Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Jirinụ Otu Ọnụ’ Na-enye Chineke Otuto

‘Jirinụ Otu Ọnụ’ Na-enye Chineke Otuto

‘Jirinụ Otu Ọnụ’ Na-enye Chineke Otuto

“Jiri otu ọnụ na-enye Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst otuto.”—Ndị Rom 15:6.

1. Ihe mmụta dị aṅaa banyere ụzọ e si edozi ndịrịta iche nke echiche ka Pọl nyere ndị kwere ekwe ibe ya?

NDỊ KRAỊST nile adịghị eme otu nhọrọ ma ọ bụ na-enwe mmasị n’otu ihe. N’agbanyeghị nke ahụ, Ndị Kraịst nile aghaghị ịga ije ụkwụ na ụkwụ n’ụzọ nke ndụ. Nke ahụ ọ̀ ga-ekwe omume? Ee, ma ọ bụrụ na anyị emeghị ka obere ndịrịta iche ghọọ oké ihe. Nke ahụ bụ ihe mmụta Pọl onyeozi nyere ndị kwere ekwe ibe ya na narị afọ mbụ. Olee otú o si kọwaa isi ihe a dị mkpa? Oleekwa otú anyị pụrụ isi tinye ndụmọdụ ya sitere n’ike mmụọ nsọ n’ọrụ taa?

Ịdị Mkpa nke Ịdị n’Otu Ndị Kraịst

2. Olee otú Pọl si mesie mkpa ịdị n’otu dị ike?

2 Pọl maara na ịdị n’otu nke Ndị Kraịst dị oké mkpa, o nyekwara ezi ndụmọdụ iji nyere Ndị Kraịst aka ịnagiderịta ibe ha n’ịhụnanya. (Ndị Efesọs 4:1-3; Ndị Kọlọsi 3:12-14) Otú o sina dị, mgbe o guzobesịrị ọtụtụ ọgbakọ ma leta ndị ọzọ n’ihe karịrị afọ 20, ọ maara na ịnọgide na-adị n’otu pụrụ ịbụ ihe ịma aka. (1 Ndị Kọrint 1:11-13; Ndị Galeshia 2:11-14) N’ihi ya, ọ gbara ndị kwere ekwe ibe ya bi na Rom ume, sị: “Ka Chineke onye na-enye ntachi obi na nkasi obi kwe . . . ka unu wee site n’otu obi jiri otu ọnụ na-enye Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst otuto.” (Ndị Rom 15:5, 6) Taa, anyị onwe anyị kwa aghaghị ‘iji otu ọnụ’ na-enye Jehova Chineke otuto dị ka òtù dị n’otu nke ndị ya. Olee otú anyị na-eme n’akụkụ a?

3, 4. (a) Nzụlite dịgasị iche dị aṅaa ka Ndị Kraịst nọ na Rom nwere? (b) Olee otú Ndị Kraịst nọ na Rom pụrụ isi “jiri otu ọnụ” na-ejere Jehova ozi?

3 Ọtụtụ Ndị Kraịst na Rom bụ ndị enyi Pọl. (Ndị Rom 16:3-16) Ọ bụ ezie na nzụlite ha dịgasị iche, Pọl nakweere ụmụnna ya nile dị ka “ndị Chineke hụrụ n’anya.” O dere, sị: “Ana m enye Chineke m ekele site na Jizọs Kraịst banyere unu nile, n’ihi na a na-ekwu banyere okwukwe unu gburugburu ụwa dum.” N’ụzọ doro anya, ndị Rom bụ ihe nlereanya n’ọtụtụ ụzọ. (Ndị Rom 1:7, 8; 15:14) N’otu oge ahụ, ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ahụ nwegasịrị echiche dị iche n’okwu ụfọdụ. Ebe ọ bụ na Ndị Kraịst taa si ná nzụlite na ọdịbendị dịgasị iche, ịmụ ndụmọdụ Pọl nke sitere n’ike mmụọ nsọ banyere ụzọ isi dozie ndịrịta iche pụrụ inyere ha aka ‘iji otu ọnụ’ na-ekwu okwu.

