Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Na-ekpughere Ndị Dị Umeala n’Obi Ebube Ya

Jehova Na-ekpughere Ndị Dị Umeala n’Obi Ebube Ya

Jehova Na-ekpughere Ndị Dị Umeala n’Obi Ebube Ya

“Ọkpụkpụ ọrụ nke obi umeala na egwu Jehova bụ akụ̀, na nsọpụrụ, na ndụ.”—Ilu 22:4.

1, 2. (a) Olee otú akwụkwọ Ọrụ Ndịozi si gosi na Stivin bụ “nwoke jupụtara n’okwukwe na mmụọ nsọ”? (b) Gịnị na-egosi na Stivin dị umeala n’obi?

STIVIN bụ “nwoke jupụtara n’okwukwe na mmụọ nsọ.” O ‘jupụtakwara n’amara na ike.’ Dị ka otu n’ime ndị mbụ na-eso ụzọ Jizọs, ọ nọ na-eme ihe ịrịba ama ndị dị ebube na oké ihe àmà n’etiti ndị mmadụ. N’otu oge, ndị ikom ụfọdụ biliri ịrụ ya ụka, “ma otú ọ dị ha apụghị iguzogide amamihe na mmụọ o ji na-ekwu okwu.” (Ọrụ 6:5, 8-10) O doro anya na Stivin bụ onye ji ịdị uchu na-amụ Okwu Chineke, o jikwa nkwuwa okwu gbachitere ya n’ihu ndị ndú okpukpe ndị Juu nke oge ya. Àmà zuru ezu ọ gbara, bụ́ nke e dekọrọ n’Ọrụ isi 7, na-agba akaebe na o nwere mmasị dị ukwuu ná mkpughe nke nzube Chineke.

2 N’adịghị ka ndị ndú okpukpe ahụ, bụ́ ndị ọnọdụ na ihe ọmụma ha mere ka ha chee na ha karịrị ndị nkịtị, Stivin dị umeala n’obi. (Matiu 23:2-7; Jọn 7:49) Ọ bụ ezie na ọ maara Akwụkwọ Nsọ nke ọma, o nwere nnọọ obi ụtọ inweta ọrụ nke ‘ikesa ihe oriri na tebụl’ ka ndịozi wee nwee ike itinye uche “n’ekpere na n’ozi nke okwu ahụ.” Stivin nwere aha ọma n’ebe ụmụnna nọ, n’ihi ya kwa, a họpụtara ya ịbụ otu n’ime ndị ikom asaa a gbaara ezi àmà bụ́ ndị ga-ahụ maka nkesa nri a a na-eme kwa ụbọchị. O ji umeala n’obi nakwere ọrụ ahụ.—Ọrụ 6:1-6.

3. Ngosipụta dị aṅaa nke obiọma Chineke na-erughịrị mmadụ ka Stivin hụrụ?

3 Jehova hụrụ ịdị umeala n’obi Stivin, tinyere ọnọdụ ime mmụọ na nguzosi ike n’ezi ihe ya. Mgbe Stivin nọ na-agbara ìgwè ndị ndú ndị Juu nwere obi ọjọọ nọ na Sanhedrin àmà, ndị na-emegide ya “hụrụ na ihu ya dị ka ihu mmụọ ozi.” (Ọrụ 6:15) Ihu ya dị ka nke onye ozi Chineke, na-enwe udo nke si n’aka Chineke nke ebube, bụ́ Jehova. Mgbe o jisịrị anyaike gbaara ndị Sanhedrin àmà, Stivin hụrụ ngosipụta dị ịrịba ama nke obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke. “N’ịbụ onye jupụtara na mmụọ nsọ, o legidere anya n’ime eluigwe ma hụ ebube Chineke, hụkwa Jizọs ka ọ na-eguzo n’aka nri Chineke.” (Ọrụ 7:55) Nye Stivin, ọhụụ a dị ịrịba ama mesighachiri ọkwá Jizọs dị ka Ọkpara Chineke na Mezaịa ahụ ike. O wusiri Stivin dị umeala n’obi ike ma mesie ya obi ike na o nwere ihu ọma Jehova.

