Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndụ Na-enye Afọ Ojuju na Obi Ụtọ nke Iji Ọchịchọ Obi Achụ Onwe Onye n’Àjà

Ndụ Na-enye Afọ Ojuju na Obi Ụtọ nke Iji Ọchịchọ Obi Achụ Onwe Onye n’Àjà

Akụkọ Ndụ

Ndụ Na-enye Afọ Ojuju na Obi Ụtọ nke Iji Ọchịchọ Obi Achụ Onwe Onye n’Àjà

DỊ KA MARIAN NA ROSA SZUMIGA SI KỌỌ

“M ga-eji onyinye afọ ofufo chụọrọ Gị àjà,” ka Abụ Ọma 54:6 na-ekwu. Okwu a abụrụwo ihe na-achịkwa ndụ Marian Szumiga na nwunye ya, bụ́ Rosa, bụ́ ndị bi na France. N’oge na-adịbeghị anya, ha kọrọ ụfọdụ ihe ndị pụtara ìhè n’ogologo ndụ na-eju afọ nke ha jiworo jeere Jehova ozi.

MARIAN: Ndị mụrụ m bụ ndị Roman Katọlik si Poland. Papa m bụ nwoke dị umeala n’obi. Ọ dịghị mgbe o nwetara ohere ịga akwụkwọ. Otú ọ dị, n’oge Agha Ụwa Mbụ, ọ mụtara ka e si agụ na ka e si ede mgbe ọ nọ na-alụ agha n’olulu ndị agha. Papa m bụ nwoke na-atụ egwu Chineke, ma chọọchị mere ka o nwee ndakpọ olileanya ọtụtụ mgbe.

Ọ dị otu ihe omume ọ na-adịghị echefu echefu. Otu ụbọchị n’oge agha ahụ, otu ụkọchukwu bịara ileta ìgwè ndị agha nke papa m so na ya. Mgbe otu ogbunigwe gbawara na nso ebe ahụ, ụkọchukwu ahụ gbalagara n’ụjọ, were obe na-akụ ịnyịnya ya iji mee ka ọ gbasiwe ike. Ọ wụrụ papa m akpata oyi na “onye nnọchiteanya” Chineke ji ihe dị “nsọ” mee ihe iji gbalaga ngwa ngwa. N’agbanyeghị ahụmahụ ndị dị otú ahụ na ihe ndị na-emenye egwu ndị agha kpatara bụ́ ndị ọ hụrụ, okwukwe papa m nwere n’ebe Chineke nọ adaghị mbà. Ọ na-ekwukarị na ọ bụ Chineke mere ya ji lọta agha ahụ n’udo.

“Obere Poland”

Na 1911, papa m lụrụ otu nwa agbọghọ si obodo nta ha na ha gbara agbata obi. Aha ya bụ Anna Cisowski. Nwa oge ka agha ahụ bisịrị, na 1919, papa m na mama m si Poland kwaga France, bụ́ ebe papa m chọtara ọrụ dị ka onye na-egwu coal. A mụrụ m na March 1926 na Cagnac-les-Mines, na ndịda ebe ọdịda anyanwụ France. Ka e mesịrị, ndị mụrụ m gara biri n’ógbè ndị Poland dị na Loos-en-Gohelle, nke dịdewere Lens n’ebe ugwu France. Onye na-emere ha bred bụ onye Poland, onye na-egburu ha anụ bụ onye Poland, onye ụkọchukwu parish ha bụkwa onye Poland. Ọ bụghị ihe ijuanya na a kpọrọ ebe a Obere Poland. Ndị mụrụ m keere òkè n’ọrụ obodo. Papa m na-ahazikarị ihe ngosi, bụ́ nke na-agụnye ihe nkiri, egwú, na ịbụ abụ. Ọ na-esokwa ụkọchukwu enwe mkparịta ụka mgbe nile, ma ọ dịghị enwe afọ ojuju mgbe ụkọchukwu ahụ na-azakarị ya, sị, “E nwere ọtụtụ ihe omimi.”

