Ọchịchị Alaeze Chineke—Ihe Dị Adị Taa
Ọchịchị Alaeze Chineke—Ihe Dị Adị Taa
“Olee otú ọtụtụ mba, bụ́ ndị nwere ọdịbendị dịrịtara nnọọ iche na ndị ókè ha meperuru anya dịrịtara nnọọ iche pụrụ isi nwee nkwekọrịta? E kwuwo na ọ bụ nanị mwakpo sitere na mbara ọzọ pụrụ ijikọta agbụrụ mmadụ.”—The Age, akwụkwọ akụkọ Australia.
Ọ̀ SỊRỊ mwakpo sitere na mbara ọzọ? Ma nke ahụ ọ̀ ga-ejikọta mba nile nke ụwa ọnụ ma ọ bụ na ọ gaghị ejikọta ha, amụma Bible na-ekwu banyere ọgba aghara na-abịanụ nke ga-eme ka mba nile nke ụwa jikọta onwe ha. N’ezie, ọ bụkwa ike na-esiteghị n’ụwa ga-akpata ọgba aghara ahụ.
Eze Devid nke Izrel oge ochie kwuru n’ụzọ amụma banyere ọnọdụ ụwa a. N’ike mmụọ nsọ Chineke, o dere, sị: “Ndị eze nke ụwa na-eguzo onwe ha, ndị isi na-agbakọtakwa ìzù, imegide Jehova, na imegide onye Ya e tere mmanụ, sị, Ka anyị tijie agbụ nile ha, tụfuo ụdọ nile ha n’ahụ́ anyị.” (Abụ Ọma 2:2, 3; Ọrụ 4:25, 26) Rịba ama na ndị eze nke ụwa ga-agbakọta ìzù ọnụ megide Jehova, Onye Okike nke eluigwe na ala, na onye ya e tere mmanụ, ma ọ bụ Eze ya ọ họpụtara, bụ́ Jizọs Kraịst. Olee otú nke ahụ ga-esi mee?
Dị ka ngụkọ oge Bible si dị, n’afọ 1914, e guzobere Alaeze Chineke n’eluigwe, Jizọs Kraịst abụrụkwa Eze ya. * N’oge ahụ, mba nile nke ụwa nwere otu echiche. Kama ido onwe ha n’okpuru ọbụbụeze Alaeze Chineke a ka mụpụtara ọhụrụ, ha mikpuru onwe ha na ndọrọ ndọrọ maka ike ọchịchị—Agha Ukwu ahụ, ma ọ bụ Agha Ụwa Mbụ.
Olee otú Jehova Chineke si ele mmeghachi omume dị otú ahụ nke ndị ọchịchị bụ́ ụmụ mmadụ anya? “Onye na-anọdụ n’eluigwe na-achị ọchị: Onyenwe anyị na-akwa ha emo. Mgbe ahụ Ọ ga-agwa ha okwu n’iwe Ya, ọ bụkwa n’iwe Ya dị ọkụ ka Ọ ga-eme ka ha maa jijiji.” Mgbe ahụ, Jehova ga-agwa Ọkpara ya, Eze e tere mmanụ nke Alaeze ahụ, sị: “Rịọ m, na aga m enye gị mba nile ka ha bụrụ ihe nketa gị, na nsọtụ ụwa ka ha bụrụ ihe onwunwe gị. Ị ga-eji mkpanaka ígwè tijisie ha; dị ka ihe ọkpụite kpụrụ ka a ga-atụpịa ha.”—Abụ Ọma 2:4, 5, 8, 9.
Mbibi ikpeazụ a nke a ga-eji mkpanaka ígwè ebibi mba ndị na-emegide Jehova na Ọkpara ya ga-ewere ọnọdụ n’Amagedọn, ma ọ bụ Ha-magedọn. Akwụkwọ ikpeazụ nke Bible, bụ́ Mkpughe, na-akọwa oké ihe omume a dị ka “agha nke oké ụbọchị nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile,” bụ́ nke a na-achịkọta “ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi” gaa na ya. (Mkpughe 16:14, 16) N’okpuru mmetụta ndị mmụọ ọjọọ, mba nile nke ụwa ga-emesị dị n’otu n’ihi otu nzube—ibu agha megide Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.
