Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ọ Na-ewe n’Ezie Iji Nwee Obi Ụtọ

Ihe Ọ Na-ewe n’Ezie Iji Nwee Obi Ụtọ

Ihe Ọ Na-ewe n’Ezie Iji Nwee Obi Ụtọ

JEHOVA, bụ́ “Chineke onye obi ụtọ,” na Jizọs Kraịst, bụ́ “onye obi ụtọ ahụ na onye nanị ya bụ Eze Ukwu,” maara karịa mmadụ nile ihe ọ na-ewe iji nwee obi ụtọ. (1 Timoti 1:11; 6:15) N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya na a na-achọta isi ihe na-akpata obi ụtọ n’Okwu Chineke, bụ́ Bible.—Mkpughe 1:3; 22:7.

N’Ozizi Elu Ugwu ya a ma ama, Jizọs kọwara ihe ọ na-ewe iji nwee obi ụtọ. Ọ na-ekwu, sị: “Obi ụtọ na-adịrị” ndị (1) maara mkpa nke ime mmụọ ha, (2) na-eru újú, (3) dị nwayọọ n’obi, (4) agụụ na-agụ, ndị akpịrị na-akpọkwa nkụ maka ezi omume, (5) na-eme ebere, (6) dị ọcha n’obi, (7) na-eme udo, (8) a kpagbuworo n’ihi ezi omume, na (9) ndị a na-akọcha ma na-akpagbu n’ihi Jizọs.—Matiu 5:3-11. *

Ihe Ndị Jizọs Kwuru Hà Ziri Ezi?

Ịbụ eziokwu nke ihe ụfọdụ Jizọs kwuru adịghị achọ oké nkọwa. Ònye ga-agbagha na onye dị nwayọọ n’obi, nke na-eme ebere ma na-eme udo bụ́ onye obi dị ọcha na-akpali ga-enwe obi ụtọ karịa onye na-ewe iwe, nke na-ese okwu, bụ́ onye na-adịghị eme ebere?

Otú ọ dị, anyị pụrụ iche otú a pụrụ isi kpọọ ndị agụụ na-agụ, ndị akpịrị na-akpọkwa nkụ maka ezi omume ma ọ bụ ndị na-eru újú ndị obi ụtọ. Ndị dị otú ahụ nwere echiche ziri ezi banyere ọnọdụ ụwa. Ha ‘na-eze ume na-asụkwa ude n’ihi ihe arụ nile nke a na-eme’ n’oge anyị. (Ezikiel 9:4) Nke ahụ n’onwe ya adịghị eme ka ha nwee obi ụtọ. Otú ọ dị, mgbe ha mụtara nzube Chineke nke iweta ọnọdụ ndị ziri ezi n’ụwa na iwetara ndị a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi, ọṅụ ha na-amụba nke ukwuu.—Aịsaịa 11:4.

Ịhụnanya maka ezi omume na-emekwa ka ndị mmadụ na-eru újú n’ihi ọdịda ha onwe ha na-ada mgbe mgbe ime ezi ihe. N’ihi ya, ha maara mkpa nke ime mmụọ ha. Ndị dị otú ahụ dị njikere ilegara Chineke anya maka ntụziaka n’ihi na ha ghọtara na ọ bụ nanị ya pụrụ inyere ndị mmadụ aka imeri adịghị ike ha nile.—Ilu 16:3, 9; 20:24.

Ndị na-eru újú, ndị agụụ na-agụ, ndị akpịrị na-akpọkwa nkụ maka ezi omume, na ndị maara mkpa nke ime mmụọ ha maara mkpa ọ dị iso Onye Okike na-enwe ezi mmekọrịta. Iso ụmụ mmadụ na-enwe ezi mmekọrịta na-atụnye ụtụ n’inwe obi ụtọ, ma iso Chineke na-enwe ezi mmekọrịta na-eme otú ahụ ọbụna karị. Ee, ndị ji ihe akpọrọ ihe, bụ́ ndị hụrụ ezi ihe n’anya, bụ́kwa ndị dị njikere ịnakwere nduzi Chineke pụrụ inwe obi ụtọ n’ezie.

