Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịzụlite Echiche Yiri nke Kraịst Banyere Ịdị Ukwuu

Ịzụlite Echiche Yiri nke Kraịst Banyere Ịdị Ukwuu

Ịzụlite Echiche Yiri nke Kraịst Banyere Ịdị Ukwuu

“Onye ọ bụla nke na-achọ ịbụ onye ukwu n’etiti unu aghaghị ịbụ onye na-ejere unu ozi.”—MATIU 20:26.

1. Gịnị bụ echiche ụwa banyere ịdị ukwuu?

NA NSO obodo Ijipt oge ochie bụ́ Thebes (Karnak nke oge a), ihe dị ka kilomita 500 site n’ebe ndịda Cairo, e nwere ihe oyiyi dị mita 18 n’ogologo nke Fero Amenhotep nke Atọ. Mmadụ apụghị ile akatamkpo ihe oyiyi ahụ anya ma ghara iche na ya pere nnọọ mpe ma e jiri ya tụnyere ihe oyiyi ahụ. Ihe ncheta a, nke ihe ịrụ ụka na-adịghị na ya na e guzobere ya iji mee ka a na-atụ onye ọchịchị ahụ egwu, na-egosipụta echiche ụwa banyere ịdị ukwuu—nke mmadụ ime onwe ya ka o yie ka ọ̀ dị ukwuu ma dị mkpa, na-emekwa ka ndị ọzọ chee na ọ dịghị ihe ha bụ.

2. Ihe nlereanya dị aṅaa ka Jizọs setịpụụrụ ụmụazụ ya, ajụjụ ndị dị aṅaa ka ọ dịkwa mkpa ka anyị jụọ onwe anyị?

2 Jiri echiche a banyere ịdị ukwuu tụnyere nke Jizọs Kraịst kụziri. Ọ bụ ezie na ọ bụ ‘Onyenwenụ na Onye Ozizi’ nke ụmụazụ ya, Jizọs kụziiri ha na ịdị ukwuu na-abịa site n’ijere ndị ọzọ ozi. N’ụbọchị ikpeazụ nke ndụ ya n’ụwa, Jizọs gosipụtara ihe ihe ọ kụziri pụtara site n’ịsa ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya. Lee omume na-egosi ịdị umeala n’obi nke ahụ bụ! (Jọn 13:4, 5, 14) Ije ozi ka ọ̀ bụ ịbụ onye a na-ejere ozi—olee nke na-amasị gị karị? Ihe nlereanya Kraịst ọ̀ na-eme ka i nwee ọchịchọ ịdị umeala n’obi dị nnọọ ka ya? Ya mere, ka anyị nyochaa echiche Kraịst banyere ịdị ukwuu nke dị iche n’echiche ọtụtụ ndị nwere n’ụwa.

Jụ Echiche Ụwa Banyere Ịdị Ukwuu

3. Olee ihe atụ Bible ndị na-egosi ajọ ihe ndị na-esite n’ịchọ otuto site n’aka ụmụ mmadụ?

3 E nwere ọtụtụ ihe atụ ndị sitere na Bible na-egosi na echiche ụwa banyere ịdị ukwuu na-eduga ná mbibi. Chee banyere Heman dị ike, bụ́ onye a ma ama n’obí eze Peasia n’ụbọchị Esta na Mọdekaị. Oké ọchịchọ Heman maka otuto dugara ná mweda n’ala na ọnwụ ya. (Esta 3:5; 6:10-12; 7:9, 10) Gịnị banyere Nebukadneza dị mpako, bụ́ onye e mere ka ọ gbaa ara mgbe ọchịchị ya nọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu? E gosipụtara echiche ya hiere ụzọ banyere ịdị ukwuu n’okwu ndị a: “Ọ́ bụghị nke a bụ Babilọn ukwu a, nke mụ onwe m wuworo ịbụ ụlọ alaeze, site n’ike nke akụ̀ m na n’ihi ebube nke ịma mma m?” (Daniel 4:30) E nwekwara Herọd Agrịpa nke Mbụ dị mpako, bụ́ onye naara otuto na-erughịrị ya kama inye Chineke otuto. “Ikpuru richapụkwara ya, o wee kubie ume.” (Ọrụ 12:21-23) Aghọtaghị echiche Jehova banyere ịdị ukwuu dugara ndị ikom a n’ọdịda na-emenye ihere.

