Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ekpere Onyenwe Anyị—Ihe Ọ Pụtara Nye Gị

Ekpere Onyenwe Anyị—Ihe Ọ Pụtara Nye Gị

Ekpere Onyenwe Anyị—Ihe Ọ Pụtara Nye Gị

A NA-ACHỌTA Ekpere Onyenwe Anyị, dị ka Jizọs Kraịst si kụzie ya n’Ozizi Elu Ugwu ahụ, na Bible na Matiu isi 6, amaokwu 9 ruo 13. Kpọmkwem tupu ya akụzie ekpere a, Jizọs kwuru, sị: “Mgbe ị na-ekpe ekpere, ekwughachila otu ihe ugboro ugboro, dị nnọọ ka ndị mba ọzọ na-eme, n’ihi na ha na-eche na a ga-anụ olu ha n’ihi ọtụtụ okwu ha na-ekwu.”—Matiu 6:7.

Mgbe ahụ, o doro anya na Jizọs ebughị n’obi ka a na-ekpeghachi Ekpere Onyenwe Anyị kpọmkwem otú ahụ o si kụzie ya. N’eziokwu, o mesịrị kụzighachi ekpere a n’ihi ndị ọzọ na-ege ya ntị. (Luk 11:2-4) Ma okwu ndị o ji mee ihe n’ekpere ahụ dịrịtatụ iche n’ihe ndekọ Oziọma Matiu na Luk. Ọzọkwa, Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ejighị kpọmkwem okwu ndị ahụ dị n’ekpere nlereanya ya mee ihe n’ekpere ndị ha kpere ka e mesịrị.

N’ihi gịnị ka e ji dekọọ Ekpere Onyenwe Anyị n’ime Bible? Site n’ekpere nlereanya a, Jizọs na-akụziri anyị otú ekpere anyị pụrụ isi bụrụ nke Chineke na-anakwere. N’ekpere a, anyị na-achọtakwa azịza nke ajụjụ ụfọdụ ndị bụ́ isi ná ndụ. Ya mere, ka anyị tụlee akụkụ nke ọ bụla nke Ekpere Onyenwe Anyị ahụ.

Gịnị Bụ Aha Chineke?

“Nna anyị nke nọ n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.” (Matiu 6:9) Okwu mmeghe a nke ekpere nlereanya ahụ na-enyere anyị aka ịbịaru Chineke nso site n’ịkpọ ya “Nna anyị.” Dị ka nwatakịrị, nke a na-adọta nnọọ n’ebe nne ma ọ bụ nna ya na-ahụ n’anya na nke na-aghọta ya nọ, anyị pụrụ ijekwuru Nna anyị nke eluigwe, na-enwe obi ike na ọ chọrọ ịnụ ekpere anyị. “Gị Onye na-anụ ekpere,” ka Eze Devid bụrụ, “Gị ka anụ ahụ́ nile, bụ́ mmadụ, ga-abịakwute.”—Abụ Ọma 65:2.

Jizọs kụziiri anyị ka anyị na-ekpe ekpere ka e doo aha Chineke nsọ. Ma gịnị bụ aha Chineke? Bible na-aza n’okwu ndị a: “Gị onwe gị, Onye aha Gị bụ Jehova, nanị Gị, bụ Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.” (Abụ Ọma 83:18) Ị̀ gụtatụwo aha ahụ bụ́ Jehova n’ime Bible?

N’ezie, aha Chineke, bụ́ Jehova, pụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ugboro 7,000 n’ime ihe odide oge ochie nke Bible. Otú ọ dị, ụfọdụ ndị nsụgharị eruwo n’ókè nke iwepụ aha a ná nsụgharị Bible ha. Ya mere, o ziri ezi na anyị na-ekpe ekpere ka Onye Okike anyị doo aha ya nsọ. (Ezikiel 36:23) Otu ụzọ isi na-eme ihe kwekọrọ n’ekpere dị otú ahụ bụ iji aha ahụ bụ́ Jehova eme ihe mgbe anyị na-ekpegara Chineke ekpere.

