Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ndị Dị Umeala n’Obi Ga-eketa Ụwa”—N’ụzọ Dị Aṅaa?

“Ndị Dị Umeala n’Obi Ga-eketa Ụwa”—N’ụzọ Dị Aṅaa?

“Ndị Dị Umeala n’Obi Ga-eketa Ụwa”—N’ụzọ Dị Aṅaa?

“Ọ PỤRỤ ịbụ na ị maara okwu ahụ na-enye obi ụtọ Jizọs kwuru nke bụ́ na ‘ndị dị umeala n’obi ga-eketa ụwa.’ Ma n’ihi ihe nile ụmụ mmadụ na-eme ibe ha nakwa ụwa, olee ihe i chere ga-afọdụrụ ndị dị umeala n’obi iketa?”—Matiu 5:5; Abụ Ọma 37:11; King James Version.

Myriam, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ji ajụjụ a malite nkwurịta okwu dabeere na Bible. Nwoke ọ gwara okwu zaghachiri na ọ bụrụ na Jizọs kwere nkwa a, ụwa aghaghị ịbụ ihe nketa ahụ a kpọrọ ya, ọ bụghịkwa mkpọmkpọ ebe mmadụ na-apụghị ibi na ya.

Nke ahụ bụ n’ezie azịza nke onye nwere nchekwube. Ma ànyị nwere ihe mere anyị ga-eji nwee nchekwube dị otú ahụ? Ee, anyị nwere, n’ihi na Bible na-enye anyị ezi ihe mere anyị ga-eji kwere na nkwa ahụ ga-emezu. N’ezie, mmezu nke nkwa ahụ na nzube Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ na maka ụwa nwere njikọ chiri anya. A na-emesikwa anyị obi ike na ihe ọ bụla Chineke zubere, ọ ga-emezu ya. (Aịsaịa 55:11) Mgbe ahụzi, gịnị bụ nzube mbụ Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ, oleekwa otú ọ ga-esi mezuchaa?

Nzube Ebighị Ebi nke Chineke Maka Ụwa

Jehova Chineke kere ụwa n’ihi otu nzube a kapịrị ọnụ. “Otú a ka Jehova Nke keworo eluigwe sịrị; Ya onwe ya bụ Chineke: Onye kpụworo ụwa, mee ya; Ya onwe ya mere ka o guzosie ike, ọ bụghị ihe tọgbọrọ n’efu ka O kere ya, ọ bụ ka e wee biri n’ime ya ka Ọ kpụrụ ya: Mụ onwe m bụ Jehova; ọ dịghịkwa Chineke ọzọ dị.” (Aịsaịa 45:18) N’ihi nke a, e kere ụwa kpọmkwem ka mmadụ biri na ya. Ọzọkwa, ọ bụ nzube Chineke ka ụwa bụrụ ebe obibi nke ihe a kpọrọ mmadụ ruo mgbe ebighị ebi. “Ọ tọwo ntọala ụwa n’elu ọnọdụ ya guzosiri ike, ka a ghara iwezụga ya n’ọnọdụ ya ruo mgbe nile ebighị ebi.”—Abụ Ọma 104:5; 119:90.

Nzube Chineke maka ụwa pụtakwara ìhè n’ọrụ o nyere mmadụ abụọ mbụ ahụ. Jehova gwara Adam na Iv, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu; nweekwanụ ike n’ahụ́ azụ nke oké osimiri, na n’ahụ́ anụ ufe nke eluigwe, na n’ahụ́ anụ nile ọ bụla dị ndụ nke na-akpụ akpụ n’elu ụwa.” (Jenesis 1:28) A tụrụ anya na ụwa, bụ́ nke Chineke nyefere Adam na Iv n’aka, ga-abụrụ ha na ụmụ ha ebe obibi ruo mgbe ebighị ebi. “Eluigwe bụ eluigwe Jehova nwere,” ka ọbụ abụ ahụ kwuru ọtụtụ narị afọ ka e mesịrị, “ma ụwa ka O nyeworo ụmụ mmadụ.”—Abụ Ọma 115:16.

