Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Ike Gwụrụ Ma Ha Adaghị Mbà

Ndị Ike Gwụrụ Ma Ha Adaghị Mbà

Ndị Ike Gwụrụ Ma Ha Adaghị Mbà

“Jehova, Onye keworo nsọtụ nile nke ụwa, . . . na-enye onye dara mbà ike; onye ike na-adịghị ka Ọ na-emekwa ka o nwee ume n’ụba.”—AỊSAỊA 40:28, 29.

1, 2. (a) Òkù dị aṅaa na-akpali akpali ka a na-akpọ ndị nile chọrọ ife ofufe dị ọcha? (b) Gịnị pụrụ itinye ọnọdụ ime mmụọ anyị n’oké ihe ize ndụ?

DỊ KA ndị na-eso ụzọ Jizọs, anyị maara ọkpụkpọ òkù ya a na-akpali akpali nke ọma: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ na ndị a na-ebogbu n’ibu, m ga-emekwa ka unu nwee ume ọhụrụ. . . . N’ihi na yok m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.” (Matiu 11:28-30) E nyewokwa Ndị Kraịst “oge . . . maka inwe ume ọhụrụ . . . site n’ebe onye ahụ bụ́ Jehova nọ.” (Ọrụ 3:19) N’ezie, gị onwe gị enwewo mmetụta na-enye ume ọhụrụ nke ịmụta eziokwu Bible, inwe olileanya na-egbukepụ egbukepụ maka ọdịnihu, na itinye ụkpụrụ Jehova n’ọrụ ná ndụ gị.

2 N’agbanyeghị nke ahụ, ụfọdụ ndị na-efe Jehova na-enwe oké ike ọgwụgwụ nke uche. Mgbe ụfọdụ, nkụda mmụọ ndị a na-adịru nwa oge. N’oge ndị ọzọ ike ọgwụgwụ pụrụ ịdịte aka. Ka oge na-aga, ụfọdụ pụrụ iche na ibu ọrụ Ndị Kraịst ha aghọwo ibu arọ kama ịbụ ibu na-enye ume ọhụrụ dị ka Jizọs kwere ná nkwa. Echiche na-ezighị ezi ndị dị otú ahụ pụrụ itinye mmekọrịta Onye Kraịst na Jehova n’oké ihe ize ndụ.

3. N’ihi gịnị ka Jizọs ji nye ndụmọdụ ahụ dị na Jọn 14:1?

3 Nwa oge tupu e jide ya ma gbuo ya, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu ekwela ka obi lọọ unu mmiri. Gosipụtanụ okwukwe na Chineke, gosipụtakwanụ okwukwe na mụ.” (Jọn 14:1) Jizọs kwuru okwu ndị a mgbe ndị na-eso ụzọ ya na-aga iche ihe omume ndị jọgburu onwe ha ihu. Ihe ga-esochi ya bụ ntiwapụ nke mkpagbu. Jizọs maara na ndị na-eso ụzọ ya pụrụ ịsụ ngọngọ n’ihi oké nkụda mmụọ. (Jọn 16:1) Ọ bụrụ na a chịkwaghị ya, mwute pụrụ ime ka ike gwụ ha n’ụzọ ime mmụọ ma mee ka ha kwụsị ịtụkwasị Jehova obi. Nke a pụkwara ime Ndị Kraịst taa. Nkụda mmụọ dịtere aka pụrụ ịkpata oké nchekasị ma nyịgbuo obi anyị. (Jeremaịa 8:18) Ike pụrụ ịgwụ mmadụ anyị bụ n’ime. N’okpuru nrụgide a, ike pụrụ ịgwụ anyị n’ụzọ mmetụta uche na n’ụzọ ime mmụọ, anyị pụrụ ọbụna ịgharazi inwe ọchịchọ ife Jehova.

4. Gịnị pụrụ inyere anyị aka ime ka ike ghara ịgwụ obi ihe atụ anyị?

4 N’ezie ndụmọdụ Bible a kwesịrị ekwesị: “Karịa ihe ndebe gị nile chebe obi gị; n’ihi na site na ya ka mpụta nile nke ndụ dị.” (Ilu 4:23) Bible na-enye ndụmọdụ ndị bara uru bụ́ ndị na-enyere anyị aka ichebe obi ihe atụ anyị pụọ ná nkụda mmụọ na ike ọgwụgwụ ime mmụọ. Otú ọ dị, ọ dị anyị mkpa ibu ụzọ mara nke ọma ihe na-akpatara anyị ike ọgwụgwụ.