Otu ụbọchị na 1930, ụmụ nwanyị abụọ kụrụ aka n’ọnụ ụzọ anyị. Ha bụ Ndị Mmụta Bible, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ. Papa m natara ha Bible, bụ́ akwụkwọ ọ nọworo na-achọ ịgụ eri ọtụtụ afọ. Ya na mama m jikwa ịnụ ọkụ n’obi gụọ akwụkwọ ndị dabeere na Bible ndị ụmụ nwanyị ahụ hapụrụ. Ihe ndị mụrụ m gụtara n’akwụkwọ ndị a metụrụ ha n’ahụ́ nke ukwuu. N’agbanyeghị na ha na-ejikarị ọrụ n’aka, ndị mụrụ m malitere ịga nzukọ ndị Ndị Mmụta Bible haziri. Mkparịta ụka papa m na ụkọchukwu ahụ ghọwanyere ihe na-akpata esemokwu ruo mgbe o yiri egwu otu ụbọchị na ọ bụrụ na ndị mụrụ m anọgide na-eso Ndị Mmụta Bible na-akpakọrịta, a ga-achụpụ nwanne m nwanyị bụ́ Stéphanie na katkizim. “Enyela onwe gị nsogbu,” ka papa m zaghachiri. “Site ugbu a gaa n’ihu, nwa m nwanyị na ụmụ anyị ndị ọzọ ga na-eso anyị aga nzukọ Ndị Mmụta Bible.” Papa m depụrụ aha ya na chọọchị, ná mmalite 1932, e mekwara ndị mụrụ m baptizim. N’oge ahụ, e nwere nanị ihe dị ka ndị nkwusa Alaeze 800 na France.

Rosa: Ndị mụrụ m si Hungary, dịkwa ka ezinụlọ Marian, ha gara biri n’ebe ugwu France iji rụọ ọrụ n’ebe a na-egwupụta coal. A mụrụ m na 1925. Na 1937, otu n’ime Ndịàmà Jehova bụ́ Auguste Beugin, ma ọ bụ Papa Auguste dị ka anyị na-akpọ ya, malitere iwetara ndị mụrụ m Ụlọ Nche n’asụsụ Hungarian. Ha nwere mmasị na magazin ndị ahụ, ma ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova.

Ọ bụ ezie na m ka na-eto eto, ihe ndị m gụtara n’Ụlọ Nche metụrụ m n’ahụ́, nwunye nwa Papa Auguste, bụ́ Suzanne Beugin, nwekwara mmasị n’ebe m nọ. Ndị mụrụ m kwere ka ọ na-akpọ m aga nzukọ. Ka e mesịrị, mgbe m malitere ịrụ ọrụ, nzukọ m na-aga kwa Sunday were papa m iwe. Ọ bụ ezie na, n’ụzọ bụ́ isi, ọ bụ ezigbo mmadụ, o mere mkpesa, sị, “Ị naghị anọ ya n’ime izu, na Sunday kwa gị agawa nzukọ gị!” Otú ọ dị, anọgidere m na-aga. Ya mere, otu ụbọchị papa m kwuru, sị, “Kwara ngwongwo gị pụọ!” Ọ bụ n’uhuruchi. Adị m nanị afọ 17, amaghịkwa m ebe m ga-aga. Agaziri m n’ụlọ Suzanne, na-ebesi ákwá ike. Anọrọ m n’ụlọ Suzanne ihe dị ka otu izu tupu papa m ezite nwanne m nwanyị ka ọ bịa kpọlata m. Abụ m onye ihere site n’ọmụmụ, ma ihe ahụ dị na 1 Jọn 4:18 nyeere m aka ịkwụsi ike. Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ na-ekwu na “ịhụnanya zuru okè na-achụpụ egwu n’èzí.” Na 1942, e mere m baptizim.

Ihe Nketa Ime Mmụọ Dị Oké Ọnụ Ahịa

Marian: E mere mụ na ụmụnne m ndị nwanyị bụ́ Stéphanie na Mélanie nakwa nwanne m nwoke bụ́ Stéphane baptizim na 1942. N’ụlọ, ndụ ezinụlọ anyị dabeere n’Okwu Chineke. Ka anyị nile na-anọdụ ala gburugburu tebụl, papa m na-agụpụtara anyị Bible n’asụsụ Polish. Anyị na-ejikarị uhuruchi anọkọ na-ege ndị mụrụ anyị ntị ka ha na-akọ ahụmahụ ndị ha nwetara n’ọrụ nkwusa Alaeze. Oge ndị a jupụtara n’ihe ime mmụọ kụziiri anyị ịhụ Jehova n’anya na ịtụkwasị ya obi karị. Nsogbu ahụ́ ike manyere papa m ịkwụsị ọrụ, ma ọ nọgidere na-elekọta anyị n’ụzọ ime mmụọ na n’ụzọ anụ ahụ́.

