Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Igwe Ihe Ndị Na-emepụta Nri

Ihe Igwe Ihe Ndị Na-emepụta Nri

Ihe Igwe Ihe Ndị Na-emepụta Nri

A KPỌWO ya “ihe oriri bụ́ isi nke ndụ,” “ihe oriri kasị ihe oriri nile,” “ihe oriri bụ́ isi nke mmadụ kemgbe ụwa.” Ee, site n’oge ochie, achịcha abụwo ihe oriri bụ́ isi.

Ihe bụ́ isi e ji eme achịcha bụ ntụ ọka, ma ọ bụ ntụ mkpụrụ akụ́kụ́ ndị ọzọ bụ́ ndị a na-enweta site n’igweri ha egweri. Ya mere, igwe ihe bụ nkà oge ochie. N’enweghị injin na-egwe ihe, lee ọrụ siri ike ọ na-aghaghị ịbụwo igweri mkpụrụ akụ́kụ́ ka ọ ghọọ ntụ! N’oge Bible, a na-eji ụda nkume igwe ihe amata oge ndị e nwere udo, anụghịkwa ụda ya na-egosi ịtọgbọrọ n’efu.—Jeremaịa 25:10, 11.

Gịnị ka igwe ihe gụnyeworo n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ? Olee usoro na ihe ụfọdụ e jiworo mee ihe iji mee nke ahụ? Oleekwa ụdị ihe igwe ihe ndị na-emepụta nri taa?

N’ihi Gịnị Ka Ha Ji Dị Mkpa?

Jehova gwara di na nwunye mbụ ahụ, bụ́ Adam na Iv, sị: “Lee, enyewo m unu ihe ọkụkụ nile ọ bụla na-amịpụta mkpụrụ ọghịgha, nke dị n’elu ụwa nile, na osisi nile ọ bụla, nke mkpụrụ osisi na-amịpụta mkpụrụ ọghịgha dị n’ime ya; unu ka ọ dịịrị ịbụ ihe oriri.” (Jenesis 1:29) Okporo ahịhịa ndị na-amịpụta mkpụrụ akụ́kụ́ so n’ihe oriri ndị Jehova Chineke nyere ihe a kpọrọ mmadụ. Ihe a e si na ya enweta ihe oriri dị oké mkpa maka ịdị adị nke mmadụ ebe ọ bụ na mkpụrụ akụ́kụ́ nile—gụnyere ọka wit, ọka bali, osikapa, millet, sorghum na ọka—nwere ihe ndị na-enye ike nke ahụ́ nwere ike ịgbanwe gaa n’ihe bụ́ isi na-enye ya ume—glucose.

Otú ọ dị, e meghị ahụ́ mmadụ ịgbari mkpụrụ akụ́kụ́. Nye ụmụ mmadụ, ha na-adị mfe oriri karị mgbe e gweriri ha ịghọ ntụ ma sie ha esie. Ụzọ ndị kasị dị mfe isi mee ka mkpụrụ akụ́kụ́ ghọọ ntụ bụ ịsụ ya n’íkwè, igweri ya n’elu nkume, ma ọ bụ ijicha ụzọ abụọ ahụ mee ihe.

Ihe Igwe Ihe Ndị E Ji Ọkpụkpụ Aka Enye Ike

Obere ihe a kpụrụ akpụ sitere n’ili ndị Ijipt oge ochie na-egosi otú e si eji otu ụdị nkume igwe ihe, bụ́ nke yiri ihe e ji anọ ọdụ n’elu ịnyịnya, egweri mkpụrụ akụ́kụ́. Nkume igwe ihe a nwere nkume abụọ—nkume nke azụ ya gbalitụrụ elu bụ́ nke dị n’ala, na obere nkume dị n’elu ya. Onye ahụ na-egwe ihe—nke na-abụkarị nwanyị—na-egbusa ikpere n’ala n’azụ nkume igwe ihe ahụ ma jiri aka ya abụọ jide obere nkume ahụ. Ọ na-ejizi ike ya nile eji obere nkume ahụ egwepịasị mkpụrụ akụ́kụ́ n’elu nkume nke ahụ dị n’ala. Lee ka nke ahụ sị bụrụ ihe dị mfe ma na-arụ ọrụ nke ọma!

