Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị ka Jizọs bu n’uche mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Amalitewo m ịhụ Setan ka ọ dawororị ada dị ka àmụ̀mà site n’eluigwe”?

Jizọs ka họpụtasịrị ndị na-eso ụzọ 70 ma “zipụ ha abụọ abụọ ka ha buru ya ụzọ gaa n’obodo na n’ebe ọ bụla nke ya onwe ya gaje ịbịa.” Mgbe ndị na-eso ụzọ 70 ahụ lọghachiri, ha nọ na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ihe ịga nke ọma ha nwere n’ozi ha. “Onyenwe anyị, a na-edo ọbụna ndị mmụọ ọjọọ n’okpuru anyị site n’iji aha gị eme ihe,” ka ha kwuru. Mgbe ha kwuru nke ahụ, Jizọs kwuru, sị: “Amalitewo m ịhụ Setan ka ọ dawororị ada dị ka àmụ̀mà site n’eluigwe.”—Luk 10:1, 17, 18.

Na mbụ, ọ pụrụ iyi ka Jizọs ọ̀ na-ezo aka n’ihe meworo eme. Ma, afọ 60 ka Jizọs kwusịrị okwu ahụ dị n’elu, Jọn onyeozi meworo agadi jikwa otu ụdị okwu ahụ mee ihe, na-ede, sị: “Otú ahụ ka e si chụda dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ mbụ ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa dum mmadụ bi; a chụdara ya n’ụwa, chụdakwa ya na ndị mmụọ ozi ya.”—Mkpughe 12:9.

Mgbe Jọn dere okwu ndị ahụ, Setan ka bi n’eluigwe. Olee otú anyị si mara? Ọ bụ n’ihi na Mkpughe bụ akwụkwọ amụma, ọ bụghị akwụkwọ akụkọ ihe mere eme. (Mkpughe 1:1) N’ihi ya, n’oge Jọn, a chụdatabeghị Setan n’ụwa. N’ezie, ihe àmà na-egosi na nke a mere nwa oge ka e chisịrị Jizọs Eze nke Alaeze Chineke n’afọ 1914. *Mkpughe 12:1-10.

Gịnịzi mere Jizọs ji kwuo banyere nchụpụ Setan site n’eluigwe dị ka à ga-asị na o meela emee? Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-enye echiche na Jizọs nọ na-abara ndị na-eso ụzọ ya mba n’ihi ịnya isi n’ụzọ na-ezighị ezi. Ha kweere na ihe ọ na-ekwu, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, bụ: ‘Unu meriri ndị mmụọ ọjọọ, ma unu anyala isi. Setan nyara isi, nke ahụ dugakwara na ya ịda n’egbughị oge.’

Anyị apụghị ikwesi olu ike n’okwu a. Otú ọ dị, o yikarịrị ka ọ̀ ga-abụ na Jizọs so ndị na-eso ụzọ ya na-aṅụrị ọṅụ ma na-ezo aka n’ọdịda Setan ga-ada n’ọdịnihu. Karịa nke ọ bụla n’ime ndị na-eso ụzọ ya, Jizọs maara oké obi ọjọọ nke Ekwensu nke ọma. Cheedị ọṅụ Jizọs nwere mgbe ọ nụrụ na e doro ndị mmụọ ọjọọ dị ike n’okpuru ndị na-eso ụzọ ya na-ezughị okè! Mmeri a e meriri ndị mmụọ ọjọọ bụ nanị ihe atụ nke ụbọchị ka dị n’ihu bụ́ mgbe Jizọs, dị ka Maịkel onyeisi ndị mmụọ ozi, ga-ebuso Setan agha ma si n’eluigwe chụtuo ya n’ụwa.

Mgbe Jizọs kwuru na ọ hụrụ Setan ka ọ “dawororị ada,” ihe àmà na-egosi na ọ na-emesi ya ike na Setan ga-adarịrị. Nke a kwekọrọ n’amụma Bible ndị ọzọ, bụ́ ndị na-ekwu banyere ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu dị ka à ga-asị na ha emeelarị. Dị ka ihe atụ, rịba ama otú e si jiri okwu ndị na-egosi ihe ga-eme n’ọdịnihu na ndị na-egosi ihe meworo eme mee ihe n’amụma banyere Mezaịa ahụ n’Aịsaịa 52:13–53:12. O yikarịrị ka Jizọs ọ̀ na-egosipụta obi ike na nchụpụ a ga-achụpụ Setan site n’eluigwe ga-emezu dị ka uche Nna Ya si dị. Jizọs jikwa n’aka na n’oge nke Chineke, a ga-atụba Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’abis ma mesịa bibie ha kpamkpam.—Ndị Rom 16:20; Ndị Hibru 2:14; Mkpughe 20:1-3, 7-10.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Lee Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, isi nke 10, na Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! Isi nke 27, ndị Ndịàmà Jehova bipụtara.