Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Onye Ụjọ Na-adịghị Atụ nke Na-awagharị n’Ihi Oziọma Ahụ’

‘Onye Ụjọ Na-adịghị Atụ nke Na-awagharị n’Ihi Oziọma Ahụ’

‘Onye Ụjọ Na-adịghị Atụ nke Na-awagharị n’Ihi Oziọma Ahụ’

A KỌRỌ na ka ọ na-erule mgbe ọ dị afọ 18, George Borrow amarawo asụsụ 12. Afọ abụọ ka e mesịrị, o nwere ike ịsụgharị asụsụ 20 dị iche iche “n’ụzọ dị mfe ma bụrụ ịgba.”

Na 1833 Òtù Bible nke Britain na Mba Ofesi dị na London, England, kpọrọ nwoke a nwere nkà pụrụ iche òkù maka ịgba ya ajụjụ ọnụ. N’enweghị ike ịkwụ ụgwọ maka njem ya ma n’ikpebisi ike iji ohere ọma a mee ihe, Borrow dị afọ 30 ji ụkwụ mee njem ahụ dị kilomita 180 site n’ụlọ ya dị na Norwich, n’ime nanị awa 28.

Òtù Bible ahụ chere ya ọrụ na-ama aka n’ihu—ịmụta asụsụ Manchu, bụ́ nke e ji eme ihe n’akụkụ ụfọdụ nke China, n’ime ọnwa isii. Ọ rịọrọ ka e nye ya akwụkwọ ụtọ asụsụ, ma nanị ihe ha pụrụ inye ya bụ Oziọma Matiu e dere n’asụsụ Manchu na akwụkwọ ọkọwa okwu site na Manchu gaa na French. N’agbanyeghị nke ahụ, n’ime izu 19, o degara akwụkwọ ozi na London, sị, “Amụtawo m Manchu,” site, dị ka o si tinye ya, “n’enyemaka Chineke.” Ihe a o mere dị ịrịba ama ọbụna karị n’ihi na n’otu oge ahụ, a kọrọ na ọ nọ na-edezi Oziọma Luk n’asụsụ Nahuatl, bụ́ otu n’ime asụsụ ụmụ amaala Mexico.

Bible n’Asụsụ Manchu

Na narị afọ nke 17, bụ́ mgbe mbụ e dere asụsụ Manchu ede, na-eji mkpụrụ akwụkwọ ndị e si ná mkpụrụ akwụkwọ Mongolian Uighur nweta, ọ ghọrọ asụsụ ndị ọchịchị China ji eme ihe. Ọ bụ ezie na ka oge na-aga, a kwụsịlatara iji ya eme ihe, Òtù Bible nke Britain na Mba Ofesi chọsiri ike ibipụta na ikesa Bible n’asụsụ Manchu. Ka ọ na-erule 1822, ha enyewo ego maka mbipụta nke mkpụrụ 550 nke Oziọma Matiu, bụ́ nke Stepan V. Lipoftsoff sụgharịrị. Ọ bụ onye òtù nke Ụlọ Ọrụ Russia Na-ahụ Maka Mmekọrịta Ya na Mba Ndị Ọzọ bụ́ onye biworo na China afọ 20. E bipụtara nke a na St. Petersburg, ma mgbe e kesaworo nanị mkpụrụ ole na ole, idei mmiri bibiri ndị fọdụrụ.

Nsụgharị nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’ozuzu sochiri n’oge na-adịghị anya. Na 1834, nchọpụta nke ihe odide ochie nke ihe ka ukwuu n’Akwụkwọ Nsọ Hibru mụbara mmasị e nwere na Bible. Ònye ga-ahazi ndegharị nke Bible Manchu dị adị ma sụgharịchaa ndị fọrọ afọ? Òtù Bible nke Britain na Mba Ofesi zipụrụ George Borrow ịrụ ọrụ a n’aha ha.

