Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Yikwasịnụ Ekike Agha Zuru Ezu nke Sitere Na Chineke”

“Yikwasịnụ Ekike Agha Zuru Ezu nke Sitere Na Chineke”

“Yikwasịnụ Ekike Agha Zuru Ezu nke Sitere Na Chineke”

“Yikwasịnụ ekike agha zuru ezu nke sitere na Chineke ka unu wee nwee ike iguzosi ike megide nzupụta ọjọọ dị iche iche nke Ekwensu.”—NDỊ EFESỌS 6:11.

1, 2. N’okwu nke aka gị, kọwaa ekike agha ime mmụọ dị Ndị Kraịst mkpa iyikwasị.

ROM nọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke ike ya na narị afọ mbụ O.A. Ike nke ndị agha Rom mere ka obodo ahụ nwee ike ịchịkwa ihe ka ukwuu n’ụwa a maara n’oge ahụ. Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme kọwara usuu ndị agha a dị ka “òtù ndị agha kasị nwee ihe ịga nke ọma e nwere n’akụkọ ihe mere eme.” Ihe mejupụtara usuu ndị agha Rom nke bụ́ ọkpọka bụ ndị agha na-erube isi bụ́ ndị na-enweta ọzụzụ siri ike, ma ihe ịga nke ọma ha dị ka usuu ndị agha dị irè dabekwaara n’ekike agha ha. Pọl onyeozi ji ekike agha nke onye agha Rom mee ihe atụ nke ekike agha ime mmụọ dị Ndị Kraịst mkpa iji nwee ihe ịga nke ọma n’ọgụ megide Ekwensu.

2 Anyị na-achọta nkọwa nke ekike agha ime mmụọ a ná Ndị Efesọs 6:14-17. Pọl dere, sị: “Guzosienụ ike, n’ịbụ ndị ji eziokwu kee gburugburu úkwù unu, na-eyikwasịkwa ihe mgbochi obi bụ́ ezi omume, na-eyirikwa akpụkpọ ụkwụ bụ́ ngwá ọrụ nke ozi ọma nke udo n’ụkwụ unu. Karịsịa ihe nile, burunụ ọta ukwu bụ́ okwukwe, bụ́ nke unu ga-eji nwee ike imenyụ akụ́ ụta nile na-ere ọkụ nke ajọ onye ahụ. Ọzọ, naranụ okpu ígwè bụ́ nzọpụta, na mma agha nke mmụọ nsọ, ya bụ, okwu Chineke.” E lee ya anya n’ụzọ nkịtị, ekike agha ndị Pọl kọwara na-enye onye agha Rom nchebe dị ukwuu. O jikwa mma agha, ngwá agha ya bụ́ isi, alụso onye iro ya agha.

3. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị irube isi ná ntụziaka Jizọs Kraịst ma na-agbaso ihe nlereanya ya?

3 E wezụga ngwá agha na ọzụzụ, ihe ịga nke ọma nke ndị agha Rom dabeere ná ndị agha ahụ irubere ọchịagha ha isi. N’otu aka ahụ, Ndị Kraịst aghaghị irubere Jizọs Kraịst isi, bụ́ onye Bible na-akọwa dị ka “onye iwu nye ndị nile dị iche iche.” (Aịsaịa 55:4) Ọ bụkwa “isi nke ọgbakọ ahụ.” (Ndị Efesọs 5:23) Jizọs na-enye anyị ntụziaka maka agha ime mmụọ anyị ma bụrụ ihe nlereanya bụ́ ịgba nke ụzọ isi yikwasị ekike agha ime mmụọ ahụ. (1 Pita 2:21) Ebe ọ bụ na àgwà yiri nke Kraịst nwere nnọọ ihe jikọrọ ya na ekike agha ime mmụọ anyị, Akwụkwọ Nsọ na-adụ anyị ọdụ ‘iwere ọnọdụ uche nke Kraịst kee onwe anyị ekike.’ (1 Pita 4:1) N’ihi ya, ka anyị na-atụle akụkụ nke ọ bụla nke ekike agha ime mmụọ anyị, anyị ga-eji ihe nlereanya Jizọs gosi mkpa ọ dị na otú o si dị irè.

Ichebe Úkwù, Obi na Ụkwụ

4. Ọrụ dị aṅaa ka ajị̀ na-arụ n’ekike agha nke onye agha, gịnịkwa ka ọ na-eme ihe atụ ya?

