Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Na-enwenụ Mmetụta Dị Nro Maka Ibe Unu”

“Na-enwenụ Mmetụta Dị Nro Maka Ibe Unu”

“Na-enwenụ Mmetụta Dị Nro Maka Ibe Unu”

“N’ịhụnanya ụmụnna, na-enwenụ mmetụta dị nro maka ibe unu.”—NDỊ ROM 12:10.

1, 2. Mmekọrịta dị aṅaa ka otu onye ozi ala ọzọ nke oge a na Pọl onyeozi na ụmụnna ha nwere?

N’IME afọ 43 nile o jere ozi ala ọzọ n’Ime Ime Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, e ji ịhụnanya Don nwere maka ndị ọ na-elekọta mara ya. Ka ọ nọ ugbu a na-arịa ọrịa ga-egbu ya, ụfọdụ ndị ọ mụụrụ ihe mere njem ruru ọtụtụ puku kilomita gaa n’akụkụ àkwà ya ịsị ya,“Kamsahamnida, kamsahamnida!”—“I meela, i meela!” n’asụsụ Korean. Mmetụta dị nro Don nwere emetụwo ha n’obi.

2 Ihe atụ a banyere Don abụghị ihe ọhụrụ. Na narị afọ mbụ, Pọl onyeozi gosipụtara mmetụta ịhụnanya miri emi n’ebe ndị o jeere ozi nọ. Pọl chụrụ onwe ya n’àjà. Ọ bụ ezie na ọ bụ nwoke nwere nkwenye siri ike, ọ bụkwa onye dị nro ma na-echebara ndị ọzọ echiche, “dị ka mgbe nne na-enye nwa ara na-elezi ụmụ nke aka ya anya.” O degaara ọgbakọ dị na Tesalonaịka akwụkwọ, sị: “N’inwe mmetụta dị nro maka unu, ọ masịrị anyị inye unu, ọ bụghị nanị ozi ọma Chineke, kamakwa mkpụrụ obi anyị onwe anyị, n’ihi na unu ghọrọ ndị anyị hụrụ n’anya.” (1 Ndị Tesalonaịka 2:7, 8) Ka e mesịrị, mgbe Pọl gwara ụmụnna ya ndị Efesọs na ha agaghị ahụ ya ọzọ, “ịkwa ákwá . . . dara n’etiti ha nile, ha dakwasịkwara Pọl n’olu ma susuo ya ọnụ n’ụzọ dị nro.” (Ọrụ 20:25, 37) O doro anya na mmekọrịta dị n’etiti Pọl na ụmụnna ya karịrị nnọọ nke ndị nọ n’otu okpukpe. Ha nwere mmetụta dị nro n’ebe ibe ha nọ.

Mmetụta Dị Nro na Ịhụnanya

3. Olee njikọ okwu ndị Bible ji mee ihe maka mmetụta ịhụnanya na ịhụnanya nwere?

3 N’Akwụkwọ Nsọ, mmetụta dị nro, mmetụta maka ndị ọzọ na ọmịiko na àgwà Ndị Kraịst kasị mkpa—ịhụnanya—nwere njikọ chiri anya. (1 Ndị Tesalonaịka 2:8; 2 Pita 1:7) Dị ka akụkụ dị iche iche nke daịamọnd mara mma, àgwà nsọpụrụ Chineke ndị a nile na-arụkọ ọrụ ọnụ. Ọ bụghị nanị na ha na-adọtakwu Ndị Kraịst nso n’ebe ibe ha nọ, kamakwa n’ebe Nna ha nke eluigwe nọ. N’ihi ya, Pọl onyeozi gbara ndị kwere ekwe ibe ya ume, sị: “Ka ịhụnanya unu bụrụ nke ihu abụọ na-adịghị na ya. . . . N’ịhụnanya ụmụnna, na-enwenụ mmetụta dị nro maka ibe unu.”—Ndị Rom 12:9, 10.

4. Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “mmetụta dị nro” pụtara?

