Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụmụ Amaala Mexico Anụ Ozi Ọma Ahụ

Ụmụ Amaala Mexico Anụ Ozi Ọma Ahụ

Ụmụ Amaala Mexico Anụ Ozi Ọma Ahụ

NA November 10, 2002, otu ìgwè ndị Mixe, bụ́ ụmụ amaala obodo Mexico, gbakọtara na San Miguel, Quetzaltepec. Nke ahụ bụ obodo dị na steeti mara mma dị n’ebe ndịda bụ́ Oaxaca. Ìgwè ahụ nọ ná mgbakọ distrikti nke Ndịàmà Jehova. Ihe pụtara ìhè e mere n’usoro ihe omume nke ụtụtụ ahụ bụ ihe nkiri Bible.

Mgbe a malitere ịkpọ ihe nkiri Bible ahụ n’ígwè okwu, ọ tụrụ ọtụtụ ndị na-ege ntị n’anya. Ha malitere ịkụ aka, anya mmiri malitekwara ịgba ọtụtụ n’ime ha. E mere ihe nkiri ahụ n’asụsụ Mixe! Mgbe e mesịrị ya, ọtụtụ kwupụtara ekele miri emi ha nwere maka ngọzi a a na-atụghị anya ya. “Na nke mbụ ya, apụrụ m ịghọta ihe nkiri. O ruru m n’obi,” ka otu onye kwuru. “Ugbu a, apụrụ m ịnwụ n’obi ụtọ n’ihi na Jehova emewo ka m gee ihe nkiri n’asụsụ m,” ka onye ọzọ kwuru.

Ihe mere n’ụtụtụ ahụ bụ otu akụkụ nke mgbalị kpụ ọkụ n’ọnụ Ndịàmà Jehova malitere ime na nso nso a na Mexico iji were ozi ọma Alaeze ahụ jekwuru ụmụ amaala obodo ahụ.—Matiu 24:14; 28:19, 20.

Jehova Nụrụ Ekpere

E nwere ihe karịrị ụmụ amaala 6,000,000 na Mexico—ọnụ ọgụgụ zuru ezu ịghọ mba nke aka ha, mba nwere ọtụtụ ọdịbendị nke na-asụ asụsụ 62 dịgasị iche iche. Ihe karịrị 100,000 mmadụ na-asụ nke ọ bụla n’ime 15 n’ime asụsụ ndị ahụ. Ihe karịrị 1,000,000 ụmụ amaala ahụ adịghị asụ Spanish, bụ́ asụsụ bụ́ isi nke mba Mexico. A bịakwa n’ime ndị na-asụ Spanish, ọ pụrụ ịdịrị ọtụtụ mfe karị ịmụta eziokwu Bible n’asụsụ nke ha. (Ọrụ 2:6; 22:2) Ụfọdụ n’ime ha amụwo Bible, jirikwa ikwesị ntụkwasị obi na-agachi nzukọ Ndị Kraịst anya ruo ọtụtụ afọ, ma nghọta ha dị nnọọ ala. Ya mere, ịnụ ozi nke eziokwu ahụ n’asụsụ ha abụwo ihe ha na-etinye n’ekpere ruo oge ụfọdụ.

Iji merie ihe ịma aka ahụ, alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Mexico malitere ime ndokwa n’afọ 1999 ka a na-enwe nzukọ ọgbakọ n’asụsụ ụmụ amaala obodo ahụ. E hiwekwara ìgwè ndị nsụgharị dị iche iche. Ka ọ na-erule afọ 2000, e mere ihe nkiri mgbakọ distrikti n’asụsụ Maya, e mesịakwa, n’ọtụtụ asụsụ ndị ọzọ.