4 Na Rom, e nwere ma ndị kwere ekwe bụ́ ndị Juu ma ndị bụ́ ndị Jentaịl. (Ndị Rom 4:1; 11:13) O yiri ka ụfọdụ ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst akwụsịghị ime omenala ụfọdụ ha nọbu na-eme n’okpuru Iwu Mozis, ọ bụ ezie na ha kwesịrị ịghọtawo na ihe omume ndị dị otú ahụ adịchaghị mkpa maka nzọpụta. N’aka nke ọzọ, ọtụtụ ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst kwetara na àjà Kraịst tọhapụrụ ha site n’ihe mgbochi ndị jibu ha tupu ha aghọọ Ndị Kraịst. N’ihi ya, ha gbanwere àgwà onwe onye na omume ụfọdụ ha na-emebu. (Ndị Galeshia 4:8-11) Otú o sina dị, dị ka Pọl mere ka ọ pụta ìhè, ha nile bụ “ndị Chineke hụrụ n’anya.” Ha nile pụrụ ‘iji otu ọnụ’ na-enye Chineke otuto ma ọ bụrụ na ha anọgide na-enwe ụzọ iche echiche kwesịrị ekwesị n’ebe ibe ha nọ. Taa anyị pụkwara inwe echiche dịgasị iche n’okwu ụfọdụ, n’ihi ya, anyị ga-eme nke ọma iji nlezianya tụlee otú Pọl si kọwaa ụkpụrụ ahụ dị mkpa.—Ndị Rom 15:4.

“Na-anabatanụ Ibe Unu”

5, 6. N’ihi gịnị ka e ji nwee ndịrịta iche nke echiche n’ọgbakọ dị na Rom?

5 N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom, Pọl na-ekwu banyere otu ọnọdụ ebe ndị mmadụ nwere echiche dịgasị iche. Ọ na-ede, sị: “Otu onye nwere okwukwe iri ihe ọ bụla, ma onye na-adịghị ike na-eri akwụkwọ nri.” Gịnị mere o ji dị otú ahụ? N’okpuru Iwu Mozis, a dịghị anakwere anụ ezì dị ka ihe oriri. (Ndị Rom 14:2; Levitikọs 11:7) Otú ọ dị, Iwu ahụ ejichighịzi onye ọ bụla mgbe Jizọs nwụsịrị. (Ndị Efesọs 2:15) Mgbe afọ atọ na ọkara nke ọnwụ Jizọs gasịkwara, otu mmụọ ozi gwara Pita onyeozi na site n’ụzọ Chineke si ele ihe anya, e kwesịghị ile ihe oriri ọ bụla anya dị ka ihe rụrụ arụ. (Ọrụ 11:7-12) N’iburu ihe ndị a n’uche, ụfọdụ ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst pụrụ ichewo na ha pụrụ iri anụ ezì—ma ọ bụ rie ụfọdụ ihe oriri ndị ọzọ Iwu ahụ machibidoro.