4. Ole ndị ka Jehova na-ekpughere ebube ya?

4 Dị ka ọhụụ ahụ Stivin hụrụ na-egosi, Jehova na-ekpughere ndị na-atụ egwu Chineke bụ́ ndị di umeala n’obi ma jiri mmekọrịta ha na ya kpọrọ ihe ebube na nzube ya. “Ọkpụkpụ ọrụ nke obi umeala na egwu Jehova bụ akụ̀, na nsọpụrụ, na ndụ,” ka Bible na-ekwu. (Ilu 22:4) N’ihi ya, ọ dị oké mkpa ka anyị ghọta ihe ezi ịdị umeala n’obi bụ, otú anyị pụrụ isi zụlite àgwà a dị mkpa, na otú anyị si erite uru site n’igosipụta ya n’akụkụ nile nke ndụ.

Ịdị Umeala n’Obi—Àgwà Chineke

5, 6. (a) Gịnị bụ ịdị umeala n’obi? (b) Olee otú Jehova siworo gosipụta ịdị umeala n’obi? (ch) Olee otú ịdị umeala n’obi Jehova kwesịrị isi metụta anyị?

5 Ọ pụrụ iju ụfọdụ anya na Jehova Chineke, bụ́ onye kasị ihe nile elu na onye kasị dịrị ebube n’eluigwe na ala, bụ ihe nlereanya kasịnụ nke ịdị umeala n’obi. Eze Devid gwara Jehova, sị: “I nyewokwa m ọta nzọpụta Gị: aka nri Gị na-akwagidekwa m, umeala n’obi nke Gị na-emekwa m ka m baa ụba.” (Abụ Ọma 18:35) N’ịkọwa Jehova dị ka onye dị umeala n’obi, Devid ji okwu Hibru pụtara “mee ka e hulata” mee ihe. E wezụga okwu bụ́ “ịdị umeala n’obi,” okwu ndị ọzọ ha na okwu ahụ nwere njikọ bụ “ịdị ala,” “ịdị nwayọọ n’obi,” na “iwedata onwe onye ala.” Ya mere, Jehova gosipụtara ịdị umeala n’obi mgbe o wedatara onwe ya ala iji soro mmadụ ahụ na-ezughị okè bụ́ Devid nwee mmekọrịta ma jiri ya mere eze na-anọchi anya Ya. Dị ka ihe e dekwasịrị n’elu Abụ Ọma nke 18 na-egosi, Jehova chebere ma kwado Devid, na-anapụta ya “n’ọbụ aka ndị iro ya nile, na n’ọbụ aka Sọl.” Devid, n’aka nke ya, maara na ịdị ukwuu ma ọ bụ ebube ọ bụla ya pụrụ inwe dị ka eze dabeere na Jehova iji umeala n’obi agbachitere ya. Ịghọta nke a nyeere Devid aka ịnọgide na-adị umeala n’obi.

6 Gịnị banyere anyị? Jehova ahụwo na o kwesịrị ekwesị ịkụziri anyị eziokwu ahụ, ọ pụrụ ịbụkwa na o nyewo anyị ihe ùgwù ije ozi pụrụ iche site n’aka nzukọ ya, ma ọ bụ jiri anyị mee ihe n’ụzọ ụfọdụ iji mezuo uche ya. Olee otú ihe ndị a nile kwesịrị ịdị anyị? Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịdị umeala n’obi? Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị inwe ekele maka ịdị umeala n’obi Jehova ma zere ibuli onwe anyị elu, bụ́ nke na-eduga nnọọ n’ọdịda?—Ilu 16:18; 29:23.

7, 8. (a) Olee otú ịdị umeala n’obi Jehova si pụta ìhè n’ụzọ o si mesoo Manase? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova, nakwa Manase, si setịpụrụ anyị ihe nlereanya anyị ga-agbaso n’igosipụta ịdị umeala n’obi?