Nzọụkwụ ọzọ bụ ịsụgharị akwụkwọ Ndịàmà Jehova bụ́ ndị na-enye aka n’ịmụ Bible. Nke mbụ, a sụgharịrị broshuọ bụ́ Idi Ndu n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi! gaa n’asụsụ Huave, Maya, Mazatec, Totonac, Tzeltal, na Tzotzil. A sụgharịkwara akwụkwọ ndị ọzọ, tinyere mbipụta Maya nke ụdị Ozi Alaeze Anyị a na-ebipụtakarị. E mepụtawokwa kaseti ndị a na-egere egere nke akwụkwọ ụfọdụ. A na-edegharị broshuọ bụ́ Apply Yourself to Reading and Writing ka e wee nwee ike iji ya na-eme ihe n’ebe ahụ iji kụziere ụmụ amaala obodo ahụ ka e si agụ na ka e si ede n’asụsụ ha. A na-ebipụta akwụkwọ Bible ugbu a n’asụsụ 15 n’ime asụsụ ụmụ amaala obodo ahụ, a ka ga-ebipụtakwa akwụkwọ ndị ọzọ.

“Na-eme Ihe Nile Ha Nwere Ike Ime”

Ọrụ nsụgharị ahụ adịghị mfe. Otu ihe kpatara ya bụ na e nwechaghị akwụkwọ ọgụgụ n’asụsụ ụmụ amaala Mexico. Ọtụtụ mgbe, inweta akwụkwọ ọkọwa okwu abụwo ihe ịma aka. Ọzọkwa, ụfọdụ asụsụ ndị ahụ nwere ọtụtụ olumba. Dị ka ihe atụ, nanị n’asụsụ Zapotec, ọ dịkarịa ala e nwere olumba ise dịgasị iche iche. Olumba ndị a abịawo nnọọ dịrịta iche nke na ndị Zapotec si ebe dịgasị iche apụghị ịghọta ibe ha.

Ọzọkwa, n’ebe a na-enweghị ụkpụrụ ndị na-achịkwa asụsụ, ndị nsụgharị ahụ aghaghị iguzobe ndị nke ha. Nke a na-achọ ọtụtụ nnyocha na ịjụ ajụjụ. Ka a sịkwa ihe mere ọtụtụ n’ime ha ji nwee ụdị mmetụta Élida nwere, bụ́ onye so n’ìgwè ndị nsụgharị Huave! Ọ na-echeta, sị: “Mgbe a kpọrọ m òkù n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Mexico ịrụ ọrụ nsụgharị, enwere m mmetụta abụọ—ọṅụ na ụjọ.”

Ndị nsụgharị ahụ aghaghịkwa ịmụta nkà iji kọmputa eme ihe, ụzọ e si ahazi ọrụ, na ụzọ ndị e si eme nsụgharị. N’ezie, ọrụ ahụ abụworo ha nnọọ ihe ịma aka. Olee otú ha si ele ya anya? Gloria, bụ́ onye so n’ìgwè ndị nsụgharị Maya, na-azaghachi, sị: “Anyị nwere ọṅụ na-enweghị atụ nke ikere òkè n’ịsụgharị akwụkwọ Bible gaa n’asụsụ Maya, bụ́ asụsụ obodo anyị.” Otu onye nlekọta ná Ngalaba Nsụgharị kwukwara banyere ndị nsụgharị ahụ, sị: “Ọchịchọ ha nke inwe akwụkwọ Bible n’asụsụ ha siri nnọọ ike nke na ha na-eme ihe nile ha nwere ike ime iji merie ihe ịma aka ahụ.” Ọ̀ dịwo ihe siri na ya pụta?

“Jehova, I Meela!”

Ngọzi Jehova apụtawo ìhè n’ọrụ a na-arụ n’ubi nke ụmụ amaala obodo ahụ. Ọnụ ọgụgụ ndị na-abịa nzukọ Ndị Kraịst na mgbakọ dị iche iche amụbawo. Dị ka ihe atụ, n’afọ 2001, Ndịàmà 223 na-asụ Mixe zukọrọ ime Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst. Ma, ngụkọta nke ndị nile bịaranụ bụ mmadụ 1,674—ihe ji okpukpu asaa na ọkara karịa ọnụ ọgụgụ Ndịàmà ahụ!

