‘Udu Mmiri na Ọkọchị Agaghị Ebi’
Ịma Mma Nke Ihe Okike Jehova
‘Udu Mmiri na Ọkọchị Agaghị Ebi’
ANWỤ na-agbakasị ahụ́ na-achakwasị ịkpa. N’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa, ọ na-eme ka ahụ́ kporo ndị mmadụ ọkụ mgbe udu mmiri gasịrị. Ee, okpomọkụ sitere n’anyanwụ bụ otu n’ime ihe ndị bụ́ isi mere e ji enwe mgbanwe ihu igwe na oge ndị a na-enwe n’afọ.
Oge ndị a na-enwe n’afọ na-adịgasị iche gburugburu ụwa. Ma olee otú oge ndị a na-enwe n’afọ si emetụta gị? Mgbanwe na-enye ume ọhụrụ a na-enwe n’oge opupu ihe ubi ọ̀ na-amasị gị mgbe ị hụrụ ka osisi na okooko osisi dị iche iche na-ama ifuru? Olee otú ọ na-adị gị mgbe ị na-anara ikuku ndụ n’uhuruchi nke oge ọkọchị? Ị̀ na-enwe obi ụtọ n’oge mgbụsị akwụkwọ na-enye ume ọhụrụ bụ́ mgbe akwụkwọ osisi na-achagharị?
Gịnị na-eme ka e nwee oge dị iche iche n’afọ? N’ikwu ya ná nkenke, ọ bụ nhulata nke ụwa. N’ebe ọ nọ na-agba anyanwụ gburugburu, o hulatara ihe dị ka degree 23.5. A sị na ụwa ehulataghị ehulata n’ebe ọ nọ na-agba anyanwụ gburugburu, a gaghị enwe oge dị iche iche n’afọ. Ihu igwe agaghị adị na-agbanwe agbanwe. Nke a ga-emetụta ahịhịa na nkọpụta nke ihe oriri.
Mmadụ pụrụ ịhụ ihe àmà nke na-egosi na ọ bụ Onye Okike haziri nsochi nke oge ndị a na-enwe n’afọ. N’ịgwa Jehova Chineke okwu, ọbụ abụ ahụ kwuru n’ụzọ dabara nnọọ adaba, sị: ‘Gị onwe gị emewo ka ókèala nile nke ụwa guzo ọtọ: mgbe okpomọkụ na mgbe oyi, Gị onwe gị akpụwo ha.’—Abụ Ọma 74:17. *
Nye onye nọ n’ụwa, ihe ndị dị na mbara igwe bụ ihe ndị doro anya e ji agụ oge. Mgbe ọ na-eke usoro mbara igwe anyị, Chineke nyere iwu, sị: “Ka ihe nke na-enye ìhè dị na mbara eluigwe . . . , ka ha bụrụkwa ihe igosi ihe ịrịba ama dị iche iche, na ịgụ mgbe a kara aka, na ịgụ ụbọchị na afọ.” (Jenesis 1:14) N’ime otu afọ, ka ụwa na-agba anyanwụ gburugburu, ugboro abụọ, ọ na-eru ebe anyanwụ na-adị nnọọ kpọmkwem n’elu ya n’etiti ehihie n’akara kere ụwa abụọ. A na-akpọ oge ndị a equinox, n’ọtụtụ ala kwa ha na-aka akara mmalite nke oge opupu ihe ubi na oge mgbụsị akwụkwọ. N’oge ndị a, ọ na-afọ nke nta ka ehihie na abalị hara nhata n’ụwa nile.
Ịdị adị na mmalite nke oge ndị a na-enwe n’afọ emetụtaghị nanị ngagharị nke ihe ndị dị na mbara igwe. Oge ndị a na-enwe n’afọ na ihu igwe nwere njikọ chiri anya n’usoro dị mgbagwoju anya nke na-akwagide ndụ. Mgbe ha na-agwa ndị bi n’Asia Minor okwu—ndị ọtụtụ n’ime ha maara ihe banyere ọrụ ugbo na ịkọpụta nri nke ọma—onyeozi bụ́ Onye Kraịst bụ́ Pọl na onye ibe ya bụ́ Banabas kwuru na Chineke bụ onye “na-enye unu mmiri ozuzo site n’eluigwe na oge mkpụrụ ji amị, na-emejupụta obi unu n’ihe oriri na ezi obi ụtọ.”—Ọrụ 14:14-17.