7 Ọ bụghị nanị na Jehova egosiwo ịdị umeala n’obi dị ukwuu site n’iso ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-enwe mmekọrịta, kamakwa o gosiwo na ya dị njikere imere ndị dị nwayọọ n’obi ebere, ọbụna na-ewelite, ma ọ bụ na-ebuli ndị wedatara onwe ha ala elu. (Abụ Ọma 113:4-7) Were ihe banyere Eze Manase nke Juda dị ka ihe atụ. O ji ọnọdụ ya dị ùgwù dị ka eze kwalite ofufe ụgha ma ‘mee ihe jọrọ njọ n’anya Jehova hie nne, ịkpasu ya iwe.’ (2 Ihe E Mere 33:6) N’ikpeazụ, Jehova tara Manase ahụhụ site n’ikwe ka eze Asiria chụtuo ya n’ocheeze ya. Mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, Manase ‘chọrọ ka ihu Jehova, bụ́ Chineke ya, dajụọ, wee huru ala nke ukwuu n’ihu Chineke,’ nke mere ka Jehova weghachi ya n’ocheeze ya na Jeruselem, Manase bịakwara mara na “Jehova, Ya onwe ya, bụ Chineke.” (2 Ihe E Mere 33:11-13) Ee, n’ikpeazụ, obi umeala Manase masịrị Jehova, bụ́ onye gosiziri umeala n’obi site n’ịgbaghara ya na ime ka ọ ghọghachi eze.

8 Njikere Jehova dị ịgbaghara na àgwà nchegharị Manase na-akụziri anyị ihe dị mkpa banyere ịdị umeala n’obi. Anyị kwesịrị iburu n’uche mgbe nile na otú anyị si emeso ndị mejọrọ anyị na àgwà anyị na-egosipụta mgbe anyị mere mmehie, pụrụ imetụta otú Jehova ga-esi emeso anyị. Ọ bụrụ na anyị ejiri ọchịchọ obi gbaghara ndị ọzọ mmehie ha ma jiri obi umeala nakwere mmejọ anyị, anyị pụrụ ịtụ anya na Jehova ga-emere anyị ebere.—Matiu 5:23, 24; 6:12.

A Na-ekpughere Ndị Dị Umeala n’Obi Ebube Chineke

9. Ịdị umeala n’obi ọ̀ bụ ihe àmà nke adịghị ike? Kọwaa.

9 Otú ọ dị, e kwesịghị ịghọtahie ịdị umeala n’obi na àgwà ndị ha na ya nwere njikọ dị ka ihe àmà nke adịghị ike ma ọ bụ ọchịchọ ịnabata ihe ọjọọ. Dị ka Akwụkwọ Nsọ na-egosi, Jehova dị umeala n’obi, n’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-ewe iwe ezi omume, na-egosipụtakwa ike dị ebube mgbe ọnọdụ e nwere chọrọ ka e mee otú ahụ. N’ihi ịdị umeala n’obi ya, Jehova na-elebara ndị dị nwayọọ n’obi anya imere ha ihe ọma ma ọ bụ na-echebara ha echiche n’ụzọ pụrụ iche, ebe ọ na-anọ ndị dị mpako n’ebe dị anya. (Abụ Ọma 138:6) Olee otú Jehova siworo gosi ndị ohu ya dị umeala n’obi nchebara echiche n’ụzọ pụrụ iche?

10. Gịnị ka Jehova na-ekpughere ndị dị umeala n’obi, dị ka e gosiri ná 1 Ndị Kọrint 2:6-10?

10 N’oge nke ya na site n’ụzọ ọ họọrọ isi agwa anyị okwu, Jehova ekpugheworo ndị dị umeala n’obi ọtụtụ ihe banyere mmezu nke nzube ya. Nye ndị ji mpako na-adabere, ma ọ bụ na-arapara n’echiche ụmụ mmadụ, ihe ndị a dị ebube nọgidere bụrụ ihe zoro ezo. (1 Ndị Kọrint 2:6-10) Ma ndị dị umeala n’obi, n’ịbụ ndị e nyeworo nghọta ziri ezi nke nzube Jehova, na-abụ ndị a na-akpali ito Jehova n’ihi na ha ji ebube ya na-akpali akpali kpọrọ ihe ọbụna karị.

