Ị̀ Na-echeta?
Ị̀ Na-echeta?
Ọ̀ masịwo gị ịgụ mbipụta Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Gịnị ma i lee ma ị̀ pụrụ ịza ajụjụ ndị na-esonụ?
• Gịnị bụ Complutensian Polyglot, gịnịkwa mere o ji dị ịrịba ama?
Ọ bụ Bible e biri ebi nke nwere ọtụtụ asụsụ na kọlụm ndị dịdebere onwe ha, bụ́ ihe odide kasị mma e nwere mgbe ahụ na Hibru, Grik na Latin, o nwekwara akụkụ ụfọdụ e dere n’Aramaic. Bible a nwere ọtụtụ asụsụ bụ nzọụkwụ gbara ọkpụrụkpụ n’ibipụta ihe odide ka zie ezie n’asụsụ ndị mbụ e ji dee Bible.—4/15, peeji nke 28-31.
• Olee otú ụmụ mmadụ pụrụ isi mee ka Chineke ṅụrịa?
Dị ka onye dị ndụ n’ezie, Jehova nwere ikike nke iche echiche, ime ihe, na inwe mmetụta. Ọ bụ “Chineke onye obi ụtọ,” na-enwekwa obi ụtọ n’imezu nzube ya. (1 Timoti 1:11; Abụ Ọma 104:31) Ka anyị na-amatakwu mmetụta Chineke, otú ahụ ka anyị ga na-amatakwu ihe anyị pụrụ ime iji mee ka obi ya ṅụrịa.—5/15, peeji nke 4-7.
• N’ihi gịnị ka Devid ji kwere ka nwunye ya bụ́ Maịkal nwee terafim?
Mgbe Eze Sọl mere atụmatụ igbu Devid, Maịkal nyeere ya aka ịgbalaga, na-atọgbọ ihe oyiyi yiri ka ọ̀ dị ka mmadụ n’elu ihe ndina. Ọ pụrụ ịbụ na o nwere terafim n’ihi na obi ya ezughị ezu n’ebe Chineke nọ. Ma ọ́ bụghị na Devid amaghị banyere ya, ya abụrụ na ọ gbachiri nkịtị n’ihi na Maịkal bụ nwa Eze Sọl. (1 Ihe E Mere 16:25, 26)—6/1, peeji nke 29.
• Olee isi ihe iwu Chineke ndị metụtara ọbara na-ezo aka na ya?
Site n’ihe Chineke kwuru ka Iju Mmiri ahụ gasịrị, n’Iwu Mozis, na n’iwu ahụ a na-achọta n’Ọrụ 15:28, 29, o zoro aka n’àjà ahụ e ji ọbara Jizọs wụsịrị chụọ. Ọ bụ nanị site n’ọbara ahụ ka anyị pụrụ inweta mgbaghara mmehie na iso Chineke dịrị n’udo. (Ndị Kọlọsi 1:20)—6/15, peeji nke 14-19.
• Ọrụ ebube Jizọs ole ka a kpọtụrụ aha na Bible?
Ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ na-ezo aka n’ihe dị ka ọrụ ebube 35 nke Jizọs. Ma a gwaghị anyị kpọmkwem ọrụ ebube ole Jizọs rụrụ, gụnyere ndị a na-edekọghị edekọ. (Matiu 14:14)—7/15, peeji nke 5.