Iso Ụzọ Kraịst Adịghị Ejichi Mmadụ Ejichi

5. Olee ihe yiri mmegiderịta nke dị n’iso ụzọ Kraịst?

5 N’ezie, ịbụ Onye Kraịst chọrọ mgbalị siri ike. (Luk 13:24) Jizọs kwuru ọbụna, sị: “Onye ọ bụla nke na-adịghị eburu osisi ịta ahụhụ ya ma na-eso m apụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m.” (Luk 14:27) N’ile ya anya elu elu, okwu ndị a pụrụ iyi ka hà na-emegide ihe Jizọs kwuru banyere ibu ya ịbụ nke dị mfe na nke na-enye ume ọhụrụ, ma n’eziokwu ha adịghị emegiderịta onwe ha.

6, 7. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ụdị ofufe anyị adịghị agwụ ike?

6 Ọ bụ ezie na ime mgbalị siri ike na ịrụ ọrụ ike na-agwụ ike, ọ pụrụ ịdị na-enye afọ ojuju na ume ọhụrụ mgbe e mere ya n’ihi ihe bara uru. (Eklisiastis 3:13, 22) Oleekwa ihe ga-aba uru karịa ịgwa ndị agbata obi anyị eziokwu ndị magburu onwe ha dị na Bible? Ọzọkwa, mgbalị siri ike anyị na-eme iji bie ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ omume ndị dị elu nke Chineke na-aghọ ihe na-adịghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere uru ndị anyị na-erite n’ihi ya. (Ilu 2:10-20) Ọbụna mgbe a na-akpagbu anyị, anyị na-ewere ya dị ka ihe ùgwù ịta ahụhụ n’ihi Alaeze Chineke.—1 Pita 4:14.

7 Ibu Jizọs na-enye ume ọhụrụ n’ezie karịsịa ma e jiri ya tụnyere ọchịchịrị ime mmụọ nke ndị nọgidere n’okpuru yok okpukpe ụgha nọ n’ime ya. Chineke nwere ịhụnanya dị nro n’ebe anyị nọ, ọ dịghịkwa achọ ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli. ‘Ihe ndị Jehova nyere n’iwu adịghị arọ.’ (1 Jọn 5:3) Ezi Iso Ụzọ Kraịst, dị ka e gosipụtara ya n’Akwụkwọ Nsọ, adịghị ejichi mmadụ ejichi. N’ụzọ doro anya, ụdị ofufe anyị adịghị akpata ike ọgwụgwụ na nkụda mmụọ.

‘Yipụ Ihe Ọ Bụla Dị Arọ’

8. Gịnị na-akpatakarị ike ọgwụgwụ ime mmụọ?

8 Ike ọgwụgwụ ime mmụọ ọ bụla anyị nwere na-abụkarị n’ihi ibu nke usoro ihe a rụrụ arụ bokwasịrị anyị. N’ihi na “ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ,” mmetụta ndị na-adịghị mma, bụ́ ndị pụrụ ịkụda anyị aka ma mee ka anyị gharazie ịkwụsi ike dị ka Ndị Kraịst, gbara anyị gburugburu. (1 Jọn 5:19) Ihe ndị na-adịchaghị mkpa pụrụ ịkpaghasị usoro ihe omume anyị dị ka Ndị Kraịst. Ibu arọ ndị a a tụkwasịrị atụkwasị pụrụ ịnyịda anyị na ọbụna igwepịa mmụọ anyị. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, Bible na-adụ anyị ọdụ ka anyị ‘yipụ ihe ọ bụla dị arọ.’—Ndị Hibru 12:1-3.

9. Olee otú nchụso ihe onwunwe pụrụ isi nyịgbuo anyị?

9 Dị ka ihe atụ, ịbụ onye a ma ama, ego, ntụrụndụ, njem mkpori ndụ, na ụdị ndị ọzọ nke nchụso ihe onwunwe, bụ́ ihe ndị ụwa na-etinyebiga uche ókè na ha, pụrụ imetụta otú anyị si eche echiche. (1 Jọn 2:15-17) Ụfọdụ Ndị Kraịst narị afọ mbụ bụ́ ndị chụsoro akụ̀ na ụba mere ka ndụ siere ha ike nke ukwuu. Pọl onyeozi na-akọwa, sị: “Ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ ọchịchọ amaghị ihe nke na-emerụkwa ahụ́, bụ́ ndị na-akwakpu mmadụ ná mbibi na ịla n’iyi. N’ihi na ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ nile, sitekwa n’ịchụso ịhụnanya nke a e duhiewo ụfọdụ pụọ n’okwukwe, ha ejiriwokwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha aghara aghara.”—1 Timoti 6:9, 10.

10. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta banyere akụ̀ na ụba site n’ihe atụ Jizọs nke ọgha mkpụrụ?

10 Mgbe anyị nwere ike ọgwụgwụ na nkụda mmụọ n’ozi anyị na-ejere Chineke, ọ̀ pụrụ ịbụ n’ihi na nchụso nke ihe onwunwe na-akpagbu ọnọdụ ime mmụọ anyị? Ọ pụrụ nnọọ ịbụ ihe kpatara ya, dị ka Jizọs gosiri n’ihe atụ ya nke ọgha mkpụrụ. Jizọs ji “nchegbu nke usoro ihe a na ike dị aghụghọ nke akụ̀ na ụba na ọchịchọ maka ihe ndị ọzọ gasị” tụnyere ogwu ndị “na-awabata ma kpagbuo” mkpụrụ nke okwu Chineke nke dị n’obi anyị. (Mak 4:18, 19) N’ihi nke a, Bible na-adụ anyị ọdụ, sị: “Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya, ka unu nọ na-enwe afọ ojuju n’ihe ndị dị ugbu a. N’ihi na o kwuwo, sị: ‘M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.’”—Ndị Hibru 13:5.

11. Olee otú anyị pụrụ isi wepụsịa ihe ndị pụrụ ịnyịgbu anyị?

11 Mgbe ụfọdụ, ihe na-eme ka ndụ siere anyị ike abụghị ịchọ inwetakwu ihe, kama ihe anyị na-eji ihe anyị nwere enwe eme. Ụfọdụ ndị pụrụ inwe ike ọgwụgwụ n’ụzọ mmetụta uche n’ihi nsogbu ahụ́ ike ndị siri ike, ọnwụ nke ndị ha hụrụ n’anya, ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ na-akpata mwute. Ha ahụwo na ọ dị mkpa ịdị na-eme mgbanwe site n’oge ruo n’oge. Otu di na nwunye kpebiri ịkwụsị ihe omume ntụrụndụ na ọrụ ụfọdụ na-adịchaghị mkpa ha na-arụ. Ha nyochasịrị nnọọ ihe ndị ha nwere ma kwakọta ihe nile metụtara ọrụ ndị ahụ ma wepụ ha. Site n’oge ruo n’oge, anyị nile pụrụ irite uru site n’inyocha àgwà na ihe onwunwe anyị ma wepụsịa ibu nile na-adịghị mkpa ka ike wee ghara ịgwụ anyị, anyị ewee daa mbà ná mkpụrụ obi anyị.

Ezi Uche na Mmadụ Ịma Ebe Ike Ya Ruru Dị Oké Mkpa

12. Gịnị ka anyị kwesịrị ịmata banyere ihie ụzọ nke anyị onwe anyị?

12 Ihie ụzọ nke anyị onwe anyị, ọbụna n’ihe ndị dị nta, pụrụ iji nke nta nke nta mee ka ndụ siere anyị ike. Lee ka okwu Devid ndị a si bụrụ eziokwu: “N’ihi na ajọ omume m [ma ọ bụ, “ihie ụzọ m”] nile agabigawo n’elu isi m: dị ka ibu arọ ha dịkara m arọ.” (Abụ Ọma 38:4) Mgbe mgbe, ime mgbanwe ole na ole ndị bara uru ga-eme ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’ibu arọ.