Otú ọ dị, ọtụtụ awa e ji gbusa ikpere n’ala nwere nsogbu nke ya. Iji obere nkume igwe ihe ahụ egwe ihe site n’otu isi nkume ruo na nke ọzọ ugboro ugboro na-ebo azụ, ogwe aka, apata ụkwụ, ikpere, na mkpịsị ụkwụ nke onye ahụ na-egwe ihe oké ibu arọ. Nnyocha nke nkwarụ ndị a hụrụ n’ọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ e gwupụtara na Siria oge ochie edugawo ndị ọkà mmụta na-amụ banyere ndụ ndị oge ochie n’ikwubi na iji nkume igwe ihe yiri nke ahụ eme ihe kpataara ụmụ agbọghọ mmerụ ahụ́ ndị na-esite n’ịdị na-ebo ahụ́ oké ibu arọ—mgbụchasị nke ikpere, mmerụ ahụ́ n’ọkpụkpụ azụ, na oké ọrịa ogbu na nkwonkwo na-ebibi cartilage na mkpịsị ụkwụ ukwu ha. N’Ijipt oge ochie, igwe ihe yiri ka ọ̀ bụ ọrụ dịịrị ndị inyom na-eje ozi. (Ọpụpụ 11:5) * Ụfọdụ ndị ọkà mmụta kweere na mgbe ndị Izrel hapụrụ Ijipt, ụdị nkume igwe ihe ha ji laa bụ ụdị ahụ yiri ihe e ji anọ ọdụ n’elu ịnyịnya.

Mmeziwanye e meziwanyere ihe ndị e ji egwe ihe ka oge na-aga gụnyere ịkanye ihe na nkume abụọ ahụ iji mee ka ha nwee ezé ka ha wee na-arụ ọrụ nke ọma karị. Imepụta obere nkume nwere oghere yiri ọgbalaga n’elu ya mere ka o kwe onye na-egwe ihe omume ịwụnye mkpụrụ akụ́kụ́ n’ime ya, bụ́ nke na-ejizi aka ya awụbanye n’etiti nkume abụọ ahụ. Na narị afọ nke anọ ma ọ bụ nke ise T.O.A., Gris mepụtara nkume igwe ihe mbụ dị mfe. A rụnyere aka toro ogologo n’otu akụkụ nke nkume nke elu ahụ bụ́ ihe a na-eji akwagharị ya. Ịkwagharị aka ya ahụ ihu na azụ na-eme ka nkume nke elu a wụnyere ihe na ya na nkume nke ala na-echikọta.

Ihe igwe ihe nile ndị ahụ e kwuru banyere ha n’elu nwere nnọọ nsogbu siri ike. Ha nile dabeere ná nkwagharị ihu na azụ nke ọ na-adịghị anụmanụ a pụrụ ịzụ ime ya. N’ihi ya, ihe igwe ihe ndị a aghaghị ịdabere n’ike ọkpụkpụ aka mmadụ. Ka oge na-aga, e mepụtara ihe igwe ihe ọhụrụ—ihe igwe ihe nke na-agba gburugburu. A pụziri iji ụmụ anụmanụ mee ihe.

Ihe Igwe Ihe Ndị Na-agba Gburugburu Emee Ka Ọrụ ahụ Dị Mfe Karị

O yiri ka è mepụtara ihe igwe mkpụrụ akụ́kụ́ bụ́ nke na-agba gburugburu n’ógbè Mediterenian n’ihe dị ka narị afọ nke abụọ T.O.A. Ka ọ na-erule ná ngwụsị nke narị afọ mbụ O.A., ndị Juu bi na Palestaịn amarawo banyere ihe igwe ihe dị otú ahụ, n’ihi na Jizọs kwuru banyere “nkume igwe nri, dị ka nke ịnyịnya ibu na-akwagharị.”—Mak 9:42.

