Ụzọ Isi Nagide Nkụda Mmụọ
Ụzọ Isi Nagide Nkụda Mmụọ
Ì NWERE nkụda mmụọ? N’oge a nke ejighị ihe n’aka na nsogbu, ọtụtụ mmadụ nwere nkụda mmụọ. Ụfọdụ nwere nkụda mmụọ n’ihi na ha enweghị ọrụ. Ndị ọzọ na-anagide ihe ndị si n’ihe mberede pụta. Ndị ọzọkwa na nsogbu ezinụlọ, nsogbu ahụ́ ike siri oké ike, ma ọ bụ owu ọmụma na-alụ.
Ọ bụrụ na i nwere nkụda mmụọ, olee ebe ị pụrụ ilega anya maka enyemaka? Ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa nile achọtawo nkasi obi site n’ịgụ Okwu Chineke, bụ́ Bible. Ha na-enweta mmesi obi ike site n’okwu Pọl onyeozi, bụ́ onye kwuru, sị: “Ka ngọzi dịrị Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, bụ́ Nna nke obi ebere na Chineke nke nkasi obi nile, bụ́ onye na-akasi anyị obi ná mkpagbu nile anyị.” (2 Ndị Kọrint 1:3, 4) Gịnị ma ị gụọ amaokwu a na amaokwu Bible ndị ọzọ na Bible nke gị? Ime otú ahụ ‘ga-akasi gị obi ma mee ka ị guzosie ike.’—2 Ndị Tesalonaịka 2:17.
A pụkwara ịchọta enyemaka iji nagide nkụda mmụọ site n’iso ndị na-ejere Jehova ozi na-akpakọrịta. Ilu 12:25 na-ekwu, sị: “Nchegbu n’obi mmadụ na-eme ka obi huru ala; ma okwu ọma na-eme ka ọ ṅụrịa.” Mgbe anyị gara nzukọ Ndị Kraịst, anyị na-anụ “okwu ọma” ahụ, bụ́ nke “na-atọ mkpụrụ obi ụtọ, bụrụkwa ihe na-agwọ ọkpụkpụ n’ọrịa.” (Ilu 16:24) Gịnị ma ị gaa otu nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova iji hụ n’onwe gị mmetụta na-ewusi ike nzukọ dị otú ahụ pụrụ inwe n’ebe ị nọ?
Ị pụkwara irite uru site n’ikike nke ekpere. Ọ bụrụ na nchekasị nke ndụ erikpuwo gị, gwa “Onye na-anụ ekpere” mmetụta ị na-enwe n’ime onwe gị. (Abụ Ọma 65:2) Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke, maara anyị nke ọma karịa ka anyị maara onwe anyị. Anyị pụrụ ịdabere n’enyemaka ya. Okwu ya na-ekwe anyị nkwa, sị: “Tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu, Ya onwe ya ga-anagidekwa gị: Ọ gaghị ekwe ka e wezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 55:22) Ee, “ndị na-ele anya Jehova ga-agbanwe ike ha.”—Aịsaịa 40:31.
Jehova Chineke emeworo anyị ndokwa ndị magburu onwe ha, bụ́ ndị pụrụ inyere anyị aka ịnagide nkụda mmụọ n’ụzọ gara nke ọma. Ị̀ ga-eji ha eme ihe?