Ụfọdụ ndị na-anabata eziokwu ahụ pụziri ịghọta ya nke ọma site ná mmalite. Mirna na-echeta ihe mere ya tupu a malite inwe nzukọ n’asụsụ Maya. “E mere m baptizim mgbe m mụsịrị Bible ruo ọnwa atọ,” ka ọ na-ekwu. “Amaara m na e kwesịrị ime m baptizim, ma aghaghị m ikwu na aghọtaghị m nnọọ eziokwu Bible nke ọma otú m kwesịrị. Echere m na ihe kpatara ya bụ na asụsụ m bụ Maya, adịghịkwa m aghọta asụsụ Spanish nke ọma. O were m oge iji ghọta eziokwu ahụ nke ọma.” Taa, ya na di ya nwere obi ụtọ iso n’ìgwè ndị nsụgharị Maya.

Nye ndị nile nọ n’ọgbakọ ndị ahụ, ọ bụụrụ ha ihe oké ọṅụ ịdị na-enweta akwụkwọ n’asụsụ nke ha. Mgbe e wepụtara broshuọ ahụ a sụgharịrị ọhụrụ bụ́ Idi Ndu n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi! n’asụsụ Tzotzil, otu nwanyị nke maliteworo ịga nzukọ Ndị Kraịst tụkwasịrị ya n’obi ya ma tie, sị: “Jehova, I meela!” Akụkọ ndị a na-enweta na-egosi na ọtụtụ ndị a na-amụrụ Bible enwewo ọganihu ngwa ngwa karị ruo n’ịbụ ndị e mere baptizim, a na-eme ka ndị nkwusa na-adịghị ejekwa ozi maliteghachi ije ozi, ọtụtụ ụmụnna nwoke Ndị Kraịst na-enwezikwa mmetụta nke ịbụ ndị ruru eru ịnakwere ibu ọrụ n’ọgbakọ. Ụfọdụ ndị nwe ụlọ na-enwekwu ọchịchọ ịnara akwụkwọ e ji amụ Bible n’asụsụ nke ha na ịmụ ya.

N’otu oge, otu Onyeàmà gara iduzi ọmụmụ Bible, ma onye ọ na-amụrụ ihe anọghị n’ụlọ. Mgbe di ya pụtara n’ọnụ ụzọ, Onyeàmà ahụ kwuru ka ya gụọrọ ya otu broshuọ. “Achọghị m ihe ọ bụla,” ka ọ zaghachiri. Nwanna nwanyị ahụ ji asụsụ Totonac gwa ya na e ji asụsụ ha dee broshuọ ahụ. Mgbe nwoke ahụ nụrụ ya, o bupụtara bench ma nọdụ ala. Ka nwanna nwanyị ahụ nọ na-agụpụtara ya broshuọ ahụ, ọ nọgidere na-asị, “Nke ahụ bụ eziokwu. Ee, nke ahụ bụ eziokwu.” Ọ na-abịazi nzukọ Ndị Kraịst ugbu a.

Na Yucatán, di nke otu Onyeàmà megidere eziokwu ahụ, na-etikwa ya ihe mgbe ụfọdụ o si nzukọ lọta. Mgbe a malitere inwe nzukọ n’asụsụ Maya, o kpebiri ịkpọ di ya òkù ịbịa nzukọ. Ọ bịara ma nụ ụtọ nzukọ ndị ahụ n’ezie. Ugbu a, ọ na-agachizi nzukọ anya, a na-amụrụ ya Bible, ọ baghịkwa uru ikwu na ọ naghịzi eti nwunye ya ihe.

Otu nwoke nke na-asụ Totonac gwara Ndịàmà abụọ na ya ekpetụbeghị ekpere n’ihi na onye ụkọchukwu ndị Katọlik gwara ya na Chineke na-anụ nanị ekpere e kpere n’asụsụ Spanish. N’ezie, ọ na-akwụ onye ụkọchukwu ahụ ụgwọ ka o wee na-ekpechitere ndị Totonac ekpere. Ndịàmà ahụ kọwaara ya na Chineke na-anụ ekpere n’asụsụ nile, ha nyekwara ya broshuọ n’asụsụ Totonac bụ́ nke o ji ọṅụ dị ukwuu nara.—2 Ihe E Mere 6:32, 33; Abụ Ọma 65:2.