11. Na narị afọ mbụ, olee otú ụfọdụ ndị si gosipụta na ha adịghị umeala n’obi, oleekwa otú nke a si metụta ha n’ụzọ dị njọ?

11 Na narị afọ mbụ, ọtụtụ ndị, gụnyere ụfọdụ ndị zọọrọ na ha bụ Ndị Kraịst, gosipụtara na ha adịghị umeala n’obi ma bụrụ ndị ihe Pọl onyeozi kpugheere ha banyere nzube Chineke mere ka ha sụọ ngọngọ. Pọl ghọrọ “onyeozi nye ndị mba ọzọ,” ma ọ bụghị n’ihi mba o si na ya, agụmakwụkwọ ya, afọ ndụ ya, ma ọ bụ ogologo oge ọ rụworo ọrụ ọma. (Ndị Rom 11:13) Ọtụtụ mgbe, ndị na-atụkwasị uche n’ihe anụ ahụ́ na-ele ihe ndị a anya dị ka ihe ndị na-ekpebi onye Jehova kwesịrị iji eme ihe. (1 Ndị Kọrint 1:26-29; 3:1; Ndị Kọlọsi 2:18) Otú ọ dị, Pọl bụ onye Jehova họọrọ n’ikwekọ n’obiọma Ya sitere n’ịhụnanya na nzube ezi omume Ya. (1 Ndị Kọrint 15:8-10) Ndị ahụ Pọl kọwara dị ka “ndịozi ọkasị mma,” nakwa ndị mmegide ndị ọzọ, jụrụ ịnakwere Pọl na nkọwa ya ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ. Adịghị umeala n’obi ha gbochiri ha inweta ihe ọmụma na nghọta nke ụzọ dị ebube Jehova si emezu nzube ya. Ka ọ ghara ịdị mgbe anyị ga-eleda ndị Jehova họọrọ iji emezu uche ya anya ma ọ bụ na-enwere ha ajọ mbunobi.—2 Ndị Kọrint 11:4-6.

12. Olee otú ihe nlereanya Mozis si egosi na ndị dị umeala n’obi na-enweta ihu ọma Jehova?

12 N’aka nke ọzọ, e nwere ọtụtụ ihe atụ ndị dị na Bible bụ́ ndị na-egosipụta otú e si eme ka ndị dị umeala n’obi hụperetụ ebube Chineke. Mozis, onye “dị umeala n’obi nke ukwuu” karịa mmadụ nile, hụrụ ebube Chineke ma soro ya nwee mmekọrịta chiri anya. (Ọnụ Ọgụgụ 12:3) Nwoke a dị umeala n’obi, bụ́ onye jere ozi afọ 40 dị ka onye ọzụzụ atụrụ dị ala, ma eleghị anya na-anọ ihe ka ukwuu n’ime ya n’Ala Dịịrị Banye na Mmiri nke Arebia, nwere nnọọ ihu ọma nke Onye Okike n’ọtụtụ ụzọ. (Ọpụpụ 6:12, 30) Site ná nkwado Jehova, Mozis ghọrọ ọnụ na-ekwuchitere mba Izrel na onye nhazi nke mba ahụ. Ya na Chineke n’onwe ya kparịtara ụka. Site n’otu ọhụụ, ọ hụrụ “ụdị Jehova.” (Ọnụ Ọgụgụ 12:7, 8; Ọpụpụ 24:10, 11) A gọzikwara ndị nakweere ohu na onye nnọchiteanya a dị umeala n’obi nke Chineke. N’ụzọ yiri nke ahụ, a ga-agọzi anyị ma ọ bụrụ na anyị anakwere ma na-erubere onye amụma ahụ ka Mozis ukwuu, bụ́ Jizọs, nakwa “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” bụ́ nke ọ họpụtara isi.—Matiu 24:45, 46; Ọrụ 3:22.