A zụlitere otu nwanyị aha ya bụ Patricia dị ka onye Katọlik, ọ makwaara Ekpere Onyenwe Anyị nke ọma. Olee otú o si meghachi omume mgbe otu n’ime Ndịàmà Jehova gosiri ya aha Chineke n’ime Bible? “O siiri m ike ikweta!” ka o kwuru. “N’ihi ya, ewetara m nsụgharị Bible nke m, ọ dịkwa na ya. Mgbe ahụ, Onyeàmà ahụ gosiri m Matiu 6:9, 10 ma kọwaa na aha Chineke na Ekpere Onyenwe Anyị nwere njikọ. Enwere m nnọọ obi ụtọ ma rịọ ya ka ọ mụwara m Bible.”

Ka Uche Chineke Mee n’Ụwa

“Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:10) Olee otú a ga-esi mezuo akụkụ a nke ekpere nlereanya Jizọs? Ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ na-ele eluigwe anya dị ka ebe dị n’udo na nke dị jụụ. Akwụkwọ Nsọ na-ezo aka n’eluigwe dị ka ‘ebe obibi Jehova nke ịdị nsọ na nke ịma mma.’ (Aịsaịa 63:15) Ka a sịkwa ihe mere anyị ji ekpe ekpere ka uche Chineke mee n’ụwa “dị ka ọ na-eme n’eluigwe”! Ma ọ̀ dị mgbe nke a ga-eme?

Onye amụma Jehova bụ́ Daniel buru amụma, sị: “Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze [ụwa] ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” (Daniel 2:44) Alaeze, ma ọ bụ ọchịchị eluigwe a ga-eme ihe n’oge na-adịghị anya iji weta udo zuru ụwa ọnụ n’okpuru ọchịchị ezi omume.—2 Pita 3:13.

Ikpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa na ka e mee uche ya n’ụwa bụ ngosipụta nke okwukwe nke na-agaghị eduga ná mmechuihu. Onye Kraịst bụ́ Jọn onyeozi dere, sị: “M wee nụ ka otu oké olu si n’ocheeze ahụ na-asị: ‘Lee! Ụlọikwuu nke Chineke na-adịnyere ihe a kpọrọ mmadụ, ya na ha ga-ebikwa, ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.’” Mgbe ahụ, Jọn gbakwụnyere, sị: “Onye ahụ nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ wee sị: . . . ‘Dee ha, n’ihi na okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi ma bụrụ eziokwu.’”—Mkpughe 21:3-5.

Ekpere na Mkpa Anụ Ahụ́ Anyị

Site n’ihe o kwuru n’ekpere nlereanya ya, Jizọs gosiri na nchegbu anyị bụ́ isi mgbe anyị na-ekpe ekpere kwesịrị ịbụ ihe metụtara aha na uche Chineke. N’agbanyeghị nke ahụ, ekpere nlereanya ahụ gara n’ihu ịgụnye arịrịọ onwe onye ndị a rịọrọ Jehova n’ụzọ kwesịrị ekwesị.

Nke mbụ n’ime ha bụ: “Nye anyị nri taa maka ụbọchị taa.” (Matiu 6:11) Nke a abụghị arịrịọ maka akụ̀ na ụba. Jizọs gbara anyị ume ikpe ekpere maka “nri anyị maka taa dị ka ihe a chọrọ taa si dị.” (Luk 11:3) N’ikwekọ n’Ekpere Onyenwe Anyị, anyị pụrụ ikpe ekpere na-enwe okwukwe na Chineke ga-egbo mkpa anyị kwa ụbọchị ma ọ bụrụ na anyị ahụ ya n’anya ma na-erubere ya isi.