Oge mgbe ụmụ mmadụ ga-agbakọta ìzù ịlụso ọbụbụeze Chineke ọgụ na-eru nso n’ike n’ike. N’ụzọ na-emegide onwe ya, “ịdị n’otu” ha agaghị abara ha uru ọ bụla. Kama nke ahụ, omume ha ga-eduga n’ihe ga-ewetara ihe nile a kpọrọ mmadụ udo ha nọworo na-eche eri ogologo oge. N’ụzọ dị aṅaa? N’agha ikpeazụ ahụ, Alaeze Chineke “ga-etipịa alaeze ndị a nile [nke ụwa] mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” (Daniel 2:44) Ọ bụ Alaeze Chineke, ọ bụghị òtù ọ bụla nke ụmụ mmadụ, ga-abụ ọchịchị nke ga-emezu ọchịchọ ihe a kpọrọ mmadụ nwere maka udo ụwa.
Onyeisi nke Ọchịchị Alaeze Ahụ
Nke ahụ bụ Alaeze nke ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu kpeworo ekpere banyere ya, na-asị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:10) Kama ịbụ nanị ọnọdụ dị n’obi, Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị adị nke rụzuworo ihe ndị dị ebube kemgbe ọ malitere n’eluigwe na 1914. Ka anyị tụlee ụfọdụ ihe ndị bụ́ isi na-egosi na Alaeze Chineke bụ ihe dị adị ma na-arụ ọrụ n’ụzọ zuru ezu taa.
Nke mbụ, o nwere akụkụ na-achị achị nke dị ike ma dị irè bụ́ nke Eze e mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze bụ́ Jizọs Kraịst bụ onyeisi ya. Na 33 O.A., Jehova Chineke mere Jizọs Kraịst Isi nke ọgbakọ Ndị Kraịst. (Ndị Efesọs 1:22) Kemgbe ahụ, Jizọs anọwo na-eji ikike ya eme ihe dị ka onyeisi ya, si otú ahụ na-egosipụta iru eru ya ịchị achị. Dị ka ihe atụ, mgbe oké ụnwụ nri dara na Judia na narị afọ mbụ, ọgbakọ Ndị Kraịst mere ihe ozugbo iji gbatara ndị òtù ya ọsọ enyemaka. A haziri ọrụ enyemaka, sikwa n’Antiọk zipụ Banabas na Sọl iwegara ha ihe enyemaka.—Ọrụ 11:27-30.
Anyị adịghị atụ anya na Jizọs Kraịst ga-eme ihe dị ala karịa nke ahụ ugbu a ọchịchị Alaeze ahụ maliteworo. Mgbe ọ bụla ọdachi—ala ọma jijiji, ụnwụ nri, idei mmiri, ajọ ifufe, oké ifufe, ma ọ bụ mgbawa ugwu—mere, ọgbakọ
Ndị Kraịst nke Ndịàmà Jehova na-eme ihe ngwa ngwa maka mkpa nke ndị kwere ekwe ibe ha na ndị ọzọ n’ebe ndị o metụtara. Dị ka ihe atụ, mgbe ala ọma jijiji ndị na-ebibi ihe dakwasịrị El Salvador na January na February 2001, a haziri ọrụ enyemaka n’akụkụ nile nke mba ahụ, ìgwè Ndịàmà Jehova si Canada, Guatemala, na United States nyekwara aka. E wughachiri ụlọ ofufe ha atọ tinyekwara ihe karịrị ebe obibi 500 n’egbughị oge.Ndị Ọchịchị Alaeze Chineke Na-achị
Kemgbe e guzobere ya na 1914, Alaeze eluigwe nke Chineke anọwo na-achịkọta ma na-ahazi ndị ọ ga-achị site ná ndị mmadụ gburugburu ụwa. Nke a bụ ná mmezu nke otu amụma dị ịrịba ama nke Aịzaịa dekọrọ: “Ọ ga-erukwa n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a, na ugwu nke ụlọ Jehova [ezi ofufe ya e buliri elu] ga na-eguzosi ike n’elu ugwu nile, . . . mba nile ga-eruba n’ime ya dị ka osimiri.” Amụma ahụ na-egosi na “ọtụtụ ndị” ga-arịgo n’ugwu ahụ ma nakwere ntụziaka na iwu Jehova.—Aịsaịa 2:2, 3.