4. Ònye na-akpata mmụọ mpako nke ụwa?

4 O kwesịrị ekwesị anyị ịchọ iji ndụ anyị eme ihe n’ụzọ ga-ewetara anyị nsọpụrụ na nkwanye ùgwù. Ma, Ekwensu na-eji ọchịchọ a eme ihe site n’ime ka ọtụtụ ndị nwee mmụọ mpako, nke bụ́ ngosipụta nke oké ọchịchọ nke ya. (Matiu 4:8, 9) Ya adịla mgbe ị ga-echefu na ọ bụ ya bụ “chi nke usoro ihe a,” nakwa na o kpebisiri ike ịgbasa echiche ya n’ụwa. (2 Ndị Kọrint 4:4; Ndị Efesọs 2:2; Mkpughe 12:9) N’ịmara ebe echiche dị otú ahụ sitere, Ndị Kraịst na-ajụ echiche nke ụwa banyere ịdị ukwuu.

5. Inwe ihe a rụzuru, ịbụ onye a ma ama, na akụ̀ na ụba, ọ̀ na-eweta afọ ojuju na-adịgide adịgide? Kọwaa.

5 Otu echiche nke Ekwensu na-akwalite bụ na inwe oké aha n’ụwa, inweta otuto site n’aka ndị mmadụ, na akụ̀ na ụba na-eme nnọọ ka e nwee ndụ obi ụtọ. Nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu? Mmadụ inwe ihe ọ rụzuru, ịbụ onye a ma ama, na akụ̀ na ụba ọ̀ na-eme ka e nwee afọ ojuju ná ndụ? Bible dọrọ anyị aka ná ntị ịghara ịbụ ndị echiche dị otú ahụ duhiere. Eze Solomọn maara ihe dere, sị: “Mụ onwe m wee hụ ndọgbu nile mmadụ na-adọgbu onwe ha n’ọrụ, ya na ọrụ nile na-agazi agazi, na ọ bụ n’ihi nke a ka mmadụ ga-abụ onye mmadụ ibe ya ga-ekwoso ekworo. Nke a bụkwa ihe efu na ịchọ ijide ifufe.” (Eklisiastis 4:4) Ọtụtụ ndị bụ́ ndị mikpuworo onwe ha n’ọchịchọ ịbụ ndị a ma ama n’ụwa pụrụ ịgba akaebe nye ịbụ eziokwu nke ndụmọdụ Bible ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ. Otu ihe atụ bụ otu nwoke nke nyere aka see ụkpụrụ ụgbọ mbara igwe nke bugara mmadụ n’ọnwa, sorokwa wuo ma nwalee ya. O kwuru, sị: “Arụsiwo m ọrụ ike ma bụrụ nnọọ aka ochie n’ihe m na-eme. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụwo ihe efu, ma ọ bụ ihe na-abaghị uru, n’ime ka m nwee obi ụtọ na udo nke uche.” * Echiche ụwa banyere ịdị ukwuu, ma ọ bụ n’azụmahịa, n’egwuregwu, ma ọ bụ ná ntụrụndụ, adịghị eweta afọ ojuju na-adịgide adịgide.