4 Jiri eziokwu kee úkwù gburugburu. N’oge Bible, ndị agha na-eyi belt e ji akpụkpọ anụ mee, ma ọ bụ ajị̀, nke na-adị site na sentimita 5 ruo sentimita 15 n’obosara. Ụfọdụ ndị nsụgharị na-atụ aro na amaokwu ahụ kwesịrị ịgụ, sị, “jiri eziokwu kee n’úkwù gị dị ka belt.” Belt onye agha na-enye aka echebe úkwù ya, ọ na-emekwa ka o nwee ebe dị mma ọ ga-amịnye mma agha ya. Mgbe onye agha kere ihe n’úkwù ya, ọ na-ejikere ịga agha. Pọl ji belt onye agha mee ihe atụ nke ókè eziokwu nke Akwụkwọ Nsọ kwesịrị imetụtaru ndụ anyị. E kwesịrị ikesi ya ike gburugburu úkwù anyị, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ka anyị wee nwee ike ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’eziokwu ahụ, nweekwa ike ịgbachitere ya n’oge ọ bụla. (Abụ Ọma 43:3; 1 Pita 3:15) Iji mezuo nke ahụ, ọ dị anyị mkpa ịdị na-amụchi Bible anya ma na-atụgharị uche n’ihe ndị dị n’ime ya. Jizọs nwere iwu Chineke ‘n’ime obi ya.’ (Abụ Ọma 40:8) Mgbe ndị mmegide jụrụ ya ajụjụ, ọ pụrụ ịzaghachi site n’ihota Akwụkwọ Nsọ n’isi.— Matiu 19:3-6; 22:23-32.

5. Kọwaa otú ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ pụrụ isi nyere anyị aka n’oge ule ma ọ bụ ọnwụnwa.

5 Mgbe anyị kwere ka eziokwu nke Bible na-eduzi anyị, ọ pụrụ ichebe anyị pụọ n’echiche hiere ụzọ ma nyere anyị aka ime mkpebi ndị amamihe dị na ha. N’oge ọnwụnwa ma ọ bụ ule, ụkpụrụ nduzi Bible ga-eme ka mkpebi anyị ime ihe ziri ezi sie ike. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, anyị ga-ahụ Onye Nkụzi Ukwu anyị bụ́ Jehova, anyị ga-anụkwa okwu n’azụ anyị nke na-asị: “Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya.”—Aịsaịa 30:20, 21.

6. N’ihi gịnị ka obi ihe atụ anyị ji chọọ nchebe, oleekwa otú ezi omume pụrụ isi chebe ya n’ụzọ dị irè?

6 Ihe mgbochi obi nke ezi omume. Ihe mgbochi obi nke onye agha na-echebe ihe dị oké mkpa, obi. Obi ihe atụ anyị—mmadụ ime anyị—chọrọ nchebe pụrụ iche n’ihi na ọ na-achọkarị ime ihe na-adịghị mma. (Jenesis 8:21) N’ihi ya, anyị aghaghị ịmara ụkpụrụ ezi omume Jehova na ịhụ ha n’anya. (Abụ Ọma 119:97, 105) Ịhụnanya anyị nwere maka ezi omume na-akpali anyị ịjụ echiche ụwa nke na-eme ka a na-eleghara nduzi doro anya nke Jehova anya ma ọ bụ na-ewere ha dị ka ndị na-adịchaghị mkpa. Ọzọkwa, mgbe anyị hụrụ ezi ihe n’anya ma kpọọ ihe ọjọọ asị, anyị na-ezere ịchụso ụzọ ndụ nke pụrụ ibibi ndụ anyị. (Abụ Ọma 119:99-101; Emọs 5:15) Jizọs bụ ezi ihe nlereanya n’akụkụ a, n’ihi na banyere ya, Akwụkwọ Nsọ na-ekwu, sị: “Ị hụrụ ezi omume n’anya, ị kpọkwara mmebi iwu asị.”—Ndị Hibru 1:9. *