Iji nweta mmezu nke atụmanya ahụ dị ebube, Adam na Iv, tinyere ụmụ ha, aghaghị ịnakwere Jehova Chineke, bụ́ Onye Okike na Onye Na-enye Ndụ, dị ka Ọkaaka ha ma dị njikere irubere ya isi. Jehova mere ka nke a doo anya mgbe o nyere mmadụ ahụ iwu a: “Mkpụrụ nke sitere n’osisi nile ọ bụla nke ubi a a gbara ogige ka ị ga na-eri eri: ma mkpụrụ nke sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ, gị erila mkpụrụ sitere na ya: n’ihi na n’ụbọchị ị ga-eri mkpụrụ sitere na ya ị ghaghị ịnwụ anwụ.” (Jenesis 2:16, 17) Ka Adam na Iv wee nọgide na-adị ndụ n’ogige Iden, ha aghaghị irube isi n’iwu ahụ dị mfe ma doo anya. Ime otú ahụ ga-abụ ngosipụta nke ekele ha nwere maka ihe nile Nna ha nke eluigwe mewooro ha.

Mgbe Adam na Iv kpachaara anya nupụrụ Chineke isi site n’imebi iwu o nyeworo ha, ha gbakụtara onye ahụ nyere ha ihe nile ha nwere azụ n’ezie. (Jenesis 3:6) Site n’ime otú ahụ, ha tụfuuru ọ bụghị nanị onwe ha, kamakwa ụmụ ha, ebe obibi Paradaịs ha mara mma. (Ndị Rom 5:12) Nnupụisi nke di na nwunye mbụ ahụ ò mebiri nzube Chineke ji kee ụwa?

Chineke nke Na-agbanwebeghị

Site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Malakaị, Chineke kwupụtara, sị: “Mụ onwe m, bụ́ Jehova, agbanweghị.” (Malakaị 3:6) N’ikwu banyere amaokwu a, onye France bụ́ ọkà mmụta Bible bụ́ L. Fillion kwuru na nkwupụta a na mmezu nke nkwa Chineke nwere njikọ chiri anya. “Jehova gaara ekpochapụworị ndị ya na-enupụ isi,” ka Fillion dere, “ma n’ihi na ọ dịghị agbanwe nzube ya, ihe ọ sọrọ ya mee, ọ ga-emezu nkwa ndị o kwere n’oge ndị gara aga.” Chineke agaghị echefu nkwa ya, ma ò kwere ya otu onye, otu mba ma ọ bụ ihe nile a kpọrọ mmadụ, kama ọ ga-emezu ya n’oge nke ya. “O chetawo ọgbụgba ndụ Ya ruo mgbe ebighị ebi, okwu O nyere [otu puku ọgbọ] n’iwu.”—Abụ Ọma 105:8.

Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na Jehova agbanwebeghị nzube mbụ ya maka ụwa? Anyị pụrụ ijide nke a n’aka n’ihi na n’ime Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible, anyị na-achọta ebe e kwuru banyere nzube Chineke inye ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ụwa. (Abụ Ọma 25:13; 37:9, 22, 29, 34) Ọzọkwa, Akwụkwọ Nsọ na-akọwa ndị Jehova gọziri dị ka ndị nọ ná nchebe, onye ọ bụla “n’okpuru osisi vaịn ya na n’okpuru osisi fig ya” n’enweghị “onye ga-eme ka ha maa jijiji.” (Maịka 4:4; Ezikiel 34:28) Ndị Jehova họpụtara “ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha.” Ha na ọbụna ụmụ anụ ọhịa ga-adị n’udo.—Aịsaịa 11:6-9; 65:21, 25.

Bible si n’ụzọ ọzọ na-enye ihe atụ nke otú Chineke ga-esi mezuo nkwa ya. N’oge ọchịchị nke Eze Solomọn, mba Izrel nwere udo na ọganihu. N’okpuru ọchịchị ya, “Juda na Izrel wee biri ná ntụkwasị obi, nwoke ọ bụla n’okpuru osisi vaịn ya na n’okpuru osisi fig ya, site na Dan wee ruo na Bia-shiba, ụbọchị nile nke Solomọn.” (1 Ndị Eze 4:25) Bible na-ekwu na Jizọs “ka Solomọn,” n’ikwukwa banyere ọchịchị ya, ọbụ abụ ahụ kwuru n’ụzọ amụma, sị: “Onye ezi omume ga-ama akwụkwọ n’ụbọchị nile ya dị ka osisi ndụ; ọtụtụ udo ga-adịkwa ruo mgbe ọnwa agaghị adị.” N’oge ahụ, ‘ọtụtụ ọka ga-adị n’ala n’elu ugwu nile.’—Luk 11:31; Abụ Ọma 72:7, 16.

