Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị A Kpọrọ Asị N’enweghị Ihe Kpatara Ya

Ndị A Kpọrọ Asị N’enweghị Ihe Kpatara Ya

Ndị A Kpọrọ Asị N’enweghị Ihe Kpatara Ya

“Ha kpọrọ m asị n’enweghị ihe kpatara ya.”—JỌN 15:25.

1, 2. (a) N’ihi gịnị ka o ji eju ụfọdụ anya mgbe e kwugidere Ndị Kraịst, ma n’ihi gịnị ka okwu ndị dị otú ahụ na-ekwesịghị iji ju anyị anya? (b) Nkọwa dị aṅaa nke okwu ahụ bụ́ “ịkpọasị” ka anyị ga-atụle n’isiokwu a? (Lee ihe odide ala ala peeji.)

NDỊÀMÀ JEHOVA na-agbalịsi ike ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị a na-achọta n’Okwu Chineke. N’ihi ya, ha nwere aha ọma n’ọtụtụ ala. Otú ọ dị, a kọwahiewo ha mgbe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, otu onye ọrụ gọọmenti n’obodo St. Petersburg, Russia, chetara, sị: “E gosiri anyị Ndịàmà Jehova dị ka otu ịrọ òtù nzuzo nọ n’ọchịchịrị ma na-egbusịsị ụmụaka na onwe ha.” Mgbe o sosịrị Ndịàmà Jehova rụkọọ ọrụ n’ihe metụtara otu mgbakọ mba nile, otu onye ọrụ ahụ kwupụtara, sị: “Ugbu a ana m ahụ ndị dị ka ndị ọzọ, ndị nwere ihu ọchị . . . Ha dị udo dịkwa jụụ, ha hụkwara ibe ha n’anya nke ukwuu.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Amaghị m nnọọ ihe mere ndị mmadụ ji agha ụgha ndị dị otú ahụ banyere ha.”—1 Pita 3:16.

2 Ọ dịghị atọ ndị ohu Chineke ụtọ ịbụ ndị a na-ekwutọ dị ka ndị na-eme ihe ọjọọ, ma ọ dịghị eju ha anya mgbe ndị mmadụ na-ekwugide ha. Jizọs buru ụzọ dọọ ụmụazụ ya aka ná ntị, sị: “Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, unu mara na ọ kpọwo m asị tupu ọ kpọọ unu asị. . . . Ọ bụ ka okwu ahụ wee mezuo, bụ́ nke e dere n’Iwu ha, sị, ‘Ha kpọrọ m asị n’enweghị ihe kpatara ya.’” * (Jọn 15:18-20, 25; Abụ Ọma 35:19; 69:4) Tupu mgbe ahụ, ọ gwawo ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụ na ndị mmadụ akpọwo onyeisi ezinụlọ Bielzebọb, ruo ókè hà aṅaa ka ha ga-akpọ ya ndị ezinụlọ ya karị?” (Matiu 10:25) Ndị Kraịst ghọtara na idi nkọcha dị otú ahụ bụ akụkụ nke “osisi ịta ahụhụ” ha nakweere mgbe ha ghọrọ ụmụazụ Kraịst.—Matiu 16:24.

3. Ruo ókè ha aṅaa ka a kpagbuworo ndị na-efe ezi ofufe?

3 Ọ dịwo anya mkpagbu nke ndị na-efe ezi ofufe malitere, laa azụ n’oge “onye ezi omume bụ́ Ebel.” (Matiu 23:34, 35) Ọ bụghị ihe mere nanị ugboro ole na ole. Jizọs kwuru na ụmụazụ ya ga-abụ ndị ‘mmadụ nile ga-akpọ asị’ n’ihi aha ya. (Matiu 10:22) Ọzọkwa, Pọl onyeozi dere na ndị ohu Chineke nile—gụnyere onye ọ bụla n’ime anyị—kwesịrị ịtụ anya na a ga-akpagbu ha. (2 Timoti 3:12) Gịnị kpatara nke a?