Ebe ọ bụ na papa m nwere ohere ugbu a, ọ na-eji otu ụbọchị n’izu eduziri ndị ntorobịa ọgbakọ anyị ọmụmụ Bible n’asụsụ Polish. Ọ bụ ebe ahụ ka m nọ mụta ịgụ ihe n’asụsụ Polish. Papa m na-agbakwa ndị na-eto eto ume n’ụzọ ndị ọzọ. Otu oge, mgbe Nwanna Gustave Zopfer, bụ́ onye na-elekọta ọrụ Ndịàmà Jehova na France n’oge ahụ, bịara ileta ọgbakọ anyị, papa m haziri òtù ukwe na ihe nkiri Bible e ji uwe ihe nkiri mee bụ́ nke dabeere n’oriri Eze Belshaza na aka ahụ na-ede ihe ná mgbidi. (Daniel 5:1-31) Ọ bụ Louis Piéchota, bụ́ onye mesịrị guzosie ike n’oge ndị Nazi, mere akụkụ nke Daniel. * Nke a bụ ọnọdụ a zụlitere anyị bụ́ ụmụaka na ya. Anyị hụrụ na ndị mụrụ anyị ji ọrụ n’aka mgbe nile n’ihe ndị metụtara ihe ime mmụọ. Taa, ana m aghọta ihe nketa dị oké ọnụ ahịa ndị mụrụ m hapụụrụ anyị.

Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ tiwapụrụ na 1939, a machibidoro ọrụ nkwusa nke Ndịàmà Jehova iwu na France. N’otu oge, e mere nnyocha n’obodo anyị. Ndị agha Germany gbara ụlọ nile gburugburu. Papa m gwuru olulu n’ebe a na-ekowe ákwà ma were ihe mechie ya, anyị zokwara ọtụtụ akwụkwọ ndị dabeere na Bible n’olulu ahụ. Otú ọ dị, ọtụtụ akwụkwọ nta bụ́ Fascism or Freedom nọ na drọwa tebụl nri anyị. Papa m mere ngwa ngwa zoo ha n’akpa uwe e kowere na paseji. Ndị agha abụọ na otu onye uwe ojii France nyochara ụlọ anyị. Anyị chị obi n’aka. Otu n’ime ndị agha ahụ malitere inyocha uwe ndị ahụ e kowere na paseji, n’oge na-adịghịkwa anya ka nke ahụ gasịrị, ọ chị akwụkwọ ndị ahụ bata na kichin, bụ́ ebe anyị nọ. O lere anyị anya ma chịsa akwụkwọ nta ndị ahụ n’elu tebụl ma gaa n’ihu na-achọ n’ebe ndị ọzọ. Achịịrị m akwụkwọ nta ndị ahụ ozugbo ma chịnye ha na drọwa ndị agha ahụ nyochaworo. Onye agha ahụ ajụghị ase akwụkwọ nta ndị ahụ ọzọ—ọ dị ka ò chezọrọ ha kpamkpam!

Ịbanye n’Ozi Oge Nile

Na 1948, ekpebiri m iwepụta onwe m iji jeere Jehova ozi oge nile n’ozi ọsụ ụzọ. Ụbọchị ole na ole ka nke ahụ gasịrị, anatara m akwụkwọ ozi site n’alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova dị na France. Akwụkwọ ozi ahụ kwuru na m ga-eje ozi dị ka onye ọsụ ụzọ n’ọgbakọ Sedan, nke dịdewere Belgium. Ndị mụrụ m nwere obi ụtọ ịhụ ka m nabatara ozi Jehova n’ụzọ dị otú ahụ. Otú o sina dị, papa m mere ka ọ pụta ìhè na ịsụ ụzọ abụghị ihe egwuregwu. Ọ ga-abụ ọrụ siri ike. Otú ọ dị, o kwuru na m nweere onwe m ịlọta ụlọ mgbe ọ bụla m chọrọ, nakwa na m pụrụ ịbịakwute ya mgbe ọ bụla m nwere nsogbu. Ọ bụ ezie na ndị mụrụ m enweghị ego buru ibu, ha zụụrụ m ịnyịnya ígwè ọhụrụ. M ka nwere risit ịnyịnya ígwè ahụ, mgbe ọ bụla m lekwara ya anya, anya mmiri na-agba m. Papa m na mama m nwụrụ na 1961, ma m ka na-echeta okwu amamihe ndị papa m gwara m; ha agbawo m ume ma kasie m obi n’afọ nile m ji jee ozi.