13. Olee otú e si kpugheere ndị ọzụzụ atụrụ dị umeala n’obi na narị afọ mbụ ebube Jehova?

13 Ole ndị ka ‘ebube Jehova gbukepụụrụ’ mgbe mmụọ ozi mara ọkwa ozi ọma banyere ọmụmụ nke ‘onye nzọpụta, onye bụ́ Kraịst Onyenwe anyị’? Ọ bụghị ndị ndú okpukpe dị mpako ma ọ bụ ndị nọ n’ọkwá dị elu kama ọ bụ ndị ọzụzụ atụrụ dị umeala n’obi bụ́ ndị “bi ebi n’ọhịa, na-echekwa ìgwè atụrụ ha nche n’abalị.” (Luk 2:8-11) Ndị a abụghị ndị e ji kpọrọ ihe nke ukwuu n’ihi nkà na ọrụ ha. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ ha ka Jehova rịbara ama ma họrọ ibu ụzọ gwa banyere ọmụmụ nke Mezaịa ahụ. Ee, Jehova na-ekpughere ndị dị umeala n’obi na-atụ egwu Chineke ebube ya.

14. Ngọzi ndị dị aṅaa sitere n’aka Chineke na-abịara ndị dị umeala n’obi?

14 Gịnị ka ihe atụ ndị a na-akụziri anyị? Ha na-egosi anyị na Jehova na-egosi ndị dị umeala n’obi ihu ọma ma na-ekpughere ha ihe ọmụma na nghọta nke nzube ya. Ọ na-ahọrọ ndị ọ pụrụ ịbụ na ha erughị ihe ụfọdụ ụmụ mmadụ tụrụ anya ha ma jiri ha na-eme ihe dị ka ụzọ isi gwa ndị ọzọ nzube ya ndị dị ebube. Nke a kwesịrị ịkpali anyị ịnọgide na-elegara Jehova, Okwu amụma ya, na nzukọ ya anya maka nduzi. Anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova ga-anọgide na-agwa ndị ohu ya dị umeala n’obi banyere mmezu nke nzube ya ndị dị ebube. Emọs onye amụma kwuru, sị: “Onyenwe anyị Jehova agaghị eme ihe, ma ọ bụrụ na O kpugheghị izu nzuzo Ya nye ndị ohu Ya, bụ́ ndị amụma Ya.”—Emọs 3:7.

Zụlite Ịdị Umeala n’Obi Ma Nweta Ihu Ọma Chineke

15. N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji na-agbalịsi ike ịnọgide na-adị umeala n’obi, oleekwa otú nke a si pụta ìhè n’ihe banyere Eze Sọl nke Izrel?

15 Iji nọgide na-enweta ihu ọma Chineke, anyị aghaghị ịnọgide na-adị umeala n’obi. Na mmadụ dịbu umeala n’obi apụtaghị na onye ahụ ga-anọgide dịrị umeala n’obi. Ọ dị mfe mmadụ ịkwụsị ịdị umeala n’obi ma malite ịdị mpako na ibuli onwe ya elu, bụ́ nke na-eduga na nganga na ọdịda. Sọl, bụ́ onye mbụ a họpụtara ịbụ eze Izrel, mere nnọọ otú ahụ. Mgbe mbụ a họpụtara ya, ọ dị ‘nta n’anya onwe ya.’ (1 Samuel 15:17) Otú ọ dị, mgbe ọ chịworo ruo nanị afọ abụọ, o mere ihe ná mpako. O leghaara ndokwa Jehova mere maka ịchụ àjà site n’aka Samuel onye amụma anya, o chepụtakwara ihe ngọpụ maka ime ihe na-erughịrị ya. (1 Samuel 13:1, 8-14) Nke a bụ mmalite nke usoro ihe omume ndị gosipụtara nnọọ na ọ dịghị umeala n’obi. Ihe si na ya pụta bụ enweghịzi mmụọ na ihu ọma Chineke, bụ́ nke mesịrị duga ya n’ịnwụ ọnwụ ihere. (1 Samuel 15:3-19, 26; 28:6; 31:4) Ihe mmụta dị na ya doro anya: Anyị aghaghị ịgbalịsi ike ịnọgide na-adị umeala n’obi ma na-edo onwe anyị n’okpuru ma bịanyụọ ọchịchọ ịdị mkpa n’anya onwe onye, si otú ahụ na-ezere omume mpako ọ bụla bụ́ ndị na-eme ka a kwụsị inwe ihu ọma Jehova.

