Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Deuterọnọmi

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Deuterọnọmi

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Deuterọnọmi

Ọ BỤ n’afọ 1473 T.O.A. Afọ 40 agafewo kemgbe Jehova napụtasịrị ụmụ Izrel n’agbụ ndị Ijipt. N’ịbụ ndị nọworo ọtụtụ afọ ndị a n’ịkpa, ụmụ Izrel ka bụ mba na-enweghị ala. Otú ọ dị, n’ikpeazụ, ha eguzo n’ọnụ ọnụ Ala Nkwa ahụ. Gịnị na-echere ha ka ha na-ewere ya? Olee nsogbu ndị ha ga-eche ihu, oleekwa ihe ha kwesịrị ime banyere ha?

Tupu Izrel agafee Osimiri Jọdan banye n’ala Kenan, Mozis akwadebe mkpọkọta ahụ maka nnukwu ọrụ na-eche ha ihu. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịgwa ha okwu ndị na-agba ume ma na-akpali akpali, ndị na-adụ ọdụ ma na-adọ aka ná ntị. Ya echetara ụmụ Izrel na Jehova Chineke kwesịrị ka e fee ya ofufe a na-ekewaghị ekewa nakwa na ha agatụghị agbaso ụzọ ndụ nke mba ndị gbara ha gburugburu. Okwu ndị a mejupụtara akụkụ bụ́ isi nke akwụkwọ Bible bụ́ Deuterọnọmi. Ndụmọdụ ndị e nyere na ha bụkwa nnọọ ihe dị anyị mkpa taa, n’ihi na anyị onwe anyị bi n’ụwa ebe ife Jehova ofufe a na-ekewaghị ekewa bụ ihe ịma aka.—Ndị Hibru 4:12.

N’ịbụ nke Mozis dere ma e wepụ isi nke ikpeazụ ya, akwụkwọ Deuterọnọmi na-akọ ihe mere n’ihe ji nke nta karịa ọnwa abụọ. * (Deuterọnọmi 1:3; Joshua 4:19) Ka anyị hụ otú ihe ndị e kwuru na ya pụrụ isi nyere anyị aka iji obi anyị dum hụ Jehova Chineke n’anya ma jiri ikwesị ntụkwasị obi na-ejere ya ozi.

‘ECHEZỌLA IHE NILE NKE ANYA GỊ ABỤỌ HỤWORO’

(Deuterọnọmi 1:1–4:49)

N’okwu nke mbụ, Mozis akọọ ụfọdụ ihe ndị mere n’ịkpa—karịsịa ndị ga-enyere ụmụ Izrel aka ka ha na-akwadebe iwere Ala Nkwa ahụ. Akụkọ banyere nhọpụta nke ndị ikpe aghaghị ichetaworo ha na Jehova na-ahazi ndị ya n’ụzọ na-eme ka e jide n’aka na a na-elekọta ha n’ụzọ ịhụnanya. Mozis ekwuokwa na akụkọ ọjọọ nke ndị nledo iri ahụ mere ka ọgbọ bu ụzọ ghara ịba n’ala ahụ e kwere ha ná nkwa. Cheedị banyere mmetụta ihe atụ ịdọ aka ná ntị a na-aghaghị inwewo n’ahụ́ ndị na-ege Mozis ntị ka ha ji anya ha na-ahụ ala ahụ.

Ichetaghachi mmeri ndị Jehova nyeworo ụmụ Izrel tupu ha agafee Jọdan aghaghị imewo ka ha nwee obi ike ka ha dị njikere ịmalite mmeri ha n’ofe nke ọzọ nke osimiri ahụ. Ala ahụ nke ha na-aga ibi na ya jupụtara n’ikpere arụsị. Lee ka o si kwesị ekwesị na Mozis dọsiri ha aka ná ntị ike megide ikpere arụsị!