Otú ọ dị, ọ pụrụ isiri gị ike ikweta na onye a na-akpagbu ma na-akọcha pụrụ inwe obi ụtọ. Ma, ọ ghaghị ịbụ eziokwu ebe ọ bụ na Jizọs n’onwe ya kwuru otú ahụ. N’ihi ya, olee otú e kwesịrị isi ghọta okwu ya?

Ndị A Na-akpagbu Ma Ha Enwee Obi Ụtọ—Olee Otú nke ahụ Pụrụ Isi Kwe Omume?

Rịba ama na Jizọs asịghị na nkọcha na mkpagbu n’onwe ha na-eweta obi ụtọ. O kwuru n’ụzọ doro anya, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị a kpagbuworo n’ihi ezi omume, . . . mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu ma na-akpagbu unu . . . n’ihi m.” (Matiu 5:10, 11) Ya mere, mmadụ na-enwe obi ụtọ nanị mgbe a na-akọcha ya n’ihi ịbụ onye na-eso ụzọ Kraịst na n’ihi ịkpụzi ndụ ya ka o kwekọọ n’ụkpụrụ ezi omume ndị Jizọs kụziri.

A na-ahụ nke a n’ihe mere Ndị Kraịst oge mbụ. Ndị òtù Sanhedrin, bụ́ ụlọikpe ukwu ndị Juu, ‘kpọrọ ndịozi ahụ, pịa ha ihe, ma nye ha iwu ka ha kwụsị ikwu okwu na-adabere n’aha Jizọs, wee hapụ ha ka ha laa.’ Olee otú ndịozi ahụ si meghachi omume? “Ya mere, ndị a si n’ihu Sanhedrin ahụ pụọ, na-aṅụrị ọṅụ n’ihi na a gụwo ha ná ndị ruru eru ịbụ ndị a ga-emenye ihere n’ihi aha ya. Kwa ụbọchị kwa, n’ụlọ nsọ na site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ha nọgidere n’esepụghị aka na-ezi ihe ma na-akpọsa ozi ọma banyere Kraịst, bụ́ Jizọs.”—Ọrụ 5:40-42; 13:50-52.

Pita onyeozi mere ka njikọ nkọcha na obi ụtọ nwere pụtakwuo ìhè. O dere, sị: “Ọ bụrụ na a na-akọcha unu n’ihi aha Kraịst, obi dị unu ụtọ, n’ihi na mmụọ nke ebube, ọbụna mmụọ nke Chineke, na-adịkwasị unu.” (1 Pita 4:14) Ee, ịta ahụhụ dị ka Onye Kraịst n’ihi ime ezi ihe, ọ bụ ezie na ahụhụ dị otú ahụ adịghị atọ ụtọ, na-eweta obi ụtọ nke na-abịa site n’ịmata na onye ahụ na-enweta mmụọ nsọ Chineke. Olee njikọ mmụọ nsọ Chineke na obi ụtọ nwere?

Ọrụ nke Anụ Ahụ́ Ka Ọ̀ Bụ Mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ?

Mmụọ nsọ Chineke na-adịkwasị nanị ndị na-erubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị. (Ọrụ 5:32) Jehova adịghị enye ndị na-arụ “ọrụ nke anụ ahụ́” mmụọ nsọ ya. Ọrụ ndị ahụ bụ “ịkwa iko, adịghị ọcha, omume rụrụ arụ, ikpere arụsị, ime mgbaasị, ibu iro, esemokwu, ekworo, iwe ọkụ, ndọrọ ndọrọ, nkewa, ịrọ òtù, anyaụfụ, ịṅụ oké mmanya, oriri oké mkpọtụ, na ihe ndị dị ka ndị a.” (Ndị Galeshia 5:19-21) N’eziokwu, n’ụwa taa “ọrụ nke anụ ahụ́” juru ebe nile. Ma, ndị na-arụ ha adịghị enwe ezi obi ụtọ na-adịgide adịgide. Kama nke ahụ, ime ihe ndị ahụ na-emebi ezi mmekọrịta nke mmadụ na ndị ikwu nakwa ndị enyi ya. Ọzọkwa, Okwu Chineke na-ekwu na ndị “na-eme ihe ndị dị otú ahụ agaghị eketa alaeze Chineke.”

