Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

O Sooro Ụmụ Klas Ya Kerịta Nkwenkwe Ya

O Sooro Ụmụ Klas Ya Kerịta Nkwenkwe Ya

O Sooro Ụmụ Klas Ya Kerịta Nkwenkwe Ya

Ọ̀ GA-AMASỊ gị inyere ụmụ klas gị aka ịmatakwu nkwenkwe gị ndị dabeere na Bible nke ọma karị? Magdalena, bụ́ nwa akwụkwọ dị afọ 18 n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị dị na Poland, na-agwakarị ụmụ klas ya okwu banyere nkwenkwe ya dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. N’ihi ya, a na-ajụkarị ya ajụjụ ndị dị ka, ‘Gịnị ka ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova pụtara?’ na ‘Ọ̀ bụ na unu ekweghị na Jizọs Kraịst?’ Olee otú ọ pụrụ isi nyere ụmụ klas ya aka? Magdalena kpegaara Jehova ekpere maka nduzi ma mee ihe kwekọrọ n’ekpere ya.—Jems 1:5.

Otu ụbọchị, Magdalena jụrụ otu onye nkụzi na-akwanyere nkwenkwe ya ùgwù ma ya pụrụ igosi ụmụ klas ya vidio bụ́ Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind the Name. * Onye nkụzi ahụ kwetara. Magdalena gwaziri ụmụ klas ya, sị: “Ana m eme ndokwa ka otu enyi m meere klas a ihe omume ga-ewe minit 90. Ọ ga-agụnye ihe nkiri vidio na nkwurịta okwu banyere Ndịàmà Jehova. Ùnu ga-enwe mmasị ịbịa?” Mmadụ nile zara ee. Magdalena na Wojciech, bụ́ onye ozi oge nile nwere ahụmahụ, malitere ịkwadebe maka ihe omume ahụ.

Atụmatụ e mere bụ na a ga-eji okwu ga-ewe minit 20 nke dabeere na broshuọ bụ́ Ndịàmà JehovaOle Ndị Ka Ha Bụ? Gịnị Ka Ha Kweere? * malite ihe omume ahụ, ajụjụ na azịza ga-esochikwa. Mgbe ahụ, a ga-egosi vidio ahụ n’ọ́bá akwụkwọ nke ụlọ akwụkwọ ahụ. A ga-enye nwa akwụkwọ nke ọ bụla nọ na klas ahụ onyinye—nnukwu envelopu nke a ga-etinye broshuọ ole na ole, akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, * na traktị na magazin ụfọdụ n’ime ya.

N’ụbọchị e mere ihe omume ahụ, ndị bịara ya gụnyere ụmụ klas ya 14, onye nkụzi ahụ, na ụmụ akwụkwọ 4 ọzọ nọ n’ọ́bá akwụkwọ n’ụbọchị ahụ. Wojciech bu ụzọ kọwaa na ọtụtụ ndị na-ede uri na ndị edemede bụ́ ndị Poland jiri aha Chineke, bụ́ Jehova, mee ihe n’ihe odide ha. O hotakwara ụfọdụ katkizim ochie nke ndị Katọlik bụ́ ndị aha Chineke dị n’ime ha. N’ịkọwa ọrụ Ndịàmà Jehova n’oge a, o gosiri broshuọ nke alaka ụlọ ọrụ dịgasị iche iche na foto nke ọtụtụ Ụlọ Mgbakọ.

Nkwurịta okwu na-ekpo ọkụ malitere. Magdalena na Wojciech jiri Bible mee ihe n’ịza ajụjụ ndị a jụrụ ha. Nke a masịrị ndị ahụ bịaranụ ma mee ka ha kweta na Ndịàmà Jehova adịghị ekwusa echiche nke onwe ha. Olee ụfọdụ ajụjụ ndị ha jụrụ, oleekwa otú e si zaa ha?

Ajụjụ: Bible nwere ọtụtụ okwu ndị na-edoghị anya na okwu ihe atụ, bụ́ ndị a pụrụ ịkọwa n’ọtụtụ ụzọ. Olee otú ọ ga-esi kwe omume ibi ndụ kwekọrọ na Bible?

Azịza: Ụfọdụ na-ekwu na Bible dị ka ụbọ nke ị pụrụ ịkpọ ụda ọ bụla ị chọrọ na ya. Ma cheedị echiche: Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata ihe onye edemede bu n’uche kwuo ihe o kwuru, ọ̀ bụ na ọ gaghị aka mma ịjụta ya? N’adịghị ka ndị edemede nwụrụ anwụ nke akwụkwọ ụmụ mmadụ, Onye Chepụtara Bible, bụ́ Jehova Chineke, dị ndụ. (Ndị Rom 1:20; 1 Ndị Kọrint 8:5, 6) Ihe ndị gbara akụkụ Akwụkwọ Nsọ gburugburu pụrụ igosi ihe bụ́ ezi nkọwa ya. Tụkwasị na nke ahụ, Bible na-ekwu banyere otu ihe n’ọtụtụ ebe, ya mere, iji otu ebe atụnyere ibe ya ga-enye aka. N’ụzọ dị otú a, anyị pụrụ ikwe ka Chineke na-eduzi echiche anyị, dị ka à ga-asị na ọ na-akọwara anyị akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ. Site n’ime nke ahụ, anyị pụrụ ịmata uche Chineke na ibi ndụ kwekọrọ na ya dị ka e kpughere ya n’ime Bible, ọ́ bụghị ya?