Onye Na-akpata Ịkpọasị Na-enweghị Ihe Kpatara Ya

4. Olee otú Bible si ekpughe onye na-akpata ịkpọasị nile na-enweghị ihe kpatara ha?

4 Okwu Chineke na-ekpughe na site ná mmalite, e nwewo onye a na-adịghị ahụ anya na-akpata ịkpọasị ahụ. Tụlee ihe banyere ogbugbu e ji obi ịta mmiri gbuo nwoke mbụ ahụ nwere okwukwe, bụ́ Ebel. Bible na-ekwu na nwanne ya nwoke na-egbu ọchụ, bụ́ Ken, “sitere n’ajọ onye ahụ,” bụ́ Setan Ekwensu. (1 Jọn 3:12) Ken gosipụtara àgwà Setan, Ekwensu jikwa ya mee ihe iji mezuo atụmatụ ọjọọ ya. Bible na-ekpughekwa òkè Setan keere n’ajọ mwakpo a wakporo Job na Jizọs Kraịst. (Job 1:12; 2:6, 7; Jọn 8:37, 44; 13:27) Akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe gbara onye na-akpata mkpagbu nke ụmụazụ Jizọs n’anwụ, na-ekwu, sị: “Ekwensu ga-anọgide na-atụba ụfọdụ n’ime unu n’ụlọ mkpọrọ ka e wee lee unu ule n’ụzọ zuru ezu.” (Mkpughe 2:10) Ee, ọ bụ Setan na-akpata ịkpọasị nile na-enweghị ihe kpatara ha a kpọrọ ndị Chineke.

5. Gịnị kpatara asị Setan kpọrọ ndị na-efe ezi ofufe?

5 Gịnị kpatara asị Setan kpọrọ ndị na-efe ezi ofufe? Na nkata ọ kpara bụ́ nke na-egosi oké mpako ya, Setan doro onwe ya megide “Eze mgbe ebighị ebi,” bụ́ Jehova Chineke. (1 Timoti 1:17; 3:6) Ọ na-azọrọ na ọchịchị Chineke na-amachibido ihe o kere eke iwu n’ụzọ na-enweghị isi nakwa na ọ dịghị onye ji obi ọcha ejere Jehova ozi, na ndị mmadụ na-eme otú ahụ nanị n’ihi uru onwe onye. Setan zọọrọ na ọ bụrụ na e nye ya ohere ile ụmụ mmadụ ule, na ya pụrụ ime ka ha nile kwụsị ijere Chineke ozi. (Jenesis 3:1-6; Job 1:6-12; 2:1-7) Site n’ikwugide Jehova dị ka onye mmegbu, onye ụgha, na onye dara ada, Setan na-agbalị iguzobe onwe ya dị ka onye na-ama ọbụbụeze Jehova aka. N’ihi ya, ọ bụ ọchịchọ ya nke ịbụ onye a ga-efe ofufe kpatara o ji eweso ndị ohu Chineke iwe.—Matiu 4:8, 9.

6. (a) Olee otú ihe iseokwu banyere ọbụbụeze Jehova si metụta anyị n’otu n’otu? (b) Olee otú ịghọta ihe iseokwu a si enyere anyị aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe? (Lee igbe, peeji nke 16.)

6 Ị̀ hụrụ otú ihe iseokwu a si metụta ndụ gị? Dị ka ohu Jehova, eleghị anya, ị chọpụtawo na ọ bụ ezie na ime uche Chineke na-achọ mgbalị siri ike, abamuru ndị dị n’ime nke ahụ dị ukwuu. Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na ọnọdụ gị ná ndụ emee ka o siere gị ike, ọbụna bụrụ ihe na-egbu mgbu nye gị ịnọgide na-erubere iwu na ụkpụrụ Jehova isi? Gịnịkwa ma o yie ka ị dịghị erite uru ọ bụla site n’ime otú ahụ? Ị̀ ga-ekwubi na ịnọgide na-ejere Jehova ozi abaghị uru? Ka ịhụnanya maka Jehova na iji àgwà ya ndị miri emi kpọrọ ihe hà ga-akpali gị ịnọgide na-eje ije n’ụzọ ya nile? (Deuterọnọmi 10:12, 13) Site n’inye Setan ohere iwetara anyị ihe isi ike ụfọdụ, Jehova enyewo onye ọ bụla n’ime anyị ohere inye azịza nke ya maka ihe ịma aka Setan.—Ilu 27:11.