4 Okwu Grik Pọl ji mee ihe maka “mmetụta dị nro” nwere akụkụ abụọ, otu pụtara ọbụbụenyi, nke ọzọ apụtakwa ịhụnanya ebumpụta ụwa. Dị ka otu ọkà mmụta Bible si kọwaa, nke a pụtara na “a ga-eji ụdị nraranye na-adị n’ezinụlọ dị n’otu nke na-ahụ n’anya ma na-akwadorịta ibe ha mara” Ndị Kraịst. Nke ahụ ọ̀ bụ ụdị mmetụta ị na-enwe n’ebe ụmụnna gị ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ Ndị Kraịst nọ? Ịhụnanya—mmetụta nke ịbụ ụmụnne—kwesịrị ijupụta n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (Ndị Galeshia 6:10) N’ihi ya, The New Testament in Modern English, nke J. B. Phillips dere, si otú a tinye Ndị Rom 12:10: “Ka anyị nwee mmetụta na-ekpo nnọọ ọkụ n’ebe ibe anyị nọ dị ka ụmụnne.” The Jerusalem Bible na-agụkwa, sị: “Na-ahụrịtanụ ibe unu n’anya dị ka o kwesịrị ụmụnne.” Ee, ịhụnanya dị n’etiti Ndị Kraịst na-agụnye ihe karịrị ezi uche na ibu ọrụ. ‘N’inwe mmetụta ụmụnna nke ihu abụọ na-adịghị ya,’ anyị kwesịrị inwe ‘ịhụnanya siri ike n’ebe ibe anyị nọ site n’obi.’—1 Pita 1:22.

“Unu Bụ Ndị Chineke Na-akụziri Ịhụrịta Ibe Unu n’Anya”

5, 6. (a) Olee otú Jehova siworo jiri mgbakọ mba nile kụziere ndị ya ihe banyere mmetụta ịhụnanya Ndị Kraịst? (b) Olee otú njikọ dị n’etiti ụmụnna si esiwanye ike ka oge ụfọdụ gasịrị?

5 Ọ bụ ezie na n’ụwa a, “ịhụnanya nke ndị ka n’ọnụ ọgụgụ” na-ajụ oyi, Jehova na-akụziri ndị ya nke oge a ‘ịhụrịta ibe ha n’anya.’ (Matiu 24:12; 1 Ndị Tesalonaịka 4:9) Mgbakọ mba nile nke Ndịàmà Jehova na-enye ohere pụrụ iche maka ọzụzụ a. Ná mgbakọ ndị a, Ndịàmà bi n’ebe a na-eme mgbakọ ahụ na-ezute ụmụnna si n’ala ndị dị anya, ọtụtụ anabatawokwa ndị si mba ofesi n’ụlọ ha. N’otu mgbakọ e nwere na nso nso a, ụfọdụ si ná mba ebe ndị mmadụ na-adịghị egosipụtakarị mmetụta ha bịa. “Mgbe ndị a bịara mgbakọ rutere, ahụ́ erutụghị ha nnọọ ala, ha adịghịkwa emesara ahụ́,” ka otu Onye Kraịst nke nyere aka n’inweta ebe obibi kwuru. “Ma nanị ụbọchị isii ka e mesịrị ka ha na-asịrịta onwe ha nọdụ nke ọma, ha na ndị ha nọrọ na nke ha nọ na-amakụ onwe ha ma na-ebe ákwá. Ha anụwo ụtọ ụdị ịhụnanya Ndị Kraịst ha na-agaghị echefu echefu ma ọlị.” Ile ụmụnna anyị ọbịa n’agbanyeghị ebe ha si bịa pụrụ ime ka ndị bịara abịa na ndị a bịara na nke ha na-akpasorịta nnọọ ibe ha àgwà ọma.—Ndị Rom 12:13.

6 N’agbanyeghị otú mgbakọ ndị a pụrụ ịdịru n’ụtọ, a na-ewulite ọbụna mmekọrịta chiri anya karịa nke ahụ mgbe Ndị Kraịst jekọọrọ Jehova ozi ọnụ ruo ogologo oge. Mgbe anyị matara ụmụnna anyị nke ọma, anyị pụrụ inwe mmasị karị n’àgwà ọma ha dị iche iche—ịbụ ndị eziokwu, ndị a pụrụ ịtụkwasị obi, ndị na-eguzosi ike n’ihe, ndị obiọma, ndị na-emesapụ aka, ndị na-echebara ndị ọzọ echiche, ndị nwere ọmịiko, na ndị na-adịghị achọ ọdịmma onwe ha nanị. (Abụ Ọma 15:3-5; Ilu 19:22) Mark, bụ́ onye jere ozi ala ọzọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa, kwuru, sị, “Iso ụmụnna anyị na-arụkọ ọrụ na-eme ka e nwee njikọ ọ na-adịghị ihe pụrụ igbubi ya.”

