Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ihe Nketa I Ji Ụmụ Gị n’Ụgwọ?

Olee Ihe Nketa I Ji Ụmụ Gị n’Ụgwọ?

Olee Ihe Nketa I Ji Ụmụ Gị n’Ụgwọ?

PAVLOS, bụ́ nwoke ji ezinụlọ onye si n’ebe ndịda Europe, adịghị anọkebe n’ụlọ iso nwunye ya na ụmụ ya—ụmụ nwanyị abụọ, ndị dị afọ 13 na 11, na nwa ya nwoke dị afọ 7—nọkọọ. Pavlos na-eji ụbọchị asaa n’izu arụ ọrụ abụọ na-ewe ogologo oge kwa ụbọchị, na-agbalị inweta ego buru ibu iji mezuo nrọ ya. Ọ chọrọ ịzụtara nke ọ bụla n’ime ụmụ ya ndị nwanyị ụlọ, ọ chọkwara ịmalitere nwa ya nwoke obere ahịa. Nwunye ya, bụ́ Sofia na-adọga iji nweta ọtụtụ ákwà linin, ngwá ndị e ji esi nri na kichin, efere nkụwa, na ngwá ndị e ji eri nri maka ebe obibi ọhụrụ ndị a. A jụọ ha ihe mere ha ji arụsi ọrụ ike otú a, ha na-azakọta ọnụ, sị, “Maka ụmụ anyị!”

Dị ka Pavlos na Sofia, ọtụtụ ndị nne na nna n’ụwa nile na-eme ihe nile ha nwere ike ime iji malitere ụmụ ha ndụ n’ụzọ kasị mma. Ụfọdụ na-edopụ ego iche bụ́ nke ụmụ ha ga-eji mee ihe n’ọdịnihu. Ndị ọzọ na-ahụ na ụmụ ha nwetara agụmakwụkwọ kwesịrị ekwesị ma mụta nkà ndị ga-abara ha uru ná ndụ. Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị nne na nna na-ele onyinye ndị dị otú ahụ anya dị ka ihe nketa na-egosi ịhụnanya, ime ndokwa dị otú ahụ na-emekarị ka ndị nne na nna na-enwe nrụgide dị ukwuu iji mezuo atụmanya nke ndị ikwu, ndị enyi, na ndị obodo ha bi na ya. N’ihi ya, ndị nne na nna bụ́ ndị na-eche banyere ụmụ ha na-ajụ n’ụzọ ziri ezi, sị, ‘Olee ihe anyị ji ụmụ anyị n’ụgwọ?’

Ịkpakọba Ihe Maka Ọdịnihu

Ọ bụghị nanị na ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị kamakwa ọ bụ ihe Akwụkwọ Nsọ kwadoro bụ́ ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ịkpakọbara ụmụ ha ihe. Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst nke oge ya, sị: “Ọ bụghị ụmụ kwesịrị ịkpakọbara ndị mụrụ ha ihe, kama ọ bụ ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ịkpakọbara ụmụ ha ihe.” (2 Ndị Kọrint 12:14) Pọl kwukwara na ndị mụrụ ụmụ ilekọta ụmụ ha bụ ibu ọrụ siri ike. O dere, sị: “N’ezie, ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị egboro ndị nke ya mkpa ha, karịsịakwa ndị bụ́ ndị ezinụlọ ya, ọ jụwo okwukwe, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.” (1 Timoti 5:8) Ọtụtụ ihe ndekọ Bible na-egosi na okwu ndị metụtara ihe nketa dị mkpa n’etiti ndị ohu Chineke n’oge Bible.—Rut 2:19, 20; 3:9-13; 4:1-22; Job 42:15.

Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, ndị nne na nna na-emikpu onwe ha n’ịkpakọbara ụmụ ha ihe nketa buru ibu. N’ihi gịnị? Manolis, bụ́ nna nke si n’ebe ndịda Europe kwaga United States, kwuru otu ihe kpatara ya: “Ndị nne na nna bụ́ ndị tara ahụhụ n’ihi Agha Ụwa nke Abụọ, ndị ụnwụ nri na ịda ogbenye kpara aka ọjọọ, na-ekpebisi ike ime ka ụmụ ha bie ndụ ka mma.” Ọ na-agbakwụnye, sị: “N’ihi iche nnọọ na iwu ji ha ịkpakọbara ụmụ ha ọtụtụ ihe na ọchịchọ ha ịmalitere ụmụ ha ndụ kasị mma, mgbe ụfọdụ, ndị nne na nna na-akpatara onwe ha mmerụ ahụ́.” N’ezie, ndị nne na nna ụfọdụ na-anapụ onwe ha ihe ndị dị mkpa ná ndụ iji kpakọbara ụmụ ha ihe onwunwe. Ma ọ̀ bụ ihe amamihe dị na ya ndị nne na nna ịchụso ụzọ ndụ dị otú ahụ?