“Mgbe Ndị Mmadụ Na-akọcha Unu”

7. Gịnị bụ otu ụzọ Ekwensu ji eme ihe iji nwaa ime ka anyị gbakụta Jehova azụ?

7 Ka anyị tụlezie nke ọma karị otu n’ime ụzọ aghụghọ ndị Setan ji eme ihe ná mgbalị ya ịnwapụta ebubo ndị o boro Jehova na ndị ohu ya—ojiji ọ na-eji nkọcha na-abụghị eziokwu eme ihe. Jizọs kpọrọ Setan “nna nke ụgha.” (Jọn 8:44) Aha nkọwa ahụ bụ́ Ekwensu, nke pụtara “Onye Nkwutọ,” na-eme ka a mata ya dị ka onye mbụ kwutọrọ Chineke, okwu Ya bara uru na aha nsọ Ya. Ekwensu na-eji mmegharị anya, ebubo ụgha, na ụgha chara acha ama ọbụbụeze Jehova aka, ọ na-ejikwa otu ụzọ ndị ahụ ekwugide ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi. Site n’iwetara Ndịàmà a nkọcha, ọ pụrụ ọbụna ime ka ule tara akpụ sikwuoro ha ike odidi.

8. Olee otú Setan si wetara Job nkọcha, mmetụta dịkwa aṅaa ka o nwere?

8 Tụlee ihe dakwasịrị Job, onye aha ya pụtara “Onye A Na-ebuso Iro.” Tụkwasị n’ịkpata mfu nke ihe ndị Job ji biri, ụmụ ya, na ahụ́ ike ya, Setan mere ka Job yie onye mmehie nke Chineke na-ata ahụhụ. Ọ bụ ezie na ọ bụ onye a na-akwanyere ùgwù nke ukwuu, ọbụna ndị ikwu Job na ezi ndị enyi ya ledawaziri ya anya. (Job 19:13-19; 29:1, 2, 7-11) Ọzọkwa, site n’ọnụ ndị nkasi obi ụgha, Setan gbalịrị ‘iji okwu zọpịa Job,’ buru ụzọ kwuo na ọ ghaghị ịbụ na o mewo mmehie ụfọdụ dị oké njọ ma mesịa maa ya nnọọ ikpe dị ka onye mmehie. (Job 4:6-9; 19:2; 22:5-10) Lee ka nke ahụ ga-esiworị kụda Job obi!

9. Olee otú e si mee ka Jizọs yie ka ọ̀ bụ onye mmehie?

9 Dị ka onye kasị akwado ọbụbụeze Jehova, Ọkpara Chineke ghọrọ onye bụ́ isi Setan busoro iro. Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, Setan gbalịrị ime ka o yie ka o nwere ntụpọ n’ụzọ ime mmụọ, dị ka o mere Job, na-eme ka Jizọs yie ka ọ̀ bụ onye mmehie. (Aịsaịa 53:2-4; Jọn 9:24) Ndị mmadụ kpọrọ ya onye na-aṅụ oké mmanya na onye oké nri ma kwuo na o “nwere mmụọ ọjọọ.” (Matiu 11:18, 19; Jọn 7:20; 8:48; 10:20) E boro ya ebubo ụgha nke ikwulu Chineke. (Matiu 9:2, 3; 26:63-66; Jọn 10:33-36) Nke a wetaara Jizọs obi erughị ala, n’ihi na ọ maara na nke ahụ na-ewetara Nna ya nkọcha na-enweghị ihe kpatara ya. (Luk 22:41-44) N’ikpeazụ, a kpọgburu Jizọs dị ka onye omekome a bụrụ ọnụ. (Matiu 27:38-44) N’ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe n’ụzọ zuru okè, Jizọs diri “okwu mmegide . . . nke ndị mmehie.”—Ndị Hibru 12:2, 3.