Onye ọzọ gbara m ume bụ otu nwanna nwanyị Onye Kraịst dị afọ 75 nke nọ n’ọgbakọ Sedan onye aha ya bụ Elise Motte. N’oge okpomọkụ, m na-eji ịnyịnya ígwè m aga n’obodo nta ndị dịpụrụ adịpụ ịga mee nkwusa, Elise na-eji ụgbọ okporo ígwè esonyere m. Otú ọ dị, otu ụbọchị, ndị ọrụ ụgbọ okporo ígwè gbara abụbọ ọrụ, Elise apụghịkwa ịla. Nanị ihe ngwọta m pụrụ icheta bụ iji ebe e ji ebu ibu n’ịnyịnya ígwè m kwọlaa ya—nke ahụ adịghị enye ntụsara ahụ́. N’ụtụtụ echi ya, ewetara m fom ma kwọrọ Elise n’ụlọ ya. Ọ kwụsịrị iji ụgbọ okporo ígwè aga, sitekwa n’ichekwa ego ọ na-ejibu agba ụgbọ okporo ígwè, ọ na-enwe ike ịzụtara anyị ihe ọṅụṅụ dị ọkụ n’oge nri ehihie. Ònye gaara eche na ịnyịnya ígwè m ga-aghọ ụgbọ njem ọha na eze?

Inwekwu Ibu Ọrụ

Na 1950, a gwara m ka m jee ozi dị ka onye nlekọta sekit n’ebe ugwu France nile. Ebe ọ bụ na m dị nanị afọ 23, ụjọ tụrụ m na mbụ. Echere m na alaka ụlọ ọrụ hiere ụzọ! Ajụjụ ndị m nọ na-ajụ onwe m bụ: ‘M̀ ruru eru ma n’ụzọ ime mmụọ ma n’ụzọ anụ ahụ́ ịrụ ọrụ ahụ? Olee otú m pụrụ isi nagide ibi n’ụlọ dị iche kwa izu?’ Ọzọkwa, kemgbe m dị afọ isii, anọwo m na-arịa ọrịa anya a na-akpọ ọrịa anya ùhiè. Ọrịa a mere ka otu mkpụrụ anya m na-aba n’ime. M na-echekarị banyere nke a, na-echegbu onwe m banyere otú ndị ọzọ ga-esi emeghachi omume. Enwetara m nnọọ enyemaka site n’aka Stefan Behunick, onye gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ndị ozi ala ọzọ nke Gilead. E si Poland chụpụ Nwanna Behunick n’ihi ọrụ nkwusa ya, e kenyeziri ya ọrụ na France. Obi ike ya kpaliri m n’ezie. O nwere nkwanye ùgwù miri emi maka Jehova na eziokwu ahụ. Ụfọdụ chere na ọ na-emeso m ihe n’aka ike, ma amụtara m ihe buru ibu n’aka ya. Nkwuwa okwu ya nyeere m aka inwekwu obi ike.

Ọrụ sekit nyere m ohere inweta ahụmahụ ozi ubi ụfọdụ magburu onwe ha. Na 1953, a gwara m ka m leta otu Maazị Paoli, bụ́ onye bi n’ebe ndịda Paris, nke tụkwara ọda Ụlọ Nche. Anyị zutere, achọpụtakwara m na o si n’ọrụ agha laa ezumike nká, nakwa na Ụlọ Nche na-amasị ya. Ọ gwara m na mgbe ya gụsịrị otu isiokwu pụtara n’oge na-adịbeghị anya bụ́ nke kwuru banyere Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst, na ya mere Ememe Ncheta nanị ya ma jiri oge fọrọ afọ n’uhuruchi ahụ gụọ Abụ Ọma. Mkparịta ụka anyị wekọọrọ ihe ka ukwuu n’ehihie ahụ. Tupu mụ alaa, anyị kwuru okwu ná mkpirikpi banyere baptizim. Emesịrị m kpọọ ya òkù ịbịa mgbakọ sekit anyị nke e nwere ná mmalite 1954. Ọ bịara, otu n’ime mmadụ 26 e mekwara baptizim ná mgbakọ ahụ bụ Nwanna Paoli. Ahụmahụ ndị dị otú ahụ ka na-enye m ọṅụ.

