Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Na-echeta “Ndị E Chefurula”

A Na-echeta “Ndị E Chefurula”

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

A Na-echeta “Ndị E Chefurula”

NÁ MMALITE afọ 2001, Haykaz, bụ́ Onyeàmà Jehova dị afọ 15 gara kirie ihe ngosi e mere na Bern, Switzerland nke isiokwu ya bụ “Ndị E Chefurula,” nke gosiri mkpagbu ndị Nazi kpagburu Ndịàmà Jehova. Ná ngwụsị nke ihe ngosi ahụ, Haykaz kwuru, sị: “Anụwo m banyere mmeso obi ọjọọ e mesoro Ndịàmà Jehova na ahụhụ ha tara n’okpuru ọchịchị ndị Nazi, ma nke a bụ nke mbụ m na-ahụ ihe odide na foto ndị sitere kpọmkwem n’oge ahụ. Ihe ndị e gosiri, akụkọ ndị ji anya ha hụ ihe merenụ kọrọ, na ihe ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kwuru n’ebe ihe ngosi ahụ, gbanyere mkpọrọgwụ n’uche na n’obi m.”

Obere oge ka e mesịrị, mgbe e kenyere Haykaz ide akụkọ maka klas ya bụ́ klas dị elu n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ọ họọrọ isiokwu bụ́ “Ndịàmà Jehova—Ndị E Chefurula n’Ime Ndị Ndị Nazi Mekpọrọ Ọnụ.” Onye nkụzi ya kwadoro isiokwu ahụ ma gwa Haykaz na ọ ga-adị mkpa ka ọ gụnye akwụkwọ ndị na-abụghị ndị nke okpukpe n’ebe ọ ga-esi enweta ihe ọ ga-ede. Haykaz ji obi ụtọ kwere. “Edere m nchịkọta nke akwụkwọ ụfọdụ ndị kwuru banyere Ndịàmà Jehova n’oge ndị Nazi bụ́ ndị m tụlere. Akọwakwara m ihe m chere n’onwe m banyere ihe ngosi ahụ bụ́ ‘Ndị E Chefurula.’ Ihe odide ahụ dị peeji 43 bu ihe osise na foto.”

Na November 2002, Haykaz gụụrụ ụmụ akwụkwọ ibe ya, ndị nkụzi, ndị ezinụlọ na ndị enyi ya akụkọ ya. Mgbe nke ahụ gasịrị, ajụjụ na azịza sochiri, bụ́ nke nyere ya ohere ịkọwa nkwenkwe ya ndị dabeere na Bible. Mgbe otu nwa agbọghọ so ná ndị na-ege ntị jụrụ ihe mere o ji họrọ isiokwu a, Haykaz kọwara na ọtụtụ akwụkwọ bụ́ ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme adịghị akpọtụ Ndịàmà Jehova aha nakwa na ya chọrọ ka ndị mmadụ mara otú Ndịàmà si jiri obi ike gbachitere okwukwe ha dị ka Ndị Kraịst. Gịnị ka ihe ọgụgụ ya ahụ rụpụtara?

“Ọ tụrụ ụmụ akwụkwọ ibe m n’anya,” ka Haykaz kwuru. “Ha amaghị na Ndịàmà Jehova dị ka otu ìgwè enwetawo mkpagbu ndị kpụ ọkụ n’ọnụ. Ọzọkwa, ọtụtụ ndị amaghị na Ndịàmà e jichiri n’ogige ịta ahụhụ nke ndị Nazi yi ihe nhụwa ama pụrụ iche—purple triangle.”

Mgbe ọ gụsịrị akụkọ ya, Haykaz nwekwuru ohere ịgwa ụmụ klas ya okwu na iso ha kwurịta nguzo dabeere na Bible nke Ndịàmà n’ihe banyere mmịnye ọbara, ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya na omume. “Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ụmụ akwụkwọ ibe m kwara m emo ma ọ bụ chịa m ọchị,” ka Haykaz kwuru. Ọzọkwa, e debeziri akụkọ ya n’ọ́bá akwụkwọ ụlọ akwụkwọ ahụ. Nke ahụ ga-enye aka ịhụ na a gaghị echefu nguzosi ike nke Ndịàmà Jehova.