Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Mgbe Jọn onyeozi dere na “ịhụnanya zuru okè na-achụpụ egwu n’èzí,” gịnị ka o bu n’uche mgbe ọ na-ekwu banyere “ịhụnanya zuru okè,” “egwu” dịkwa aṅaa ka e si otú ahụ achụpụ n’èzí?

“Egwu ọ bụla adịghị n’ịhụnanya,” ka Jọn onyeozi dere, “kama ịhụnanya zuru okè na-achụpụ egwu n’èzí, n’ihi na egwu na-eweta ihe mgbochi. N’ezie, e mebeghị ka onye na-atụ egwu zuo okè n’ịhụnanya.”—1 Jọn 4:18.

Ihe ndị gbara amaokwu a gburugburu na-egosi na Jọn na-ekwu banyere inwe nkwuwa okwu—karịsịa njikọ dị n’etiti ịhụ Chineke n’anya na inwe nkwuwa okwu n’ebe Ọ nọ. A pụrụ ịhụ nke a site n’ihe anyị na-agụ n’amaokwu nke 17: “Otú a ka e siworo mee ka ịhụnanya zuo okè n’ebe anyị nọ, ka anyị wee nwee nkwuwa okwu n’ụbọchị ikpe.” Ókè Onye Kraịst hụruru Chineke n’anya ma na-enwe mmetụta na Chineke hụrụ ya n’anya na-emetụta ya inwe nkwuwa okwu—ma ọ bụ enweghị ya—mgbe ọ na-abịakwute Chineke n’ekpere.

Okwu ahụ bụ́ “ịhụnanya zuru okè” nwere ihe ọ pụtara. Dị ka e si jiri ya mee ihe na Bible, okwu ahụ bụ́ “zuru okè” apụtaghị izu okè n’ụzọ a na-akparaghị ókè, ya bụ, n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu, kama a na-ejikarị ya eme ihe n’ụzọ a kpaara ókè. Dị ka ihe atụ, n’Ozizi Elu Ugwu ya, Jizọs kwuru, sị: “N’otu aka ahụ unu aghaghị izu okè, dị ka Nna unu nke eluigwe zuru okè.” Jizọs nọ na-agwa ụmụazụ ya na ọ bụrụ na ha na-ahụ nanị ndị na-ahụ ha n’anya n’anya, ịhụnanya ha ga-abụ nke na-ezughị ezu, nke ihe kọrọ, na nke na-adịghị mma. Ha kwesịrị ime ka ịhụnanya ha zuo okè, site n’ịhụ ọbụna ndị iro ha n’anya. Mgbe ahụ, n’ụzọ yiri nke ahụ, mgbe Jọn dere banyere “ịhụnanya zuru okè,” ọ na-ekwu banyere inwe ịhụnanya a zụlitere nke ọma maka Chineke na nke sitere n’obi dum, nke na-emetụtakwa akụkụ nile nke ndụ mmadụ.—Matiu 5:46-48; 19:20, 21.

Mgbe Onye Kraịst na-agakwuru Chineke n’ekpere, ọ na-eburu nnọọ n’uche na ya bụ onye na-eme mmehie na onye na-ezughị okè. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ịhụnanya ya maka Chineke na mmetụta nke ịbụ onye Chineke hụrụ n’anya abụrụ nke a zụlitere nke ọma, ọ naghị atụ egwu nke ịbụ onye a mara ikpe ma ọ bụ onye a jụrụ ajụ. Kama nke ahụ, ọ na-enwe nkwuwa okwu n’ikwupụta ihe dị ya n’obi na n’ịrịọ mgbaghara mmehie ná ndabere nke àjà mgbapụta ahụ, bụ́ nke Chineke jiworo ịhụnanya nye site na Jizọs Kraịst. Ọ na-ejide n’aka na Chineke na-anụ arịrịọ ya.

Olee otú a pụrụ isi ‘mee ka mmadụ zuo okè n’ịhụnanya,’ sikwa otú ahụ ‘chụpụ egwu nke ịbụ onye a mara ikpe na onye a jụrụ ajụ n’èzí’? “Onye ọ bụla nke na-edebe okwu ya [Chineke], n’eziokwu n’ime onye a ka e meworo ka ịhụnanya ya n’ebe Chineke nọ zuo okè,” ka Jọn onyeozi kwuru. (1 Jọn 2:5) Tụlee nke a: Ọ bụrụ na Chineke hụrụ anyị n’anya mgbe anyị ka bụ ndị mmehie, ọ̀ bụ na ọ gaghị ahụ anyị n’anya karịa ma ọ bụrụ na anyị echegharịa n’ezie ma jiri ịdị uchu “na-edebe okwu ya”? (Ndị Rom 5:8; 1 Jọn 4:10) N’ezie, ọ bụrụhaala na anyị anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi, anyị pụrụ inwe otu mmesi obi ike ahụ Pọl onyeozi nwere mgbe o kwuru banyere Chineke, sị: “Onye ahụ nke na-azọghị ọbụna Ọkpara nke ya kama nyefee ya maka anyị nile, gịnị mere ya na ya na-agaghịkwa eji obiọma nye anyị ihe nile ọzọ?”—Ndị Rom 8:32.