13. Olee otú inwe ezi uche pụrụ isi nyere anyị aka inwe echiche ziri ezi banyere ozi anyị?

13 Bible na-agba anyị ume ịzụlite “nzube ihe [ma ọ bụ, “ezi amamihe”] na izuzu.” (Ilu 3:21, 22) “Amamihe nke sitere n’elu . . . [nwere] ezi uche,” ka Bible na-ekwu. (Jems 3:17) Ụfọdụ echewo na ha aghaghị ime ihe nile ndị ọzọ na-eme n’ozi Ndị Kraịst. Otú ọ dị, Bible na-adụ ọdụ, sị: “Ka onye ọ bụla na-anwapụta ihe ọrụ nke ya bụ, mgbe ahụkwa ọ ga-eme ka o nwee aṅụrị n’ihe banyere nanị onwe ya, ọ bụghịkwa n’iji onwe ya tụnyere onye nke ọzọ. N’ihi na onye ọ bụla ga-ebu ibu nke ya.” (Ndị Galeshia 6:4, 5) N’ezie, ezi ihe nlereanya nke Ndị Kraịst ibe anyị pụrụ ịgba anyị ume iji obi anyị dum na-ejere Jehova ozi, ma ezi amamihe na ezi uche ga-enyere anyị aka isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị ezi uche dị na ha na-adabere n’ọnọdụ anyị.

14, 15. Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta ezi amamihe n’ilekọta mkpa anụ ahụ́ na nke mmetụta uche anyị?

14 Anyị inwe ezi uche ọbụna n’ihe ndị pụrụ iyi ka ha adịchaghị mkpa pụrụ inyere anyị aka izere ike ọgwụgwụ. Dị ka ihe atụ, ànyị na-azụlite àgwà ndị ziri ezi bụ́ ndị na-akwalite ezi ahụ́ ike? Tụlee ihe atụ nke otu di na nwunye na-eje ozi n’otu n’ime alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova. Ha ahụwo uru nke ezi amamihe bara n’igbochi ike ọgwụgwụ. Nke nwunye na-ekwu, sị: “N’agbanyeghị otú ọrụ anyị nwere haruru, anyị na-agbalị ịlaba ihe dị ka n’otu oge kwa abalị. Anyị na-emegakwa ahụ́ mgbe nile. Nke a enyeworo anyị nnọọ aka. Anyị amụtawo ịma ebe ike anyị ruru, anyị na-emekwa ihe kwekọrọ na nke ahụ. Anyị na-agbalị ịghara iji onwe anyị atụnyere ndị ọzọ bụ́ ndị yiri ka hà nwere ume na-adịghị agwụ agwụ.” Ànyị na-eri nri ndị na-edozi ahụ́ ma na-ezu ike otú o kwesịrị mgbe nile? Iji ezi uche na-elebara ahụ́ ike anyị anya n’ụzọ zuru ezu pụrụ ibelata ike ọgwụgwụ nke uche na nke ime mmụọ.

15 Ụfọdụ n’ime anyị nwere mkpa ndị pụrụ iche. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwanyị Onye Kraịst ejewo ozi oge nile n’ọtụtụ ebe ndị siri ike. O nwewo nsogbu ahụ́ ike ndị siri oké ike, gụnyere ọrịa cancer. Gịnị na-enyere ya aka ịnagide ọnọdụ ndị na-akpata nchekasị? Ọ na-ekwu, sị: “Ọ dị m mkpa inwe oge mgbe m nwere ike ịnọrọ onwe m ma nọrọ jụụ. Ka m na-enwewanye nchekasị na ike ọgwụgwụ, otú ahụ ka m na-enwewanye mkpa nke inwe oge m ga-eji nọrọ jụụ bụ́ mgbe m pụrụ ịgụ akwụkwọ ma zuo ike.” Ezi amamihe na izuzu na-enyere anyị aka ịmata na imeju mkpa anyị n’otu n’otu ma si otú ahụ na-ezere ike ọgwụgwụ ime mmụọ.

Jehova Chineke Na-enye Anyị Ume

16, 17. (a) N’ihi gịnị ka ilekọta ahụ́ ike ime mmụọ anyị ji dị oké mkpa? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị itinye n’usoro ihe omume anyị kwa ụbọchị?

16 N’ezie, ilekọta ahụ́ ike ime mmụọ anyị dị oké mkpa. Mgbe anyị na Jehova Chineke nwere mmekọrịta chiri anya, ike pụrụ ịgwụ anyị n’ụzọ anụ ahụ́, ma ọ dịghị mgbe ike ga-agwụ anyị ife ya ofufe. Jehova bụ onye “na-enye onye dara mbà ike; onye ike na-adịghị ka Ọ na-emekwa ka o nwee ume n’ụba.” (Aịsaịa 40:28, 29) Pọl onyeozi, bụ́ onye hụworo ịbụ eziokwu nke okwu ndị ahụ n’onwe ya dere, sị: “Anyị adịghị ada mbà, kama ọ bụrụgodị na mmadụ anyị bụ n’elu ahụ́ na-ala n’iyi, n’ezie a na-eme ka mmadụ anyị bụ n’ime ahụ́ na-adịghachi ọhụrụ site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị.”—2 Ndị Kọrint 4:16.