6 Otú ọ dị, nanị iche echiche iri ihe oriri ndị e leburu anya dị ka ihe ndị na-adịghị ọcha pụrụ iyiwo ihe a na-asọ oyi nye ndị Juu ọzọ bụ́ Ndị Kraịst. Ọ pụrụ ịbụ na ndị dị otú ahụ ihe na-emetụta n’ụzọ dị mfe were nnọọ iwe ịhụ ka ndị Juu bụ́ ụmụnna ha n’ime Kraịst na-eri ihe oriri ndị dị otú ahụ. Ọzọkwa, ọ pụrụ ijuwo ndị Jentaịl ụfọdụ bụ́ Ndị Kraịst, bụ́ ndị o yiri ka ọ dịtụbeghị mgbe okpukpe ha na-ekpe machibidoro ihe oriri ụfọdụ iwu, anya na mmadụ pụrụ ime ka ihe oriri bụrụ ihe ga-akpata esemokwu. N’ezie, ọ bụghị ihe ọjọọ mmadụ ịghara iri ihe oriri ụfọdụ ma ọ bụrụhaala na ọ dịghị anọgide na-ekwu na ịghara iri ihe ahụ dị mkpa iji nweta nzọpụta. Ma, ndịrịta iche nke echiche dị otú ahụ pụrụ ịkpatawo esemokwu n’ọgbakọ n’ụzọ dị mfe. Ọ ga-adị Ndị Kraịst nọ na Rom mkpa ilezi anya ka ndịrịta iche dị otú ahụ ghara igbochi ha ‘iji otu ọnụ’ na-enye Chineke otuto.

7. Echiche ndị dị iche dịgasị aṅaa bilitere n’ihe banyere idebe ụbọchị pụrụ iche kwa izu?

7 Pọl na-enye ihe atụ nke abụọ, sị: “Otu onye na-ewere ya na otu ụbọchị ka nke ọzọ; onye ọzọ na-ewere ya na otu ụbọchị dị ka ụbọchị ndị ọzọ nile.” (Ndị Rom 14:5a) N’okpuru Iwu Mozis, a dịghị arụ ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike. Ọbụna a machibidoro ime njem n’ụbọchị ahụ iwu. (Ọpụpụ 20:8-10; Matiu 24:20; Ọrụ 1:12) Otú ọ dị, mgbe e wepụrụ Iwu ahụ, mmachibido ndị ahụ adịkwaghị. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ pụrụ ịbụ na ahụ́ eruchaghị ụfọdụ ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst ala ịrụ ụdị ọrụ ọ bụla ma ọ bụ ime njem dị ogologo n’ụbọchị ahụ ha leburu anya dị ka nke dị nsọ. Ọbụna mgbe ha ghọsịrị Ndị Kraịst, ọ pụrụ ịbụ na ha wepụtara ụbọchị nke asaa iche nanị maka ihe ime mmụọ, ọ bụ ezie na site n’ụzọ Chineke si ele ihe anya, a dịkwaghị edebe Ụbọchị Izu Ike. Hà mere ihe ọjọọ n’ime nke ahụ? Ee e, ma ọ bụrụhaala na ha anọgideghị na-ekwu na Chineke chọrọ ka a na-edebe Ụbọchị Izu Ike. Ya mere, n’ihi ichebara akọ na uche ụmụnna ya bụ́ Ndị Kraịst echiche, Pọl dere, sị: “Ka onye ọ bụla kwetazuo n’ime obi nke ya.”—Ndị Rom 14:5b.

8. Ọ bụ ezie na ha pụrụ ichebara akọ na uche ndị ọzọ echiche, gịnị ka Ndị Kraịst nọ na Rom na-agaghị eme?

8 Otú o sina dị, ọ bụ ezie na ọ na-agba ụmụnna ya ume inwe ndidi n’ebe ndị ka na-alụso ihe ndị metụtara akọ na uche ọgụ, Pọl katọrọ ndị gbalịrị ịmanye ndị kwere ekwe ibe ha idebe Iwu Mozis dị ka ihe a chọrọ maka nzọpụta n’ụzọ siri ike. Dị ka ihe atụ, n’ihe dị ka 61 O.A., Pọl dere akwụkwọ Ndị Hibru, bụ́ akwụkwọ ozi siri ike o degaara ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst nke na-akọwa n’ụzọ doro anya na idebe Iwu Mozis abaghị uru ọ bụla n’ihi na Ndị Kraịst nwere olileanya ka elu nke dabeere n’àjà mgbapụta Jizọs.—Ndị Galeshia 5:1-12; Taịtọs 1:10, 11; Ndị Hibru 10:1-17.