Ịdị Ukwuu Na-abịa Site n’Ije Ozi Ịhụnanya Kpaliri

6. Gịnị na-egosi na Jems na Jọn nwere echiche na-ezighị ezi banyere ịdị ukwuu?

6 Otu ihe mere ná ndụ Jizọs na-ekpughe ihe ezi ịdị ukwuu gụnyere. Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ na-aga Jeruselem maka Ememe Ngabiga nke 33 O.A. Ka ha na-aga n’ụzọ, ụmụ nwanne nne Jizọs, Jems na Jọn, gosipụtara echiche na-ezighị ezi banyere ịdị ukwuu. Site n’ọnụ nne ha, ha rịọrọ Jizọs arịrịọ a: ‘Kwuo ka anyị nọdụ ala, otu onye n’aka nri gị na otu onye n’aka ekpe gị, n’alaeze gị.’ (Matiu 20:21) N’etiti ndị Juu, a na-ele ịnọdụ n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe anya dị ka ihe ùgwù dị ukwuu. (1 Ndị Eze 2:19) Jems na Jọn ji oké ọchịchọ gbalịa inweta ọnọdụ ndị kasị dị ùgwù. Ha chọrọ ịzọrọ ọnọdụ ịbụisi ndị a. Jizọs maara ihe dị ha n’obi ma jiri ohere ahụ gbazie echiche ha na-ezighị ezi banyere ịdị ukwuu.

7. Olee otú Jizọs si kọwaa otú e si enweta ezi ịdị ukwuu Ndị Kraịst?

7 Jizọs maara na n’ụwa a mpako jupụtara, onye a na-ewere dị ka onye dị ukwuu bụ onye na-achịkwa ma na-enye ndị ọzọ iwu na onye ọ na-abụ ọ na-ekwu ekwu a na-eme eme. Ma n’etiti ụmụazụ Jizọs, ọ bụ ije ozi dị ala ka e ji amata otú mmadụ dịruru n’ukwuu. Jizọs sịrị: “Onye ọ bụla nke na-achọ ịbụ onye ukwu n’etiti unu aghaghị ịbụ onye na-ejere unu ozi, onye ọ bụla nke na-achọkwa ịbụ onye mbụ n’etiti unu aghaghị ịbụ ohu unu.”—Matiu 20:26, 27.

8. Gịnị ka ịbụ onye na-eje ozi pụtara, ajụjụ ndị dịkwa aṅaa ka anyị pụrụ ịjụ onwe anyị?

8 Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ ‘onye na-eje ozi’ na Bible na-ezo aka n’onye ji ịdị uchu nọgide na-agbalị ijere ndị ọzọ ozi. Jizọs nọ na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya ihe mmụta dị mkpa: Inye ndị mmadụ iwu ime ihe adịghị eme mmadụ ka ọ dị ukwuu; ijere ndị ọzọ ozi mgbe ọ bụ ịhụnanya kpaliri ya na-eme ka mmadụ dị ukwuu. Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú m gaara esi emeghachi omume ma a sị na m bụ Jems ma ọ bụ Jọn? M̀ gaara aghọta na ezi ịdị ukwuu na-abịa site n’ije ozi nke ịhụnanya kpaliri?’—1 Ndị Kọrint 13:3.

9. Ihe nlereanya dị aṅaa ka Jizọs setịpụrụ n’ụzọ o si mesoo ndị ọzọ ihe?

9 Jizọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya na ọ bụghị ihe e ji ekpebi ịdị ukwuu n’ụwa ka e ji ekpebi ụdị ịdị ukwuu Kraịst. Ọ dịghị mgbe o buliri onwe ya elu karịa ndị o jeere ozi ma ọ bụ mee ka ha yie ndị dị ala. Ahụ́ ruru ụdị mmadụ nile—ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka, ndị ọgaranya, ndị ogbenye, na ndị dị ike, tinyere ndị a maara dị ka ndị mmehie—ala mgbe ha na ya nọ. (Mak 10:13-16; Luk 7:37-50) Ndị mmadụ adịghị enwekarị ndidi n’ebe ndị nwere adịghị ike ụfọdụ nọ. Jizọs adịghị otú ahụ. Ọ bụ ezie na ndị na-eso ụzọ ya mere ihe n’echeghị echiche ma see okwu mgbe ụfọdụ, o ji ndidi kụziere ha ihe, na-egosi ha na ya dị umeala n’obi ma dị nwayọọ n’ezie.—Zekaraịa 9:9; Matiu 11:29; Luk 22:24-27.