17 Rịba ama okwu ahụ bụ́ “site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị.” Nke a na-apụta anyị iji ndokwa ndị Jehova mere eme ihe kwa ụbọchị. Onye ozi ala ọzọ bụ́ onye ji ikwesị ntụkwasị obi jee ozi ruo afọ 43 nwere oge ndị ike gwụrụ ya n’ụzọ anụ ahụ́, ya enweekwa nkụda mmụọ. Ma ọ daghị mbà. Ọ na-ekwu, sị: “Emewo m ka ọ bụrụ àgwà m iteta ụra n’oge ka m wee nwee ike iji oge ụfọdụ kpegara Jehova ekpere ma gụọ Okwu ya tupu mụ amalite ọrụ ọ bụla. Usoro ihe omume a m na-agbaso kwa ụbọchị enyeworo m aka ịtachi obi ruo ugbu a.” N’ezie, anyị pụrụ ịdabere n’ikike na-enye ume ọhụrụ nke Jehova ma ọ bụrụ na anyị ana-ekpegara ya ekpere mgbe nile, ee, na-atụgharị uche n’àgwà ya ndị dị elu na nkwa ya nile “site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị.”

18. Nkasi obi dị aṅaa ka Bible na-enye ndị na-ekwesị ntụkwasị obi bụ́ ndị meworo agadi ma ọ bụ ndị ahụ́ na-esighị ike?

18 Nke a bụ ihe na-enye aka karịsịa nye ndị na-enwe nkụda mmụọ n’ihi ime agadi na nsogbu ahụ́ ike. Ndị dị otú ahụ pụrụ ịda mbà n’obi, ọ bụghị n’ihi na ha na-eji onwe ha atụnyere ndị ọzọ, kama n’ihi na ha na-eji onwe ha atụnyere ihe ha bụbu. Lee ihe nkasi obi ọ bụ ịmara na Jehova na-akwanyere ndị agadi ùgwù! Bible na-ekwu, sị: “Okpueze nke mara mma ka isi awọ bụ, n’ụzọ ezi omume ka a ga-ahụ ya.” (Ilu 16:31) Jehova maara erughị eru anyị ma na-eji ofufe anyị ji obi anyị dum efe ya akpọrọ oké ihe n’agbanyeghị adịghị ike anyị. Ezi ọrụ ndị anyị rụwokwara abanyewo n’ikike ncheta Chineke n’ụzọ a na-apụghị ihichapụ ehichapụ. Akwụkwọ Nsọ na-emesi anyị obi ike, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya, ebe unu jewooro ndị nsọ ozi ma nọgide na-eje ozi.” (Ndị Hibru 6:10) Lee obi ụtọ anyị nile nwere inwe n’etiti anyị ndị guzosiworo ike n’ihe nye Jehova ruo ọtụtụ iri afọ!

Adala Mbà

19. Olee uru anyị na-erite site n’ịdị na-eme ihe dị mma mgbe nile?

19 Ọtụtụ ndị kweere na ịrụ ọrụ ike mgbe nile pụrụ ibelata ike ọgwụgwụ. N’otu aka ahụ, ihe omume ime mmụọ a na-emechi anya pụrụ inye aka belata ike ọgwụgwụ mmetụta uche ma ọ bụ nke ime mmụọ ọ bụla anyị pụrụ inwe. Bible na-ekwu, sị: “Ka anyị ghara ịda mbà n’ime ihe dị mma, n’ihi na mgbe oge ya ruru anyị ga-aghọrọ mkpụrụ ya ma ọ bụrụ na ike agwụghị anyị. Ya mere, n’ezie, ọ bụrụhaala na anyị nwere oge dị mma maka ya, ka anyị na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ nile nọ, ma karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ.” (Ndị Galeshia 6:9, 10) Rịba ama okwu ndị ahụ bụ́ ‘ime ihe dị mma’ na ‘ime ihe ọma.’ Ha na-egosi na a chọrọ anyị ọrụ n’aka. Imere ndị ọzọ ihe ọma pụrụ n’ezie inye aka ime ka ike ghara ịgwụ anyị n’ozi anyị na-ejere Jehova.