10. Olee otú ihe fọdụrụ ná ndị ahụ e tere mmanụ siworo bụrụ ndị Setan na-ebuso iro n’oge a?

10 N’oge a, ihe fọdụrụ n’ụmụazụ Kraịst e tere mmanụ aghọwokwa ndị Ekwensu na-ebuso iro. A kọwara Setan dị ka “onye ahụ nke na-ebo ụmụnna [Kraịst] ebubo, bụ́ onye na-ebo ha ebubo ehihie na abalị n’ihu Chineke anyị.” (Mkpughe 12:9, 10) Kemgbe a chụpụrụ ya n’eluigwe ma chụda ya n’ụwa, Setan emewo mgbalị siri ike ime ka e lewe ụmụnna Kraịst anya dị ka ndị a na-asọ oyi a mapụrụ n’iwu. (1 Ndị Kọrint 4:13) Ná mba ụfọdụ, a kpọwo ha òtù dị ize ndụ, ọbụna dị ka a kpọrọ Ndị Kraịst narị afọ mbụ. (Ọrụ 24:5, 14; 28:22) Dị ka anyị hụrụ ná mmalite, a gbasawo echiche na-eduhie eduhie banyere ha site n’ibo ha ebubo. N’agbanyeghị nke ahụ, “site n’otuto na ihe ihere, site n’akụkọ ọjọọ na akụkọ ọma,” ụmụnna Kraịst e tere mmanụ, n’ịbụ ndị ndị ibe ha bụ́ “atụrụ ọzọ ahụ” na-akwado, ejiwo obi umeala na-agbalị ‘idebe ihe ndị Chineke nyere n’iwu ma na-arụ ọrụ ịgba àmà banyere Jizọs.’—2 Ndị Kọrint 6:8; Jọn 10:16; Mkpughe 12:17.

11, 12. (a) Gịnị pụrụ ịkpata ụfọdụ nkọcha a na-akọcha Ndị Kraịst? (b) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Onye Kraịst pụrụ isi taa ahụhụ n’ụzọ na-ezighị ezi n’ihi okwukwe ya?

11 N’ezie, ọ bụghị nkọcha nile a na-akọcha ndị ohu Chineke n’otu n’otu bụ “n’ihi ezi omume.” (Matiu 5:10) Nsogbu ụfọdụ pụrụ ịbụ n’ihi ezughị okè anyị. Uru pụrụ iche adịghị ya ma ọ bụrụ na mgbe anyị “na-emehie ma bụrụ ndị a na-ama ụra, [anyị] atachie obi.” Otú ọ dị, ọ bụrụ na Onye Kraịst, “n’ihi akọ na uche ya n’ebe Chineke nọ, atachie obi n’ihe mwute, taakwa ahụhụ n’ụzọ na-ezighị ezi, nke a bụ ihe dị mma” n’anya Jehova. (1 Pita 2:19, 20) N’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka nke a pụrụ ime?

12 E mesowo ụfọdụ omume ọjọọ n’ihi na ha jụrụ ikere òkè n’ememe olili ozu ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. (Deuterọnọmi 14:1) Ndị ntorobịa bụ́ Ndịàmà abụrụwo ndị a na-akọ ọnụ n’ihi ịrapara n’ụkpụrụ omume ọma Jehova. (1 Pita 4:4) E bowo ụfọdụ ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ebubo nke ịbụ ndị “na-eleghara ụmụ ha anya” ma ọ bụ ndị “na-emegbu ụmụ ha” n’ihi na ha chọrọ ka a gwọọ ụmụ ha n’ejighị ọbara. (Ọrụ 15:29) Ndị Kraịst abụrụwo ndị ndị ikwu na ndị agbata obi ha chụpụrụ nanị n’ihi na ha ghọrọ ndị ohu Jehova. (Matiu 10:34-37) Ndị a nile na-agbaso usoro ndị amụma setịpụrụ nakwa nke Jizọs setịpụrụ n’onwe ya n’ịta ahụhụ n’ụzọ na-ezighị ezi.—Matiu 5:11, 12; Jems 5:10; 1 Pita 2:21.