7. Gịnị ka a chọrọ anyị n’aka iji na-enwe mmetụta ịhụnanya Ndị Kraịst n’ọgbakọ?

7 Iji zụlite ma nọgide na-enwe nkekọ dị otú ahụ n’ọgbakọ, ndị nọ n’ọgbakọ ahụ aghaghị ịdị na-abịaru ibe ha nso. Site n’ịgachi nzukọ Ndị Kraịst anya, anyị na-ewusi nkekọ dị n’etiti anyị na ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị ike. Site n’ịnọ ya na ikere òkè tupu nzukọ amalite, mgbe ọ na-aga n’ihu, na mgbe e mechisịrị, anyị na-agbarịta ibe anyị ume ma na-akpali ibe anyị “inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.” (Ndị Hibru 10:24, 25) “Eji m obi ụtọ na-echeta,” ka otu okenye nọ na United States na-akọ, “na mgbe m ka bụ nwata, ezinụlọ m na-eso mgbe nile ná ndị ikpeazụ na-ahapụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, na-enwe mkparịta ụka enyi na enyi na nke bara uru ruo ogologo oge dị ka o kwere mee.”

Ọ̀ Dị Gị Mkpa ‘Ịgbasapụ’?

8. (a) Gịnị ka Pọl bu n’uche mgbe ọ gbara ndị Kọrint ume ‘ịgbasapụ’? (b) Gịnị ka anyị pụrụ ime iji kwalite mmetụta ịhụnanya n’ime ọgbakọ?

8 Iji kere òkè n’ụzọ zuru ezu ná mmetụta ịhụnanya dị otú ahụ, ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ‘ịgbasapụ’ n’obi anyị. Pọl onyeozi degaara ọgbakọ dị na Kọrint akwụkwọ, sị: “Obi anyị agbasapụwo. Unu nwere ohere n’ime anyị.” Pọl gbara ha ume imeghachi omume site ‘n’ịgbasapụ.’ (2 Ndị Kọrint 6:11-13) Ị̀ pụkwara ‘ịgbasapụ’ ná mmetụta ịhụnanya gị? Ọ dịghị gị mkpa ichere ka ndị ọzọ bịakwute gị. N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom, Pọl jikọtara mkpa ọ dị inwe mmetụta dị nro na ndụmọdụ a: “N’inye ibe unu nsọpụrụ, na-ebutenụ ụzọ.” (Ndị Rom 12:10) Iji kwanyere ndị ọzọ ùgwù, ị pụrụ ibute ụzọ n’ikele ha ná nzukọ. Ị pụkwara ịgwa ha ka ha sonyere gị n’ozi ubi ma ọ bụ n’ịkwadebe nzukọ. Ime otú ahụ na-enye ohere ka mmetụta dị nro tolite.

9. Nzọụkwụ ndị dị aṅaa ka ụfọdụ werewooro iji ghọọ ezi ndị enyi nke Ndị Kraịst ibe ha? (Gụnye ahụmahụ ọ bụla e nwere n’ógbè unu.)

9 Ezinụlọ na ndị mmadụ n’otu n’otu nọ n’ọgbakọ pụrụ ‘ịgbasapụ’ site n’ịdị na-eleta ibe ha, ikekwe na-erikọ obere nri ọnụ, nakwa site n’ịdị na-arụkọ ọrụ ndị dị mma ọnụ. (Luk 10:42; 14:12-14) Hakop na-ahaziri ìgwè dị nta mkpapụ ntụrụndụ site n’oge ruo n’oge. “Ndị nọ n’afọ ndụ nile na-abịa, gụnyere ndị nne na nna nanị ha na-azụ ụmụ,” ka ọ na-akọ. “Mmadụ nile na-eji obi ụtọ ala, ha na-enwekwa mmetụta nke ịnọkwu ibe ha nso.” Dị ka Ndị Kraịst, anyị kwesịrị ịgbalị, ọ bụghị nanị ịbụ ndị kwere ekwe ibe nke ụmụnna anyị, kamakwa ezi ndị enyi ha.—3 Jọn 14.