10. Olee otú ụzọ ndụ Jizọs n’ozuzu ya si gosipụta àgwà nke iji achọghị ọdịmma onwe onye nanị na-ejere ndị ọzọ ozi?

10 Ihe nlereanya nke achọghị ọdịmma onwe onye nanị nke Ọkpara a e buru ụzọ mụọ nke Chineke setịpụrụ gosiri ihe ịdị ukwuu pụtara n’ezie. Jizọs abịaghị n’ụwa ka e jeere ya ozi kama ka o jeere ndị ọzọ ozi, na-agwọ “ọrịa dị iche iche” ma na-eme ka ndị mmụọ ọjọọ ji nwere onwe ha. Ọ bụ ezie na ọ dị oge ndị ike gwụrụ ya, ya achọọkwa izu ike, o butere mkpa nke ndị ọzọ ụzọ mgbe nile, na-agbalịsi ike ịkasi ha obi. (Mak 1:32-34; 6:30-34; Jọn 11:11, 17, 33) Ịhụnanya o nwere n’ebe ndị mmadụ nọ kpaliri ya inyere ha aka n’ụzọ ime mmụọ, na-eme njem gaa ihe karịrị ọtụtụ narị kilomita n’okporo ụzọ uzuzu iji kwusaa ozi ọma nke Alaeze ahụ. (Mak 1:38, 39) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Jizọs ji ijere ndị ọzọ ozi kpọrọ ihe.

Ṅomie Ịdị Umeala n’Obi Kraịst

11. Àgwà ndị dị aṅaa ka a chọrọ ka ụmụnna ndị a họpụtara ije ozi dị ka ndị nlekọta n’ọgbakọ nwee?

11 Ná ngwụsị afọ ndị 1800, e mere ka àgwà kwesịrị ekwesị Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta kwesịrị inwe pụta ìhè mgbe a họpụtara ndị ikom ịbụ ndị nnọchianya na-ejegharị ejegharị ịhụ maka mkpa nke ndị Chineke. Ihe a chọrọ, dị ka Zion’s Watch Tower nke September 1, 1894 kwuru, bụ ndị ikom “dị umeala n’obi—ka ha wee ghara ịfụli onwe ha elu . . . , ndị dị umeala n’obi bụ́ ndị na-adịghị achọ ikwusa onwe ha kama ikwusa Kraịst—ọ bụghị ikwupụta ihe ọmụma ha kama ikwupụta Okwu ya dị ka o si dị mfe na dị ka o si dị ike.” N’ụzọ doro anya, ezi Ndị Kraịst ekwesịtụghị ịchọ ibu ọrụ iji mezuo oké ọchịchọ onwe onye ma ọ bụ iji bụrụ ndị a ma ama, iji nweta ike ma na-achịkwa ndị ọzọ. Onye nlekọta dị umeala n’obi na-eburu n’uche na ibu ọrụ ya bụ “ọrụ ọma,” ọ bụghị ọkwá dị elu nke na-ewetara ya otuto. (1 Timoti 3:1, 2) Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi nile kwesịrị ime ike ha nile iji jiri umeala n’obi na-ejere ndị ọzọ ozi ma na-ebute ụzọ n’ozi dị nsọ, na-esetịpụ ihe nlereanya kwesịrị ekwesị nke ndị ọzọ ga-eṅomi.—1 Ndị Kọrint 9:19; Ndị Galeshia 5:13; 2 Timoti 4:5.