Ihe omume a emewo ka e nwee otu òtù kasị dị ịrịba ama n’oge a—òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke Ndị Kraịst karịrị 6,000,000 n’ihe karịrị ala 230 n’ụwa. Ná mgbakọ mba nile nke Ndịàmà Jehova, ọ na-ejukarị ndị na-ekiri ihe na-emenụ anya ịhụ ịhụnanya, udo na ịdị n’otu dị n’etiti ìgwè mmadụ buru ibu, bụ́ nke na-agabiga ihe mgbochi nke mba, ọdịbendị na asụsụ. (Ọrụ 10:34, 35) Ọ̀ bụ na ị gaghị ekweta na ka ọchịchị bụrụ nke nwere ike ime ka ọtụtụ narị agbụrụ bịakọta ọnụ n’udo ma nwee nkwekọrịta, ọ ghaghị ịbụ nke dị irè ma kwụsie ike—dịkwa adị?
Alaeze Chineke na Mmụta
Ọchịchị ọ bụla nwere ụkpụrụ a tụrụ anya ka ndị ọ na-achị na-agbaso, onye ọ bụla nke chọkwara ibi n’okpuru ọchịchị ahụ aghaghị ịgbaso ụkpụrụ ndị ahụ. N’otu aka ahụ, Alaeze Chineke nwere ụkpụrụ ndị ndị nile ga-eru eru ịbụ ndị ọ ga-achị na-aghaghị ịgbaso. Otú ọ dị, inyere ọtụtụ mmadụ bụ́ ndị nwere nzụlite dịgasị nnọọ iche aka ịnakwere ma gbasoo otu ụkpụrụ bụ nnọọ ọrụ buru ibu. Ya mere, nke a bụ ihe ọzọ na-agba akaebe na Alaeze Chineke dị adị—usoro mmụta ya dị irè bụ́ nke na-eru na ma na-agbanwe ọ bụghị nanị uche kamakwa obi.
Olee otú ọchịchị Alaeze ahụ si arụzu ọrụ a na-ama aka? Ọ bụ site n’ịgbaso usoro ahụ ndịozi ji mee ihe bụ́ ime nkwusa “site n’ụlọ ruo n’ụlọ” na ịkụziri ndị mmadụ n’otu n’otu Okwu Chineke. (Ọrụ 5:42; 20:20) Olee otú ụdị mmụta a dịruru n’irè? Jacques Johnson, bụ́ onye ụkọchukwu Katọlik, dere n’akwụkwọ akụkọ Canada a na-ebipụta kwa izu banyere mgbalị ndị o mere iji mee ka otu nwanyị kwụsị iso Ndịàmà Jehova na-amụ ihe. “Ike gwụrụ m nnọọ, achọpụtakwara m na o nweghị ebe m ji azụ aga,” ka o kwuru. “Amalitere m ịchọpụta na ruo ọtụtụ ọnwa ndị inyom a bụ́ Ndịàmà Jehova wulitere mmekọrịta chiri anya n’ebe nne a na-akatabeghị ahụ́ nke na-adịghị apụ èzí nọ. Ha riri ya obi site n’inyere ya aka, imete ya enyi, soro ya nwee nkekọ ruru n’ala ala obi. N’oge na-adịghị anya, ọ ghọrọ onye na-anụ ọkụ n’obi n’okpukpe ha, ọ dịghịkwa ihe m pụrụ ime iji gbochie nke ahụ.” Dị nnọọ ka ozi Bible nke Ndịàmà Jehova na-akụzi na omume Ndị Kraịst ha si kpalie obi onye a bụbu onye Katọlik, otú ahụ ka e si akpali obi ọtụtụ nde mmadụ gburugburu ụwa.