16. Olee otú ịtụgharị uche ná mmekọrịta anyị na Jehova na nke anyị na ụmụ mmadụ ibe anyị pụrụ isi nyere anyị aka ịzụlite ịdị umeala n’obi?

16 Ọ bụ ezie na e depụtaghị ịdị umeala n’obi dị ka akụkụ nke mkpụrụ nke mmụọ Chineke, ọ bụ àgwà Chineke nke a na-aghaghị ịzụlite. (Ndị Galeshia 5:22, 23; Ndị Kọlọsi 3:10, 12) Ebe ọ bụ na ọ gụnyere ọnọdụ uche—ya bụ, otú anyị si ele onwe anyị na ndị ọzọ anya—ịzụlite ịdị umeala n’obi na-achọ mgbalị a kpachaara anya na-eme. Ichebasiri mmekọrịta anyị na Jehova na ụmụ mmadụ ibe anyị echiche ike na ịtụgharị uche na ha pụrụ inyere anyị aka ịnọgide na-adị umeala n’obi. N’anya Chineke, anụ ahụ́ nile na-ezughị okè dị ka ahịhịa ndụ nke na-eto ruo obere oge, mgbe ahụ kpọnwụọ. Ụmụ mmadụ dị ka ụkpara nkịtị dị n’ọhịa. (Aịsaịa 40:6, 7, 22) Ọ̀ dị ihe mere otu ahịhịa ga-eji dị mpako nanị n’ihi na ọ katụ ahịhịa ndị ọzọ ogologo? Ọ̀ dị ihe ga-eme ka otu ụkpara na-anya isi nanị n’ihi na ọ pụrụ ịmaru n’ebe dịtụ anya karịa ụkpara ndị ọzọ? Ọ bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya ichetụdị otú ahụ. Ya mere, Pọl onyeozi chetaara Ndị Kraịst ibe ya, sị: “Ònye na-eme ka ị dị iche n’ebe onye ọzọ nọ? N’ezie, olee ihe i nwere nke ị na-anataghị anata? Ma, ọ bụrụ na ị natara ya anata n’ezie, n’ihi gịnị ka i ji na-anya isi dị ka à ga-asị na ị nataghị ya anata?” (1 Ndị Kọrint 4:7) Ịtụgharị uche n’akụkụ Bible ndị dị ka ndị a pụrụ inyere anyị aka ịzụlite na igosipụta ịdị umeala n’obi.

17. Gịnị nyeere Daniel onye amụma aka ịzụlite ịdị umeala n’obi, gịnịkwa pụrụ inyere anyị aka ime otu ihe ahụ?

17 A kpọrọ onye amụma Hibru bụ́ Daniel “ihe a na-achọsi ike nke ukwuu” n’anya Chineke n’ihi “iweda” onwe ya ala, ya bụ, n’ihi umeala n’obi ya. (Daniel 10:11, 12) Gịnị nyeere Daniel aka ịzụlite umeala n’obi? Nke mbụ, ọ dabeere kpamkpam na Jehova, na-echigharịkwuru ya mgbe nile n’ekpere. (Daniel 6:10, 11) Tụkwasị na nke ahụ, Daniel bụ onye ji ịdị uchu na ezi obi na-amụ Okwu Chineke, bụ́ nke nyeere ya aka ilekwasị anya ná nzube dị ebube nke Chineke. Ọ dịkwa njikere ịnakwere adịghị ike nke ya, ọ bụghị nanị nke ndị ya. O nwekwara mmasị n’ezie n’ịkwalite ezi omume Chineke, ọ bụghị nke ya. (Daniel 9:2, 5, 7) Ànyị pụrụ ịmụta ihe site n’ihe nlereanya dị ịrịba ama nke Daniel ma gbalịsie ike ịzụlite na igosipụta ịdị umeala n’obi n’akụkụ nile nke ndụ anyị?