“Kualtsin Tajtoua”

N’ịbụ ndị ihe omume ndị a tọrọ ụtọ nke ukwuu, ọtụtụ n’ime ndị nkwusa Alaeze na-agbalị ịmụta otu asụsụ ụmụ amaala ahụ ma ọ bụ inwetakwu ihe ọmụma banyere otu n’ime ha. Nke a bụ nnọọ ihe otu onye nlekọta sekit nke na-eleta ọgbakọ ise na-asụ asụsụ Nahuatl n’ebe ugwu Puebla na-eme. Ọ na-akọ, sị: “Ụmụaka ndị na-arahụ ụra ná nzukọ n’oge mbụ na-amụzi anya ma na-ege ntị nke ọma mgbe m na-ekwu okwu n’asụsụ Nahuatl. Mgbe otu nzukọ gbasasịrị, otu nwatakịrị nwoke dị afọ anọ bịakwutere m ma kwuo, sị: ‘Kualtsin tajtoua’ (ị ma ekwu okwu). Nke ahụ mere ka m chee na mgbalị ahụ kwesịrị ya.”

Ee, ubi nke ndị na-asụ asụsụ ụmụ amaala “achawo” n’ezie, a gbawokwa ndị nile na-ekere òkè na ya ume nke ukwuu. (Jọn 4:35) Roberto, bụ́ onye rụrụ ọrụ n’ịhazi ìgwè ndị nsụgharị dị iche iche, chịkọtara ya n’okwu ndị a: “Ọ bụwo ahụmahụ a na-agaghị echezọ echezọ ịhụ ka anya mmiri nke ọṅụ na-agba ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị n’anya ka ha na-ege ntị n’eziokwu ahụ n’asụsụ obodo ha ma na-aghọta ya. Iche banyere nke a na-eri m ọnụ.” Obi abụọ adịghị ya na inyere ndị a nwere obi eziokwu aka ịdịnyere Alaeze ahụ na-emekwa ka obi Jehova ṅụrịa.—Ilu 27:11.

[Igbe dị na peeji nke 10, 11]

Ka Anyị Kọwaara Gị Ụfọdụ n’Ime Ndị Nsụgharị Ahụ

● “Ndị mụrụ m kụziiri m eziokwu ahụ site na nwa ọhụrụ. N’ụzọ dị mwute, mgbe m dị afọ 11, papa m hapụrụ ọgbakọ Ndị Kraịst. Mgbe afọ abụọ gasịrị, mama m gbahapụrụ anyị. N’ịbụ onye kasị okenye n’ime ụmụ ise, eweghaara m ọrụ mama m, ọ bụ ezie na m ka na-aga akwụkwọ.

“Anyị nwetara nkwado ịhụnanya nke ụmụnna ime mmụọ anyị ndị nwoke na ndị nwanyị, ma ihe siiri anyị ike. Mgbe ụfọdụ, ana m eche, sị: ‘Gịnị mere ihe a ji na-eme m? Aka m bụ nnọọ nwata!’ Ọ bụ nanị site n’enyemaka Jehova ka m nagidere ya. Mgbe m gụsịrị kọleji, aghọrọ m onye ozi oge nile, nke ahụ nyekwaara m aka nke ukwuu. Mgbe e hiwere ìgwè ndị nsụgharị Nahuatl, a kpọrọ m isonye na ya.

“Papa m alaghachiwo n’ọgbakọ ugbu a, ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị m tọrọ na-ejekwara Jehova ozi. Ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova eruwo nnọọ mgbalị m tinyere maka ya. Ọ gọziwo ezinụlọ m nke ukwuu.”—Alicia.