12. Ajụjụ ndị dị aṅaa ka ndị na-agbalị iru eru maka ihe ùgwù n’ọgbakọ pụrụ ịjụ onwe ha?

12 Ọ pụrụ ịdị mkpa ka nwanna ọ bụla na-agbalị iru eru maka ihe ùgwù dị iche iche jụọ onwe ya, sị: ‘M̀ na-achọ ohere iji na-ejere ndị ọzọ ozi, ka m̀ na-achọ ka a na-ejere m ozi? Àdị m njikere ịrụ ọrụ na-aba uru ndị ndị ọzọ na-adịghị ahụ?’ Dị ka ihe atụ, nwa okorobịa pụrụ ịdị na-achọ ikwu okwu n’ọgbakọ Ndị Kraịst ma o nwere ike na-ala azụ n’inyere ndị agadi aka. Ọ pụrụ ịdị na-enwe mmasị ná mkpakọrịta nke ndị ikom nwere ibu ọrụ n’ọgbakọ ma na-ala azụ ikere òkè n’ọrụ nkwusa. Nwa okorobịa dị otú ahụ ga-eme nke ọma ịjụ onwe ya, sị: ‘Anya m ọ̀ dị karịsịa n’akụkụ ụfọdụ nke ozi Chineke ndị na-eweta otuto ma na-eme ka mmadụ bụrụ onye a ma ama? Àna m agbalịsi ike ime ka ndị ọzọ hụ m?’ Mmadụ ịchọ otuto onwe onye abụghị n’ezie àgwà Kraịst.—Jọn 5:41.

13. (a) Olee otú ihe nlereanya nke ịdị umeala n’obi nke onye nlekọta pụrụ isi metụta ndị ọzọ? (b) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ịdị umeala n’obi, ma ọ bụ ịdị nwayọọ n’obi, abụghị ihe Onye Kraịst pụrụ ime ma ọ chọọ?

13 Mgbe anyị rụsiri ọrụ ike iṅomi ịdị umeala n’obi nke Kraịst, a na-akpali anyị ijere ndị ọzọ ozi. Tụlee ihe nlereanya nke onye nlekọta zoonụ bụ́ onye nọ na-eme nnyocha otú ọrụ si na-aga n’otu n’ime alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova. N’agbanyeghị na o ji nnọọ ọrụ n’aka ma nwee nnukwu ibu ọrụ, onye nlekọta a kwụsịrị iji nyere nwanna nwoke bụ́ nwa okorobịa aka, bụ́ onye na-adọga idozi ígwè ọrụ e ji adụchi akwụkwọ. “O riri m ọnụ!” ka nwanna ahụ na-akọ. “Ọ gwara m na ya ji ụdị ígwè ọrụ ahụ rụọ ọrụ mgbe ya bụ nwa okorobịa na-eje ozi na Betel, na ya chetakwara otú o si esi ike idozi ya ka ọ rụwa ọrụ nke ọma. O so m rụọ ọrụ n’ígwè ọrụ ahụ ruo oge ụfọdụ ọ bụ ezie na o nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị mkpa ime. Nke ahụ masịrị m n’ezie.” Nwanna nwoke ahụ, onye bụ́ onye nlekọta ugbu a n’otu n’ime alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova, ka na-echeta omume ịdị umeala n’obi ahụ. Ya adịtụla mgbe anyị ga-eche na anyị dị nnọọ ukwuu ime ihe ndị dị ala ma ọ bụ dịrị oké mkpa ịrụ ọrụ ndị dị nta. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị iyikwasị onwe anyị “umeala n’obi.” Nke ahụ abụghị ihe anyị ga-eme ma anyị chọọ. Ọ bụ akụkụ nke “ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ” nke Onye Kraịst na-aghaghị iyikwasị.—Ndị Filipaị 2:3; Ndị Kọlọsi 3:10, 12; Ndị Rom 12:16.

Ụzọ Isi Zụlite Echiche Yiri nke Kraịst Banyere Ịdị Ukwuu

14. Olee otú ịtụgharị uche ná mmekọrịta anyị na Chineke na ụmụ mmadụ ibe anyị pụrụ isi nyere anyị aka ịzụlite echiche ziri ezi banyere ịdị ukwuu?