7. N’ihi gịnị ka akpụkpọ ụkwụ siri ike ji dị onye agha Rom mkpa, gịnịkwa ka ọ na-eme ihe atụ ya?

7 Na-eyirikwa ngwá ọrụ nke ozi ọma nke udo n’ụkwụ. Akpụkpọ ụkwụ ma ọ bụ sandal siri ike dị ndị agha Rom mkpa, ebe ọ bụ na n’oge agha, ha na-eyi uwe agha ma ọ bụ na-ebu ngwá agha dị kilogram 27 eje ije ruo kilomita 30 kwa ụbọchị. Pọl ji akpụkpọ ụkwụ mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị dị ka ihe atụ nke njikere anyị dị ikwusara onye ọ bụla ga-ege ntị ozi Alaeze ahụ. Nke a dị mkpa n’ihi na olee otú ndị mmadụ ga-esi mara Jehova ma ọ bụrụ na anyị adịghị njikere ma nwee ọchịchọ ime nkwusa?—Ndị Rom 10:13-15.

8. Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya Jizọs dị ka onye na-ekwusa ozi ọma ahụ?

8 Gịnị bụ ọrụ kasị mkpa ná ndụ Jizọs? Ọ gwara Gọvanọ Pọntiọs Paịlet nke Rom, sị: ‘Abịawo m n’ụwa iji gbaara eziokwu ahụ àmà.’ Jizọs mere nkwusa n’oge ọ bụla ọ hụrụ onye ga-ege ntị, ozi ya tọkwara ya ụtọ nke ukwuu nke na o butere ya ụzọ karịa mkpa anụ ahụ́ ya. (Jọn 4:5-34; 18:37) Dị ka Jizọs, ọ bụrụ na anyị nwere ọchịchọ siri ike ikwusa ozi ọma ahụ, anyị ga-ahụ ọtụtụ ohere iji soro ndị ọzọ kerịta ya. Ọzọkwa, anyị imikpu onwe anyị n’ozi anyị ga-enyere anyị aka ịnọgide na-adị ike n’ụzọ ime mmụọ.—Ọrụ 18:5.

Ọta, Okpu Ígwè na Mma Agha

9. Nchebe dị aṅaa ka ọta ukwu na-enye onye agha Rom?

9 Ọta ukwu bụ́ okwukwe. Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “ọta ukwu” na-ezo aka n’ọta buru nnọọ ibu ruo n’ókè nke ikpuchi akụkụ ka ukwuu nke ahụ́. Ọ ga-echebe onye agha pụọ ‘n’akụ́ ụta nile na-ere ọkụ’ ndị e zoro aka na ha ná Ndị Efesọs 6:16. N’oge Bible, ndị agha na-eji akụ́ ndị e ji achara mee bụ́ ndị nwere ígwè a pụrụ ịgbanye mmanụ ọkụ n’ime ha. Otu ọkà mmụta na-akọwa akụ́ ndị a dị ka “ngwá agha kasị dịrị ize ndụ n’agha oge ochie.” Ọ bụrụ na onye agha enweghị ọta ukwu iji chebe onwe ya pụọ n’akụ́ ụta ndị dị otú ahụ, ha pụrụ imerụ ya ahụ́ nke ukwuu ma ọ bụ ọbụna gbuo ya.

10, 11. (a) ‘Akụ́ ụta dị aṅaa na-ere ọkụ’ nke Setan pụrụ imebi okwukwe anyị? (b) Olee otú ihe nlereanya Jizọs si gosi mkpa okwukwe dị n’oge ule?

10 Olee ‘akụ́ ụta ndị na-ere ọkụ’ Setan ji eme ihe iji mebie okwukwe anyị? Ọ pụrụ ịkpalite mkpagbu ma ọ bụ mmegide n’ime ezinụlọ, n’ebe ọrụ, ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ. Ọchịchọ ịnọgide na-enwetakwu ihe onwunwe na ihe ndọrọ nke omume rụrụ arụ ebibiwokwa ụfọdụ ndị n’ụzọ ime mmụọ. Iji chebe onwe anyị pụọ n’ihe ize ndụ ndị dị otú ahụ, “karịsịa ihe nile, [anyị aghaghị iburu] ọta ukwu bụ́ okwukwe.” Okwukwe na-abịa site n’ịmụ banyere Jehova, ịgwa ya okwu mgbe nile n’ekpere, na ịghọta otú o si echebe ma na-agọzi anyị.—Joshua 23:14; Luk 17:5; Ndị Rom 10:17.