Rosa: N’October 1948, amalitere m ije ozi dị ka ọsụ ụzọ. Mgbe m jesịrị ozi n’Anor, nke dịdewere Belgium, e kenyere mụ na onye ọsụ ụzọ ọzọ, bụ́ Irène Kolanski (nke na-azazi Leroy), ọrụ na Paris. Anyị bi n’otu obere ọnụ ụlọ na Saint-Germain-des-Près nke dị n’etiti obodo ahụ. N’ịbụ onye a zụlitere n’ime obodo, ana m atụ nnọọ ndị Paris ụjọ. Ana m eche na ha nile wara anya ma nwee ụbụrụ na-aghọ ụkọ. Ma n’oge na-adịghị anya, amatara m site n’imere ha nkwusa na ha adịghị iche ná ndị ọzọ. Mgbe mgbe, ndị na-elekọta ụlọ na-achụ anyị ọsọ, ịmalite ọmụmụ Bible na-esikwa ike. N’agbanyeghị nke ahụ, ụfọdụ ndị nabatara ozi anyị.

N’otu mgbakọ sekit e nwere na 1951, a gbara mụ na Irène ajụjụ ọnụ banyere ozi ọsụ ụzọ anyị. Ị̀ ma onye gbara anyị ajụjụ ọnụ? Ọ bụ otu onye nlekọta sekit na-akatabeghị ahụ́ nke aha ya bụ Marian Szumiga. Anyị ezutewo otu ugboro tupu mgbe ahụ, ma mgbe mgbakọ ahụ gasịrị, anyị malitere iderịta akwụkwọ ozi. Mụ na Marian nwekọrọ ọtụtụ ihe ọnụ, nke gụnyere na e mere anyị baptizim n’otu afọ, anyị aghọọkwa ndị ọsụ ụzọ n’otu afọ. Otú ọ dị, nke kasị mkpa bụ na anyị abụọ chọrọ ịnọ n’ozi oge nile. Ya mere, mgbe anyị jiri ekpere tụlechaa ya, anyị lụrụ na July 31, 1956. Mgbe nke ahụ gasịrị, amalitere m ibi nnọọ ndụ ọhụrụ kpamkpam. Ọ bụghị nanị na aghaghị m ime ka ọrụ m dị ka nwunye mara m ahụ́ kamakwa aghaghị m isonyere Marian n’ọrụ sekit, bụ́ nke pụtara ihi n’ụlọ dị iche kwa izu. Na mbụ, ọ dịghịrị m mfe, ma ọṅụ buru ibu na-echere anyị.

Ndụ Na-enye Afọ Ojuju

Marian: Ruo ọtụtụ afọ, anyị enwewo ihe ùgwù nke inye aka ịhazi ọtụtụ mgbakọ. Nke kasị enye m obi ụtọ ma m cheta ya bụ otu e nwere na 1966, na Bordeaux. N’oge ahụ, a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu na Portugal. Ya mere, e mekwara ihe omume mgbakọ ahụ n’asụsụ Portuguese n’ihi Ndịàmà pụrụ ime njem gaa France. Ọtụtụ narị ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ Ndị Kraịst si Portugal bịara, ma ihe ịma aka e nwere bụ ebe ha ga-ebi. Ebe ọ bụ na Ndịàmà nọ na Bordeaux enweghị ọnụ ụlọ zuru ezu n’ụlọ ha, anyị natara otu ebe a na-eme ihe nkiri ná ngo iji mere ebe obibi. Anyị bupụsịrị oche nile, werekwa ákwà mgbochi dị ebe ahụ kewaa ụlọ nzukọ ahụ ịbụ ụlọ obibi abụọ, otu maka ụmụnna ndị nwoke, nke ọzọkwa maka ndị nwanyị. Anyị rụkwara ebe ịsa ahụ́ na ebe ịkwọ aka, tụọkwa ahịhịa mataras n’ala ma jiri ákwà kpuchie ya. Ndokwa a juru onye ọ bụla afọ.