14 Olee otú anyị pụrụ isi nwee echiche ziri ezi banyere ịdị ukwuu? Otu ụzọ bụ site n’ịtụgharị uche ná mmekọrịta anyị na Jehova Chineke. Ịdị ukwuu ya, ike ya, na amamihe ya mere ka ọ dị elu karịa nghọta nke ụmụ mmadụ efu. (Aịsaịa 40:22) Ịtụgharị uche ná mmekọrịta anyị na ụmụ mmadụ ibe anyị na-enyekwara anyị aka ịzụlite ịdị umeala n’obi. Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ ime nke ọma karịa ndị ọzọ n’ihe ụfọdụ, ma ha pụrụ ịkarị anyị n’akụkụ ndị ọzọ nke ndụ bụ́ ndị ka mkpa, ma ọ bụ ụmụnna anyị Ndị Kraịst pụrụ inwe àgwà ụfọdụ anyị na-enweghị. N’ezie, ọtụtụ ndị dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke adịghị achọ ime ka a mara ha n’ihi àgwà ịdị umeala n’obi ha.—Ilu 3:34; Jems 4:6.

15. Olee otú iguzosi ike n’ezi ihe nke ndị Chineke si egosi na ọ dịghị onye nwere ihe mere ọ ga-eji chee na ya karịrị ndị ọzọ?

15 Ahụmahụ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova bụ́ ndị a na-ele ule n’ihi okwukwe ha na-egosipụta nke a nke ọma. Mgbe mgbe, ọ bụ ndị ụwa ga-ewere dị ka ndị nkịtị guzosiworo ike n’ezi ihe nye Chineke n’okpuru ule kpụ ọkụ n’ọnụ. Ịtụgharị uche n’ihe atụ ndị dị otú ahụ pụrụ inyere anyị aka ịnọgide na-adị umeala n’obi ma kụziere anyị ‘ịghara iche banyere onwe anyị karịa ka ọ dị mkpa iche.’—Ndị Rom 12:3. *

16. Olee otú mmadụ nile nọ n’ọgbakọ pụrụ isi zụlite ịdị ukwuu n’iṅomi ụkpụrụ Jizọs setịpụrụ?

16 Ndị Kraịst nile, ndị na-eto eto na ndị agadi, kwesịrị ịchọ ịzụlite echiche Kraịst banyere ịdị ukwuu. N’ọgbakọ, e nwere ọrụ dịgasị iche iche a na-aghaghị ịrụ. Ya adịla mgbe ị ga-ewe iwe ma a sị gị mee ihe ndị pụrụ iyi ka hà dị ala. (1 Samuel 25:41; 2 Ndị Eze 3:11) Ndị nne na nna, ùnu na-agba ụmụ unu na ndị dị afọ iri na ụma ume iji obi ụtọ na-arụ ọrụ ọ bụla e nyere ha rụọ, ma ọ bụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ n’ebe a na-eme mgbakọ? Hà na-ahụ ka unu na-arụ ọrụ ndị dị ala? Otu nwanna nwoke, bụ́ onye na-eje ozi ugbu a n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova, na-echeta nnọọ nke ọma ihe nlereanya nke ndị mụrụ ya. O kwuru, sị: “Otú ha si arụ ọrụ nke idebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ ụlọ mgbakọ ọcha gosiri m na ha weere ya dị ka ihe dị mkpa. Ha na-ewepụtakarị onwe ha ịrụ ọrụ ndị bụ́ maka ọdịmma nke ọgbakọ ma ọ bụ òtù ụmụnna, n’agbanyeghị otú ọrụ ndị ahụ pụrụ iyiru ihe dị ala. Àgwà a enyeworo m aka iji ọchịchọ obi anakwere ọrụ ọ bụla e nyere m na Betel ebe a.”

17. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ndị inyom dị umeala n’obi pụrụ isi bụrụ ngọzi nye ọgbakọ?

17 A bịa n’ibute ọdịmma nke ndị ọzọ ụzọ, Esta, bụ́ onye ghọrọ nwunye eze nke Alaeze Ukwu Peasia na narị afọ nke ise T.O.A., bụụrụ anyị ihe nlereanya magburu onwe ya. Ọ bụ ezie na o bi n’obí eze, ọ dị njikere itinye ndụ ya n’ihe ize ndụ n’ihi ndị Chineke, na-eme ihe n’ụzọ kwekọrọ n’uche Ya. (Esta 1:5, 6; 4:14-16) N’agbanyeghị ọnọdụ akụ̀ na ụba ha, Ndị Kraịst bụ́ ndị inyom taa pụrụ igosipụta mmụọ yiri nke Esta site n’ịgba ndị dara mbà n’obi ume, ileta ndị ọrịa, ikere òkè n’ọrụ nkwusa, na ikwenyere ndị okenye. Lee ngọzi ụmụnna nwanyị dị otú ahụ dị umeala n’obi bụụrụ ọgbakọ!