E jiri ihe igwe ihe nke anụmanụ na-akwagharị mee ihe na Rom na n’akụkụ ka ukwuu nke Alaeze Ukwu Rom. A ka nwere ọtụtụ ihe igwe ihe ndị dị otú ahụ na Pompeii. Ha na-enwe nkume nke elu dị arọ nke gbaliri elu n’ọnụ ọnụ ya na nke nwere ebe a na-awụnye ihe na ya na nkume nke ala gbaliri elu n’azụ ya. Ka nkume nke elu na-agba gburugburu n’elu nkume nke ala, mkpụrụ akụ́kụ́ na-aba n’etiti ha ma bụrụ ndị e gweriri. Ụdị nkume elu a ndị ka dịnụ dịgasị iche n’ibu site n’ihe dị ka sentimita 45 ruo sentimita 90 n’obosara. Ihe igwe ihe ndị a ruru ihe dị ka sentimita 180 n’ogologo.

O dochaghị anya ma è si n’ihe igwe ihe anụmanụ na-akwagharị mepụta ihe igwe ihe na-agba gburugburu na-adịchaghị arọ ka è si n’ihe igwe ihe na-agba gburugburu na-adịchaghị arọ mepụta ihe igwe ihe anụmanụ na-akwagharị. Otú o sina dị, ihe igwe ihe na-agba gburugburu e ji aka akwagharị pere mpe ma dị mfe karị iji eme ihe. O nwere nkume abụọ gbara gburugburu ndị na-adị ikekwe site na sentimita 30 ruo sentimita 40 n’obosara. Nkume nke elu gbalitụrụ elu n’azụ ya, ihu ya akpọdatụkwa akpọda iji mee ka o kwekọọ na nkume nke ala bụ́ nke ime ya gbalitetụrụ elu, azụ ya akpọdatụkwa akpọda. A na-adọnye nkume nke elu ahụ n’okporo ihe dị n’etiti nkume nke ala ahụ, ọ na-enwekwa aka e ji akwagharị ya. Ndị inyom abụọ na-echerịtakarị onwe ha ihu, nke ọ bụla ana-atụkwasị otu aka na nkume elu ahụ iji na-akwagharị ya. (Luk 17:35) Otu n’ime ndị inyom ahụ na-eji aka ya nke ọzọ achịnye mkpụrụ akụ́kụ́ n’oghere e nwere na nkume elu ahụ, nwanyị nke ọzọ ana-achịkọtakwa ntụ ọka ahụ n’ime efere ma ọ bụ ákwà a tụrụ n’okpuru ka ọ na-apụta n’ihe igwe ihe ahụ. Ụdị ihe igwe ihe a gboro mkpa nke ndị agha, ndị na-anya ụgbọ mmiri, ma ọ bụ ezinụlọ ndị bi n’ebe ụlọ ọrụ na-egwe ihe na-adịghị.

Ndị Mmiri na Ifufe Na-akwagharị

N’ihe dị ka afọ 27 T.O.A., onye injinia Rom bụ́ Vitruvius kọwara ihe igwe ihe mmiri na-akwagharị nke oge ya. Mmiri na-asọ asọ na-asọkwasị ụmara ndị a rụnyere na wiil e jikọtara ya na okporo igwe toro ogologo, na-eme ka wiil ahụ na-atụgharị. Wiil ahụ na-atụgharị atụgharị na-akwagharịzi okporo ígwè ogologo ahụ. Okporo ígwè ahụ n’aka nke ya, na-akwagharịzi nnukwu nkume igwe ihe nke elu.

Olee ihe ihe igwe ihe mmiri na-akwagharị na-emepụta ma e jiri ya tụnyere ihe igwe ihe ndị ọzọ? E mere atụmatụ na ihe igwe ihe ndị e ji ọkpụkpụ aka akwagharị na-egweri ihe na-erughị kilogram 10 nke mkpụrụ akụ́kụ́ kwa awa, ihe igwe ihe ndị anụmanụ na-akwagharị nke kasị arụ ọrụ na-egweri ihe ruru kilogram 50 nke mkpụrụ akụ́kụ́ kwa awa. Ihe igwe ihe nke mmiri na-akwagharị nke Vitruvius, n’aka nke ya, pụrụ igweri ihe dị ka kilogram 150 ruo kilogram 200 kwa awa. Site n’ịgbanwe na imeziwanye ọtụtụ ihe n’ụkpụrụ bụ́ isi Vitruvius kọwara, ndị bụ́ aka ochie n’imepụta ihe igwe ihe nọgidere na-eji ya na-eme ihe ruo ọtụtụ narị afọ ka e mesịrị.