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

2:4-6, 9, 19, 24, 31-35; 3:1-6—N’ihi gịnị ka ụmụ Izrel ji kpochapụ ụfọdụ ndị bi n’akụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan ma hapụ ndị ọzọ? Jehova nyere Izrel iwu ịghara ịlụso ụmụ Ịsọ ọgụ. N’ihi gịnị? N’ihi na ha bụ ụmụ nwanne Jekọb. Ụmụ Izrel agaghị akpagbu ma ọ bụ lụso ndị Moab na Amọn agha n’ihi na ha bụ ụmụ nwanne Ebreham bụ́ Lọt. Otú ọ dị, Eze Saịhọn na Eze Ọg bụ́ ndị Amọraịt abụghị ụmụnne ụmụ Izrel, n’ihi ya, ha ekwesịghịkwa ibi n’ala ahụ ha na-achị. Ya mere, mgbe Saịhọn jụrụ ikwe ka ụmụ Izrel gafere, nakwa mgbe Ọg bịara ịlụso ha ọgụ, Jehova nyere ụmụ Izrel iwu ibibi obodo ha, ghara ịhapụ onye ọ bụla ndụ.

4:15-20, 23, 24—Iwu ahụ e nyere ka a ghara ime arụsị a pịrị apị ọ̀ na-eme ka ọ bụrụ ihe ọjọọ ime ihe oyiyi nke ihe ụfọdụ dị ka ihe ịchọ mma? Ee e. Iwu e nyere ebe a bụ megide ịkpụ ihe oyiyi maka ofufe—megide ‘ịkpọ isiala nye arụsị na ife ha ofufe.’ Akwụkwọ Nsọ amachibidoghị ịkpụ ihe ọkpụkpụ ma ọ bụ ise ihe osise dị ka ihe ịchọ mma.—1 Ndị Eze 7:18, 25.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

1:2, 19. Ụmụ Izrel wagharịrị n’ịkpa ruo ihe dị ka afọ 38, ọ bụ ezie na Kedesh-bania ga-ewe nanị “ụbọchị iri na otu site na Horeb [ugwu gbara Ugwu Saịnaị, bụ́ ebe a nọ nye Iwu Iri ahụ, gburugburu] ma i si n’ụzọ ugwu Sia.” Lee nnukwu ihe inupụrụ Jehova Chineke isi furu ha!—Ọnụ Ọgụgụ 14:26-34.

1:16, 17. Ụkpụrụ ikpe Chineke ka bụkwa otu ihe ahụ taa. Ndị e nyere ibu ọrụ nke ije ozi na kọmitii ikpe agaghị ekwe ka ile mmadụ anya n’ihu ma ọ bụ egwu mmadụ megharịa ha anya.

4:9. Ọ dị ụmụ Izrel mkpa ‘ịghara ichezọ ihe nile nke anya ha abụọ hụworo’ ka ha wee nwee ihe ịga nke ọma. Ka ụwa ọhụrụ ahụ e kwere ná nkwa na-abịaru nso, ọ dịkwa anyị onwe anyị oké mkpa ilekwasị anya n’ọrụ ndị dị ebube nke Jehova site n’ịbụ ndị ji ịdị uchu na-amụ Okwu ya.

HỤ JEHOVA N’ANYA, DEBEKWA IHE O NYERE N’IWU

(Deuterọnọmi 5:1–26:19)

N’okwu ya nke abụọ, Mozis akọọ banyere Iwu ahụ e nyere n’Ugwu Saịnaị ma gụghachi Iwu Iri ahụ. A kpọọ mba asaa aha maka ibibi ha kpamkpam. E chetara ụmụ Izrel otu ihe dị mkpa ha mụtara n’ịkpa: “Ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ ihe nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta ka mmadụ ga-eji dị ndụ.” N’ọnọdụ ọhụrụ ha, ha aghaghị ‘idebe ihe nile e nyere n’iwu.’—Deuterọnọmi 8:3; 11:8.