Ngọzi Ndị Na-abịa Site n’Ụdị Ịdị Ukwuu nke Kraịst

18. Uru ndị dị aṅaa na-abịa site n’igosipụta ụdị ịdị ukwuu nke Kraịst?

18 Ị ga-erite ọtụtụ uru mgbe ị nọgidere na-enwe echiche yiri nke Kraịst banyere ịdị ukwuu. Iji achọghị ọdịmma onwe onye nanị na-ejere ndị ọzọ ozi na-ewetara ma gị ma ha ọṅụ. (Ọrụ 20:35) Ka i ji ọchịchọ obi na ịnụ ọkụ n’obi na-agba mbọ n’ihi ụmụnna gị, ị na-eme ka ha hụ gị n’anya nke ukwuu. (Ọrụ 20:37) Nke ka mkpa, Jehova na-ele ihe ị na-eme iji kwalite ọdịmma nke Ndị Kraịst ibe gị anya dị ka àjà nke na-amasị ya.—Ndị Filipaị 2:17.

19. Gịnị kwesịrị ịbụ mkpebi anyị n’ihe metụtara echiche Kraịst banyere ịdị ukwuu?

19 Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị inyocha obi ya ma jụọ onwe ya, sị: ‘Ọ̀ bụ nanị n’ọnụ ka m ga na-ekwu banyere ịzụlite echiche Kraịst banyere ịdị ukwuu, ka m̀ ga-arụsi ọrụ ike itinye ya n’ọrụ?’ Echiche Jehova banyere ndị mpako doro anya. (Ilu 16:5; 1 Pita 5:5) Ka àgwà anyị gosi na ọ na-atọ anyị ụtọ igosipụta echiche yiri nke Kraịst banyere ịdị ukwuu, ma ọ bụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst, ná ndụ ezinụlọ anyị, ma ọ bụ n’otú anyị si emeso ụmụ mmadụ ibe anyị ihe kwa ụbọchị—na-eme ihe nile iji wetara Chineke otuto na nsọpụrụ.—1 Ndị Kọrint 10:31.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Lee Ụlọ Nche nke November 1, 1982, peeji nke 3-6, “N’ịchọ Ihe Ịga nke Ọma.”

^ par. 15 Dị ka ihe atụ, lee 1992 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, peeji nke 181-182, na Ụlọ Nche nke September 1, 1993, peeji nke 27-31.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịjụ echiche ụwa banyere ịdị ukwuu?

• Olee otú Jizọs si tụọ ịdị ukwuu n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀?

• Olee otú ndị nlekọta pụrụ isi ṅomie ịdị umeala n’obi nke Kraịst?

• Gịnị pụrụ inyere anyị aka ịzụlite ụdị ịdị ukwuu nke Kraịst?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe dị na peeji nke 17]

Ònye Nwere Ụdị Ịdị Ukwuu nke Kraịst?

Onye na-achọ ka e jeere ya ozi ka ọ̀ bụ onye dị njikere ije ozi?

Onye na-achọ ịpụta ìhè ka ọ̀ bụ onye na-anakwere ọrụ ndị dị ala?

Onye na-ebuli onwe ya elu ka ọ̀ bụ onye na-ebuli ndị ọzọ elu?

[Foto dị na peeji nke 14]

Akatamkpo ihe oyiyi nke Fero Amenhotep nke Atọ

[Foto dị na peeji nke 15]

Ị̀ maara ihe dugara n’ọdịda Heman?

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

Ị̀ na-achọ ohere iji jeere ndị ọzọ ozi?