Ịnagide Nkọcha

13. Gịnị pụrụ inyere anyị aka ịnọgide na-akwụsi ike n’ụzọ ime mmụọ mgbe a na-akọcha anyị n’ụzọ siri ike?

13 Mgbe a kọchara anyị n’ụzọ siri ike n’ihi okwukwe anyị, anyị pụrụ inwe nkụda mmụọ, dị ka Jeremaịa onye amụma nwere ma chee na anyị apụghị ịnọgide na-ejere Chineke ozi. (Jeremaịa 20:7-9) Gịnị pụrụ inyere anyị aka ịnọgide na-akwụsi ike n’ụzọ ime mmụọ? Gbalịa ile okwu ahụ anya n’ụzọ Jehova si ele ya anya. Ọ na-ele ndị nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi n’okpuru ule anya dị ka ndị mmeri, ọ bụghị ndị e meriri. (Ndị Rom 8:37) Gbalịa iji anya nke uche gị hụ ndị kwadoro ọbụbụeze Jehova n’agbanyeghị mweda n’ala Ekwensu pụrụ iwetaworo ha—ndị ikom na ndị inyom ndị dị ka Ebel, Job, nne Jizọs bụ́ Meri, na ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie, tinyekwara ndị ohu ibe anyị nke oge a. (Ndị Hibru 11:35-37; 12:1) Na-atụgharị uche n’ụzọ ndụ ha nke iguzosi ike n’ezi ihe. Oké ìgwè ahụ nke ndị na-eguzosi ike n’ihe na-akpọ anyị òkù isonyere ha n’inweta ihe nrite nke e debeere ndị ji okwukwe ha merie ụwa.—1 Jọn 5:4.

14. Olee otú ikpesi ekpere ike pụrụ isi wusie anyị ike ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi?

14 Ọ bụrụ na ‘nchegbu anyị na-aba ụba n’ime anyị,’ anyị pụrụ ịgakwuru Jehova n’ekpere, ọ ga-agụgụkwa anyị ma wusie anyị ike. (Abụ Ọma 50:15; 94:19) Ọ ga-enye anyị amamihe dị anyị mkpa iji nagide ule ma nyere anyị aka ilekwasị anya n’oké ihe iseokwu ahụ, ọbụbụeze Jehova, bụ́ nke mere e ji akpọ ndị ohu ya asị n’enweghị ihe kpatara ya. (Jems 1:5) Jehova pụkwara inye anyị “udo nke Chineke nke karịrị echiche nile.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ịdị jụụ a Chineke na-enye na-enyere anyị aka ịnọ jụụ ma kwụsie ike n’agbanyeghị oké nrụgide, ghara inwe obi abụọ ma ọ bụ tụwa ụjọ. Site ná mmụọ ya, Jehova pụrụ ịkwagide anyị ịgabiga ihe ọ bụla o kwere ka ọ bịakwasị anyị.—1 Ndị Kọrint 10:13.

15. Gịnị ga-enyere anyị aka ịghara inwe obi ilu mgbe anyị na-ata ahụhụ?

15 Gịnị pụrụ inyere anyị aka ịghara ịbụ ndị nwere obi ilu n’ebe ndị kpọrọ anyị asị n’enweghị ihe kpatara ya nọ? Cheta na ndị mmegide anyị bụ́ isi bụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ. (Ndị Efesọs 6:12) Ọ bụ ezie na ụfọdụ ụmụ mmadụ na-ama ụma ma kpachara anya na-akpagbu anyị, ọtụtụ n’ime ndị na-emegide ndị Chineke na-eme nke ahụ n’amaghị ama ma ọ bụ bụrụ ndị ndị ọzọ kpaliri ime otú ahụ. (Daniel 6:4-16; 1 Timoti 1:12, 13) Jehova chọrọ ka “ụdị mmadụ nile” nwee ohere nke ịbụ ndị ‘a zọpụtara na ka ha bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu.’ (1 Timoti 2:4) N’ezie, ụfọdụ ndị na-emegidebu anyị bụzi ụmụnna Ndị Kraịst anyị n’ihi ịhụ àgwà anyị na-enweghị ntụpọ. (1 Pita 2:12) Tụkwasị na nke ahụ, anyị pụrụ ịmụta ihe site n’ihe nlereanya nke nwa Jekọb bụ́ Josef. Ọ bụ ezie na Josef tara ahụhụ dị ukwuu n’ihi ụmụnne ya, o burughị ha iwe n’obi. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ ghọtara na aka Jehova dị na n’okwu ahụ, na-achịkwa ihe omume ndị ahụ iji mezuo uche Ya. (Jenesis 45:4-8) N’otu aka ahụ, Jehova pụrụ iji ahụhụ anyị na-ata n’ụzọ na-ezighị ezi mee ihe iji wetara aha ya otuto.—1 Pita 4:16.