10. Gịnị ka anyị pụrụ ime mgbe anyị na ụmụnna anyị nwere nsogbu?

10 Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, ezughị okè pụrụ ime ka o sie ike ịzụlite ọbụbụenyi na mmetụta ịhụnanya. Gịnị ka anyị pụrụ ime? Nke mbụ, anyị pụrụ ikpe ekpere ka anyị na ụmụnna anyị nwee ezi mmekọrịta. Ọ bụ uche Chineke ka ndị na-ejere ya ozi bụrụ enyi ibe ha, ọ ga-azakwa ekpere dị otú ahụ e ji ezi obi kpee. (1 Jọn 4:20, 21; 5:14, 15) Anyị kwesịkwara ime ihe kwekọrọ n’ekpere anyị. Ric, bụ́ onye ozi na-ejegharị ejegharị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa, na-echeta otu nwanna nwoke nke àgwà ezoghị ọnụ ya mere ka o sie ike imeta ya enyi. “Kama ịdị na-ezere nwanna ahụ, ekpebiri m ịmara ya nke ọma,” ka Ric na-akọwa. “O mesịrị bụrụ na nna nwanna ahụ bụ onye na-eji aka ike enye ntaramahụhụ. Ozugbo m ghọtara otú nwanna ahụ siworo rụsie ọrụ ike iji merie àgwà ahụ na ọganihu o nweworo, amalitere m inwe mmasị miri eme n’ebe ọ nọ. Anyị ghọrọ ezi ndị enyi.”—1 Pita 4:8.

Meghee Obi Gị!

11. (a) Gịnị dị mkpa iji mee ka mmetụta ịhụnanya tolite n’ime ọgbakọ? (b) N’ihi gịnị ka ịghara igosi ndị ọzọ mmetụta ịhụnanya pụrụ iji bụrụ ihe na-emebi ihe n’ụzọ ime mmụọ?

11 Taa, ọtụtụ mmadụ na-ebi ndụ n’adịtụghị mgbe ha nwere ezigbo enyi. Lee ihe mwute nke a bụ! O kwesịghị ịdị otú ahụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ezi ịhụnanya ụmụnna abụghị nanị mkparịta ụka dị ùgwù na nke na-egosi nsọpụrụ; ọ bụghịkwa igosi ndị ọzọ mmetụta gabiga ókè. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịdị njikere imeghe obi anyị, dị ka Pọl mere n’ebe ndị Kọrint nọ, ma gosi ndị kwere ekwe ibe anyị na anyị na-echegbu nnọọ onwe anyị banyere ọdịmma ha. Ọ bụ ezie na ọ bụghị mmadụ nile na-emesapụrụ nnọọ ndị ọzọ ahụ́ ma ọ bụ bụrụ ndị ekwurekwu, ịjụbiga oyi ókè pụrụ imebi ihe. “Ọchịchọ nke ya onwe ya na-achọsi ike ka onye na-ekewapụ onwe ya na-achọ,” ka Bible na-adọ aka ná ntị. “Ọ bụ ezi nzube ihe nile ka ọ na-alụsosi ọgụ ike.”—Ilu 18:1.

12. N’ihi gịnị ka ezi nkwurịta okwu ji dị mkpa iji nwee mmekọrịta chiri anya n’ime ọgbakọ?

12 Ezi nkwurịta okwu bụ isi ihe na-eduga n’ezi ọbụbụenyi. (Jọn 15:15) Enyi nke anyị pụrụ ịkọrọ ihe anyị na-eche na mmetụta anyị na-enwe n’ime obi anyị dị anyị nile mkpa. Ọzọkwa, ka anyị na-amatakwu ibe anyị nke ọma, otú a ka ọ na-adịwanye mfe igbo mkpa ibe anyị. Mgbe anyị si otú a na-achọ ọdịmma nke ibe anyị, anyị na-akwalite mmetụta dị nro, anyị ga-ahụkwa ịbụ eziokwu nke okwu Jizọs ndị a: “A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35; Ndị Filipaị 2:1-4.