9, 10. Gịnị ka Ndị Kraịst kwesịrị izere ime? Kọwaa.

9 Dị ka anyị hụworo, Pọl na-ekwu na ime nhọrọ dịgasị iche ekwesịghị iyi ịdị n’otu egwu ma ọ bụrụhaala na e nweghị ụkpụrụ doro anya nke Ndị Kraịst o megidere. N’ihi ya, Pọl na-ajụ Ndị Kraịst nwere akọ na uche na-adịghị ike karị, sị: “Gịnị mere i ji ekpe nwanna gị ikpe?” Ọ na-ajụkwa ndị nwere akọ na uche siri ike karị (ikekwe, ndị akọ na uche ha nyere ohere iri ụfọdụ ihe oriri ndị a machibidoro iwu n’okpuru Iwu ahụ ma ọ bụ ịrụ ọrụ ego n’Ụbọchị Izu Ike), sị: “Gịnị mere i jikwa elelị nwanna gị?” (Ndị Rom 14:10) Dị ka Pọl si kwuo, Ndị Kraịst nwere akọ na uche na-adịghị ike karị aghaghị izere ịkatọ ụmụnna ha bụ́ ndị nwere echiche ka saa mbara. N’otu aka ahụ, Ndị Kraịst nwere akọ na uche dị ike aghaghị izere ileda ndị akọ na uche ha na-adịghị ike n’akụkụ ụfọdụ anya. Ha nile kwesịrị ịkwanyere ebumnobi ziri ezi nke ndị ọzọ ùgwù ma ghara “iche banyere onwe [ha] karịa ka ọ dị mkpa iche.”—Ndị Rom 12:3, 18.

10 Pọl si otú a kọwaa echiche ziri ezi: “Ka onye na-eri ghara ilelị onye na-adịghị eri, ka onye na-adịghịkwa eri ghara ikpe onye na-eri ikpe, n’ihi na Chineke anabatawo onye ahụ.” Ọzọkwa, ọ na-ekwu, sị: “Kraịst nabatakwara anyị, ka e wee nye Chineke otuto.” Ebe ọ bụ na Chineke na Kraịst na-anabata ma ndị dị ike ma ndị na-adịghị ike, anyị kwesịrị inwe echiche sara mbara yiri nke ahụ ma ‘na-anabata ibe anyị.’ (Ndị Rom 14:3; 15:7) Ònye pụrụ ịgbagha nke ahụ n’ụzọ ziri ezi?

Ịhụnanya Ụmụnna Na-arụpụta Ịdị n’Otu Taa

11. Ọnọdụ dị aṅaa pụrụ iche ka e nwere n’oge Pọl?

11 N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom, Pọl nọ na-ekwu banyere ọnọdụ pụrụ iche. Jehova ka wepụsịrị otu ọgbụgba ndụ ma guzobe nke ọhụrụ. O siiri ụfọdụ ndị ike ime mgbanwe. E nweghị kpọmkwem ọnọdụ ahụ taa, ma okwu ndị yiri ya pụrụ ibilite mgbe ụfọdụ.

12, 13. Olee ọnọdụ ụfọdụ bụ́ ebe Ndị Kraịst taa pụrụ ichebara akọ na uche ụmụnna ha echiche?

12 Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịbụ na nwanyị bụ́ Onye Kraịst nọbu n’okpukpe na-ekwu na e kwesịghị iyi ákwà a chọrọ mma na iji ihe ntecha eme ihe. Mgbe ọ nabatara eziokwu ahụ, ọ pụrụ isiri ya ike ime mgbanwe iji nabata na iyi ákwà kwesịrị ekwesị nke nwere àgwà dị iche iche ma ọ bụ iji ihe ntecha eme ihe ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị abụghị ihe a machibidoro iwu. Ebe ọ bụ na ọ dịghị ụkpụrụ Bible o metụtara, ọ gaghị abụ ihe kwesịrị ekwesị onye ọ bụla ịgbalị ịrụgide nwanyị ahụ bụ́ Onye Kraịst ime ihe megidere akọ na uche ya. N’otu oge ahụ, o kwesịrị ịghọta na ya ekwesịghị ịkatọ ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst bụ́ ndị akọ na uche ha nyere ohere iji ihe ndị dị otú ahụ na-eme ihe.