Ịga Russia

Mgbe o rutere na St. Petersburg, Borrow mikpuru onwe ya n’ịmụ asụsụ Manchu iji nyere ya aka ịgụgharị na idegharị ihe odide Bible n’ụzọ ziri ezi karị. Otú o sina dị, ọrụ ahụ siri ike, ọ rụkwara ọrụ ruo awa 13 kwa ụbọchị, na-enye aka ịchịkọta mkpụrụ akwụkwọ maka The New Testament, bụ́ nke e mesịrị kọwaa dị ka “ọmarịcha mbipụta nke akwụkwọ bụ́ ịgba.” E bipụtara ya otu puku na 1835. Ma ọchịchọ obi Borrow, bụ́ iburu ha gaa China ịga kesaa ha ebe ahụ, kụrụ afọ n’ala. Ọchịchị Russia, n’ịtụ egwu na a pụrụ ile nke a anya dị ka ozi ala ọzọ bụ́ nke nwere ike imebi mmekọrịta enyi na enyi dị n’etiti ha na ndị agbata obi ha, jụrụ inye Borrow ikike ịgafe China ma ọ bụrụ na “o jiri Bible Manchu ọ bụla.”

E kesara mkpụrụ ole na ole n’ihe dị ka afọ iri ka e mesịrị, nsụgharị nke Oziọma Matiu na Mak n’asụsụ Manchu na Chinese n’otu akwụkwọ, pụtakwara na 1859. Otú ọ dị, ka ọ na-erule mgbe ahụ, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị pụrụ ịgụ Manchu họọrọ ịgụ Chinese, atụmanya inwe Bible Manchu zuru ezu malitekwara ibelata. N’ezie, Manchu bụ asụsụ na-apụ n’anya, bụ́ nke asụsụ Chinese na-aga ịnọchi n’oge na-adịghị anya. Ọ nọchichara ya kpamkpam ka ọ na-erule 1912 mgbe China ghọrọ mba nweere onwe ya.

Ebe Ala Dịịrị Banye na Mmiri nke Iberia

N’ịbụ onye ahụmahụ ya wusiri ike, George Borrow laghachiri London. E zigaziri ya Portugal na Spen na 1835, “iji chọpụta otú ndị mmadụ dịruru njikere ịnakwere eziokwu nke Iso Ụzọ Kraịst,” dị ka o si kwuo ya ka e mesịrị. N’oge ahụ, a hụbeghị aka Òtù Bible nke Britain na Mba Ofesi ná mba abụọ ahụ n’ihi ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke obodo. Borrow nwere obi ụtọ iso ndị bi n’ime ime obodo Portugal nwee mkparịta ụka banyere Bible, ma n’oge na-adịghị anya, enweghị mmasị n’okpukpe nke ndị mmadụ n’ebe ahụ kpaliri ya ịgafe Spen.

O nwetara ihe ịma aka dị iche na Spen, karịsịa n’etiti ndị Gypsy bụ́ ndị Borrow so nwee mmekọrịta chiri anya n’oge na-adịghị anya, ebe ọ bụ na ọ pụrụ ịsụ asụsụ ha. Obere oge ka o rutesịrị, ọ malitere ịsụgharị “New Testament” gaa n’asụsụ ndị Gypsy nke Spen, bụ́ Gitano. Ọ kpọrọ ụmụ nwanyị Gypsy abụọ inyere ya aka n’akụkụ ụfọdụ nke ọrụ a. Ọ na-agụrụ ha nsụgharị nke Spanish ma gwazie ha ka ha sụgharịa ya. N’ụzọ dị otú a, ọ mụtara ụzọ ziri ezi e si eji akpaala okwu Gypsy eme ihe. N’ihi mgbalị a, e bipụtara Oziọma Luk n’oge mgbụsị akwụkwọ nke 1838, bụ́ nke kpaliri otu bishọp ikwu, sị: “Ọ ga-eji asụsụ gypsy tọghata ndị Spen nile.”

E nyewo George Borrow ikike ịchọta “onye ruru eru ịsụgharị Akwụkwọ Nsọ gaa n’asụsụ Basque.” E nyere Dr. Oteiza ọrụ ahụ, bụ́ dọkịta “nke maara olumba ahụ nke ọma, bụ́ nke mụ onwe m matụkwa,” ka Borrow dere. Na 1838, Oziọma Luk ghọrọ Bible mbụ pụtara n’asụsụ Basque nke Spen.