Mgbe nnọkọ nke ọ bụla nke mgbakọ ahụ gasịrị, anyị letara ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị n’ebe obibi ahụ. Mmadụ nile nwere nnọọ obi ụtọ n’ebe ahụ. Lee ka ahụmahụ ndị ha nwere n’agbanyeghị ọtụtụ afọ nke idi mmegide si gbaa anyị ume! Mgbe ha lara ná ngwụsị nke mgbakọ ahụ, anya mmiri juru anyị nile anya.

Ihe ùgwù ọzọ bịara afọ abụọ tupu mgbe ahụ, na 1964, bụ́ mgbe a gwara m ka m jee ozi dị ka onye nlekọta distrikti. Ọzọkwa, anọ m na-eche ma m̀ ruru eru maka ọrụ ahụ. Ma agwara m onwe m na ọ bụrụ na ndị na-enye ọrụ gwara m rụọ ọrụ ahụ, o doro anya na ha chere na m ga-arụli ya. Ọ bụ ahụmahụ magburu onwe ya iso ndị nlekọta ndị ọzọ na-ejegharị ejegharị na-eje ozi n’ụzọ chiri anya. Amụtara m ọtụtụ ihe site n’aka ha. Ọtụtụ n’ime ha bụ nnọọ ndị nlereanya n’inwe ndidi na ịnọgidesi ike n’ihe, àgwà ndị dị oké mkpa n’anya Jehova. Amụtawo m na ọ bụrụ na anyị amụta ichere, Jehova ma ebe ọ ga-achọta anyị.

Na 1982 alaka ụlọ ọrụ gwara anyị ka anyị na-elekọtakwa otu ìgwè na-asụ Polish nke nwere ndị nkwusa 12 na Boulogne-Billancourt, nke dị n’ebe dịpụrụ adịpụ na Paris. Nke ahụ bụ ihe ịtụnanya. Amaara m okwu ọchịchị Chineke n’asụsụ Polish, ma ọ na-esiri m ike imepụta ahịrịokwu. N’agbanyeghị nke ahụ, obiọma na ịdị njikere nke ụmụnna ndị ahụ nyeere m aka n’ụzọ dị ukwuu. Taa, e nwere ihe dị ka ndị nkwusa 170 n’ọgbakọ ahụ, gụnyere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị ọsụ ụzọ 60. Mgbe e mesịrị, mụ na Rosa letakwara ìgwè ndị na-asụ Polish n’Austria, Denmark, nakwa na Germany.

Ọnọdụ Ndị Na-agbanwe Agbanwe

Ileta ọgbakọ dị iche iche ghọrọ akụkụ nke ndụ anyị, ma nsogbu ahụ́ ike m na-akawanye njọ chọrọ na anyị ga-akwụsị ozi njegharị anyị na 2001. Anyị chọtara ụlọ n’obodo Pithiviers, bụ́ ebe nwanne m nwanyị bụ́ Ruth bi. Alaka ụlọ ọrụ ji obiọma kenye anyị ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ma mee ka awa a chọrọ anyị n’aka dabere n’ọnọdụ anyị.

Rosa: Afọ nke mbụ ka anyị kwụsịchara ọrụ sekit siiri m nnọọ ike. Mgbanwe ahụ bịara nnọọ ngwa ngwa nke na m nwere mmetụta nke ịbụ onye na-abaghịzi uru. Mgbe ahụ, echetaara m onwe m, sị, ‘Ị ka pụrụ iji oge na ume i nwere mee ihe nke ọma site n’ije ozi dị ka ọsụ ụzọ.’ Taa, obi dị m ụtọ iso ndị ọsụ ụzọ ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ anyị na-eje ozi.

Jehova Elekọtawo Anyị Mgbe Nile

Marian: Ana m ekele Jehova nke ukwuu na Rosa abụwo onye ibe m ruo afọ 48 ugbu a. N’afọ nile ahụ anyị rụrụ ọrụ njegharị, ọ kwadowo m n’ụzọ dị ukwuu. Ọ dịghị mgbe m nụrụ o kwuru, sị, ‘A sịtụ nnọọ na anyị ga-akwụsị ma nwee ebe obibi nke anyị.’

