Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịtụle Akụ̀ Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa nke Chester Beatty

Ịtụle Akụ̀ Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa nke Chester Beatty

Ịtụle Akụ̀ Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa nke Chester Beatty

“EBE nwere ọtụtụ akụ̀ ndị dị oké ọnụ ahịa sitere n’ọtụtụ ebe ndị mepere anya e nwere n’oge ochie, . . . nke nwere ọtụtụ ọmarịcha ihe ọkpụkpụ na ihe osise.” Nke ahụ bụ otú onye na-elekọtabu Ọ́bá Akwụkwọ Chester Beatty dị na Dublin, Ireland bụ́ R. J. Hayes si kọwaa ọ́bá akwụkwọ ahụ. O nwere ọtụtụ ihe mgbe ochie ndị dị oké ọnụ ahịa, ọrụ nkà ndị magburu onwe ha, na akwụkwọ na ihe odide ndị dị oké ọnụ ahịa. Ònyekwanụ bụ Chester Beatty? Oleekwa akụ̀ ndị dị oké ọnụ ahịa o wekọtara?

Alfred Chester Beatty, bụ́ onye a mụrụ na 1875 na New York, U.S.A., sitere n’agbụrụ ndị Scotland, Ireland, na England. Ka ọ na-erule mgbe ọ dị afọ 32, ọ bawo ọgaranya dị ka injinia na ọkachamara n’ihe banyere akụ̀ ndị a na-egwute n’ime ala. Ná ndụ ya nile, o ji akụ̀ na ụba buru ibu o nwere wekọta ihe ndị magburu onwe ha. Mgbe ọ nwụrụ na 1968 ka ọ gbasịrị afọ 92, Beatty hapụụrụ ndị Ireland ihe nile o wekọtara.

Olee Ihe Ndị O Wekọtara?

Ihe ndị Beatty wekọtara buru ibu ma dịgasịa iche. Ọ bụ nanị ihe dị ka 1 pasent n’ime ya ka a na-egosi n’otu mgbe. O wekọtara ihe ndị siri ike nnweta na ndị dị oké ọnụ ahịa site n’oge na ọdịbendị dịgasị iche ndị dịruru ọtụtụ puku afọ—site na Europe nke Oge Ụwa Na-emepechabeghị Anya na nke Oge Ntụte, nakwa site n’ọtụtụ mba Eshia na ndị nke Africa. Dị ka ihe atụ, a na-ewere ihe osise ndị Japan e ji osisi a tụrụ atụ bie bụ́ nke so n’ihe ndị o wekọtara dị ka nke kasị mma n’ụwa.

Ọtụtụ narị mbadamba ụrọ ndị Babilọn na ndị Sumer mara mma e ji ihe odide cuneiform oge ochie dee ihe na ha bụ́ ndị o wekọtara dị nnọọ iche n’ihe ndị a tụrụ atụ. Ndị biri na Mesopotemia ihe karịrị afọ 4,000 gara aga na-akọ akụkọ ndụ ha n’ụzọ zuru ezu ná mbadamba ụrọ ndị dị mmiri mmiri, bụ́ ndị a na-emesịzi ṅakpọọ n’ọkụ. Ọtụtụ n’ime mbadamba ụrọ ndị ahụ adịgidewo ruo n’oge anyị, na-enye anyị ihe àmà doro anya nke otú e si ede ihe n’oge ochie.

Mmasị O Nwere n’Akwụkwọ

O yiri ka nkà dị n’imepụta akwụkwọ ndị mara mma ọ̀ dọọrọ mmasị Chester Beatty. O wekọtara ọtụtụ puku akwụkwọ ndị na-abụghị nke okpukpe na ndị nke okpukpe, gụnyere ụfọdụ akwụkwọ Koran a chọrọ nnọọ mma. Otu onye edemede na-ekwu na “otú e si hazie ihe odide Arabic ya masịrị ya nke ukwuu, . . . nakwa na peeji ya ndị e ji ọlaọcha na ọlaedo na ihe ndị ọzọ na-egbukepụ egbukepụ sitere n’okike mepụta bụ́ ndị e ji aka akwụkwọ ndị mara mma dee ihe na ha kpaliri mmasị o nwere n’àgwà ndị mara mma.”