18. Nsọpụrụ dị aṅaa na-echere ndị na-egosipụta ịdị umeala n’obi taa?

18 “Ọkpụkpụ ọrụ nke obi umeala na egwu Jehova bụ akụ̀, na nsọpụrụ, na ndụ,” ka Ilu 22:4 na-ekwu. Ee, Jehova na-egosi ndị dị umeala n’obi ihu ọma, ihe ọ na-arụpụtakwa bụ nsọpụrụ na ndụ. Mgbe ọ fọrọ nke nta ka ọ kwụsị ozi ọ na-ejere Chineke ma mesịa bụrụ onye Jehova gbaziri echiche ya, ọbụ abụ bụ́ Esaf ji obi umeala kweta, sị: “Ị ga-eji ndụmọdụ Gị na-edu m, e mesịa Ị ga-ejikwa nsọpụrụ nara m.” (Abụ Ọma 73:24) Gịnị banyere taa? Nsọpụrụ dị aṅaa na-echere ndị na-egosipụta ịdị umeala n’obi? Tụkwasị n’iso Jehova enwe ezi mmekọrịta na nke na-enye obi ụtọ, ha pụrụ ilepụ anya n’ihu ịhụ mmezu nke okwu Eze Devid dere n’ike mmụọ nsọ: “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” Ọdịnihu dị ebube n’ezie!—Abụ Ọma 37:11.

Ị̀ Na-echeta?

• Olee otú Stivin si bụrụ ihe atụ nke onye dị umeala n’obi bụ́ onye Jehova kpugheere ebube Ya?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jehova Chineke siworo gosipụta ịdị umeala n’obi?

• Ihe atụ ndị dị aṅaa na-egosi na Jehova na-ekpughere ndị dị umeala n’obi ebube ya?

• Olee otú ihe nlereanya Daniel pụrụ isi nyere anyị aka ịzụlite ịdị umeala n’obi?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe dị na peeji nke 12]

Onye Dị Ike Ma Dị Umeala n’Obi

Ná mgbakọ Ndị Mmụta Bible (ndị a maara taa dị ka Ndịàmà Jehova) nwere na 1919 na Cedar Point, Ohio, U.S.A., J. F. Rutherford dị afọ 50, bụ́ onye na-elekọta ọrụ anyị mgbe ahụ, ji obi ụtọ wepụta onwe ya ije ozi dị ka onye na-enyere ndị ọbịa aka na họtel, na-ebu ibu ndị bịara mgbakọ ma na-eduga ha n’ọnụ ụlọ ha. N’ụbọchị ikpeazụ nke mgbakọ ahụ, ọ kpaliri nnọọ mmasị ndị bịaranụ dị 7,000 site n’ikwu, sị: “Ị bụ onye nnọchianya nke Eze kachasị ndị eze nile na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile, ị na-amara ndị mmadụ ọkwa . . . alaeze dị ebube nke Onyenwe anyị.” Ọ bụ ezie na Nwanna Rutherford bụ nwoke nwere nkwenye siri ike, bụ́ onye a maara maka nkwuwa okwu ya nakwa alaghị azụ ya n’ihe o kweere na ọ bụ eziokwu, ọ dịkwa umeala n’obi n’ezie n’anya Chineke, na-egosipụta nke ahụ mgbe nile n’ekpere ya n’ofufe ụtụtụ na Betel.

[Foto dị na peeji nke 9]

Stivin, bụ́ onye maara Akwụkwọ Nsọ nke ọma, ji obi umeala kesaa ihe oriri

[Foto dị na peeji nke 10]

Obi dị umeala nke Manase masịrị Jehova

[Foto dị na peeji nke 12]

Gịnị mere ka Daniel bụrụ “ihe a na-achọsi ike nke ukwuu”?