13 Tụlee ihe atụ ọzọ. Nwoke bụ́ Onye Kraịst pụrụ ịbụ onye a zụlitere n’ebe a na-adịghị anabata iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe. Mgbe o nwetasịrị ihe ọmụma nke eziokwu ahụ, ya amụta na Bible na-ele mmanya anya dị ka onyinye sitere n’aka Chineke, nakwa na a pụrụ iji ya mee ihe ruo n’ókè kwesịrị ekwesị. (Abụ Ọma 104:15) Ya anakwere echiche ahụ. Ma, n’ihi nzụlite ya, ya ahọrọ ịghara iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe kpamkpam, ma ọ dịghị akatọ ndị na-eji ya eme ihe ruo n’ókè kwesịrị ekwesị. N’ụzọ dị otú ahụ, ọ na-etinye okwu Pọl n’ọrụ bụ́ nke na-asị: “Ka anyị na-achụso ihe ndị na-akpata udo na ihe ndị na-ewuli ibe anyị elu.”—Ndị Rom 14:19.

14. N’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka Ndị Kraịst pụrụ itinye mmụọ nke ndụmọdụ Pọl nyere ndị Rom n’ọrụ?

14 Ọnọdụ ndị ọzọ na-achọ ka e tinye mmụọ nke ndụmọdụ Pọl nyere ndị Rom n’ọrụ na-ebilite. Ọ bụ ọtụtụ ndị mejupụtara ọgbakọ Ndị Kraịst, ihe ndị na-amasị ha dịgasịkwa iche. N’ihi ya, ha pụrụ ime nhọrọ dịgasị iche—dị ka ihe atụ, n’ihe metụtara uwe na ejiji. N’ezie, Bible na-enye ụkpụrụ doro anya nke Ndị Kraịst nile nwere ezi obi na-agbaso. Ọ dịghị onye n’ime anyị kwesịrị iyi ákwà ma ọ bụ kpaa isi ndị na-eme ka anyị gbapụ iche ma ọ bụ ndị na-ekwesịghị ekwesị ma ọ bụ ndị na-enye echiche na anyị na ụfọdụ ndị ụwa na-akpa àgwà ọjọọ na-akpakọ. (1 Jọn 2:15-17) Ndị Kraịst kwesịrị icheta mgbe nile, ọbụna mgbe ha na-atụrụ ndụ na ha bụ ndị ozi na-anọchite anya Eze Eluigwe na Ala. (Aịsaịa 43:10; Jọn 17:16; 1 Timoti 2:9, 10) Otú ọ dị, n’ọtụtụ ebe, e nwere ọtụtụ nhọrọ kwesịrị ekwesị maka Ndị Kraịst. *

