Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Chọpụtanụ Onye Kwesịrị Ekwesị”

“Chọpụtanụ Onye Kwesịrị Ekwesị”

“Chọpụtanụ Onye Kwesịrị Ekwesị”

DAMASKỌS bụ obodo bara ọgaranya na narị afọ mbụ nke Oge Anyị. N’ịbụ nke ubi mkpụrụ osisi gbara gburugburu, ọ dị ka ebe izu ike nye ndị njem si n’ala ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke obodo ahụ. Oge na-adịghị anya ka Jizọs Kraịst nwụsịrị, e nwere ọgbakọ Ndị Kraịst na Damaskọs. Ndị Juu ndị ọ pụrụ ịbụ na ha ghọrọ ụmụazụ Jizọs n’oge Ememe Pentikọst na Jeruselem na 33 O.A. so n’ọgbakọ ahụ. (Ọrụ 2:5, 41) Ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ ndị na-eso ụzọ si Judia kwagara Damaskọs mgbe mkpagbu malitere ka a tụgbusịrị Stivin na nkume.—Ọrụ 8:1.

Eleghị anya, na 34 O.A., otu Onye Kraịst si Damaskọs aha ya bụ Ananaịas natara otu ọrụ dị ịrịba ama. Onyenwe anyị gwara ya, sị: “Bilie, gaa n’okporo ámá a na-akpọ Nke Kwụ Ọtọ, chọọkwa, n’ụlọ Judas, otu nwoke aha ya bụ Sọl, onye Tasọs. N’ihi na, lee! ọ na-ekpe ekpere.”—Ọrụ 9:11.

Okporo ámá ahụ a na-akpọ Nke Kwụ Ọtọ dị ihe dị ka otu kilomita na ọkara n’ogologo ma si n’etiti Damaskọs gafee. Site n’ihe osise dị n’ebe a nke e sere na narị afọ nke 19, anyị na-aghọtatụ ihe okporo ámá ahụ dị ka ya n’oge ochie. N’ihi otú e si rụọ ya, ọ pụrụ ịbụwo na o were Ananaịas oge ụfọdụ ịchọta ụlọ Judas. Otú ọ dị, Ananaịas chọtara ya, ọbịbịa ya dugakwara na Sọl ịghọ Pọl onyeozi, bụ́ onye nkwusa ozi ọma na-anụ ọkụ n’obi.—Ọrụ 9:12-19.

Jizọs ezipụwo ndị na-eso ụzọ ya ma gwa ha ka ha ‘chọpụta ndị kwesịrị’ ozi ọma ahụ. (Matiu 10:11) O yiri nnọọ ka Ananaịas ọ̀ chọrọ Sọl achọ n’ezie. Dị ka Ananaịas, Ndịàmà Jehova na-eji obi ụtọ achọ ndị kwesịrị ekwesị, ha na-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu mgbe ndị mmadụ nabatara ozi ọma nke Alaeze ahụ. Ịchọta ha na-eme ka mgbalị ahụ nile kwesị ekwesị.—1 Ndị Kọrint 15:58.

[Foto dị na peeji nke 32]

‘Okporo ámá a na-akpọ Nke Kwụ Ọtọ’ taa

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]

Site n’akwụkwọ La Tierra Santa, Mpịakọta nke Abụọ, 1830