Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Na-eme Ka Ndụ Nwee Ezi Nzube?

Gịnị Na-eme Ka Ndụ Nwee Ezi Nzube?

Gịnị Na-eme Ka Ndụ Nwee Ezi Nzube?

MGBE a jụrụ Jesse, bụ́ nwa akwụkwọ sekọndrị dị afọ 17, ajụjụ banyere ihe bụ́ nzube nke ndụ, ọ zara, sị, “Kporie nnọọ ndụ otú i nwere ike mgbe ị ka dị ndụ.” Suzie nwere echiche dị iche. “Ekweere m n’ezie na nzube nke ndụ bụ ihe i mere ya ka ọ bụrụ,” ka o kwuru.

Ọ̀ dịla mgbe i chere banyere ihe bụ́ nzube nke ndụ? È nwere otu nzube maka ihe nile a kpọrọ mmadụ? Ka ihe Suzie kwuru ò ziri ezi—na ndụ bụ n’ụzọ bụ́ isi ihe onye ọ bụla n’ime anyị mere ya ka ọ bụrụ? N’agbanyeghị otú ọha mmadụ anyị bi n’etiti ha nweruru ọganihu n’ụzọ nkà na ụzụ, ihe dị anyị n’ime yiri ka ọ̀ na-achọ ihe bụ́ nzube nke ndụ. N’oge ụfọdụ ná ndụ anyị, ihe ka ọtụtụ n’ime anyị na-ajụ, sị, ‘N’ihi gịnị ka anyị ji nọrọ n’ebe a?’

Sayensị ọgbara ọhụrụ agbalịwo ịza ajụjụ ahụ. Gịnị si na ya pụta? “Ozizi evolushọn apụghị ịgwa anyị ihe bụ́ nzube nke ndụ,” ka David P. Barash, bụ́ prọfesọ nkà mmụta akparamàgwà na nke ndụ ụmụ anụmanụ kwuru. Nye ndị ọkà mmụta ihe ndị dị ndụ bụ́ ndị kweere n’evolushọn, ihe ndị dị ndụ nwere nanị otu nzube: ịdịgide ndụ na ịmụba. N’ihi ya, Prọfesọ Barash na-atụ aro, sị: “N’eluigwe na ala nke na-enweghị nzube na nke na-adịghị enwe mmetụta banyere ọdịmma ndị mmadụ, ọ bụ ibu ọrụ dịịrị ụmụ mmadụ inye ndụ anyị nzube site ná nhọrọ ndị anyị ji aka anyị mara ụma na-eme.”

Isi Iyi nke Nzube

Mgbe ahụ, nke ahụ ọ̀ bụ nanị nzube e nwere ná ndụ—onye ọ bụla n’ime anyị ime ihe ọ chọrọ? Kama ịhapụ anyị nnọọ ka anyị na-awagharị n’enweghị ebe ndụ anyị chere ihu n’ụwa nke na-enweghị nzube, Bible ekpughewo eri ogologo oge na e nwere nzube anyị ji nọrọ n’ebe a. Ndụ anyị dị abụghị n’ihi ihe mberede mere na mbara igwe. A gwara anyị na Onye Okike ji ọtụtụ afọ kwadoo ụwa maka mmadụ ọ ga-eke. Ọ dịghị ihe mere na mberede. Ọ hụrụ nnọọ na ihe nile “dị mma nke ukwuu.” (Jenesis 1:31; Aịsaịa 45:18) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Chineke nwere nzube maka mmadụ.

Ma, ọ dị mma ịmara na Chineke ebughị ụzọ detuo ọdịnihu nke mmadụ ọ bụla, site n’itinye aka n’onwe ya ma ọ bụ site n’usoro ọzọ metụtara ndụ ha. Ọ bụ ezie na ihe anyị ketara site n’ọmụmụ na-enwe mmetụta n’ebe anyị nọ, anyị pụrụ ịchịkwa ihe ka ukwuu n’ihe anyị na-eme. Anyị nile nweere onwe anyị ịhọrọ ụzọ ndụ anyị ga-agbaso.

Ọ bụ ezie na onye ọ bụla n’ime anyị ga-ahọrọ ihe ọ ga-eji ndụ ya mee, ọ ga-abụ ihie ụzọ ịgụpụ Onye Okike n’atụmatụ ndị anyị na-eme. N’ezie, ọtụtụ achọpụtawo na e nwere ihe jikọrọ inwe ezi nzube ná ndụ na mmadụ na Chineke inwe mmekọrịta. E mere ka njikọ dị mkpa dị n’etiti Chineke na nzube anyị ná ndụ pụta ìhè n’aha aka Chineke, bụ́ Jehova, nke pụtara n’ụzọ nkịtị, “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ.” (Ọpụpụ 6:3; Abụ Ọma 83:18) Ya bụ na ọ na-emezu nkwa ya nile n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu, na-arụzukwa ihe ọ bụla o zubere ịrụ mgbe ọ bụla. (Ọpụpụ 3:14; Aịsaịa 55:10, 11) Cheedị banyere nke ahụ. Aha ahụ bụ́ Jehova bụ ihe mmesi obi ike nye anyị nile na ọ bụ Isi Iyi na-adịgide adịgide nke nzube bara uru ná ndụ.