Zere Ime Ka Ndị Ọzọ Sụọ Ngọngọ

15. Olee mgbe Onye Kraịst, n’ihi abamuru ụmụnna ya, pụrụ ịghara ime ihe ruuru ya?

15 Pọl dọọrọ uche anyị gaa n’otu ụkpụrụ ikpeazụ dị mkpa na ndụmọdụ o nyere Ndị Kraịst nọ na Rom. Mgbe ụfọdụ, Onye Kraịst a zụrụ akọ na uche ya nke ọma pụrụ ikpebi ịghara ime ihe ruuru ya. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ ghọtara na ime ihe ụfọdụ pụrụ imerụ ndị ọzọ ahụ́. Ya bụrụ otú ahụ, gịnị ka anyị kwesịrị ime? Pọl na-ekwu, sị: “Ọ dị mma ịghara iri anụ ma ọ bụ ịṅụ mmanya ma ọ bụ ime ihe ọ bụla nke na-eme ka nwanna gị sụọ ngọngọ.” (Ndị Rom 14:14, 20, 21) N’ihi ya, “anyị ndị siri ike kwesịrị iburu adịghị ike nke ndị na-esighị ike, ọ bụghịkwa ịdị na-eme ihe na-amasị anyị onwe anyị. Ka onye ọ bụla n’ime anyị na-eme ihe na-amasị onye agbata obi ya n’ihe dị mma maka iwuli ya elu.” (Ndị Rom 15:1, 2) Mgbe ihe anyị na-eme pụrụ imerụ akọ na uche Onye Kraịst ibe anyị ahụ́, ịhụnanya ụmụnna ga-akpali anyị ichebara ya echiche ma ghara ime ihe ụfọdụ ruuru anyị. Ihe atụ nke a pụrụ ịbụ iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe. E nyere Onye Kraịst ohere ịṅụ mmanya ruo n’ókè kwesịrị ekwesị. Ma ọ bụrụ na ime otú ahụ pụrụ ime ka onye ibe ya sụọ ngọngọ, ọ gaghị esi ọnwụ ime ihe ruuru ya.

16. Olee otú anyị pụrụ isi na-echebara ndị nọ n’ókèala anyị echiche?

16 A pụkwara itinye ụkpụrụ a n’ọrụ n’otú anyị si emeso ndị ọzọ na-anọghị n’ọgbakọ Ndị Kraịst ihe. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịbụ na anyị bi n’ebe okpukpe e nwere ebe ahụ na-akụziri ndị òtù ya ile otu ụbọchị n’izu anya dị ka ụbọchị ezumike. N’ihi nke ahụ, iji ghara ime ka ndị agbata obi anyị sụọ ngọngọ na ime ka e nwee ihe mgbochi nye ọrụ nkwusa ahụ, anyị ga-ezere, ruo n’ókè o kwere mee, ime ihe ọ bụla n’ụbọchị ahụ nke ga-eme ka ndị agbata obi anyị sụọ ngọngọ. N’ọnọdụ ọzọ, Onye Kraịst bara ọgaranya pụrụ ịkwaga ebe e nwere mkpa ka ukwuu iji jee ozi n’etiti ndị ogbenye. Ọ pụrụ ịhọrọ ichebara ndị agbata obi ọhụrụ ya echiche site n’iji ejiji dị ala ma ọ bụ ibi ndụ dị ala karịa ego o nwere.

17. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ezi uche dị na ya ichebara ndị ọzọ echiche ná nhọrọ ndị anyị na-eme?

17 Ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya ịtụ anya ka “ndị siri ike” mee mgbanwe ndị dị otú ahụ? Ọ dị mma, chee echiche banyere ihe atụ a: Ka anyị kwọ ụgbọala na-aga n’okporo ụzọ awara awara, anyị elepụ anya ma hụ ka ụmụaka ụfọdụ na-abata n’okporo ụzọ ahụ n’ụzọ dị ize ndụ. Ànyị na-anọgide na-agba n’ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ e nyere ohere ya nanị n’ihi na iwu kwadoro anyị ime otú ahụ? Ee e, anyị na-akwụsịtụ iji zere imerụ ụmụaka ahụ ahụ́. Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị mkpa inwe ọchịchọ obi yiri nke ahụ nke ịkwụsịtụ, ma ọ bụ ịnabata ihe ụfọdụ, ná mmekọrịta anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị ma ọ bụ ndị ọzọ. Ọ pụrụ ịbụ na ihe anyị na-eme bụ nnọọ ihe ruuru anyị. Anyị emebighị ụkpụrụ Bible ọ bụla. Otú o sina dị, ọ bụrụ na anyị pụrụ ime ihe ga-emetụta ndị ọzọ ma ọ bụ mee ka akọ na uche ndị na-adịghị ike sụọ ngọngọ, ịhụnanya Ndị Kraịst ga-akpali anyị ịkpachara anya. (Ndị Rom 14:13, 15) Ijigide ịdị n’otu na ịkwalite ihe ndị metụtara Alaeze dị mkpa karịa ihe ndị ruuru anyị.