Nchegbu na-enweghị isi n’ihi nsogbu akụ̀ na ụba pụrụ ime ka anyị na-eleghara mkpa ime mmụọ anyị anya ma si otú ahụ ghara ime ihe Chineke na-atụ anya ya n’aka anyị. Ma ọ bụrụ na anyị ebute ofufe Chineke ụzọ ná ndụ anyị, anyị pụrụ ijide n’aka na a ga-anụ arịrịọ anyị maka mkpa anụ ahụ́, ndị dị ka nri na uwe. Jizọs kwuru, sị: “Nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume [Chineke], a ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile.” (Matiu 6:26-33) Ịchọ ezi omume Chineke bụ ihe ịma aka, ebe ọ bụ na anyị nile na-eme mmehie ma nwee mkpa maka mgbaghara mmehie. (Ndị Rom 5:12) A gụnyekwara nke ahụ n’Ekpere Onyenwe Anyị.

Ekpere Anyị na Mgbaghara Mmehie

“Gbagharakwa anyị ụgwọ ndị anyị ji, dị ka anyị gbagharawokwaara ndị ji anyị ụgwọ.” (Matiu 6:12) N’ihe ndekọ Luk nke Ekpere Onyenwe Anyị, e zoro aka ‘n’ụgwọ’ ndị a dị ka “mmehie.” (Luk 11:4) Jehova Chineke ọ̀ ga-agbaghara anyị mmehie anyị n’ezie?

Ọ bụ ezie na Eze Devid nke Izrel oge ochie mere mmehie ndị dị oké njọ, o chegharịrị ma jiri obi ike kpee ekpere, sị: “Gị onwe gị, Onyenwe anyị, dị mma, Ị bụkwa onye na-agbaghara mmehie, Ị na-abakwa ụba n’ebere n’ahụ́ ndị nile na-akpọku Gị.” (Abụ Ọma 86:5) Lee ihe na-akasi obi nke ahụ bụ! Nna anyị nke eluigwe “na-agbaghara” mmehie nke ndị chegharịrị ma na-akpọku ya. Dị nnọọ ka e ji n’aka na a pụrụ ịkagbu ụgwọ kpamkpam, n’otu aka ahụ, Jehova Chineke pụrụ ịgbaghara anyị mmehie anyị kpamkpam.

Otú ọ dị, Jizọs kwuru otu ihe nke a ga-adabere na ya: Iji bụrụ ndị Chineke ga-agbaghara, anyị aghaghị ịgbaghara ndị ọzọ. (Matiu 6:14, 15) Ọ bụ ezie na ndị enyi atọ nke onye ezi omume ahụ bụ́ Job mesoro ya ihe n’ụzọ na-adịghị mma, ọ gbaghaara ha, ọbụnakwa kpee ekpere maka ha. (Job 42:10) Ọ bụrụ na anyị na-agbaghara ndị mehiere anyị, anyị ga-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ ma bụrụ ndị ọ ga-emere ebere.

Njikere Chineke dị ịnụ arịrịọ anyị kwesịrị ịkpali anyị ịchọ nnwapụta ya. Anyị pụkwara ime otú ahụ n’agbanyeghị na anyị bụ ndị na-ezughị okè. (Matiu 26:41) Jehova pụkwara inyere anyị aka n’akụkụ a, dị ka Jizọs gosiri site n’iji otu arịrịọ dị oké mkpa mechie ekpere nlereanya ahụ.

Enyemaka Iji Gbasoo Ụzọ Ezi Omume

“Ewebatakwala anyị n’ime ọnwụnwa, kama gbapụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.” (Matiu 6:13) Jehova adịghị agbahapụ anyị n’oge ọnwụnwa ma ọ bụ mee ka anyị daba ná mmehie. Okwu ya na-ekwu, sị: “A pụghị iji ihe ọjọọ nwaa Chineke, ya onwe ya adịghịkwa anwa onye ọ bụla.” (Jems 1:13) Chineke na-ekwe ka a nwaa anyị, ma ọ pụrụ ịnapụta anyị n’aka Onye Ọnwụnwa Ukwu ahụ—“ajọ onye ahụ” a maara dị ka Setan bụ́ Ekwensu.

