Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Njupụta nke Oké Osimiri Nile”

“Njupụta nke Oké Osimiri Nile”

Ịma Mma nke Ihe Okike Jehova

“Njupụta nke Oké Osimiri Nile”

KA ANYANWỤ na-ada, ikuku dị nro ana-ebugharị oké osimiri, ebili mmiri ya ejirikwa nwayọọ nwayọọ na-asọpụta n’ikperé mmiri. Ụda ebili mmiri ahụ na-adị ụtọ ná ntị na-adọrọ nnọọ mmasị nke ọtụtụ ndị na-aga n’ụsọ mmiri maka ezumike na ịnọ jụụ. *

E nwere ọtụtụ ogologo ụsọ mmiri ndị dị otú ahụ gburugburu ụwa. Ihe mgbochi a na-agbanwe agbanwe mgbe nile nke dị n’agbata ájá na mmiri na-akpara oké osimiri ókè ebe ọ ga-ejedebe. Nke ahụ bụ otú Onye Okike si mee ya. N’ikwu banyere onwe ya, Chineke na-ekwu na ya ‘edowo ájá ịbụ ókè nke oké osimiri.’ Ọ na-agbakwụnye, sị: “Ọ bụ ezie na mmali mmiri ya nile na-amagharị, ma ha apụghị; ọ bụ ezie na ha na-ebigbọ, ma ha adịghị agabiga ya.”—Jeremaịa 5:22; Job 38:8; Abụ Ọma 33:7.

N’ezie, mmiri jupụtara na mbara ala anyị karịa mbara ala ọzọ n’usoro mbara igwe anyị. Mmiri kpuchiri ihe karịrị pasent 70 nke ụwa. Mgbe Jehova nọ na-eke ụwa maka mmadụ ibi na ya, o nyere iwu, sị: “Mmiri ahụ nke dị n’okpuru eluigwe, ka a chịkọta ha n’otu ebe, ka a hụkwa ala akọrọ.” Nke ahụ ‘wee dịkwa otú ahụ.’ Ihe ndekọ ahụ na-agbakwụnye, sị: “Chineke wee kpọọ ala akọrọ ahụ Ala; nchịkọta mmiri ahụ ka Ọ kpọkwara Oké Osimiri: Chineke wee hụ na ọ dị mma.” (Jenesis 1:9, 10) Gịnị ka oké osimiri na-arụzu?

N’ọtụtụ ụzọ dị ịrịba ama, e mere mmiri nke oké osimiri ịkwagide ndụ. Dị ka ihe atụ, mmiri nwere ikike nke ichekwa okpomọkụ. N’ụzọ dị otú a, oké osimiri na-arụ ọrụ dị ka nnukwu ihe nchekwa okpomọkụ, na-eme ka oge oyi ghara ịjụbiga oyi ókè.

Mmiri nwere ikike ọzọ nke na-akwagide ndụ. Ọ pụrụ ịgbari ihe ngwa ngwa karịa ihe ọ bụla ọzọ dị mmiri mmiri. Ebe ọ bụ na usoro ndị dị mkpa ná ndụ na-esite ná mgbanwe nke mmiri ọgwụ dị iche iche, mmiri dị mkpa iji gbarie mmiri ọgwụ ndị ahụ na-agbanwe agbanwe ma jikọta irighiri ihe ndị mejupụtara ha. Mmiri dị n’ime ọtụtụ mmiri ọgwụ ndị dị n’ihe ndị dị ndụ. Akwụkwọ bụ́ The Sea na-ekwu, sị: “Mmiri—bụ́ nke na-aghaghị isite n’oké osimiri, dị ihe nile dị ndụ mkpa, ọbụna ihe ọkụkụ na ụmụ anụmanụ ndị e nwere n’ala.”

Oké osimiri nke Ụwa na-ekerekwa òkè dị mkpa n’ime ka ikuku dị ọcha. Plankton ndị dị n’oké osimiri na-amịkọrọ ikuku carbon dioxide ma na-ewepụta ikuku oxygen. Dị ka otu onye nchọpụta si kwuo, “pasent 70 nke ikuku oxygen na-abanye n’ikuku kwa afọ na-esite na plankton ndị dị n’oké osimiri.”