● “Otu nwa klas m bụ́ Onyeàmà kwuru okwu banyere otú ndụ si malite. Anọghị m na klas mgbe a kụziri ya, ma ụjọ na-atụ m ma m̀ ga-agafekwa n’ule, n’ihi ya arịọrọ m ya ka ọ kọwaara m isiokwu ahụ. Anọwo m na-eche mgbe nile ihe mere mmadụ ji na-anwụ anwụ. Mgbe o nyere m akwụkwọ Creation * ma kwuo ka ọ mụwara m Bible, ekwetara m. Nzube na ịhụnanya nke Onye Okike metụrụ m n’ahụ́ nke ukwuu.

“Mgbe m gasịrị akwụkwọ, enwetara m ohere nke ịghọ onye nkụzi nke asụsụ abụọ, Spanish na Tzotzil. Ma nke a gaara achọ ịkwaga n’ebe dị anya, iji ngwụsị izu na-aga akwụkwọ, na ịgha nzukọ Ndị Kraịst. Kama nke ahụ, arụrụ m ọrụ dị ka onye na-edo blọk. Mkpebi m mere amasịtụghị papa m, bụ́ onye na-abụghị Onyeàmà. N’ikpeazụ, mgbe m na-eje ozi dị ka onye ozi ọsụ ụzọ, e hiwere otu ìgwè ga na-asụgharị akwụkwọ Bible gaa n’asụsụ Tzotzil. A kpaliri m isonyere ha.

“Apụrụ m ịhụ na ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị inwe akwụkwọ n’asụsụ nke ha na-eme ka ha nwee mmetụta nke ịbụ ndị e ji kpọrọ ihe na ndị a kwanyeere ùgwù. Nke ahụ na-enye afọ ojuju. Enwere m mmetụta nke ịbụ onye e nyere ihe ùgwù dị ukwuu n’ihi ọrụ a e nyere m.”—Humberto.

● “Mgbe m dị afọ isii, mama m gbahapụrụ anyị. Mgbe m nọ n’afọ iri na ụma, papa m malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ ihe. Otu ụbọchị, otu nwanna nwanyị kwuru ka ọ mụwara m Bible nke gụnyere ndụmọdụ maka ndị na-eto eto. Dị ka onye nọ n’afọ iri na ụma nke na-enweghị nne, echere m na nke a bụ kpọmkwem ihe dị m mkpa. E mere m baptizim mgbe m dị afọ 15.

“N’afọ 1999 ndị ajọ mmadụ bụ́ ndị chọrọ ịnara papa m ala ya gburu ya. Uche kpaghasịrị m. Enwere m oké ịda mbà n’obi ma chee na apụghịzi m ịdị ndụ. Ma anọgidere m na-ekpegara Jehova ekpere maka ume. Onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na nwunye ya gbara m ume nke ukwuu. N’oge na-adịghị anya, aghọrọ m onye ọsụ ụzọ oge nile.

“N’otu oge, ahụrụ m ụfọdụ mmadụ bụ́ ndị jeworo ije ruo ihe dị ka awa isii nanị iji gere okwu ihu ọha ga-ewe minit 20 n’asụsụ Totonac, ọ bụ ezie na akụkụ ndị ọzọ nke nzukọ ahụ bụ n’asụsụ Spanish, bụ́ nke ha na-adịghị aghọta. N’ihi ya, enwere m obi ụtọ mgbe a kpọrọ m inye aka n’ịsụgharị akwụkwọ Bible gaa n’asụsụ Totonac.

“Ana m agwabu papa m na enwere m ọchịchọ siri ike ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova. Ọ gwara m na nke a agaghị adịrị nwata nwanyị na-alụghị di dị ka m mfe. Lee obi ụtọ ọ ga-enwe ma ọ bịa ná mbilite n’ọnwụ ma chọpụta na m mechara mee otú ahụ, na-asụgharị akwụkwọ Bible gaa n’asụsụ anyị!”—Edith.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 28 Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation? nke Ndịàmà Jehova bipụtara n’afọ 1985.

[Foto dị na peeji nke 9]

Ndị òtù ìgwè nsụgharị Tzotzil na-ekwurịta banyere okwu siiri ha ike nsụgharị