Ụdị mmụta a—mmụta Alaeze—dabeere na Bible, na-akwado uru ọ bara na ụkpụrụ ya n’ihe banyere omume ọma. Ọ na-akụziri ndị mmadụ ịhụ ibe ha n’anya na ịkwanyere ha ùgwù n’agbanyeghị ebe ha si. (Jọn 13:34, 35) Ọ na-enyekwara ndị mmadụ aka irube isi na ndụmọdụ bụ́: “Kwụsịkwanụ ịbụ ndị a na-eme ka ha yie usoro ihe nke a, kama bụrụnụ ndị e nwoghara site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ, ka unu wee na-anwapụtara onwe unu ihe bụ́ uche Chineke nke ziri ezi na nke a na-anara nke ọma na nke zuru okè.” (Ndị Rom 12:2) Site n’ịhapụ ụdị ndụ ha na-ebibu ma jiri obi ụtọ na-eme ka ndụ ha kwekọọ n’iwu na ụkpụrụ nke ọchịchị Alaeze ahụ, ọtụtụ nde mmadụ achọtawo udo na obi ụtọ ugbu a ma nwee atụmanya na-egbukpepụ egbukepụ maka ọdịnihu.—Ndị Kọlọsi 3:9-11.
Ihe enyemaka pụtara ìhè n’inweta ịdị n’otu a zuru ụwa ọnụ bụ magazin a, bụ́ Ụlọ Nche. Site n’usoro nsụgharị a haziri ahazi na ngwá ọrụ ndị e ji ebipụta akwụkwọ n’ọtụtụ asụsụ, a na-ebipụta isiokwu ndị bụ́ isi nke Ụlọ Nche n’otu oge n’asụsụ 135, ihe karịkwara pasent 95 nke ndị na-agụ ya n’ụwa nile pụrụ ịmụ ya n’asụsụ ha n’otu oge ahụ.
Otu onye Mormon na-ede akwụkwọ dekọrọ ihe ịga nke ọma ndị kasị mma e nwere n’ozi ala ọzọ ma e wezụga nke chọọchị ya. O depụtara Ụlọ Nche na Teta!, ndị Ndịàmà Jehova na-ebipụta, dị ka magazin ndị kasị mma e ji ezisa ozi ọma ma kwuo, sị: “Ọ dịghị onye pụrụ ibo Ụlọ Nche na Teta! ebubo nke ịkwalite echiche nke onwe onye iju ya afọ—kama nke ahụ, ha na-eme ka ndị mmadụ mụrụ anya n’ụzọ m na-ahụtụbeghị n’akwụkwọ okpukpe ndị ọzọ. Ụlọ Nche na Teta! na-enye ume ọhụrụ n’ihi ihe ndị dị na ha bụ́ ndị dabeere n’ihe ndị bụ́ eziokwu, ndị e nyochara nke ọma, ndị dị irè bụ́ ndị na-emetụta ihe ndị na-eme eme taa.”
E nwere ọtụtụ ihe àmà na-egosi na Alaeze Chineke dị adị n’ezie ma na-arụ ọrụ n’ụzọ zuru ezu. Ndịàmà Jehova ji obi ụtọ na nrụsi ọrụ ike soro ndị agbata obi ha na-ekerịta “ozi ọma nke a nke alaeze,” na-akpọ ha òkù ịghọ ndị ọ ga-achị. (Matiu 24:14) Atụmanya dị otú ahụ ọ̀ na-amasị gị? Ị pụrụ inweta ngọzi ndị na-abịa site n’iso ndị ahụ a na-akụziri ụkpụrụ nke Alaeze ahụ, ndị na-agbalịkwa ibi ndụ kwekọro na ya akpakọrịta. Karịsịakwa, ị pụrụ inweta atụmanya nke ibi ndụ n’okpuru ọchịchị Alaeze ahụ n’ime ụwa ọhụrụ e kwere ná nkwa bụ́ nke ‘ezi omume gaje ibi n’ime ya.’—2 Pita 3:13.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 5 Maka ntụle zuru ezu, lee isi nke 10, “Alaeze Chineke Na-achị,” n’akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Ndịàmà Jehova bipụtara, peeji nke 90-97.
[Foto dị na peeji nke 4, 5]
Na 1914 mba nile mikpuru onwe ha n’agha ụwa
[Foto ndị dị na peeji nke 6]
Ọrụ enyemaka a rụrụ n’afọ ofufo bụ ihe àmà nke ịhụnanya Ndị Kraịst nọ n’ọrụ
[Foto dị na peeji nke 7]
Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa na-erite uru site n’otu usoro mmụta