Nanị ikwere na Onye Okike dị adị na-enwe mmetụta dị ukwuu n’otú mmadụ si ele ndụ anya. Linet dị afọ 19 na-ekwu, sị: “Ịhụ ihe nile magburu onwe ha Jehova kere na nzube ha na-egosi m na e nwekwara nzube e ji kee m.” Amber na-agbakwụnye, sị: “Mgbe ndị mmadụ na-ekwu banyere ‘ihe a na-amaghị ama,’ ọ na-echetara m mgbe nile na m maara. Ihe àmà na-egosi na Jehova dị adị dị nnọọ n’ihe ndị o meworo.” (Ndị Rom 1:20) N’ezie, ịmata na Onye Okike dị adị bụ otu ihe, ma ịzụlite ezi mmekọrịta n’etiti anyị na ya bụ ihe ọzọ.

Iso Chineke Bụrụ Enyi

N’ebe a kwa, Bible pụrụ inye aka. Amaokwu ya ndị mbụ na-enye ihe àmà doro anya na Jehova Chineke bụ Nna na-ahụ n’anya. Dị ka ihe atụ, o keghị Adam na Iv ma hapụ ha ka ha kọwa nkọ banyere onye ọ bụ. Kama nke ahụ, ha na ya kwurịtara okwu mgbe nile. Ọ hapụghị ha n’Iden ka ha chọwa ụzọ ha n’ụwa ma ya onwe ya achụsowa ihe ndị ọzọ. Kama, o nyere ha ntụziaka ndị a kapịrị ọnụ banyere ụzọ kasị mma isi bie ndụ. O nyere ha ọrụ na-enye afọ ojuju, o mekwara ndokwa nke ịnọgide na-ezi ha ihe. (Jenesis 1:26-30; 2:7-9) Nke a ọ́ bụghị ihe ị ga-atụ anya ya n’aka nna na-ahụ n’anya nke maara ọrụ ya? Chezienụ ihe nke ahụ pụtara. “Ịmara na Jehova kere ụwa ma kee anyị inwe ike ịnụ ụtọ ihe ndị o kere,” ka Denielle na-ekwu, “na-egosi m na ọ chọrọ ka anyị nwee obi ụtọ.”

Karịa nke ahụ, dị ka ezigbo nna ọ bụla, Jehova chọrọ ka ya na ụmụ ya nile nwee mmekọrịta chiri anya. Banyere nke a, Ọrụ 17:27 na-emesi anyị obi ike, sị: “Ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.” Ọ dị uru nke ahụ bara? Amber na-ekwu, sị: “Ịmata Jehova enyewo m obi ike na ọ dịghị mgbe m nọ nnọọ nanị m. N’agbanyeghị ihe merenụ, enwere m onye m pụrụ ichigharịkwuru mgbe nile.” Ọzọkwa, ka ị na-amata Jehova, ị ga-achọpụta na ọ dị obiọma, na-ekpe ikpe ziri ezi ma dị mma. Ị pụrụ ịdabere n’ebe ọ nọ. “Mgbe Jehova ghọrọ ezigbo enyi m,” ka Jeff na-ekwu, “amatara m na ọ dịghị nnọọ onye ọzọ ga-adị njikere ịkwado m karịa ya.”

N’ụzọ dị mwute, e kwuwo ọtụtụ ihe na-adịghị mma banyere Jehova. A tawo ya ụta maka ọtụtụ nhụjuanya nke ụmụ mmadụ na àgwà ọjọọ nke ndị okpukpe. E kwuwo na ọ bụ ya kpatara ụfọdụ arụrụala kasị njọ a rụtụrụla n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Ma Deuterọnọmi 32:4, 5 na-akọwa, sị: “Ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi. . . . Ha ebibiwo onwe ha, ọ bụghị nke ụmụ Ya ka ọrụ nke dị ha n’ahụ́ bụ.” N’ihi ya, iwu ji anyị inyocha ihe ndị bụ́ eziokwu n’onwe anyị.—Deuterọnọmi 30:19, 20.