18, 19. (a) N’ichebara ndị ọzọ echiche, olee otú anyị si agbaso ihe nlereanya Jizọs? (b) N’ihe ndị dị aṅaa ka anyị na-eme nnọọ ihe n’ịdị n’otu, gịnịkwa ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

18 Mgbe anyị na-eme ihe n’ụzọ dị otú a, anyị na-agbaso ihe nlereanya kasị mma. Pọl na-ekwu, sị: “Ọbụna Kraịst ahụ emeghị ihe masịrị ya onwe ya; kama dị nnọọ ka e dere, sị: ‘Nkọcha nke ndị na-akọcha gị adakwasịwo m.’” Jizọs dị njikere ịchụ ndụ ya n’àjà n’ihi anyị. N’ezie, anyị dị njikere ịchụ ụfọdụ ihe ndị ruuru anyị n’àjà ma ọ bụrụ na nke ahụ ga-enyere “ndị na-esighị ike” aka iso anyị na-eto Chineke n’ịdị n’otu. N’ezie, igosipụta mmụọ nnabata ihe na nke mmesapụ aka n’ebe Ndị Kraịst nwere akọ na uche na-adịghị ike nọ—ma ọ bụ iji ọchịchọ obi anyị ghara ime nhọrọ ụfọdụ na isi ọnwụ ime ihe ruuru anyị—na-egosi “otu ụzọ iche echiche ahụ nke Kraịst Jizọs nwere.”—Ndị Rom 15:1-5.

19 Ọ bụ ezie na echiche anyị n’ihe ndị na-emetụtaghị ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ pụrụ ịdịgasị iche ruo n’ókè ụfọdụ, n’ihe ndị metụtara ofufe, anyị na-eme nnọọ ihe n’ịdị n’otu. (1 Ndị Kọrint 1:10) Dị ka ihe atụ, ịdị n’otu dị otú ahụ na-apụta ìhè n’otú anyị si emeghachi omume n’ebe ndị na-emegide ezi ofufe nọ. Okwu Chineke na-akpọ ndị mmegide dị otú ahụ ndị bịara abịa ma na-adụ anyị ọdụ ka anyị kpachara anya maka “olu ndị bịara abịa.” (Jọn 10:5) Olee otú anyị pụrụ isi mata ndị bịara abịa dị otú ahụ? Olee otú anyị kwesịrị isi na-emeghachi omume n’ebe ha nọ? A ga-atụle ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 14 Ọchịchọ nke ndị nne na nna ga-achịkwa ụmụ ha ndị ka dị obere n’ihe metụtara uwe.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• N’ihi gịnị ka inwe echiche dịgasị iche n’ihe ndị dịịrị onwe onye na-agaghị eji yie ịdị n’otu egwu?

• N’ihi gịnị ka anyị dị ka Ndị Kraịst kwesịrị iji jiri ịhụnanya na-echebara ibe anyị echiche?

• Olee ụzọ ụfọdụ ndị anyị pụrụ isi tinye ndụmọdụ Pọl banyere ịdị n’otu n’ọrụ taa, gịnịkwa ga-akpali anyị ime otú ahụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 9]

Ndụmọdụ Pọl n’ihe banyere ịdị n’otu dị oké mkpa maka ọgbakọ

[Foto dị na peeji nke 10]

Ndị Kraịst dị n’otu n’agbanyeghị nzụlite ha dịgasị iche

[Foto dị na peeji nke 12]

Gịnị ka ọkwọ ụgbọala a kwesịrị ime ugbu a?