Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ezi Ndụmọdụ Ọ̀ Dị Mkpa?

Ezi Ndụmọdụ Ọ̀ Dị Mkpa?

Ezi Ndụmọdụ Ọ̀ Dị Mkpa?

TAA, ọtụtụ mmadụ kweere na ha pụrụ ịma ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ nakwa na ha nweere onwe ha ime ihe ọ bụla masịrị ha. Ndị ọzọ na-ekwu na ihe ọ bụla dị mma ma ọ bụrụhaala na ọ na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. Ọ na-enwe mmetụta dị njọ n’alụmdi na nwunye na ndụ ezinụlọ, bụ́ ihe ndị e leworo anya eri ogologo oge dị ka ntọala nke ọha mmadụ.—Jenesis 3:5.

Tụlee ihe banyere Verónica, * bụ́ onye bi na Mexico. Ọ na-akọ, sị: “Mgbe anyị lụworo di na nwunye ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 15, di m gwara m na ya na nwanyị ọzọ na-eme enyi. O kwuru na ebe ọ bụ na nwanyị a bụ nwa agbọghọ karịa m ma na-eme ya obi ụtọ karị na ya agaghị ahapụ ya. Ọ wụrụ m akpata oyi na ezigbo enyi m agaghịzi anọnyere m ọzọ. M na-echebu na ọnwụ nke ndị anyị hụrụ n’anya bụ ihe kasị akpata ihe mgbu. Ma nye m, ịkwa iko nke di m na-egbu m mgbu ọbụna karị n’ihi na ọ bụghị nanị na onye m hụrụ n’anya nke ukwuu hapụrụ m kama ọ nọgidere na-eme ihe na-agbawa m obi.”

E nwekwara otu nwoke gbara afọ 22 bụ́ onye gbaworo alụkwaghịm nke nwere otu nwa nwoke ma ọ dịghị njikere ịnakwere ibu ọrụ ya dị ka nna. Ọ na-atụ anya ka nne ya na-elekọta ya na nwa ya. Ọ bụrụ na nne ya emezughị ihe nile ọ chọrọ, ọ na-ewe oké iwe ma na-akparị ya, dị nnọọ ka nwa na-enweghị ezi àgwà. Nne ya amakwaghị ihe ọ ga-eme n’ihi àgwà mkparị dị otú ahụ.

Ọnọdụ ndị a abụghị ihe ndị a na-adịghị ahụkebe. Nkewa na alụkwaghịm a na-eme n’ụlọikpe na-arịwanye elu n’ebe nile. Ọtụtụ ụmụaka na-ahụ ka otu n’ime ndị mụrụ ha na-ahapụ ụlọ iji malite ndụ ọhụrụ. Ụfọdụ ndị na-eto eto adịghị akwanyere ndị ọzọ ùgwù, gụnyere ndị mụrụ ha, ha na-etinyekwa aka n’omume ndị a na-agatụghị echeta n’echiche n’oge ndị gara aga. Ịnwale mmekọahụ, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, mwakpo sitere n’aka ndị ntorobịa na ụmụaka igbu ndị nkụzi ma ọ bụ ndị nne na nna ha aghọwo ihe a na-ahụkarị n’ọtụtụ ala. Ị pụkwara ịhụwo na ọzụzụ nke ụmụaka na alụmdi na nwunye abụghị nanị akụkụ ndị a na-enwe ihe isi ike na ha n’ụwa nke taa.

Ka anyị na-ahụ ihe ndị a na-emenụ, anyị pụrụ ịdị na-eche ihe meworo ọha mmadụ. Ọ bụrụ n’ezie na ndị mmadụ ma ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ, gịnị mere na e dozibeghị ọtụtụ nsogbu? È nwere mkpa maka ezi ndụmọdụ? È nwere isi iyi nke ndụmọdụ bara uru dị otú ahụ, nke gosiworo onwe ya ịbụ ihe a pụrụ ịtụkwasị obi? Ọ bụ ezie na ọtụtụ na-ekwu na ha kwere na Chineke na Okwu ya e dere ede, nke a eyighị ka ọ̀ na-emetụta mkpebi ha. Ma uru ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ irite mgbe anyị na-achọ ma na-anata ndụmọdụ site n’aka Chineke? Ka anyị tụlee nke ahụ n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanweela aha ahụ.