11 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o gosipụtara mkpa ọ dị inwe okwukwe siri ike n’oge ihe isi ike. Ọ tụkwasịrị mkpebi nke Nna ya obi kpamkpam, nweekwa obi ụtọ ime uche Chineke. (Matiu 26:42, 53, 54; Jọn 6:38) Ọbụna mgbe ọ na-ahụsi anya n’ogige Getsemeni, Jizọs gwara Nna ya, sị: “Ọ bụghị dị ka m si chọọ ya, kama dị ka i si chọọ.” (Matiu 26:39) Ọ dịghị mgbe Jizọs chefuru mkpa ọ dị iguzosi ike n’ihe na ime ka Nna ya ṅụrịa. (Ilu 27:11) Ọ bụrụ na anyị enwee obi ike dị otú ahụ na Jehova, anyị agaghị ekwe ka nkatọ ma ọ bụ mmegide mee ka okwukwe anyị ghara ịdị ike. Kama nke ahụ, a ga-ewusi okwukwe anyị ike ma ọ bụrụ na anyị adabere na Chineke, na-egosipụta ịhụnanya n’ebe ọ nọ ma na-edebe ihe o nyere n’iwu. (Abụ Ọma 19:7-11; 1 Jọn 5:3) Ọ dịghị ihe onwunwe ma ọ bụ ihe ụtọ anụ ahụ́ na-adịru nwa oge nke a pụrụ iji tụnyere ngọzi Jehova kwadebeere ndị hụrụ ya n’anya.—Ilu 10:22.

12. Akụkụ dị mkpa dị aṅaa nke ahụ́ anyị ka okpu ígwè ihe atụ anyị na-echebe, n’ihi gịnịkwa ka nchebe dị otú ahụ ji dị oké mkpa?

12 Okpu ígwè bụ́ nzọpụta. Okpu ígwè na-echebe isi na ụbụrụ onye agha—bụ́ isi iyi nke ihe ọmụma. E ji olileanya anyị dị ka Ndị Kraịst tụnyere okpu ígwè n’ihi na ọ na-echebe uche anyị. (1 Ndị Tesalonaịka 5:8) Ọ bụ ezie na anyị emewo ka uche anyị dị ọhụrụ site n’ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke, anyị ka bụ ụmụ mmadụ na-adịghị ike na ndị na-ezughị okè. A pụrụ imerụ uche anyị n’ụzọ dị mfe. Ihe mgbaru ọsọ nke usoro ihe a pụrụ ịdọpụ uche anyị ma ọ bụ ọbụna nọchie olileanya Chineke nyere anyị. (Ndị Rom 7:18; 12:2) Ekwensu gbalịrị n’efu ịdọpụ uche Jizọs site n’inye ya “alaeze nile nke ụwa na ebube ha.” (Matiu 4:8) Ma Jizọs jụwara isi ịnara onyinye ahụ, Pọl kwukwara banyere ya, sị: “N’ihi ọṅụ ahụ e setịpụrụ n’ihu [Jizọs], o diri osisi ịta ahụhụ, na-eleda ihere anya, ọ nọdụwokwa ala n’aka nri nke ocheeze Chineke.”—Ndị Hibru 12:2.

13. Olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-enwe obi ike n’olileanya ahụ dị n’ihu?

13 Ụdị obi ike Jizọs nwere abịaraghị onwe ya. Ọ bụrụ na anyị ejiri ọchịchọ na ihe mgbaru ọsọ nke usoro ihe a mejuo uche anyị kama iburu olileanya ahụ dị n’ihu n’uche, okwukwe anyị nwere ná nkwa Chineke ga-ajụwa oyi. Ka oge na-aga, anyị pụrụ ọbụna ịkwụsị kpamkpam inwe olileanya. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na anyị ana-atụgharị uche mgbe nile ná nkwa Chineke, anyị ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ n’olileanya e debere anyị n’ihu.—Ndị Rom 12:12.

14, 15. (a) Gịnị bụ mma agha ihe atụ anyị, oleekwa otú a pụrụ isi jiri ya na-eme ihe? (b) Nye ihe atụ nke otú mma agha nke mmụọ nsọ pụrụ isi nyere anyị aka iguzogide ọnwụnwa.