13. Gịnị ka anyị kwesịrị ime iji gosi na anyị nwere ezi mmetụta ịhụnanya n’ebe ụmụnna anyị nọ?

13 Ka mmetụta ịhụnanya anyị wee rụpụta ihe kasị mma, ọ dị anyị mkpa igosipụta ya. (Ilu 27:5) Mgbe anyị nwere ezi mmetụta ịhụnanya, o yikarịrị ka ọ̀ ga-apụta ìhè n’ihu anyị, ọ pụkwara ime ka obi ndị ọzọ meghachi omume na ya. “Ihe nke na-enye anya ìhè na-eme ka obi ṅụrịa,” ka onye amamihe ahụ dere. (Ilu 15:30) Omume ndị e ji ezi uche mee na-akwalitekwa mmetụta dị nro. Ọ bụ ezie na mmadụ apụghị ịzụta ezi mmetụta ịhụnanya, onyinye e ji ezi obi nye pụrụ ịba ezi uru. Kaadị, akwụkwọ ozi, na “okwu e kwuru na mgbe kwesịrị ya”—ha nile pụrụ igosipụta mmetụta ịhụnanya miri emi. (Ilu 25:11; 27:9) Ozugbo anyị na ndị ọzọ ghọrọ enyi, anyị aghaghị ijigide ya site n’ịnọgide na-egosi mmetụta ịhụnanya na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nanị. Karịsịa n’oge mkpa, anyị kwesịrị ịnọ ya iji nyere ndị enyi anyị aka. Bible na-ekwu, sị: “Na mgbe nile ka enyi na-ahụ n’anya, a na-amụkwa nwanne banyere ahụhụ.”—Ilu 17:17.

14. Gịnị ka anyị pụrụ ime ma ọ bụrụ na o yie ka mmadụ adịghị emeghachi omume ná mmetụta ịhụnanya anyị gosiri ya?

14 N’eziokwu, anyị apụghị ịtụ anya isoro mmadụ nile nọ n’ọgbakọ na-akpachi anya. Ọ ga-enwe ụfọdụ ndị anyị na-agaru nso karịa ka anyị na-agaru ndị ọzọ. Ya mere, ọ bụrụ na o yie ka mmadụ adịghị emesapụrụ gị ihu dị ka ị chọrọ, ekpebila ngwa ngwa na ọ dị ihe na-eme gị ma ọ bụ na ọ dị ihe na-eme onye ahụ. Anwakwala ịmanye onye ahụ iso gị na-akpachi anya. Ọ bụrụ nnọọ na i mesoo ya omume enyi ruo n’ókè ọ ga-anabata, ị ga-eme ka ọ dịrị unu mfe inwekwu mmekọrịta chiri anya n’ọdịnihu.

“Anwapụtawo M Gị”

15. Mmetụta dị aṅaa ka ịja mma, ma ọ bụ ịghara ịja mma, na-enwe n’ahụ́ ndị ọzọ?

15 Lee ka Jizọs na-aghaghị isiworị ṅụrịa ọṅụ n’oge baptizim ya, bụ́ mgbe ọ nụrụ okwu ndị a site n’eluigwe: “Anwapụtawo m gị”! (Mak 1:11) Ọ ghaghị ịbụ na okwu nnabata a mere ka Jizọs kwenyesikwuo ike na Nna ya nwere mmetụta na-ekpo ọkụ n’ebe ọ nọ. (Jọn 5:20) N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ adịghị anụ okwu ịja mma dị otú ahụ site n’ọnụ ndị ha na-akwanyere ùgwù na ndị ha hụrụ n’anya. “Ọtụtụ ndị na-eto eto dị ka m enweghị ndị ezinụlọ ha ha na ha nwekọrọ nkwenkwe Ndị Kraịst,” ka Ann na-ekwu. “N’ụlọ, nanị ihe anyị na-anụ bụ nkatọ. Nke ahụ na-eme anyị nnọọ obi ọjọọ.” Otú ọ dị, mgbe ha batara n’ọgbakọ, ha na-enweta ịhụnanya nke ezinụlọ ime mmụọ na-enye nkwado na nke na-echebara ha echiche—ndị nne na nna na ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị n’okwukwe.—Mak 10:29, 30; Ndị Galeshia 6:10.