N’imezu okwu ya, Jehova Chineke ga-ahụ, ọ bụghị nanị na ihe nketa ahụ o kwere ná nkwa dị adị, kamakwa na e weghachiri ya n’ịma mma mbụ ya. Ná Mkpughe 21:4, Okwu Chineke na-agwa anyị na n’ime ụwa ọhụrụ ahụ e kwere ná nkwa, Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya [ụmụ mmadụ], ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.” Ihe e kwere nkwa ya bụ nnọọ Paradaịs.—Luk 23:43.

Ụzọ Isi Nweta Ihe Nketa ahụ E Kwere ná Nkwa

A ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs n’okpuru ọchịchị nke ga-achị site n’eluigwe, Alaeze nke Jizọs Kraịst bụ Eze ya. (Matiu 6:9, 10) Nke mbụ, Alaeze ahụ ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa.’ (Mkpughe 11:18; Daniel 2:44) Mgbe ahụ, dị ka “Onyeisi Udo,” Jizọs Kraịst ga-emezu okwu amụma a: “Ọ dịghị ọgwụgwụ ọ bụla ịba ụba nke ịbụ onyeisi Ya na udo Ya ga-agwụ.” (Aịsaịa 9:6, 7) N’okpuru Alaeze ahụ, ọtụtụ nde mmadụ, gụnyere ndị a ga-eme ka ha dịghachi ndụ site n’ịkpọlite ha n’ọnwụ, ga-enwe ohere nke iketa ụwa.—Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15.

Ònye ga-eru eru inweta ihe nketa ahụ dị ebube? Tụlee okwu Jizọs bụ́: “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, ebe ọ bụ na ha ga-eketa ụwa.” (Matiu 5:5) Gịnị ka ịdị nwayọọ n’obi, ma ọ bụ ịdị umeala n’obi, pụtara? Akwụkwọ ọkọwa okwu n’ozuzu ha na-akọwa “ịdị umeala n’obi,” ma ọ bụ “ịdị nwayọọ” dị ka ịdị nro, imeru ihe n’ókè, ido onwe onye n’okpuru, na ọbụna ime ihere. Otú ọ dị, okwu Grik mbụ e ji mee ihe pụtara ihe karịrị nke a. “E nwere ịdị nro” n’okwu ahụ, ka New Testament Wordbook, nke William Barclay dere na-ekwu, “ma e nwere ike yiri nke ígwè n’azụ ịdị nro ahụ.” Ọ na-egosi ọnọdụ uche nke na-eme ka mmadụ nagide ihe ọjọọ e mere ya n’ebughị iwe n’obi ma ọ bụ chee echiche imegwara, n’ihi na ya na Chineke na-enwe ezi mmekọrịta, mmekọrịta ahụ abụrụkwa ihe na-enye ya ume.—Aịsaịa 12:2; Ndị Filipaị 4:13.

Onye dị nwayọọ n’obi na-eji obi umeala anakwere ụkpụrụ Chineke n’akụkụ nile nke ndụ ya; ọ dịghị esi ọnwụ ịgbaso echiche nke ya ma ọ bụ nke ndị ọzọ. Ọ bụ onye a pụrụ izi ihe, na-achọkwa ka Jehova zie ya ihe. Ọbụ abụ bụ́ Devid dere, sị: “[Jehova] na-eme ka ndị dị umeala n’obi zọọ ije n’ikpe: Ọ na-ezikwa ndị dị umeala n’obi ụzọ Ya.”—Abụ Ọma 25:9; Ilu 3:5, 6.

Ị̀ ga-eso ná “ndị dị umeala n’obi” ga-eketa ụwa? Site n’ịmara Jehova na uche ya site n’iji ịdị uchu na-amụ Okwu ya ma na-etinye ihe ndị ị na-amụta n’ọrụ, gị onwe gị kwa pụrụ ịtụ anya iketa ụwa paradaịs na ibi n’ime ya ruo mgbe ebighị ebi.—Jọn 17:3.

[Foto dị na peeji nke 5]

Nzube Chineke maka ụwa pụtara ìhè n’ọrụ o nyere Adam na Iv

[Foto dị na peeji nke 6, 7]

Udo na ịnọ ná ntụkwasị obi nke dị n’oge ọchịchị Solomọn nyere ihe atụ nke ihe nketa ahụ e kwere ná nkwa

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ụmụ atụrụ na ugwu dị n’azụ: Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.; ele Arebia: Hai-Bar, Yotvata, Izrel; onye ọrụ ugbo na-akọ ala: Garo Nalbandian

[Foto dị na peeji nke 7]

Ụwa ọhụrụ ezi omume na-abịa n’ihu—ị̀ ga-anọ na ya?