Ka ha na-ebiri n’ala nkwa ahụ, iwu ga-adị ụmụ Izrel mkpa ọ bụghị nanị n’ihe ndị metụtara ofufe kamakwa n’ihe ndị metụtara ikpe, ọchịchị, agha, na ndụ ọha na nke onwe onye a na-adị kwa ụbọchị. Mozis atụleghachi iwu ndị ahụ ma mesie ike mkpa ọ dị ịhụ Jehova n’anya na idebe ihe o nyere n’iwu.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

8:3, 4—N’ụzọ dị aṅaa ka uwe ụmụ Izrel na-akaghị nká, ụkwụ ha agharakwa ịza aza n’oge njem ha n’ịkpa? Nke a bụ ọrụ ebube dịkwa ka mana ahụ a na-enye ha mgbe nile bụ. Ụmụ Izrel yi otu uwe ahụ na otu akpụkpọ ụkwụ ahụ ha yi mgbe ha malitere njem, eleghị anya na-enyefe ha ndị ọzọ ka ụmụaka na-etolite, ndị okenye ana-anwụpụkwa. Ebe ọ bụ na ọnụ abụọ ahụ a gụrụ ha ná mmalite nakwa ná ngwụsị nke njem ha n’ịkpa gosiri na ọnụ ọgụgụ ụmụ Izrel arịghị elu, ọ ghaghị ịbụworị na uwe na akpụkpọ ụkwụ ndị e nyere ha ná mmalite zuuru ha.—Ọnụ Ọgụgụ 2:32; 26:51.

14:21—N’ihi gịnị ka ụmụ Izrel pụrụ iji nye onye ọbịa ma ọ bụ renye onye ala ọzọ anụ nwụrụ anwụ a na-egbupụghị ọbara bụ́ nke ha onwe ha na-agaghị eri? N’ime Bible, okwu bụ́ “onye ọbịa” pụrụ izo aka n’ebe onye na-abụghị onye Izrel nọ bụ́ onye ghọrọ onye na-eso ụzọ ndị Juu ma ọ bụ onye bi ebi nke na-agbaso iwu ndị bụ́ isi nke ala ahụ ma ọ dịghị efe Jehova. Onye ala ọzọ ma ọ bụ onye ọbịa nke na-aghọghị onye na-eso ụzọ ndị Juu anọghị n’okpuru Iwu ahụ, ọ pụkwara iji anụ nwụrụ anwụ nke a na-egbupụghị ọbara mee ihe n’ụzọ dịgasị iche. Ụmụ Izrel pụrụ inye ma ọ bụ irenye ha anụ ndị dị otú ahụ. N’aka nke ọzọ, onye na-eso ụzọ ndị Juu nọ n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. Dị ka e gosiri na Levitikọs 17:10, iwu megidere onye dị otú ahụ iri ọbara anụmanụ.

24:6—N’ihi gịnị ka e ji jiri iwere “nkume igwe nri ma ọ bụ aka nkume” n’ihe ibe tụnyere iwere “ndụ mmadụ” n’ihe ibe? Nkume igwe nri na aka nkume ya na-anọchi anya “ndụ mmadụ,” ma ọ bụ ihe o ji ebi ndụ. Iwere nke ọ bụla n’ime ihe ndị a ga-anapụ ezinụlọ ahụ dum nri ụbọchị ha.

25:9—Gịnị ka ịtọpụ akpụkpọ ụkwụ n’ụkwụ onye jụrụ ịlụ nwunye nwanne ya nwụrụ anwụ na ịgbasa onye ahụ asọ n’ihu pụtara? Dị ka “a na-eme na mgbe gara aga n’Izrel banyere ihe mgbapụta, . . . nwoke [ga-agbụpụ] akpụkpọ ụkwụ ya, nye ya mmadụ ibe ya.” (Rut 4:7) N’ihi ya, ịtọpụ akpụkpọ ụkwụ n’ụkwụ onye jụrụ ịlụ nwunye nwanne ya nwụrụ anwụ na-eme ka ọ pụta ìhè na ọ jụwo ọnọdụ ya na ikike o nwere ịmụtara nwanne ya nwoke nwụrụ anwụ nwa. Nke a bụ ihe ihere. (Deuterọnọmi 25:10) Ịgbasa ya asọ n’ihu bụ mweda n’ala.—Ọnụ Ọgụgụ 12:14.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