16. N’ihi gịnị ka inwe àgwà nke ịkatọ ndị ọzọ na-ejighị enye aka?

16 N’ọdịbendị ụfọdụ, ọ na-esiri ndị nne na nna, ndị toro eto na ndị nkụzi ike iji obi ha nile jaa ndị na-eto eto mma, na-eche na otuto dị otú ahụ nwere ike ime ka ha dị okomoko ma ọ bụ na-anya isi. Echiche dị otú ahụ pụrụ ọbụna imetụta ezinụlọ na ọgbakọ Ndị Kraịst. N’ikwu banyere ihe omume ma ọ bụ mgbalị ọzọ mmadụ mere, ndị toro eto pụrụ ikwu, sị: “Nke ahụ dị nnọọ mma, ma ị pụrụ imeziwanye ihe!” Ma ọ bụ ha pụrụ ọbụna isi n’ụzọ ọzọ nye echiche na ha enweghị mmasị n’ebe nwatakịrị ahụ nọ. Site n’ime otú ahụ, ọtụtụ na-eche na ha na-akpali ndị ka na-eto eto ime ike ha nile. Ma nke a na-enwekarị mmetụta dị iche n’ihe a tụrụ anya ya ebe ọ bụ na ndị na-eto eto pụrụ ịkwụsị ime mgbalị ma ọ bụ chee na ha apụghị iru ihe a chọrọ ha n’aka.

17. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji na-achọ ohere iji jaa ndị ọzọ mma?

17 Otú ọ dị, ịja mma ekwesịghị ịbụ ihe e ji ebido inye ndụmọdụ. Ịja mma sitere n’obi na-akwalite mmetụta dị nro n’ime ezinụlọ na n’ọgbakọ, si otú a na-agba ndị na-eto eto ume ịdị na-agakwuru ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị nwere ahụmahụ maka ndụmọdụ. Ya mere, kama ikwe ka ọdịbendị kpebie otú anyị ga-esi na-emeso ndị ọzọ ihe, ka anyị “yikwasịkwa ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ bụ́ nke e kere dị ka uche Chineke si dị n’ezi omume na iguzosi ike n’ihe.” Na-aja ndị ọzọ mma dị ka Jehova na-eme.—Ndị Efesọs 4:24.

18. (a) Ndị na-eto eto, olee otú unu kwesịrị isi na-ele ndụmọdụ sitere n’aka ndị toro eto anya? (b) N’ihi gịnị ka ndị toro eto kwesịrị iji kpachara anya banyere otú ha si enye ndụmọdụ?

18 N’aka nke ọzọ, ndị na-eto eto, unu ekwubila na ọ bụrụ na ndị toro eto agbazie unu ma ọ bụ nye unu ndụmọdụ, ọ pụtara na ha enweghị mmasị n’ebe unu nọ. (Eklisiastis 7:9) Ọ dịghị otú ahụ ma ọlị! O yikarịrị ka ọ̀ bụ nchegbu na mmetụta ịhụnanya miri emi ha nwere n’ebe unu nọ kpaliri ha ime otú ahụ. Ma ọ́ bụghị ya, gịnị mere ha ga-eji nyewe onwe ha nsogbu ịgwa unu banyere ihe ahụ? N’ịmara mmetụta okwu pụrụ inwe, ndị toro eto—karịsịa ndị okenye ọgbakọ—mgbe mgbe na-etinye oge dị ukwuu n’iche echiche na n’ikpe ekpere tupu ha enye ndụmọdụ ebe ọ bụ nanị ezi ihe ka ha chọrọ ime.—1 Pita 5:5.