Ajụjụ: Gịnị dị iche n’etiti Ndị Kraịst na Ndịàmà Jehova?

Azịza: Anyị bụ Ndị Kraịst! Ma kama nanị ịdị na-azọrọ na ha bụ Ndị Kraịst, Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike ibi ndụ kwekọrọ n’ihe ha kweere na n’ihe Chineke na-akụziri ha maka abamuru ha. (Aịsaịa 48:17, 18) Ebe ọ bụ na ozizi ha nile dabeere na Bible, ha maara na ihe ha kweere bụ eziokwu.—Matiu 7:13, 14, 21-23.

Ajụjụ: N’ihi gịnị ka unu ji agakwuru ndị unu na-amatụghị ma sie ọnwụ ịgwa ha okwu? Nke ahụ ọ́ bụghị ịmanye ndị ọzọ ịnakwere nkwenkwe unu?

Azịza: Ị̀ na-eche na ọ bụ ihe na-ezighị ezi mgbe mmadụ ji obiọma gwa gị okwu n’okporo ámá ma jụọ gị ihe i chere banyere ihe ụfọdụ? (Jeremaịa 5:1; Zefanaịa 2:2, 3) (Wojciech na Magdalena gosiziri otú ha si ajụ ndị na-agafe agafe ma Chineke ọ̀ na-eche banyere ndị na-ata ahụhụ n’ihi idei mmiri e nwere na Poland n’oge na-adịbeghị anya.) Mgbe onye ahụ gwara anyị echiche ya, anyị na-arụtụ aka na Bible. Ọ bụrụ na mmadụ achọghị ikwu okwu, anyị na-asị ya gaa nke ọma ma chọwa onye ọzọ. (Matiu 10:11-14) Nke ahụ ọ̀ bụ ịmanye ndị ọzọ ikwu okwu? Ka ndị mmadụ hà ga-akwụsịzi inwe mkparịta ụka?

Ajụjụ: Gịnị mere unu adịghị eme ememe ụbọchị ezumike?

Azịza: Anyị na-eme nanị otu ememe Bible nyere anyị iwu ime—Ememe Ncheta nke ọnwụ Jizọs Kraịst. (1 Ndị Kọrint 11:23-26) N’ihe banyere ememe ụbọchị ezumike, ị pụrụ ịchọpụta otú ha si malite site n’ịgụ akwụkwọ nkà ihe ọmụma na akwụkwọ ndị ọzọ a pụrụ ịdabere na ha. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ị ga-achọpụta n’ụzọ dị mfe ihe mere anyị adịghị eme ememe ndị dị otú ahụ.—2 Ndị Kọrint 6:14-18.

A jụrụ ọtụtụ ajụjụ ndị ọzọ ma zaa ha. Nkwurịta okwu ahụ were ogologo oge nke na e yigharịrị ụbọchị a ga-egosi ihe nkiri vidio ahụ.

Olee otú ụmụ akwụkwọ ahụ si meghachi omume? Ka Magdalena gwa anyị: “O juru m anya na ụmụ akwụkwọ ụfọdụ ndị na-ezuzukarị ezuzu ma na-akwa emo jụrụ ajụjụ ndị bara uru. Ọ bụ ezie na ha zọọrọ na ha bụ ndị na-ekweghị na Chineke dị, n’oge a na-enwe nkwurịta okwu ahụ ha gosipụtara okwukwe na Chineke!” Ndị ahụ bịaranụ ji obi ekele nara onyinye ndị ahụ—e nyefere ihe dị ka akwụkwọ ukwu 35, broshuọ 63, na magazin 34.

Lee ihe magburu onwe ya si n’ihe omume ụlọ akwụkwọ pụta! Ọ bụghị nanị na o nyeere ụmụ klas Magdalena aka ịbịa mara ma ghọta Ndịàmà Jehova nke ọma karị, kamakwa ọ gbara ọtụtụ n’ime ndị ahụ na-eto eto ume iche echiche banyere nzube nke ndụ. Gịnị ma ị gbalịa inyere ụmụ klas gị aka ịmụtakwu banyere ihe i kweere?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 4 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 4 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 31]

Magdalena na Wojciech ka ha na-akwado maka nkwurita okwu ahụ