Mmiri na-asọ asọ abụghị nanị ikike sitere n’okike e ji mee ihe n’ịkwagharị nkume igwe ihe. Ọ bụrụ na e jiri ákwà ifufe dochie anya wiil ndị mmiri na-akwagharị a pụrụ imezu otu ihe ahụ. A malitere iji ihe igwe ihe ndị nwere ákwà ifufe eme ihe na Europe ikekwe na narị afọ nke 12 O.A., e jikwa ha mee ihe n’ụzọ buru ibu na Belgium, Germany, Holland na n’ebe ndị ọzọ. E jiri ha mee ihe ruo mgbe ihe igwe ihe ndị uzu ọkụ na ihe ndị ọzọ na-enye ike na-akwagharị jiri nwayọọ nwayọọ mee ka ihe igwe ihe ndị ọzọ pụọ n’anya.

‘Nri Maka Ụbọchị Taa’

N’agbanyeghị ọganihu ndị e nweworo, a nọgidere na-eji ọtụtụ ụzọ ndị e si egweri ihe bụ́ ndị e nwere n’oge ndị gara aga eme ihe n’otu akụkụ ụwa ma ọ bụ ọzọ. A ka na-eji íkwè na ọdụ eme ihe n’akụkụ ụfọdụ nke Africa na nke Oceania. Na Mexico na n’Etiti Kọntinent America, a na-eji ihe igwe ihe ndị yiri ihe e ji anọ ọdụ n’elu ịnyịnya egweri ọka e ji eme achịcha e tinyere àkwá n’ime ya. A ka na-ejikwa ọtụtụ ihe igwe ihe ndị mmiri na ifufe na-akwagharị eme ihe n’ebe dịgasị iche iche.

Otú ọ dị, a na-eji ihe igwe ihe ndị nwere injin emepụta ihe ka ọtụtụ n’ime ntụ ọka ndị e ji eme achịcha ná mba ndị mepere emepe taa. A na-eji nwayọọ nwayọọ eme ka mkpụrụ akụ́kụ́ ghọọ ntụ ka a na-akwọ ha ọtụtụ ugboro n’agbata ígwè abụọ ndị nwere ezé ma dị gburugburu ka ha na-agba gburugburu n’ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ dịgasị iche. Usoro a na-eme ka o kwe omume imepụta ụdị ntụ ọka dịgasị iche n’ọnụ ego dị ala.

Obi abụọ adịghị ya na inweta ntụ ọka iji mee achịcha abụghịzi oké ọrụ dị ka ọ bụbu. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị pụrụ ikele Onye Okike anyị maka inye anyị ma mkpụrụ akụ́kụ́ ma nkà nke ime ka ọ ghọọ ‘nri maka ụbọchị taa.’—Matiu 6:11.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 N’oge Bible, e nyere ndị iro e jichiri ejichi, ndị dị ka Samsin na ndị Izrel ndị ọzọ ọrụ igwe ihe. (Ndị Ikpe 16:21; Abụ Ákwá 5:13) Ndị inyom na-abụghị ohu gwere mkpụrụ akụ́kụ́ maka ezinụlọ ha.—Job 31:10.

[Foto dị na peeji nke 23]

Ihe igwe ihe ndị Ijipt nke yiri ihe e ji anọ ọdụ n’elu ịnyịnya

[Ebe E Si Nweta Foto]

Soprintendenza Archeologica per la Toscana, Firenze

[Foto dị na peeji nke 23]

E jiri ihe igwe ihe anụmanụ na-akwagharị pịpụta mmanụ n’oliv

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 22]

Site na Self-Pronouncing Edition of the Holy Bible, nke nwere nsụgharị King James na nke Revised