N’ụzọ dị iche, Chineke na-enye ndị na-azụlite “mkpụrụ nke mmụọ nsọ” mmụọ ya. Àgwà ndị mejupụtara mkpụrụ a bụ “ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, njide onwe onye.” (Ndị Galeshia 5:22, 23) Mgbe anyị na-egosipụta àgwà ndị a, anyị na-emeghe ohere nke iso ndị ọzọ, nakwa Chineke, na-enwe mmekọrịta udo, bụ́ nke na-eweta ezi obi ụtọ. (Lee igbe.) Nke ka mkpa, site n’igosipụta ịhụnanya, obiọma, ịdị mma, na àgwà ndị ọzọ na-enye Chineke nsọpụrụ, anyị na-eme ihe na-atọ Jehova ụtọ ma nwee olileanya na-enye obi ụtọ nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke.

Ị Pụrụ Ịhọrọ Inwe Obi Ụtọ

Mgbe Wolfgang na Brigitte, bụ́ di na nwunye bi na Germany, malitere ịmụsi Bible ike, ha nwere ọtụtụ ihe onwunwe bụ́ ihe ndị ụmụ mmadụ chere na ha dị mkpa iji nwee obi ụtọ. Ha ka bụ okoro na agbọghọ, ahụ́ ka sikwara ha ike. Ha na-eyi uwe ndị dị oké ọnụ ahịa, biri n’ụlọ a chọrọ nnọọ mma ma nwee achụmnta ego na-aga nke ọma. Ha na-etinye ihe ka ukwuu n’oge ha n’ịchọ inwetakwu ihe onwunwe, ma nke ahụ enyeghị ha ezi obi ụtọ. Otú ọ dị, ka oge na-aga, Wolfgang na Brigitte mere nhọrọ dị mkpa. Ha malitere itinyekwu oge na mgbalị n’ịchụso ihe ime mmụọ ma chọọ ụzọ ndị ha ga-esi bịarukwuo Jehova nso. N’oge na-adịghị anya, nhọrọ ha dugara ha n’ịgbanwe àgwà ha, bụ́ nke mesịkwara kpalie ha ime ka ndụ ha ka mfe na ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ, ma ọ bụ ndị na-ezisa ozi ọma Alaeze oge nile. Taa, ha na-eje ozi dị ka ndị ozi afọ ofufo n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Germany. Tụkwasị na nke ahụ, ha na-amụ otu asụsụ ndị Eshia iji nyere ndị ala ọzọ aka ịmụta eziokwu dị n’Okwu Chineke, bụ́ Bible.

Di na nwunye a hà chọtara ezi obi ụtọ? Wolfgang na-ekwu, sị: “Kemgbe anyị tinyekwuru onwe anyị n’ịchụso ihe ime mmụọ, anyị enwewo obi ụtọ karị, nweekwa afọ ojuju karị. Iji obi anyị dum na-ejere Jehova ozi ewusiwokwa alụmdi na nwunye anyị ike. Anyị nweburu alụmdi na nwunye obi ụtọ ma anyị nwere ibu ọrụ na ihe ndị na-amasị anyị bụ́ ndị nọ na-adọrọ uche anyị gaa n’ebe dịgasị iche. Ugbu a, anyị ji ịdị n’otu na-achụso otu ihe mgbaru ọsọ.”