Rosa: Mgbe ụfọdụ, ụfọdụ ndị na-asị m, “Ndụ ị na-ebi adịghị otú o kwesịrị. Ị na-ebinyere ndị ọzọ mgbe nile.” Ma gịnị n’ezie bụ ‘ndụ dị otú o kwesịrị’? Mgbe mgbe, anyị na-ewere ọtụtụ ihe ndị pụrụ ịghọ ihe mgbochi nye nchụso nke ihe ime mmụọ gbaa onwe anyị gburugburu. Ihe ndị dị anyị mkpa n’ezie bụ àkwà dị mma, tebụl, na ihe ole na ole ndị ọzọ bụ́ isi. Dị ka ndị ọsụ ụzọ, anyị enweghị ihe buru ibu n’ụzọ ihe onwunwe, n’agbanyeghị nke ahụ, anyị nwere ihe nile dị anyị mkpa iji mee uche Jehova. Mgbe ụfọdụ, a jụwo m, sị, “Gịnị ka ị ga-eme mgbe ị kara nká n’enweghị ebe obibi nke gị na ego ezumike nká?” Mgbe ahụ, ana m ehota ihe dị n’Abụ Ọma 34:10: “Ma ndị na-achọ Jehova, ọ dịghị ezi ihe ọ bụla ga-akọ ha.” Jehova elekọtawo anyị mgbe nile.

Marian: Ọ bụ eziokwu! N’ezie, Jehova enyewo anyị ihe karịrị nnọọ ihe ndị dị anyị mkpa. Dị ka ihe atụ, na 1958, a họọrọ m ịnọchite anya sekit anyị ná mgbakọ mba nile e nwere na New York. Otú ọ dị, anyị enweghị ego a ga-eji zụtara Rosa tiketi. Otu uhuruchi, otu nwanna nwoke nyere anyị envelopu nke e dere “New York” n’elu ya. Onyinye nọ na ya mere ka Rosa soro m mee njem ahụ!

Mụ na Rosa enweghị ihe ịkwa ụta ọ bụla banyere afọ ndị anyị jiworo jeere Jehova ozi. Ọ dịghị ihe funahụrụ anyị kama anyị nwetara ihe nile—ndụ na-enye afọ ojuju na obi ụtọ n’ozi oge nile. Jehova bụ nnọọ Chineke dị ebube. Anyị amụtawo ịtụkwasị ya obi kpamkpam, ịhụnanya anyị nwekwara n’ebe ọ nọ emikwuwo emi. Ụfọdụ ụmụnna anyị Ndị Kraịst ejiwo ndụ ha kwụọ ụgwọ ikwesị ntụkwasị obi ha. Otú ọ dị, ekweere m na ka ọtụtụ afọ na-agafe, mmadụ pụkwara iji nke nta nke nta na-achụ ndụ ya n’àjà. Nke ahụ bụ ihe mụ na Rosa gbalịworo ime ruo ugbu a, nke ahụ bụkwa ihe anyị kpebiri ime n’ọdịnihu.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 14 E bipụtara akụkọ ndụ Louis Piéchota, “Alanarịrị m ‘Ije Ọnwụ’ Ahụ,” n’Ụlọ Nche nke February 15, 1981.

[Foto dị na peeji nke 20]

François na Anna Szumiga na ụmụ ha, Stéphanie, Stéphane, Mélanie, na Marian ihe dị ka n’afọ 1930. Marian guzo n’elu oche

[Foto dị na peeji nke 22]

N’elu: Inyefe akwụkwọ ndị dabeere na Bible n’ebe a na-ere ihe n’ahịa n’Armentières, n’ebe ugwu France, na 1950

[Foto dị na peeji nke 22]

N’aka ekpe: Stefan Behunick na Marian na 1950

[Foto dị na peeji nke 23]

Marian na Rosa n’ụbọchị sochiri agbamakwụkwọ ha

[Foto dị na peeji nke 23]

Rosa (n’isi isi aka ekpe) na onye ya na ya na-asụkọ ụzọ bụ́ Irène (onye nke anọ site n’aka ekpe), ka ha na-akpọsa otu mgbakọ a ga-enwe na 1951

[Foto dị na peeji nke 23]

Ọ bụ ịnyịnya ígwè ka anyị na-ejikarị eme njem n’oge anyị na-eleta ọgbakọ dị iche iche