“Jehova Nwere Mmetụta Dị Nnọọ Nro”

19. N’ihi gịnị ka ndị e mechuworo ihu pụrụ iji legara Jehova anya maka enyemaka?

19 Ahụmahụ ndị na-adịghị mma ụfọdụ ndị nweworo pụrụ ime ka ha chee na igosi mmetụta dị nro ga-eduga nanị ná mmechuihu. Ọ na-ewe obi ike na okwukwe siri ike iji megheghachiri ndị ọzọ obi ha. Ma ha ekwesịtụghị ichezọ na Jehova ‘anọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.’ Ọ na-agwa anyị ka anyị bịaruo ya nso. (Ọrụ 17:27; Jems 4:8) Ọ na-aghọtakwa egwu anyị nke ịbụ ndị e mechuru ihu, ọ na-ekwekwa anyị nkwa na ọ ga-anọnyere anyị ma nyere anyị aka. Ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid na-emesi anyị obi ike, sị: “Jehova nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa, Ọ na-azọpụtakwa ndị a zọpịaworo n’ime mmụọ ha.”—Abụ Ọma 34:18.

20, 21. (a) Olee otú anyị si mara na anyị na Jehova pụrụ inwe mmekọrịta chiri anya? (b) Gịnị ka a chọrọ iji soro Jehova na-enwe mmekọrịta chiri anya?

20 Ọbụbụenyi chiri anya nke anyị na Jehova bụ mmekọrịta kasị mkpa anyị pụrụ ịzụlite. Ma nkekọ dị otú ahụ ọ̀ pụrụ ikwe omume n’ezie? Ee. Bible na-ekpughe otú ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị ezi omume si nwee mmetụta nke ịnọ nnọọ Nna anyị nke eluigwe nso. E chekwawo ihe ndị ha ji obi ụtọ kwuo iji mee ka anyị nwee obi ike na anyị onwe anyị pụkwara ịbịaru Jehova nso.—Abụ Ọma 23, 34, 139; Jọn 16:27; Ndị Rom 15:4.

21 Ihe ndị Jehova chọrọ n’aka anyị iji soro ya na-enwe mmekọrịta chiri anya dị n’ebe aka onye ọ bụla pụrụ iru. “Jehova, ònye ga-anọ dị ka ọbịa n’ụlọikwuu Gị,” ka Devid jụrụ. “Onye na-eje ije n’izu okè, nke na-arụkwa ọrụ ezi omume, nke na-ekwukwa eziokwu n’obi ya.” (Abụ Ọma 15:1, 2; 25:14) Ka anyị na-ahụ na ijere Chineke ozi na-amịpụta ezi mkpụrụ ma na-eme ka anyị nweta nduzi na nchebe ya, anyị ga-abịa mata na “Jehova nwere mmetụta dị nnọọ nro.”—Jems 5:11.

22. Olee ụdị mmekọrịta Jehova chọrọ ka ndị ya na-enwe?

22 Lee ka anyị si bụrụ ndị a gọziri agọzi na Jehova chọrọ iso ụmụ mmadụ na-ezughị okè nwee mmekọrịta chiri anya dị otú a! Ya bụrụ otú ahụ, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịdị na-egosirịta ibe anyị mmetụta dị nro? Site n’enyemaka Jehova, onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịtụnye ụtụ ná mmetụta dị nro bụ́ nke e ji mara òtù ụmụnna Ndị Kraịst anyị na ịnụ ụtọ ya. N’okpuru Alaeze Chineke, mmadụ nile nọ n’ụwa ga-ekere òkè ná mmetụta a dị nro ruo mgbe ebighị ebi.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Ọnọdụ dị aṅaa kwesịrị ịdị n’ọgbakọ Ndị Kraịst?

• Olee otú onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ isi tụnye ụtụ ná mmetụta dị nro n’ime ọgbakọ?

• Olee otú ịja mma sitere n’obi si akwalite mmetụta ịhụnanya Ndị Kraịst?

• Olee otú mmetụta dị nro nke Jehova si enyere anyị aka ma na-akwagide anyị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 15]

Ịhụnanya dị n’etiti Ndị Kraịst na-agụnye ihe karịrị ibu ọrụ nkịtị

[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

Ị̀ pụrụ ‘ịgbasapụ’ ná mmetụta ịhụnanya gị?

[Foto dị na peeji nke 18]

Ị̀ na-akatọ akatọ ka ị̀ na-agba ume?