Nkume jade dọọrọ mmasị Chester Beatty, ọbụna dị ka ọ dọọrọ nke ụfọdụ ndị eze ukwu China na narị afọ ndị bu nke ya ụzọ. Ha lere ezigbo nkume jade anya dị ka nkume dị oké ọnụ ahịa karịa nkume nile, nke bara nnọọ uru karịa ọlaedo. Ndị ọchịchị a nyere ndị ọkpụ ụzụ ọrụ nke iji ọkpụrụkpụ nkume jade mepụta mbadamba jade dị iche iche. Ndị na-ese ihe bụ́ ndị nwere nkà na-ejizi ihe odide na ihe osise ndị mara mma bụ́ ndị e ji ọlaedo chọọ mma mejupụta peeji ndị a e ji nkume jade mepụta, si otú ahụ na-emepụta akwụkwọ ndị kasị maa mma e mepụtatụrụla. A ma akwụkwọ ndị a Beatty wekọtara ama n’ụwa nile.

Ihe Odide Bible Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa

Nye ndị nwere mmasị na Bible, akụ̀ kasị oké ọnụ ahịa nke Chester Beatty bụ ọtụtụ ihe odide Bible oge ochie na ndị nke Oge Ụwa Na-emepechabeghị Anya ndị o wekọtara. Ọmarịcha ihe odide ndị a chọrọ mma na-egosipụta ndidi na nkà nke ndị odeakwụkwọ bụ́ ndị ji aka depụtaghachi ha. Akwụkwọ ndị e biri ebi na-egosipụta nkà nke ndị ndụkọta na ndị obibi akwụkwọ nke oge mbụ. Dị ka ihe atụ, Anton Koberger, bụ́ onye dịrị ndụ n’ihe dị ka n’oge Johannes Gutenberg na onye a kọwara dị ka “otu n’ime ndị obibi akwụkwọ oge mbụ kasị mkpa na ndị kasị rụsie ọrụ ike” biri Biblia Latina na Nuremberg na 1479.

Otu ihe pụrụ iche dị n’Ọ́bá Akwụkwọ Chester Beatty bụ otu ihe odide vellum nke Ephraem, bụ́ ọkà mmụta si Siria, dere ná mbido narị afọ nke anọ. Ephraem hotara ọtụtụ ihe e kwuru n’otu akwụkwọ e dere na narị afọ nke abụọ nke a na-akpọ Diatessaron. N’ime ya, onye dere ya bụ́ Tatian chịkọtara Oziọma anọ ahụ kọrọ banyere ndụ Jizọs Kraịst n’otu akụkọ kwekọrọ ekwekọ. Ndị edemede e nwere ka oge na-aga zoro aka na Diatessaron, ma ọ dịghị otu n’ime akwụkwọ ahụ ka dịnụ. Ọbụna ụfọdụ ndị ọkà mmụta nke narị afọ nke 19 nwere obi abụọ ma ọ̀ dị mgbe e nwere akwụkwọ dị otú ahụ. Otú ọ dị, na 1956, Beatty chọtara nkọwa Ephraem nke Diatessaron Tatian—nchọpụta nke tụnyere ụtụ n’ihe àmà ndị e nweburu enwe na Bible ziri ezi ma na-ekwu eziokwu.

Ikpo Ihe Odide Papaịrọs Dị Oké Ọnụ Ahịa

Beatty wekọtakwara ọtụtụ ihe odide papaịrọs, ma ndị nke okpukpe ma ndị na-abụghị nke okpukpe. E dere ihe karịrị codex papaịrọs 50 n’ime ha tupu narị afọ nke anọ O.A. E si ná nnukwu ikpo papaịrọs—ndị na-abụkarị ikpo ahịhịa ndị dị n’ịkpa Ijipt bụ́ ndị a na-achọpụtaghị ruo ọtụtụ narị afọ—wepụta ụfọdụ n’ime papaịrọs ndị a. Ọtụtụ ihe odide papaịrọs na-adị iberibe iberibe mgbe e wepụtara ha ire ha. Ndị na-ere ha na-ebu katọn ndị iberibe papaịrọs jupụtara na ha abịa. “Ihe ndị chọrọ ịzụ ha na-eme bụ nnọọ ịmanye aka n’ime ha ma họpụta iberibe kasị ibu bụ́ nke e nwere ihe odide na ya karị,” ka Charles Horton, onye nlekọta nke Ihe Ndị E Wekọtara n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa dị n’Ọ́bá Akwụkwọ Chester Beatty, na-ekwu.

‘Ihe kasị dị ịrịba ama Beatty chọtara,’ ka Horton na-ekwu, nwere codex ndị dị oké ọnụ ahịa nke Bible bụ́ ndị “gụnyere ụfọdụ Agba Ochie na Agba Ọhụrụ nke Ndị Kraịst bụ́ ndị kasị ochie a maara.” Ọ pụrụ ịbụ nnọọ na ndị ahịa maara abamuru nke codex dọrisịrị ha iberibe iberibe iji resị ha ndị dị iche iche. Otú ọ dị, Beatty zụkọtaliri ihe ahụ a chọtara ọnụ. Ma olee otú codex ndị a baruru n’uru? Sir Frederic Kenyon na-akọwa nchọta ha dị ka “nke kasị nnọọ mkpa” kemgbe Tischendorf chọtasịrị Codex Sinaiticus na 1844.