A pụkwara inweta ọgwụ ndị sitere n’okike e ji agwọ ọrịa n’oké osimiri. Ruo ọtụtụ narị afọ, a nọwo na-eji ihe ndị e si n’azụ nweta eme ihe dị ka ọgwụ. A nọwo na-eji mmanụ imeju okporoko eme ihe eri ogologo oge. N’oge na-adịchabeghị anya, e jiwo mmiri ọgwụ ndị sitere n’azụ na ihe ndị ọzọ e kere eke dị n’oké osimiri mee ihe iji gwọọ ụkwara ume ọkụ na iji lụso nje virus na ọrịa cancer ọgụ.

E mewo mgbalị ime atụmatụ uru akụ̀ na ụba nke ihe ndị a na-enweta n’oké osimiri. Ọ bụ ezie na o siri ike ime atụmatụ ziri ezi n’akụkụ a, ndị nnyocha emewo atụmatụ na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke uru a na-enweta n’usoro ihe ndị dị ndụ na gburugburu ha n’ụwa nile na-esite n’oké osimiri. Nke a na-eme ka eziokwu ahụ bụ́ na e mere oké osimiri maka otu nzube pụta ìhè—iji zụọ ma kwado ndụ. Lee nnọọ ka nke a si kwekọọ n’ihe Bible na-akpọ “njupụta nke oké osimiri”!—Deuterọnọmi 33:19.

A na-enye Jehova otuto dị ka Onye Ukwu haziri ma mepụta akụ̀ a. A kpaliri Nehemaịa iji okwu ndị na-esonụ too ya: “Gị onwe gị bụ Jehova, nanị gị; Gị onwe gị emewo eluigwe, . . . na oké osimiri nile na ihe nile nke dị n’ime ha, Gị onwe gị na-edebekwa ha nile ndụ.”—Nehemaịa 9:6.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Lee 2004 Calendar of Jehovah’s Witnesses, September/October.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 9]

Mmiri, Ifufe na Ebili Mmiri

Mmiri na ifufe na-eme ka e nwee nnukwu ebili mmiri ndị na-adachi ntị bụ́ ndị na-amakwasị ọnụ ọnụ ugwu ndị bụ́ okwute okwute, dị ka ndị a dị na California, United States. Ebili mmiri abụrụwo mgbe nile akụkụ magburu onwe ya nke oké osimiri, na-egosipụta ike ya dị egwu. Ha bụkwa ihe ncheta na-atụ n’anya nke ike dị ebube nke Onye Okike. Jehova bụ onye “na-azọkwasịkwa ebe nile dị elu nke oké osimiri ụkwụ.” “Ike Ya ka O ji mee oké osimiri ka o dere duu.” (Job 9:8; 26:12) N’ezie, ‘karịa olu nile nke ọtụtụ mmiri, karịa ebili mmiri nile dị ebube nke oké osimiri, Jehova nọ n’ebe dị elu dị ebube.’—Abụ Ọma 93:4.

Ájá Ndị Yiri Ihe A Tụrụ Atụ

Mgbe mgbe, a na-enwe ihe ndị yiri ọmarịcha ihe a tụrụ atụ n’ụsọ oké osimiri, dị ka ikpo ájá a na-ahụ n’ebe a n’ụsọ oké osimiri Namibia, n’ebe ndịda Africa. Ifufe bụ ikike bụ́ isi na-akwagharị ya bụ́ nke na-eme ka ájá nwee ọdịdị pụrụ iche. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ikpo ájá pụrụ ịdị obere, ịdị elu nke ndị ọzọ pụrụ iru ihe dị ka mita 400. Ájá ndị dị otú ahụ buru ibu na-enyere anyị aka ịghọta ihe ahụ dị na Bible bụ́ “dị ka ájá nke dị n’ụsọ oké osimiri.” E ji ya gosi ihe a na-apụghị ịgụta ọnụ, ihe siri ike ịtụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. (Jenesis 22:17) Ọ na-eme ka anyị na-atụ egwu Onye Okike anyị, bụ́ onye mere ihe mgbochi ahụ sitere n’okike nke na-egbochi nsọpụta nke ebili mmiri nke oké osimiri.

[Foto dị na peeji nke 9]

Anwụ ọdịda n’ụsọ osimiri, Bight of Biafra, Cameroon