16, 17. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji na-echegbu onwe anyị banyere mgbalị ndị mmegide na-eme iji gbochie ọrụ nkwusa ahụ?

16 Ọ dịghị anyị mkpa ichegbubiga onwe anyị ókè mgbe o yiri ka ndị mmegide hà na-enwe ihe ịga nke ọma n’igbochi ọganihu nke ozi ọma ahụ. Jehova na-eme ka mba nile mee mkpọtụ ugbu a site n’àmà zuru ụwa ọnụ a na-agba, ihe a na-achọsi ike na-abatakwa. (Hagaị 2:7) Kraịst Jizọs, bụ́ Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ, kwuru, sị: “Atụrụ m na-ege ntị n’olu m, amakwaara m ha, ha na-esokwa m. M na-enyekwa ha ndụ ebighị ebi, . . . ọ dịghịkwa onye ga-apụnara ha n’aka m.” (Jọn 10:27-29) Ndị mmụọ ozi dị nsọ na-ekerekwa òkè n’oké owuwe ihe ubi ime mmụọ ahụ. (Matiu 13:39, 41; Mkpughe 14:6, 7) Ya mere, ọ dịghị ihe ndị mmegide ga-ekwu ma ọ bụ mee nke pụrụ ime ka uche Chineke ghara imezu.—Aịsaịa 54:17; Ọrụ 5:38, 39.

17 Mgbe mgbe, mgbalị ndị mmegide na-arụpụta ihe dị iche n’ihe ha bu n’uche. N’otu ógbè Africa, a gbasara ọtụtụ ụgha ndị jọgburu onwe ha banyere Ndịàmà Jehova, nke gụnyere na ha na-efe Ekwensu. N’ihi nke a, mgbe ọ bụla Ndịàmà bịara, Grace na-agbaba n’azụ ụlọ ya ma zoo ruo mgbe ha lara. Otu ụbọchị, pastọ chọọchị ya weliri otu akwụkwọ anyị elu ma gwa ndị nile nọ ebe ahụ ka ha ghara ịgụ ya n’ihi na ọ ga-eme ka ha hapụ okpukpe ha. Nke a kpaliri ọchịchọ ịmata ihe Grace. Mgbe ọzọ Ndịàmà ahụ bịara, kama ịga zoo, o sooro ha nwee mkparịta ụka ma nata otu akwụkwọ ahụ. A maliteere ya ọmụmụ Bible, na 1996 kwa, e mere ya baptizim. Grace na-ejizi oge ya achọ ndị ọzọ bụ́ ndị ọ pụrụ ịbụ na a gwawo ihe na-ezighị ezi banyere Ndịàmà Jehova.

Wusie Okwukwe Gị Ike Ugbu A

18. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa anyị iwusi okwukwe anyị ike tupu ule siri ike abịa, oleekwa otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ?

18 Ebe ọ bụ na Setan pụrụ iji ịkpọasị na-enweghị ihe kpatara ya awakpo anyị mgbe ọ bụla, ọ dị oké mkpa anyị iwusi okwukwe anyị ike ugbu a. Olee otú anyị pụrụ isi mee nke a? Otu akụkọ sitere n’otu mba bụ́ ebe a kpagbuworo ndị Jehova kwuru, sị: “Otu ihe aghọwo ihe doro anya nke ọma: Ndị nwere àgwà ọma nke ime mmụọ na nghọta dị omimi nke eziokwu Bible, adịghị enwe ihe isi ike ọ bụla n’iguzosi ike mgbe ọnwụnwa dị iche iche bịara. Ma ndị na-agha nzukọ ‘n’oge dị mma,’ ndị na-adịghị ejechi ozi ubi anya, ndị na-ekwenyekwara ihe na-ezighị ezi n’okwu ndị dị nta, na-ada mgbe mgbe n’okpuru ọnwụnwa ‘dị ọkụ.’” (2 Timoti 4:2) Ọ bụrụ na ị hụ ebe ndị ọ dị mkpa ka ị rụọ ọrụ na ha, tinye mgbalị ime otú ahụ n’egbughị oge.—Abụ Ọma 119:60.