6:6-9. Dị nnọọ ka e nyere ụmụ Izrel iwu ịmara Iwu ahụ, anyị aghaghịkwa ịmara iwu Chineke n’obi anyị, na-echeta ha mgbe nile ma na-ezi ha ụmụ anyị. Anyị aghaghị ‘ike ha n’elu aka anyị ka ha bụrụ ihe ịrịba ama’ nke na àgwà anyị—nke aka anyị na-anọchi anya ya—aghaghị igosi na anyị na-erubere Jehova isi. Dịkwa ka ‘mkpọ n’ihu n’etiti anya abụọ,’ nrubeisi anyị aghaghị ịpụta ìhè nye mmadụ nile.

6:16. Ka ọ ghara ịdị mgbe anyị ga-anwa Jehova ọnwụnwa dị ka ụmụ Izrel ji enweghị okwukwe mee na Masa, bụ́ ebe ha nọrọ tamuo ntamu banyere ụkọ mmiri.—Ọpụpụ 17:1-7.

8:11-18. Ịhụ ihe onwunwe n’anya pụrụ ime ka anyị chefuo Jehova.

9:4-6. Anyị aghaghị ịnọ na nche megide ịbụ ndị ezi omume n’anya onwe anyị.

13:6. Anyị agatụghị ekwe ka onye ọ bụla dọpụ anyị n’ofufe Jehova.

14:1. Ibi onwe onye mma na-egosi enweghị nkwanye ùgwù maka ahụ́ mmadụ, ya na okpukpe ụgha pụrụ inwe njikọ, a ghaghịkwa izere ya. (1 Ndị Eze 18:25-28) Olileanya anyị nke mbilite n’ọnwụ na-eme ka ngosipụta dị otú ahụ gabigara ókè nke iru újú ghara ikwesị ekwesị.

20:5-7; 24:5. E kwesịrị ichebara ndị nọ n’ọnọdụ pụrụ iche echiche ọbụna mgbe e ji ọrụ dị mkpa n’aka.

22:23-27. Otu n’ime ụzọ ndị kasị dị irè nwanyị ga-esi chebe onwe ya mgbe a chọrọ idina ya n’ike bụ iti mkpu.

“HỌRỌKWA NDỤ”

(Deuterọnọmi 27:1–34:12)

N’okwu ya nke atọ, Mozis ekwuo na mgbe ụmụ Izrel gafesịrị Jọdan, ha aghaghị ide Iwu ahụ n’elu mbadamba nkume, ya ekwupụtakwa nkọcha maka nnupụisi na ngọzi maka nrubeisi. Okwu ya nke anọ ejiri ntụleghachi nke ọgbụgba ndụ dị n’etiti Jehova na Izrel malite. Mozis adọghachi ha aka ná ntị megide nnupụisi ma gbaa ndị ahụ ume ‘ịhọrọ ndụ.’—Deuterọnọmi 30:19.