E Mezuo Nzube Chineke

Otú ọ dị, n’agbanyeghị ihe anyị kpebiri, ọ dịghị ihe ga-egbochi Chineke imezucha nzube ya maka ụwa a na ihe a kpọrọ mmadụ. E kwuwerị, ọ bụ ya bụ Onye Okike. Gịnịzi bụ nzube ahụ? Jizọs Kraịst zoro aka na ya n’Ozizi Elu Ugwu ya mgbe o kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, ebe ọ bụ na ha ga-eketa ụwa.” Ka e mesịrị, ọ kọwaara onyeozi ya bụ́ Jọn na Chineke ekpebisiwo ike “ibibi ndị na-ebibi ụwa.” (Matiu 5:5; Mkpughe 11:18) N’ihi na Jizọs na Chineke nọ n’oge ọ na-eke ihe, ọ maara na site ná mmalite, ọ bụ nzube Chineke ime ka ezinụlọ mmadụ zuru okè biri n’elu ala ruo mgbe ebighị ebi n’ime paradaịs. (Jenesis 1:26, 27; Jọn 1:1-3) Chineke adịghịkwa agbanwe agbanwe. (Malakaị 3:6) “N’ezie dị ka M cheworo,” ka Chineke na-ekwe anyị nkwa ya, “otú a ka ọ ga-adị; na dị ka M zubeworo, nke ahụ ga-eguzosi ike.”—Aịsaịa 14:24.

N’oge anyị, Jehova amaliteworị ịtọ ntọala nke òtù ụmụ mmadụ dị n’otu nke dabeere, ọ bụghị n’anyaukwu na ọchịchọ onwe onye nke jupụtara n’ụwa anyị taa, kama n’ịhụnanya maka Chineke na ndị agbata obi. (Jọn 13:35; Ndị Efesọs 4:15, 16; Ndị Filipaị 2:1-4) Ọ bụ òtù ndị mmadụ na-eji ọchịchọ obi anọ na ya nke ndị mejupụtara ya bụ ndị nwere mmasị n’ọganihu na ndị na-anụ nnọọ ọkụ n’obi imezu nzube ha—ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke na-abịanụ tupu usoro ihe a abịa ná njedebe. (Matiu 24:14; 28:19, 20) N’ihe karịrị ala 230, Ndị Kraịst karịrị nde isii amalitelarị ifekọ ofufe ọnụ n’ịhụnanya, dị ka òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ dị n’otu.

Mee Ka Ndụ Gị Nwee Nzube

Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ndụ gị nwekwuo nzube, biko mara na Jehova Chineke na-akpọ gị òkù iso ndị ya—‘mba ya nke na-eme ezi omume’—kpakọrịta ugbu a. (Aịsaịa 26:2) Otú ọ dị, ị pụrụ ịnọ na-eche, sị, ‘Olee otú ndụ n’òtù Ndị Kraịst a na-adị? Àchọrọ m n’ezie iso na ya?’ Gee ntị n’ihe ụfọdụ ndị na-eto eto nwere ikwu:

Quentin: “Ọgbakọ bụụrụ m ebe nchebe pụọ n’ụwa. Ịmara na Jehova nọ ná ndụ m na-enyere m aka ịhụ na ọ dị adị ma chọọ ka m nwee obi ụtọ.”

Jeff: “Ọgbakọ bụ ebe kasị mma m pụrụ ịga maka agbamume. Ụmụnna m ndị nwoke na ndị nwanyị nọ n’ebe ahụ, na-akwado m ma na-aja m mma. Ha bụ n’ezie ndị ezinụlọ m gbasapụrụ agbasapụ.”

Linet: “Ọ dịghị ọṅụ ọzọ a pụrụ iji tụnyere nke ịhụ ka mmadụ nabatara eziokwu Bible ma kpebie ijere Jehova ozi. Nke a na-enye m nnọọ afọ ojuju ná ndụ.”

Cody: “Ndụ m agaghị aba uru ma e wezụga Jehova. Agaara m anọ na-awagharị n’enweghị ebe m chere ihu dị ka ọ dị ọtụtụ ndị ọzọ site n’otu ihe gaa n’ọzọ, na-agbalị ịchọta obi ụtọ ma ghara ịchọta ya. Kama nke ahụ, Jehova enyewo m ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa nke iso ya na-enwe mmekọrịta, nke ahụ na-emekwa ka ndụ m nwee nzube.”

Gịnị ma i mee nchọpụta n’onwe gị? Ị ga-achọpụta na site n’ịbịaru Onye Okike gị, bụ́ Jehova Chineke, nso, ị ga-achọta ezi nzube ná ndụ.

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

Iso Chineke na-enwe mmekọrịta na-eme ka ndụ anyị nwee nzube

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 29]

Foto NASA