Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Kpeenụ Ekpere Otú A”

“Kpeenụ Ekpere Otú A”

“Kpeenụ Ekpere Otú A”

Ị̀ MAARA okwu ndị dị n’Ekpere Onyenwe Anyị? Ọ bụ ekpere nlereanya nke Jizọs Kraịst kụziri. Ka ọ na-ezi Ozizi Elu Ugwu ya a ma ama, Jizọs kwuru, sị: “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a.” (Matiu 6:9) Ebe ọ bụ na ọ bụ Jizọs kụziri ya, a na-akpọkarị ya Ekpere Onyenwe Anyị, a makwaara ya dị ka ekpere Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe.—Latin, Paternoster.

Ọtụtụ nde mmadụ gburugburu ụwa eburuwo Ekpere Onyenwe Anyị ahụ n’isi ma na-ekpeghachi ya mgbe mgbe, ikekwe kwa ụbọchị. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ọtụtụ ndị ekpeghachiwo ekpere a n’ụlọ akwụkwọ na n’ihe omume ọha na eze. N’ihi gịnị ka e ji jiri Ekpere Onyenwe Anyị kpọrọ ihe nke ukwuu otú a?

Ọkà mmụta okpukpe nke narị afọ nke atọ bụ́ Cyprian dere, sị: “Olee ekpere pụrụ ịbụ ekpere dabeere n’ihe ime mmụọ karịa nke ahụ Kraịst kụziiri anyị . . . ? Olee ekpere a na-ekpegara Nna ahụ nke pụrụ ịbụ eziokwu karịa nke ahụ Ọkpara ahụ onye bụ́ Eziokwu ahụ kụziiri anyị?”—Jọn 14:6.

Na katkizim ya, Chọọchị Roman Katọlik lere ekpere Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe anya dị ka “ekpere bụ́ isi nke Ndị Kraịst.” Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia kwetara na okpukpe nile nke Krisendọm ji ekpere a kpọrọ ihe, na-akpọ ya otu n’ime “nkwupụta ndị bụ́ isi nke okwukwe Ndị Kraịst.”

Otú ọ dị, a ghaghị ikweta na ọtụtụ ndị na-ekpeghachi Ekpere Onyenwe Anyị adịghị aghọtacha ya. “Ọ bụrụ na o nwetụrụ ihe ị ma banyere Iso Ụzọ Kraịst, eleghị anya ị pụrụ ikpechapụ Ekpere Onyenwe Anyị n’akwụsịghị akwụsị,” ka akwụkwọ akụkọ Canada bụ́ Ottawa Citizen na-ekwu, “ma ọ pụrụ isiri gị ike ikpe ya nwayọọ nwayọọ ma na-aghọta ya.”

N’ezie, ọ̀ dị anyị mkpa ịghọta ekpere anyị na-ekpegara Chineke? N’ihi gịnị ka Jizọs ji kụziere anyị Ekpere Onyenwe Anyị? Gịnị ka ọ pụtara nye gị? Ka anyị tụlezie ajụjụ ndị a.