Gịnị Ka Ọ Na-ewe Iji Nwee Obi Ụtọ?

N’igbu ya ná nkenke: Zere “ọrụ nke anụ ahụ́” ma zụlite “mkpụrụ nke mmụọ [Chineke].” Iji nwee obi ụtọ, ọ dị mkpa ka agụụ iso Chineke na-enwe mmekọrịta chiri anya na-agụ mmadụ. Onye na-agbalị iru ihe mgbaru ọsọ a ga-ekwekọ ná nkọwa Jizọs nke onye obi ụtọ.

Ya mere, ehiela ụzọ site n’ikwubi na obi ụtọ bụ ihe aka na-apụghị iru. N’ezie, ka ọ dị ugbu a, ọ pụrụ ịbụ na i nweghị ezi ahụ́ ike, ma ọ bụ ị pụrụ ọbụna ịdị na-enwe nsogbu n’alụmdi na nwunye gị. Ọ pụrụ ịbụ na ị gaghịzi enweta ụgwọ ọrụ ndị a na-enweta site n’ịbụ nne ma ọ bụ nna, ma ọ bụ ị pụrụ ịdị na-agbalị ịchọta ọrụ na-aga nke ọma. O nwere ike ịbụ na akpa gị adịghịzi arọ dị ka ọ na-adịbu. Otú o sina dị, nwee obi ike; ọ dịghị ihe mere ị ga-eji nwee obi nkoropụ! Ọchịchị Alaeze Chineke ga-edozi nsogbu ndị a nile na ọtụtụ narị ndị ọzọ. N’ezie, n’oge na-adịghị anya, Jehova Chineke ga-emezu nkwa ya nke ọbụ abụ ahụ kwupụtara: “Alaeze Gị bụ alaeze ruo mgbe nile ebighị ebi . . . Ị na-asaghe aka Gị, Ị na-ewerekwa ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.” (Abụ Ọma 145:13, 16) Dị ka ọtụtụ nde ndị na-ejere Jehova ozi n’ụwa nile pụrụ ịgba akaebe ya, ịdị na-eburu nkwa a na-emesi obi ike nke Jehova n’uche ga-atụnye ụtụ n’obi ụtọ gị taa.—Mkpughe 21:3.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Nke ọ bụla n’ime okwu ngọzi itoolu ndị a, dị ka a na-akpọkarị ha, ji okwu Grik bụ́ ma·kaʹri·oi malite. Kama iji okwu bụ́ “ngọzi” mee ihe dị ka nsụgharị ụfọdụ mere, nsụgharị New World Translation na nsụgharị ndị ọzọ, dị ka The Jerusalem Bible na Today’s English Version, ji okwu ka zie ezie bụ́ “obi ụtọ” mee ihe.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]

Ihe Ndị Na-atụnye Ụtụ n’Inwe Obi Ụtọ

Ịhụnanya na-eme ka ndị ọzọ hụkwa gị n’anya.

Ọṅụ na-enye gị ume iji nagide ihe ịma aka.

Udo na-enyere gị aka ịnọgide soro ndị ọzọ na-emekọrịta ihe n’eseghị okwu.

Ogologo ntachi obi na-enyere gị aka ịnọgide na-enwe obi ụtọ ọbụna mgbe ị nọ n’ule.

Obiọma na-adọta ndị ọzọ n’ebe ị nọ.

Ịdị mma nke gị na-eme ka ndị ọzọ gbatara gị ọsọ enyemaka mgbe enyemaka dị gị mkpa.

Okwukwe ga-eme ka i jide nduzi ịhụnanya Chineke n’aka.

Ịdị nwayọọ ga-enye gị udo nke obi, nke uche na nke ahụ́.

Njide onwe onye pụtara na ihie ụzọ gị ga-ebelata.

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Iji nwee obi ụtọ, ọ dị gị mkpa igbo mkpa ime mmụọ gị