Tinyere ịgwa ha okwu anọ ndị ahụ, Mozis ekwuo banyere mgbanwe onye ndú ma kụziere ụmụ Izrel otu ọmarịcha abụ nke na-eto Jehova ma dọọ ha aka ná ntị banyere ahụhụ ndị na-esi n’ekwesịghị ntụkwasị obi apụta. Mgbe ọ gọzisịrị ebo ahụ nile, Mozis anwụọ mgbe ọ gbara afọ 120, e liekwa ya. E jiri ụbọchị 30 ruoro ya újú, na-ewekọrọ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara nke oge ihe e dekọrọ na Deuterọnọmi ji mee.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

32:13, 14—Ebe ọ bụ na a machibidoro ụmụ Izrel iwu iri abụba ọ bụla, gịnị ka ha iri “abụba ụmụ atụrụ” pụtara? E ji okwu ahụ mee ihe n’ebe a n’ụzọ ihe atụ, ọ na-ezokwa aka n’atụrụ kasị mma. Eziokwu ahụ bụ́ na otu amaokwu ahụ na-ekwukwa banyere “abụba obi ọka wit” na “ọbara mkpụrụ vaịn” na-egosi na e ji ya mee ihe n’ụzọ ihe atụ.

33:1-29—N’ihi gịnị ka a na-ejighị kpọtụ Simiọn aha kpọmkwem ná ngọzi ahụ Mozis gọziri ụmụ Izrel? Nke a bụ n’ihi na àgwà Simiọn na nke Livaị ‘esika ike,’ iwe ha ‘dịkwa ike.’ (Jenesis 34:13-31; 49:5-7) Ihe nketa ha na nke ebo ndị nke ọzọ ahaghị. Livaị nwetara obodo 48, ihe nketa Simiọn dịkwa n’etiti ókèala Juda. (Joshua 19:9; 21:41, 42) N’ihi ya, Mozis agọzighị Simiọn iche. Otú ọ dị, ngọzi Simiọn so ná ngọzi e nyere Izrel n’ozuzu.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

31:12. Ụmụntakịrị kwesịrị isoro ndị toro eto nọrọ ná nzukọ ọgbakọ ma gbalịa ige ntị na ịmụta ihe.

32:4. Ọrụ nile nke Jehova zuru okè n’echiche bụ́ na ọ na-eji àgwà ya ndị bụ́ ikpe ziri ezi, amamihe, ịhụnanya, na ike eme ihe n’ụzọ kwekọrọ nnọọ ekwekọ.

Ọ Baara Anyị Uru nke Ukwuu

Deuterọnọmi na-akọwa na “Jehova bụ otu.” (Deuterọnọmi 6:4) Ọ bụ akwụkwọ na-ekwu banyere ndị ha na Chineke nwere mmekọrịta pụrụ iche. Akwụkwọ Deuterọnọmi na-adọkwa anyị aka ná ntị megide ikpere arụsị ma na-emesi ike mkpa ọ dị inye ezi Chineke ahụ ofufe a na-ekewaghị ekewa.

N’ezie, Deuterọnọmi baara anyị uru nke ukwuu! Ọ bụ ezie na anyị anọghị n’okpuru Iwu ahụ, anyị pụrụ ịmụta ọtụtụ ihe site na ya bụ́ ndị ga-enyere anyị aka ‘iwere obi anyị, mkpụrụ obi anyị, na ike anyị nile, hụ Jehova, bụ́ Chineke anyị, n’anya.’—Deuterọnọmi 6:5.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ọ pụrụ ịbụ Jọshụa ma ọ bụ Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Elieza gbakwụnyere isi nke ikpeazụ, bụ́ nke na-akọ banyere ọnwụ Mozis.

[Map dị na peeji 24]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

SIA

Kedesh- bania

Ugwu Saịnaị (Horeb)

Oké Osimiri Uhie

[Ebe E Si Nweta Foto]

Dabere na map nke Pictorial Archive (Near Eastern History) Est. and Survey of Israel ji ikike mbipụtaghachi ya

[Foto dị na peeji nke 24]

Okwu ndị Mozis kwuru mejupụtara akụkụ bụ́ isi nke Deuterọnọmi

[Foto dị na peeji nke 26]

Olee ihe mmụta dị na Jehova inye mana?

[Foto dị na peeji nke 26]

E ji iwere nkume igwe nri ma ọ bụ aka nkume ya n’ihe ibe tụnyere iwere “ndụ mmadụ” n’ihe ibe