14 Mma agha nke mmụọ nsọ. Okwu ma ọ bụ ozi Chineke, bụ́ nke e dekọrọ na Bible, dị ka mma agha dị nkọ nke nwere ihu abụọ bụ́ nke pụrụ igbutu ụgha nke okpukpe ma nyere ndị obi ha ziri ezi aka ịchọta nnwere onwe ime mmụọ. (Jọn 8:32; Ndị Hibru 4:12) Mma agha ime mmụọ a pụkwara ichebe anyị mgbe a na-anwa anyị ọnwụnwa ma ọ bụ mgbe ndị si n’ezi ofufe dapụ na-agbalị ibibi okwukwe anyị. (2 Ndị Kọrint 10:4, 5) Lee ka anyị si nwee ekele na ‘Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke ma na-akwadebe anyị n’ụzọ zuru ezu maka ezi ọrụ ọ bụla’!—2 Timoti 3:16, 17.

15 Mgbe Setan nwara ya ọnwụnwa n’ịkpa, Jizọs ji mma agha nke mmụọ nsọ mee ihe n’ụzọ dị irè iji gbochie echiche ụgha na ọnwụnwa aghụghọ. Nye ihe ịma aka ọ bụla nke Setan, ọ zara, sị: “E dere, sị.” (Matiu 4:1-11) David, otu n’ime Ndịàmà Jehova nọ na Spen, chọpụtakwara na Akwụkwọ Nsọ nyeere ya aka imeri ọnwụnwa. Mgbe ọ dị afọ 19, otu nwa agbọghọ mara mma bụ́ onye ya na ya na-arụ n’otu ụlọ ọrụ na-edebe ihe ọcha gwara ya ka ha “kporie ndụ.” David jụrụ ọnwụnwa ya ma rịọ onye nlekọta ọrụ ya ka o nye ya ọrụ n’ebe dị iche ka ọnọdụ ahụ ghara ibilite ọzọ. “Echetara m ihe nlereanya Josef,” ka David kwuru. “Ọ jụrụ omume rụrụ arụ ma si n’ebe ahụ pụọ ozugbo. Emere m otu ihe ahụ.”—Jenesis 39:10-12.

16. Kọwaa ihe mere ọzụzụ ji dị anyị mkpa iji wee nwee ike ‘ijizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.’

16 Jizọs jikwa mma agha nke mmụọ nsọ nyere ndị ọzọ aka inwere onwe ha pụọ n’aka Setan. “Ihe m na-ezi abụghị nke m,” ka Jizọs kwuru, “kama ọ bụ nke onye zitere m.” (Jọn 7:16) Iji ṅomie izi ihe Jizọs nke bụ́ ịgba, ọzụzụ dị anyị mkpa. Banyere ndị agha Rom, onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus dere, sị: “Onye agha ọ bụla na-emega ahụ́ kwa ụbọchị, ọ na-ejikwa ịdị uchu dị ukwuu eme nke ahụ, dị ka à ga-asị na ọ bụ n’oge agha, bụ́ nke na-eme ka ọ dịrị ya mfe ịtachi obi n’ọgbọ agha.” N’agha ime mmụọ anyị, ọ dị anyị mkpa iji Bible na-eme ihe. Ọzọkwa, anyị aghaghị ‘ime ike anyị nile iche onwe anyị n’ihu Chineke dị ka ndị a nwapụtara anwapụta, dị ka ndị ọrụ nke na-enweghị ihe ha ga-emere ihere, na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.’ (2 Timoti 2:15) Leekwa afọ ojuju dị ukwuu anyị na-enwe mgbe anyị ji Akwụkwọ Nsọ zaa ajụjụ onye nwere mmasị ji ezi obi jụọ!

Na-ekpe Ekpere n’Oge Nile

17, 18. (a) Òkè dị aṅaa ka ekpere na-ekere n’iguzogide Setan? (b) Nye ihe atụ iji gosi uru ekpere bara.