“Ihe Efu na Ihe Ọjọọ nke Hiri Nne”

Eze Solomọn nke Izrel oge ochie nwere okwu ịdọ aka ná ntị banyere ihe nketa. O dere, sị: “Mụ onwe m kpọkwara ndọgbu m nile asị, bụ́ nke mụ onwe m na-adọgbu onwe m n’ọrụ n’okpuru anyanwụ: n’ihi na m ga-ahapụrụ ya mmadụ nke ga-anọ mgbe m gasịrị. Ma ònye maara ma ọ ga-abụ onye maara ihe ma ọ bụ onye nzuzu? ma ọ ga-achị ndọgbu m nile nke m dọgbuworo onwe m n’ọrụ, na nke m meworo n’amamihe n’okpuru anyanwụ. Nke a bụkwa ihe efu. . . . N’ihi na mmadụ dị nke ndọgbu ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ dị n’amamihe, na n’ihe ọmụma, na n’izi ezi; ma ọ bụ mmadụ nke na-adọgbughị onwe ya n’ọrụ n’ime ya ka ọ ga-enye ya ka ọ bụrụ òkè ya. Nke a bụkwa ihe efu na ihe ọjọọ nke hiri nne.”—Eklisiastis 2:18-21.

Dị ka Solomọn na-akọwa, ndị na-anata ihe nketa nwere ike ghara ịghọtacha abamuru ya n’ihi na ha adọgbughị onwe ha n’ọrụ maka ya. N’ihi ya, ndị nketa nwere ike jiri ihe nne na nna ha dọgburu onwe ha n’ọrụ ịkpakọba mee ihe iberibe. Ha pụrụ ọbụna imefusị ihe onwunwe dị otú ahụ a tara ahụhụ nweta. (Luk 15:11-16) Lee ka nke ahụ ga-esi bụrụ “ihe efu na ihe ọjọọ nke hiri nne”!

Ihe Nketa na Anyaukwu

Ọ dị ihe ọzọ ndị nne na nna kwesịrị ichebara echiche. N’ọdịbendị ebe e ji ihe nketa na ihe nketa alụmdi na nwunye kpọrọ ihe nke ukwuu, ụmụaka pụrụ ịghọ ndị anyaukwu, na-achọ ihe onwunwe ma ọ bụ ego karịrị nke ndị nne na nna ha pụrụ inye. “Ebere emeerela m nna nke nwere ụmụ nwanyị abụọ ma ọ bụ atọ,” ka Loukas bụ́ nna nke si Gris, ji egwuregwu kwuo. Ọ na-ekwu, sị: “Ụmụaka ndị nwanyị pụrụ iji ihe nna ha nwere ike inye ha tụnyere ihe ndị nne na nna ndị ọzọ ‘kpakọbajuuru’ ụmụ ha. Ha pụrụ ikwu na o yikararịghị ka ọ̀ dị onye ga-achọ ịlụ ha ma ọ bụrụ na ha apụghị iweta ụgwọ isi buru ibu.” *

Manolis, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, na-ekwu, sị: “Nwa okorobịa pụrụ ịgbatị oge mbedo ya ruo mgbe nna nwanyị ọ na-aga ịlụ kwere nkwa ihe ọ ga-enye ya maka nwanyị ahụ, nke na-abụkarị ala na ụlọ ma ọ bụ ego buru ibu. Ọ pụrụ ịghọ iji iyi egwu anapụ mmadụ ihe.”

Bible na-adọ aka ná ntị megide ụdị ọ bụla nke anyaukwu. Solomọn dere, sị: “Ihe nketa nke a na-anara ọsọ ọsọ [ma ọ bụ, “nke e ji anyaukwu anara”] na mbụ; a gaghị agọzikwa ikpeazụ ya.” (Ilu 20:21) Pọl onyeozi mesiri ya ike, sị: “Ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ nile.”—1 Timoti 6:10; Ndị Efesọs 5:5.

‘Amamihe na Ihe Nketa’

N’eziokwu, ihe nketa batụrụ uru, ma amamihe bara uru karịa ihe onwunwe. Eze Solomọn dere, sị: “Amamihe dị mma dị ka ihe nketa . . . N’ihi na amamihe bụ ndò, ego bụkwa ndò: ma ọkaaka nke ihe ọmụma bụ, na amamihe na-eme ka onye nwe ya dị ndụ.” (Eklisiastis 7:11, 12; Ilu 2:7; 3:21) Ọ bụ ezie na ego na-enyetụ nchebe, na-eme ka onye nwere ya nwee ike inweta ihe dị ya mkpa, ọ ka pụrụ ifunahụ mmadụ. N’aka nke ọzọ, amamihe—ikike iji ihe ọmụma edozi nsogbu ma ọ bụ eru ihe mgbaru ọsọ ụfọdụ—pụrụ ichebe mmadụ pụọ n’itinye onwe ya n’ihe ize ndụ na-enweghị isi. Mgbe ọ dabeere n’ezi ịtụ egwu Chineke, ọ pụrụ inyere onye ahụ aka inweta ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ Chineke nke ga-abịa n’isi nso—ihe nketa dị oké ọnụ ahịa n’ezie!—2 Pita 3:13.

Nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-egosipụta amamihe dị otú ahụ site n’ibute ihe ndị ka mkpa ụzọ, nyekwara ụmụ ha aka ime otu ihe ahụ. (Ndị Filipaị 1:10) Ịkpakọbara ụmụaka ihe onwunwe ekwesịghị ibutere ihe ime mmụọ ụzọ. Jizọs gbara ụmụazụ ya ume, sị: “Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze [Chineke] na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile.” (Matiu 6:33) Ndị nne na nna bụ́ ndị na-esetịpụrụ ezinụlọ ha bụ́ Ndị Kraịst ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ pụrụ ịtụ anya inweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu. Eze Solomọn maara ihe dere, sị: “Nna nke onye ezi omume ga-etegharị egwú ọṅụ nke ukwuu: onye na-amụkwa onye maara ihe ga-aṅụrị ọṅụ na ya. Ka nna gị na nne gị ṅụrịa, ka nwanyị mụworo gị tegharịakwa egwú ọṅụ.”—Ilu 23:24, 25.

Ihe Nketa Na-adịgide Adịgide

Nye ndị Izrel oge ochie, ihe ndị metụtara ihe nketa dị oké mkpa. (1 Ndị Eze 21:2-6) Otú ọ dị, Jehova dụrụ ha ọdụ, sị: “Okwu ndị a, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, ga-adịkwasịkwa n’obi gị: ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị, ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.” (Deuterọnọmi 6:6, 7) N’ụzọ yiri nke ahụ, a gwara ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst, sị: “Nọgidenụ na-azụlite [ụmụ unu] n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.”—Ndị Efesọs 6:4.

Ndị nne na nna bụ́ ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe na-aghọta na inye ezinụlọ ha ihe na-akpa ha gụnyere inye ntụziaka sitere na Bible. Andreas, bụ́ nna nke ji ụmụ atọ, na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na ụmụaka amụta itinye ụkpụrụ Chineke n’ọrụ ná ndụ ha, ha ga-abụ ndị a kwadebere n’ụzọ ka mma maka ọdịnihu.” Ihe nketa dị otú ahụ na-elekwasịkwa anya n’inyere ha aka iso Onye Okike ha na-enwe mmekọrịta chiri anya na ịzụlite mmekọrịta dị otú ahụ.—1 Timoti 6:19.

Ì chewo echiche banyere ime ndokwa maka ọdịnihu ime mmụọ nke nwa gị? Dị ka ihe atụ, gịnị ka ndị nne na nna pụrụ ime ma ọ bụrụ na nwa ha na-achụso ozi oge nile? Ọ bụ ezie na onye ozi oge nile ekwesịghị ikwu ka e nye ya nkwado ego ma ọ bụ ịtụ anya ya, ndị nne na nna na-ahụ n’anya pụrụ ikpebi ‘iso ya kerịta ihe dị ka mkpa ya si dị’ iji nyere ya aka ịnọgide n’ozi oge nile. (Ndị Rom 12:13; 1 Samuel 2:18, 19; Ndị Filipaị 4:14-18) N’ezie, àgwà inye nkwado dị otú ahụ ga-atọ Jehova ụtọ.

Ya mere, gịnị ka ndị nne na nna ji ụmụ ha n’ụgwọ? E wezụga ịhụ maka mkpa anụ ahụ́ ha, ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ga-ahụ na ụmụ ha nwetara ụbara ihe nketa ime mmụọ nke ga-abara ha uru ruo mgbe ebighị ebi. N’ụzọ dị otú ahụ, okwu ndị dị n’Abụ Ọma 37:18 ga-emezu: “Jehova maara ụbọchị nile nke ndị zuru okè: ihe nketa ha ga-adịrukwa mgbe ebighị ebi.”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Okwu ndị e hotara na paragraf a nakwa ná ndị na-eso ya na-egosi omenala ndị e nwere n’ala ụfọdụ bụ́ ebe ndị a na-atụ anya ka ezinụlọ nke nwanyị a na-alụ ọhụrụ kwụọ ezinụlọ nke nwoke na-alụ nwunye ọhụrụ ụgwọ isi ma ọ bụ nye ha onyinye. N’ọtụtụ omenala ndị Africa, ọ bụ nwoke ahụ ma ọ bụ ezinụlọ ya ka a na-atụ anya ka ha kwụọ ezinụlọ nke nwanyị a na-alụ ọhụrụ ụgwọ isi ma nye ha onyinye. Otú ọ dị, ụkpụrụ ndị e setịpụrụ ebe a na-emetụtacha ọnọdụ abụọ ahụ.

[Foto ndị dị na peeji nke 26, 27]

Ọdịnihu dị aṅaa ka i bu n’uche maka ụmụ gị?