N’ịbụ onye ọchịchọ ya ịkụziri ndị nkịtị ihe kpaliri, Borrow mere ogologo njem, bụ́ ndị dị ize ndụ ọtụtụ mgbe gaa ikesara ndị ogbenye nọ n’ime ime obodo akwụkwọ Bible. Ọ chọrọ ịtọhapụ ha n’amaghị nke a na-akọ nke okpukpe na nkwenkwe ụgha. Iji kpughee otú indọljens ha na-azụ si bụrụ nke na-abaghị uru, ọ na-ekwu dị ka ihe atụ, sị: “Ọ̀ ga-ekwe omume na Chineke, onye dị mma, ga-akwado orire nke mmehie?” Ma Òtù Bible ahụ, n’ịtụ egwu na nkatọ dị otú ahụ pụrụ iduga n’ịmachibido ọrụ ha iwu, nyere ya ntụziaka ka o lekwasị anya nanị n’ikesa Akwụkwọ Nsọ.

Borrow natara ikike a na-edeghị ede ibipụta El Nuevo Testamento, New Testament n’asụsụ Spanish, n’etinyeghị ihe odide nke nkwenkwe okpukpe Roman Katọlik. Nke ahụ bụ n’agbanyeghị mmegide praịm minista megideburu ya, bụ́ onye kọwaworo nsụgharị ahụ dị ka ‘akwụkwọ dị ize ndụ na nke na-ekwesịghị ekwesị.’ Borrow megheziri ebe mbusa akwụkwọ na Madrid iji ree New Testament a dị n’asụsụ Spanish, bụ́ ihe omume nke wetaara ya na ma ndị ndú okpukpe ma ndị ọchịchị esemokwu. A tụrụ ya mkpọrọ ruo ụbọchị 12. Mgbe o mere mkpesa, a gwara Borrow ka o jiri nwayọọ laa. N’ịmara nke ọma na a tụrụ ya mkpọrọ n’ụzọ iwu na-akwadoghị, o zoro aka n’ihe atụ nke Pọl onyeozi ma họrọ ịnọgide n’ebe ahụ ruo mgbe a tọhapụrụ ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị, n’eteghị aha ya unyi.—Ọrụ 16:37.

Ka ọ na-erule mgbe onye ozi ha a na-anụ ọkụ n’obi hapụrụ Spen na 1840, Òtù Bible ahụ pụrụ ịkọ, sị: “E kesawo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ Akwụkwọ Nsọ 14,000 na Spen n’ime afọ ise gara aga.” N’ịbụ onye kerewooro òkè dị ukwuu na nke a, Borrow chịkọtara ahụmahụ o nwere na Spen dị ka “afọ ndị kasị enye obi ụtọ nke ndụ m.”

The Bible in Spain, nke e bipụtara nke mbụ ya na 1842—nke a ka na-ebipụtakwa—bụ ihe ndekọ doro anya George Borrow dere n’onwe ya banyere njem na ahụmahụ ya. N’ime akwụkwọ a, bụ́ nke gara nnọọ ahịa ozugbo ahụ, ọ kpọrọ onwe ya “onye na-awagharị n’ihi Oziọma ahụ.” O dere, sị: “Ezubere m ileta ebe ndị zoro ezo n’etiti ugwu dị iche iche ma gwa ndị mmadụ okwu, n’ụzọ nke m, nke Kraịst.”

Site n’iji ịnụ ọkụ n’obi dị otú ahụ kesaa ma sụgharịa Akwụkwọ Nsọ, George Borrow tọọrọ ndị ọzọ ntọala—ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa n’ezie.

[Map dị na peeji 29]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Mgbalị ndị George Borrow mere ịsụgharị na ikesa Bible si n’England (1) kpọga ya (2) Russia, (3) Portugal, na (4) Spen

[Ebe E Si Nweta Foto]

Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.

[Foto dị na peeji nke 28]

Okwu mmalite nke Oziọma Jọn n’asụsụ Manchu, nke e biri na 1835, isi n’elu gụrụ ya gbadaa ala site n’aka ekpe gaa n’aka nri

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’akwụkwọ bụ́ The Bible of Every Land, 1860

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 27]

Site n’akwụkwọ bụ́ The Life of George Borrow nke Clement K. Shorter dere, 1919