Ndị Maara Ihe”

“Mgbe ihe a na-achọsi ike mere ọ na-atọ mkpụrụ obi ụtọ,” ka eze ahụ maara ihe na-ekwu, “ma ọ bụ ihe arụ n’anya ndị nzuzu isi n’ihe ọjọọ wezụga onwe ha.” (Ilu 13:19) Banyere ihe ilu a pụtara, otu akwụkwọ ntụaka na-ekwu, sị: “Mgbe mmadụ ruru ihe mgbaru ọsọ ma ọ bụ nweta ihe ọ chọrọ, ọ na-enwe afọ ojuju . . . Ebe ọ bụ na mmadụ iru ihe mgbaru ọsọ ya bụ nnọọ ihe na-enye obi ụtọ, n’ihi ya iwezụga onwe ya n’ihe ọjọọ aghaghị ịbụ ihe arụ n’anya ndị nzuzu. Ọ bụ nanị site n’ime ihe n’ụzọ ọjọọ ka ha pụrụ inweta ọchịchọ ha, ọ bụrụkwa na ha ahapụ ihe ọjọọ, ha agaghị enwe obi ụtọ nke imezu ọchịchọ ha.” Lee ka o si dị oké mkpa anyị ịzụlite ọchịchọ dị mma!

Lee mmetụta dị nnọọ ike ndị anyị na ha na-akpakọ na-enwe n’echiche anyị, n’ihe ndị na-amasị anyị na n’ihe ndị na-adịghị amasị anyị! Solomọn kwupụtara eziokwu na-adịghị agbanwe agbanwe mgbe o kwuru, sị: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.” (Ilu 13:20) Ee, onye anyị na ya na-akpakọrịta, ọbụna site n’ihe ntụrụndụ, Intanet, na ihe anyị na-agụ, na-emetụta ihe anyị bụ na ihe anyị ga-aghọ. Lee ka o si dị mkpa na anyị ga-eji amamihe họrọ ndị anyị na ha na-akpakọ!

‘Mee Ka E Keta Ihe Gị’

“Ndị mmehie ka ihe ọjọọ na-achụ,” ka eze Izrel na-ekwu, “ma ndị ezi omume ka a ga-akwụghachi ezi ihe.” (Ilu 13:21) Ịgbalịsi ike ime ezi omume na-akwụghachi ụgwọ, n’ihi na Jehova na-eche banyere onye ezi omume. (Abụ Ọma 37:25) Otú ọ dị, anyị aghaghị ịghọta na “mgbe na ihe ndapụta” na-adabara anyị nile. (Eklisiastis 9:11) Ànyị pụrụ ime ihe ọ bụla iji kwadebe maka ihe mberede?

“Ezi mmadụ na-eme ka ụmụ ụmụ ya keta ihe ya,” ka Solomọn na-ekwu. (Ilu 13:22a) Lee ihe nketa dị oké ọnụ ahịa ndị nne na nna na-ahapụrụ ụmụ ha mgbe ha na-enyere ụmụ ha aka inweta ihe ọmụma Jehova na ịzụlite ezi mmekọrịta n’ebe ọ nọ! Ma ọ́ gaghị abụkwa ịdị akọ bụ́ ime ndokwa, mgbe o kwere mee, maka ọdịmma anụ ahụ́ nke ezinụlọ, a dịghị ama ama nne ma ọ bụ nna anwụchuo ọnwụ? N’ọtụtụ ebe, ndị isi ezinụlọ pụrụ ime ndokwa maka inshọransị, ike ékpé iwu kwadoro, na ichekwa ego ụfọdụ.

Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ihe nketa nke onye na-emebi iwu? “Ihe a na-akpakọbara onye ezi omume ka akụ̀ onye mmehie bụ,” ka Solomọn gara n’ihu na-ekwu. (Ilu 13:22b) Tụkwasị n’uru ọ bụla a ga-erite ugbu a, nke a ga-abụ eziokwu mgbe Jehova ga-emezu nkwa ya nke ike “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” nke “ezi omume gajekwa ibi n’ime ha.” (2 Pita 3:13) Mgbe ahụ a ga-ekpochapụworị ndị na-emebi iwu ma “ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala.”—Abụ Ọma 37:11.

Onye dị akọ na-eji ihe ọmụma eme ihe, ọbụna mgbe ihe onwunwe ya dị nnọọ nta. “Ọtụtụ ihe oriri dị n’ubi ndị ogbenye,” ka Ilu 13:23 na-ekwu, “ma o nwere nke a na-ekpochapụ site n’ikpe na-abụghị ikpe.” Ihe dị nnọọ nta na-amụba site n’ịrụsi ọrụ ike na ngọzi Chineke. Otú ọ dị, mgbe a na-enweghị ikpe ziri ezi, mkpebi na-ezighị ezi pụrụ ịla akụ̀ na ụba n’iyi.