17 Mgbe ọ tụlesịrị ekike agha ime mmụọ zuru ezu, Pọl gbakwụnyere ndụmọdụ ọzọ dị mkpa. N’iguzogide Setan, Ndị Kraịst kwesịrị ịdị na-eji “ụdị ọ bụla nke ikpe ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike” eme ihe. Ugboro ole? ‘Na-anọgidenụ n’ekpere n’oge nile n’ime mmụọ nsọ,’ ka Pọl dere. (Ndị Efesọs 6:18) Mgbe anyị na-eche ọnwụnwa ma ọ bụ ule ihu, ma ọ bụ mgbe anyị nwere nkụda mmụọ, ekpere pụrụ iwusi anyị ike nke ukwuu. (Matiu 26:41) Jizọs “ji mkpu ákwá siri ike na anya mmiri kpesie ekpere ike ma rịọkwa Onye ahụ nke nwere ike ịzọpụta ya n’ọnwụ arịrịọ, e jikwa ihu ọma nụrụ olu ya n’ihi egwu Chineke o nwere.”—Ndị Hibru 5:7.

18 Milagros, bụ́ onye lekọtaworo di ya nke na-arịa ọrịa na-adịghị ala ala ruo ihe karịrị afọ 15 na-ekwu, sị: “Mgbe m nwere nkụda mmụọ, ana m echigharịkwuru Jehova n’ekpere. Ọ dịghị onye pụrụ inyere m aka karịa ya. N’eziokwu, ọ dị mgbe ọ na-adị m ka m gaghị anagidelikwa ọnọdụ m. Ma ugboro ugboro, mgbe m kpekusịrị Jehova ekpere, m na-enweghachi ume ọhụrụ na ahụ́ efe.”

19, 20. Gịnị dị anyị mkpa iji nwee mmeri n’ọgụ anyị megide Setan?

19 Ekwensu maara na oge ya dị mkpụmkpụ, ọ na-agbalịsikwa ike imeri anyị. (Mkpughe 12:12, 17) Anyị aghaghị iguzogide onye iro a dị ike ma “lụọ ezi ọgụ nke okwukwe.” (1 Timoti 6:12) Nke a chọrọ ike karịrị ike nkịtị. (2 Ndị Kọrint 4:7) Enyemaka nke mmụọ nsọ Chineke dịkwa anyị mkpa, n’ihi ya kwa, anyị kwesịrị ịdị na-ekpe ekpere maka ya. Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu, ọ bụ ezie na unu bụ ndị ajọ omume, maara ụzọ isi nye ụmụ unu ezi onyinye, lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ karị!”—Luk 11:13.

20 N’ụzọ doro anya, ọ dị oké mkpa ka anyị yikwasị ekike agha zuru ezu nke Jehova na-enye. Iyikwasị ekike agha ime mmụọ a chọrọ ka anyị zụlite àgwà ndị na-amasị Chineke, dị ka okwukwe na ezi omume. Ọ chọrọ ka anyị hụ eziokwu n’anya dị ka à ga-asị na e kere ya n’úkwù anyị, ka anyị dị njikere ikwusa ozi ọma n’oge nile, nakwa ka anyị buru olileanya ahụ dị anyị n’ihu n’uche. Anyị aghaghị ịmụta iji nkà eji mma agha nke mmụọ nsọ eme ihe. Site n’iyikwasị ekike agha zuru ezu nke sitere na Chineke, anyị pụrụ imeri na mgba anyị na ndị mmụọ ọjọọ na-agba, anyị pụkwara n’ezie iwetara aha dị nsọ nke Jehova otuto.—Ndị Rom 8:37-39.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 N’amụma Aịzaịa, a kọwara Jehova n’onwe ya dị ka onye yi “ezi omume dị ka uwe agha.” N’ihi ya, ọ na-achọ ka ndị nlekọta ọgbakọ na-ekpe ikpe ziri ezi ma na-eme ezi omume.—Aịsaịa 59:14, 15, 17.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Ònye bụ ihe nlereanya kasịnụ nke otú e kwesịrị isi yikwasị ekike agha ime mmụọ, n’ihi gịnịkwa ka anyị ji kwesị iji nlezianya tụlee ihe nlereanya ya?

• Olee otú anyị pụrụ isi chebe uche na obi ihe atụ anyị?

• Olee otú anyị pụrụ isi jiri mma agha nke mmụọ nsọ na-eme ihe nke ọma?

• N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịdị na-ekpe ekpere n’oge nile?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Iji ịdị uchu na-amụ Bible pụrụ ịkpali anyị ikwusa ozi ọma ahụ n’oge nile

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Olileanya anyị e ji n’aka na-enyere anyị aka iche ọnwụnwa ihu

[Foto ndị dị na peeji nke 19]

Ị̀ na-eji “mma agha nke mmụọ nsọ” eme ihe n’ozi?