19. Gịnị ka iguzosi ike n’ezi ihe nke ndị ohu Chineke mgbe ha na-eche ịkpọasị na-enweghị ihe kpatara ya ihu na-arụzu?

19 Iguzosi ike n’ezi ihe nke ndị na-efe ezi ofufe n’okpuru ihe otiti nke ịkpọasị Setan bụ ihe akaebe nye izi ezi, iru eru na ezi omume nke ọbụbụeze Jehova. Ikwesị ntụkwasị obi ha na-eme ka obi Chineke ṅụrịa. Ọ bụ ezie na ụmụ mmadụ pụrụ ịkọcha ha, ‘ihere ha adịghị eme onye ebube ya dị n’ụwa na eluigwe ịbụ onye a na-akpọku dị ka Chineke ha.’ N’ezie, banyere ndị dị otú ahụ na-eguzosi ike n’ihe, a pụrụ ikwu n’ụzọ ziri ezi, sị: “Ha ekwesịghịkwa ụwa.”—Ndị Hibru 11:16, 38.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 N’Akwụkwọ Nsọ, okwu ahụ bụ́ “ịkpọasị” nwere ihe ndị dịtụgasị iche ọ pụtara. N’ebe ụfọdụ, ọ na-apụta nanị ịhụ n’anya n’ụzọ dị nta karị. (Deuterọnọmi 21:15, 16) “Ịkpọasị” pụkwara ịpụta enweghị nnọọ mmasị n’ihe ma ọ bụ onye ma n’ebughị n’obi imebi ihe ahụ ma ọ bụ imerụ onye ahụ ahụ́, kama nke ahụ, na-achọ ụzọ isi zere ya n’ihi oyi a na-asọ ya. Otú ọ dị, okwu ahụ bụ́ “ịkpọasị” pụkwara ịpụta oké ibu iro, ibu iro ruo ogologo oge bụ́ nke obi ilu na-esokarị. Ọ bụ nkọwa a nke okwu ahụ ka a tụlere n’isiokwu a.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Gịnị mere e ji kpọọ ndị na-efe ezi ofufe asị n’enweghị ihe kpatara ya?

• Olee otú Setan si jiri nkọcha mee ihe ná mgbalị imebi iguzosi ike n’ezi ihe nke Job na Jizọs?

• Olee otú Jehova si ewusi anyị ike iji kwụsie ike n’agbanyeghị ịkpọasị Setan?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe/Foto dị na peeji nke 16]

Ha Ghọtara Isi Ihe Kpatara Ya

Otu n’ime Ndịàmà Jehova na Ukraine, bụ́ ebe a machibidoro ọrụ nkwusa Alaeze ahụ iwu ruo afọ 50, kwuru, sị: “E kwesịghị ile ọnọdụ Ndịàmà Jehova chọtara onwe ha na ya anya nanị site n’otú ndị mmadụ si emeso anyị. . . . Ihe ka ọtụtụ ná ndị ọchịchị na-arụ nnọọ ọrụ ha. Mgbe a gbanwere ọchịchị, ndị ọrụ gọọmenti na-agbanwe ndị ha na-eguzosi ike n’ihe nye, ma anyị adịghị eme otú ahụ. Anyị ghọtara na e kpughewo onye na-akpata nsogbu anyị n’ezie n’ime Bible.

“Anyị eleghị onwe anyị anya nanị dị ka ndị aka ha dị ọcha bụ́ ndị ndị mmegbu na-emegide. Ihe nyeere anyị aka ịtachi obi bụ ịghọta nke ọma ihe iseokwu ahụ bilitere n’ogige Iden—ihe iseokwu nke oruru o ruuru Chineke ịchị achị. . . . Anyị nọ n’otu akụkụ nke ihe iseokwu metụtara ọ bụghị nanị ọdịmma ụmụ mmadụ kamakwa nke metụtara Eze eluigwe na ala. Anyị nwere nghọta ka ukwuu nke ihe ihe iseokwu ahụ gụnyere. Nke a mere ka anyị dị ike ma nyere anyị aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe ọbụna n’ọnọdụ ndị kasị sie ike.”

[Foto]

Victor Popovych, bụ́ onye e jichiri na 1970

[Foto dị na peeji nke 13]

Ònye kpatara nkọcha a kọchara Jizọs?

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Job, Meri, na ndị ohu Chineke nke oge a ndị dị ka Stanley Jones, akwadowo ọbụbụeze Jehova