“Na-adọsi Ya Aka ná Ntị Ike”

Ịdọ aka ná ntị dị ụmụ mmadụ na-ezụghị okè mkpa, ọ dịkwa ha mkpa site na mgbe ha bụ nwata gaa n’ihu. “Onye na-egbochi mkpanaka ya na-akpọ nwa ya asị,” ka eze Izrel na-ekwu, “ma onye na-ahụ ya n’anya na-adọsi ya aka ná ntị ike.”Ilu 13:24.

Mkpanaka na-anọchi anya ikike. N’Ilu 13:24, ọ na-ezo aka n’ikike nne na nna nwere. N’ihe a na-ekwu n’ebe a, iji mkpanaka ịdọ aka ná ntị eme ihe apụtachaghị ịpịa nwatakịrị ihe. Kama, ọ pụtara ụzọ isi gbazie nwata, ụdị ọ bụla ọ pụrụ ịbụ. N’ọnọdụ ụfọdụ, ịbara nwatakịrị mba n’ụzọ obiọma pụrụ izu iji gbazie omume ọjọọ ya. Nwatakịrị ọzọ pụrụ ịchọ ịdọ aka ná ntị sikwuru ike. “Ịbasi mba ike na-abami n’ime onye nghọta karịa ka [otu narị otiti] ga-aba n’ime onye nzuzu,” ka Ilu 17:10 na-ekwu.

Ịdọ aka ná ntị nne na nna kwesịrị ịbụ ndị ịhụnanya na amamihe na-eduzi mgbe nile maka abamuru nke ụmụaka. Nne ma ọ bụ nna na-ahụ n’anya adịghị eleghara emezighị emezi nke nwa ya anya. N’ụzọ dị iche, ọ na-achọ emezighị emezi ndị ahụ ka o wee wepụ ha tupu ha agbanyesie mkpọrọgwụ ike. N’ezie, nne ma ọ bụ nna na-ahụ n’anya na-eburu ndụmọdụ Pọl n’obi: “Ndị bụ́ nna, unu adịkwala na-eme ụmụ unu ihe iwe, kama nọgidenụ na-azụlite ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.”—Ndị Efesọs 6:4.

Gịnị ma ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna ana-ahapụ nwatakịrị ime ihe masịrị ya ma ghara inye mgbazi dị mkpa? Nne ma ọ bụ nna dị otú ahụ ọ̀ ga-enweta ekele ma e mesịa n’ihi ịgba nwa ya nkịtị ime ihe masịrị ya? Ọ dịghị ma ọlị! (Ilu 29:21) Bible na-ekwu, sị: “Nwata nke a na-ahapụ n’onwe ya na-eme ka ihere mee nne ya.” (Ilu 29:15) Ịla azụ n’iji ikike e nwere dị ka nne na nna eme ihe na-egosi enweghị mmasị ma ọ bụ enweghị ịhụnanya. Otú ọ dị, iji obiọma na nkwụsi ike eji ikike eme ihe na-egosipụta nchegbu ịhụnanya.

Onye dị akọ ma zie ezie nke na-akpa àgwà n’ụzọ na-egosi ihe ọmụma ga-enweta ngọzi. Solomọn mesiri anyị obi ike, sị: “Onye ezi omume na-eri ihe ruo mgbe afọ juru mkpụrụ obi ya: ma afọ ndị na-emebi iwu, ihe na-akọ ya.” (Ilu 13:25) Jehova maara ihe ga-abara anyị uru n’akụkụ ọ bụla nke ndụ—n’ihe banyere ezinụlọ anyị, ná mmekọrịta anyị na ndị ọzọ, n’ozi anyị, ma ọ bụ mgbe a na-adọ anyị aka ná ntị. Sitekwa n’iji amamihe na-etinye ndụmọdụ ndị a na-achọta n’Okwu ya n’ọrụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na anyị ga-ebi ndụ kasị mma.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Maka ntụle nke Ilu 13:1-14, lee peeji nke 21-25 nke mbipụta Ụlọ Nche September 15, 2003.

[Foto dị na peeji nke 28]

Mgbe a katọrọ ya n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị, onye nwere ezi uche na-akwa ire ya nga

[Foto dị na peeji nke 29]

Onye mkpọsa Alaeze kwesịrị ntụkwasị obi na-arụpụta nnọọ ezi ihe

[Foto dị na peeji nke 30]

Ọ bụ ezie na ịja mma na-agba ume, anyị aghaghị ịdị na-anabata mgbazi

[Foto dị na peeji nke 31]

Nne ma ọ bụ nna na-ahụ n’anya adịghị eleghara emezighị emezi nke nwa ya anya