20. Iji lụso nkụda mmụọ ọgụ, olee ndị anyị kwesịrị izere mkpakọrịta ha?

20 N’ụzọ megidere nke ahụ, iso ndị na-eleghara iwu Chineke anya na-akpakọrịta ma na-emekọrịta ihe pụrụ ịghọ ibu arọ na-agwụ ike. Bible na-adọ anyị aka ná ntị, sị: “Nkume dị arọ, ájá bụkwa ibu; ma mkpasu iwe nke onye uche ya gbagọrọ agbagọ dị arọ karịa ha abụọ.” (Ilu 27:3) Iji lụso mmetụta nke nkụda mmụọ na ike ọgwụgwụ ọgụ, anyị kwesịrị izere mkpakọrịta nke anyị na ndị na-enwe echiche na-ezighị ezi na ndị na-ahụtakarị mmejọ nke ndị ọzọ ma na-akatọ ha.

21. Olee otú anyị pụrụ isi bụrụ ndị na-agba ndị ọzọ ume ná nzukọ Ndị Kraịst?

21 Nzukọ Ndị Kraịst bụ ndokwa sitere n’aka Jehova nke pụrụ inye anyị ume n’ụzọ ime mmụọ. N’ebe ahụ, anyị nwere ohere magburu onwe ya nke iji ndụmọdụ na mkpakọrịta ndị na-enye ume ọhụrụ gbarịta ibe anyị ume. (Ndị Hibru 10:25) Mmadụ nile nọ n’ọgbakọ kwesịrị ịgbalị ịdị na-ewuli ndị ọzọ elu mgbe ha na-aza ajụjụ ná nzukọ ma ọ bụ mgbe ha na-eme ihe omume n’elu ikpo okwu. Ndị na-edu ndu dị ka ndị ozizi karịsịa nwere ibu ọrụ nke ịgba ndị ọzọ ume. (Aịsaịa 32:1, 2) Ọbụna mgbe e nwere mkpa nke ịgba ume ma ọ bụ ịdọ aka ná ntị, ndụmọdụ ahụ kwesịrị ịbụ nke na-enye ume ọhụrụ. (Ndị Galeshia 6:1, 2) Ịhụnanya anyị nwere n’ebe ndị ọzọ nọ ga-enyere anyị aka n’ezie ijere Jehova ozi n’adaghị mbà.—Abụ Ọma 133:1; Jọn 13:35.

22. N’agbanyeghị ọdịdị mmadụ anyị na-ezughị okè, n’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jupụta n’obi ike?

22 Ife Jehova n’oge ọgwụgwụ a chọrọ ọrụ. Ndị Kraịst na-enwekwa mmetụta nke ike ọgwụgwụ nke uche, ihe mgbu mmetụta uche, na ọnọdụ ndị na-akpata nchekasị. Ọdịdị mmadụ anyị na-ezughị okè esighị ike, dị ka ihe e ji ụrọ kpụọ. N’agbanyeghị nke ahụ, Bible na-ekwu, sị: “Anyị nwere akụ̀ a n’arịa e ji ụrọ kpụọ, ka ike karịrị ike nkịtị wee bụrụ nke Chineke, n’abụghịkwa nke sitere n’aka anyị onwe anyị.” (2 Ndị Kọrint 4:7) Ee, ike ga-agwụ anyị ma ka anyị ghara ịda mbà mgbe ọ bụla ma ọ bụ kwụsị. Kama ka anyị “jupụta n’obi ike ma kwuo, sị: ‘Jehova bụ onye inyeaka m.’”—Ndị Hibru 13:6.

Ntụle Dị Mkpirikpi

• Olee ibu arọ ụfọdụ anyị pụrụ ibupụ?

• Olee otú anyị pụrụ isi kere òkè n’ime “ihe ọma” n’ebe Ndị Kraịst ibe anyị nọ?

• Olee otú Jehova si akwagide anyị mgbe anyị nwere ike ọgwụgwụ ma ọ bụ nkụda mmụọ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 23]

Jizọs maara na nkụda mmụọ dịtere aka pụrụ inye ndịozi ya nsogbu

[Foto dị na peeji nke 24]

Ụfọdụ ndị akwụsịwo ihe omume ntụrụndụ na ọrụ onwe onye ụfọdụ na-adịchaghị mkpa

[Foto dị na peeji nke 26]

N’agbanyeghị erughị eru anyị, Jehova na-eji ofufe anyị ji obi anyị dum na-efe ya akpọrọ oké ihe