Pita onyeozi gbara Ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Nọgidenụ na-enwe uche ziri ezi, na-echenụ nche. Onye mmegide unu, bụ́ Ekwensu, na-ejegharị dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa.” (1 Pita 5:8) N’ezie, Setan nwara ọbụna nwoke ahụ zuru okè bụ́ Jizọs Kraịst! Gịnị bụ ebumnobi Ekwensu? Ọ bụ ime ka Jizọs gbakụta ezi ofufe nke Jehova Chineke azụ. (Matiu 4:1-11) Ọ bụrụ na ị na-achọ ijere Chineke ozi, ebumnobi Setan bụ iripịakwa gị!

Site n’ụwa nke ọ na-achịkwa, Ekwensu pụrụ ịnwa anyị itinye aka n’omume ndị Chineke na-adịghị anakwere. (1 Jọn 5:19) Ya mere, ọ dị oké mkpa anyị ijekwuru Chineke mgbe nile maka enyemaka, karịsịa mgbe anyị na-eche ọnwụnwa na-adịghị akwụsị akwụsị ihu. Ọ bụrụkwa na anyị na-efe Jehova ofufe dị ka Okwu ya e ji ike mmụọ nsọ dee, bụ́ Bible, si kwuo, ọ ga-anapụta anyị site n’inyere anyị aka iguzogide Ekwensu. “Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi,” ka Bible na-agwa anyị, “ọ gaghịkwa ekwe ka a nwaa unu gabiga ihe unu pụrụ ịnagide.”—1 Ndị Kọrint 10:13.

Okwukwe n’Ebe Chineke Nọ Dị Mkpa

Lee ihe na-enye obi ụtọ ọ bụ ịmara na Nna anyị nke eluigwe nwere mmasị n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ! Ọbụna o mere ka Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, kụziere anyị otú e si ekpe ekpere. N’ezie, nke a na-eme ka anyị na-achọ ime ihe ga-atọ Jehova Chineke ụtọ. Olee otú anyị pụrụ isi mee otú ahụ?

Bible na-ekwu, sị: “Ma okwukwe adịghị ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị [Chineke] ezi mma, n’ihi na onye na-abịaru Chineke nso aghaghị ikwere na ọ dị adị, nakwa na ọ bụ onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Olee otú a pụrụ isi nweta okwukwe dị otú ahụ? “Okwukwe na-esochi ihe a na-anụ,” ka Bible na-ekwu. (Ndị Rom 10:17) Ndịàmà Jehova na-enwe obi ụtọ iso onye ọ bụla ọ na-agụsi agụụ ike iji ezi okwukwe na-ejere Chineke ozi kwurịta ihe ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ.

Anyị nwere olileanya na ntụle a nke Ekpere Onyenwe Anyị emewo ka ị ghọtakwuo ihe ọ pụtara. Site n’inwetakwu ihe ọmụma banyere Jehova na ụgwọ ọrụ ọ ga-akwụ “ndị na-achọsi ya ike,” ị pụrụ iwusi okwukwe i nwere n’ebe Chineke nọ ike. Mụtakwuo banyere ya na nzube ya ka i wee nwee ike iso Nna gị nke eluigwe nwee mmekọrịta chiri anya ruo mgbe ebighị ebi.—Jọn 17:3.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

“Nna anyị nke nọ n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe. Nye anyị nri taa maka ụbọchị taa; gbagharakwa anyị ụgwọ ndị anyị ji, dị ka anyị gbagharawokwaara ndị ji anyị ụgwọ. Ewebatakwala anyị n’ime ọnwụnwa, kama gbapụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.”—Matiu 6:9-13

[Foto dị na peeji nke 7]

Jehova na-egbo mkpa nke ndị hụrụ ya n’anya

[Foto dị na peeji nke 7]

Chineke na-enyekwara anyị aka iguzogide Ekwensu

[Foto dị na peeji nke 7]

Ọ bụrụ na anyị, dị ka Job, agbaghara ndị mehiere anyị, anyị pụrụ ịbụ ndị Chineke ga-emere ebere