E dere codex ndị a n’agbata narị afọ nke abụọ na nke anọ O.A. N’ime Akwụkwọ Nsọ Hibru dị ná nsụgharị Grik nke Septuagint, e nwere akwụkwọ Jenesis abụọ. Ha bara uru nke ukwuu, ka Kenyon na-ekwu, “n’ihi na ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ dịghị akụkụ nke akwụkwọ ahụ [nke Jenesis] dị na Vaticanus na Sinaiticus,” bụ́ ihe odide vellum ndị e dere na narị afọ nke anọ. Codex atọ nwere akwụkwọ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Otu n’ime ha nwere akụkụ ka ukwuu nke Oziọma anọ ahụ na ọtụtụ akụkụ nke akwụkwọ Ọrụ Ndịozi. Codex nke abụọ, nke nwere ọtụtụ peeji karị bụ́ nke Beatty zụtara ka e mesịrị, fọrọ nke nta ka o nwee akwụkwọ ozi nile nke Pọl, gụnyere akwụkwọ ozi o degaara ndị Hibru. Codex nke atọ nwere ihe dị ka otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke akwụkwọ Mkpughe. Dị ka Kenyon si kwuo, papaịrọs ndị a “ewusikwuwo ike obi ike anyị—bụ́ nke siburu ike—n’Agba Ọhụrụ nke anyị nwetara.”

Papaịrọs Bible Chester Beatty na-egosi na ọ dịla anya Ndị Kraịst malitere iji codex, akwụkwọ nwere peeji, eme ihe n’ọnọdụ akwụkwọ mpịakọta bụ́ nke na-esi ike ojiji, ma eleghị anya tupu ọgwụgwụ nke narị afọ mbụ O.A. Papaịrọs ndị ahụ na-egosikwa na mgbe mgbe n’ihi ụkọ nke ihe ndị e ji ede ihe, ndị ndepụtaghachi na-eji papaịrọs ndị e jibu dee ihe eme ihe. Dị ka ihe atụ, e dere otu ihe odide ndị Copt nke bụ́ akụkụ nke Oziọma Jọn “n’elu ihe yiri ka ọ̀ bụ akwụkwọ e ji ede ihe n’ụlọ akwụkwọ nke nwere mgbakọ na mwepụ ndị Gris.”

Akwụkwọ papaịrọs ndị a adịghị adọrọ adọrọ n’anya, ma ha dị oké ọnụ ahịa. Ha bụ ihe ndị a na-ahụ anya na ndị gbara ọkpụrụkpụ na-agwa anyị banyere mmalite nke Iso Ụzọ Kraịst. “N’ime ha,” ka Charles Horton na-ekwu, “ị pụrụ iji nnọọ anya gị hụ ụdị akwụkwọ Ndị Kraịst mbụ ji mee ihe—akwụkwọ ndị ha ji kpọrọ ihe nke ukwuu.” (Ilu 2:4, 5) Ọ bụrụ na i nwee ike inyocha ụfọdụ n’ime akụ̀ ndị a dị oké ọnụ ahịa dị n’Ọ́bá Akwụkwọ Chester Beatty, ị gaghị akwa ụta na i mere otú ahụ.

[Foto dị na peeji nke 31]

Ihe osise ndị Japan e ji osisi a tụrụ atụ bie nke Katsushika Hokusai biri

[Foto dị na peeji nke 31]

“Biblia Latina” so na Bible ndị mbụ e biri ebi

[Foto dị na peeji nke 31]

Nkọwa Ephraem nke “Diatessaron” Tatian na-emesi ịbụ eziokwu nke Bible ike

[Foto dị na peeji nke 31]

Chester Beatty P45, bụ́ “codex” kasị ochie n’ụwa, nwere akụkụ ka ukwuu nke Oziọma anọ ahụ na ọtụtụ akụkụ nke akwụkwọ Ọrụ Ndịozi n’otu mpịakọta

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 29]

E bipụtaghachiri ya site n’ikike Òtù Ndị Nlekọta nke Ọ́bá Akwụkwọ Chester Beatty, Dublin, ji obiọma nye

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 31]

Ihe osise nile: E bipụtaghachiri ha site n’ikike Òtù Ndị Nlekọta nke Ọ́bá Akwụkwọ Chester Beatty, Dublin, ji obiọma nye