Usoro magburu onwe ya nke photosynthesis na-eme ka a nọgide na-enwe ihe ọkụkụ n’ala na ahịhịa ndị na-ese n’elu oké osimiri bụ́ ndị a pụrụ iji nanị ígwè microscope hụ. N’ihi nke a, usoro nke ihe ndị dị ndụ iji ibe ha emere ihe oriri iji dịgide ndụ bụ́ nke dị ugbu a na njikọ dị n’etiti ihe ndị dị ndụ na ibe ha na-emeghachi omume n’ọnọdụ ihu igwe n’ụzọ ndị dị mgbagwoju anya. Pọl zoro aka n’ụzọ dabara adaba n’òkè Jehova na-ekere n’ihe a nile, na-asị: “Ala nke na-aṅụ mmiri ozuzo nke na-ezokwasị ya mgbe mgbe, na nke na-epupụtazi ihe ọkụkụ kwesịrị ekwesị maka ndị e jikwa n’ihi ha kọọ ya, na-enweta, n’aka nke ya, ngọzi sitere n’aka Chineke.”—Ndị Hibru 6:7.
Okwu ahụ bụ́ “ngọzi” na-enwe ihe ọhụrụ ọ pụtara ma ọ bụrụ nnọọ na ị kwụsị ma chee echiche banyere ihe ndị na-eme n’ebe ndị oge opupu ihe ubi na-eme ka e nwee ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ ndị na-adị mma Abụ nke Abụ 2:12, 13) Nke a na-eduga n’iwe ihe ubi ná ngwụsị oge ọkọchị ma ọ bụ n’oge mgbụsị akwụkwọ.—Ọpụpụ 23:16.
n’ahụ́, ehihie ndị na-adị ogologo karị, mee ka e nwekwuo anwụ, na mmiri ozuzo ndị na-ajụ ahụ́ oyi. Okooko osisi na-agbawa, ụmụ ahụhụ na-esikwa n’ụlọ oge oyi ha pụta, dịrị njikere ime ka ihe ọkụkụ mịa mkpụrụ. Nnụnụ ndị dị ka blue jay ị na-ahụ n’ebe a na-eme ka e nwee ọtụtụ àgwà na abụ n’oké ọhịa, ala na-aghọkwa nke jupụtara n’ihe ndị dị ndụ. A na-enwewanye ume ná ndụ, ihe ndị dị ndụ na-anọgidekwa na-enwe usoro ha nke ọmụmụ, nnwogha, na uto. (Otú Jehova si debe ụwa, na-eme ka e nwee ehihie na abalị, oge ndị a na-enwe n’afọ, na oge ịgha mkpụrụ na oge owuwe ihe ubi na-egosipụta ọrụ ya n’ụzọ dị ebube. Anyị nwere obi ike na ọkọchị ga-esochi udu mmiri. E kwuwerị, ọ bụ Chineke kwere nkwa, sị: “Ruo ụbọchị nile nke ụwa, ọghịgha mkpụrụ na owuwe ihe ubi, na oyi na okpomọkụ, na udu mmiri na ọkọchị, na ehihie na abalị, agaghị ebi.”—Jenesis 8:22.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 6 Lee 2004 Calendar of Jehovah’s Witnesses, July/August.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 9]
Ihe Na-enye Ìhè na Mbara Igwe Bụ́ nke Dị Oké Mkpa Maka Ndụ
Kemgbe ụwa, ọnwa anọgidewo na-akpali ndị mmadụ ma na-eju ha anya. Ma ị̀ maara na ọnwa na-emetụta oge ndị a na-enwe n’afọ? Ọnwa na-enye aka n’ịchịkwa nhulata nke ụwa ka ọ na-agba anyanwụ gburugburu. Nke a na-arụ “ọrụ dị mkpa n’ime ka e nwee ọnọdụ ndị pụrụ ime ka ndụ dịgide n’Ụwa,” ka onye na-ede akwụkwọ sayensị bụ́ Andrew Hill na-ekwu. A sị na e nweghị nnukwu ihe sitere n’okike na-enye ìhè iji mee ka mbara ala anyị nọgide na-ehulata ehulata ka ọ na-agba anyanwụ gburugburu, ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ gaara arị elu, ma eleghịkwa anya mee ka ọ ghara ikwe omume inwe ihe dị ndụ n’ụwa. N’ihi ya, otu ìgwè nke ndị na-enyocha mbara igwe kwubiri, sị: “Mmadụ pụrụ ile Ọnwa anya dị ka ihe pụrụ ịchịkwa mgbanwe ọnọdụ ihu igwe n’Ụwa.”—Abụ Ọma 104:19.
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ọnwa: U.S. Fish & Wildlife Service, Washington, D.C./Bart O’Gara
[Foto dị na peeji nke 9]
Kamel, Ebe Ugwu Africa na n’Ala Dịịrị Banye na Mmiri n’Arebia