Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ụdị Àgwà Nchere I Nwere?

Olee Ụdị Àgwà Nchere I Nwere?

Olee Ụdị Àgwà Nchere I Nwere?

N’ỤWA nke taa, ọtụtụ mmadụ adịghị enwe mmasị ichere mmadụ ma ọ bụ ihe. Ọ dịghị ekwe ha odidi. Otú ọ dị, Akwụkwọ Nsọ na-agba ndị Chineke ume ịzụlite ‘àgwà nchere.’ N’ụzọ dị iche n’ebe ndị gbara ya gburugburu nọ, Maịka onye amụma kwuru, sị: “M ga-echere Chineke nke nzọpụta m: Chineke m ga-anụ olu m.”—Maịka 7:7; Abụ Ákwá 3:26.

Otú ọ dị, gịnị ka ichere Jehova pụtara? Olee otú Onye Kraịst kwesịrị isi na-echere Chineke? È nwere ụzọ ndị kwesịrị ekwesị na ndị na-ekwesịghị ekwesị isi na-eme nke a? Ahụmahụ Jona onye amụma nke narị afọ nke itoolu T.O.A. na-akụziri anyị ihe n’akụkụ a.

Ụdị Nchere Na-ezighị Ezi

Jehova Chineke nyere Jona ntụziaka ịga meere ndị Ninive, bụ́ isi obodo Alaeze Ukwu Asiria, nkwusa. A maara Ninive dị ka “obodo ọbara” n’ihi obi ọjọọ na mmekpọ ọnụ ya, bụ́ ihe ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na ndị ọkà mmụta ihe ochie gbara akaebe ya. (Nehum 3:1) Na mbụ, Jona gbalịrị izere ọrụ a, ma Jehova hụrụ na onye amụma ahụ mesịrị gaa Ninive.—Jona 1:3–3:2.

“Jona wee malite ịba n’obodo ije nke otu ụbọchị, o wee kpọsaa, sị, Ọ fọdụrụ [iri ụbọchị anọ], e wee kwatuo Ninive.” (Jona 3:4) Ndị ahụ meghachiri omume n’ụzọ dị ịrịba ama ná mgbalị Jona: “Ndị Ninive wee kwere na Chineke; ha wee kpọsaa obubu ọnụ, yiri ákwà mkpe, site n’onye ukwu ha wee ruo onye nta ha.” (Jona 3:5) N’ihi ya, Jehova, bụ́ Chineke nke ‘na-adịghị achọ ka e bibie onye ọ bụla kama ka mmadụ nile ruo nchegharị,’ hapụrụ obodo ahụ.—2 Pita 3:9.

Gịnị bụ mmeghachi omume Jona? Ihe ndekọ ahụ na-ekwu, sị: “O wee jọọ Jona ajọ njọ nke ukwuu, iwe ya ewee dị ọkụ.” (Jona 4:1) N’ihi gịnị? Ikekwe Jona chere na mbibi o kwupụtara nke na-emezughị n’ụbọchị o kwuru na ọ ga-eme mechuru ya ihu dị ka onye amụma. O doro anya na ọ nọ na-eche banyere inwe ezi aha karịa ebere na nzọpụta nke ndị ọzọ.

N’ezie, Jona erughị n’ókè nke ịgba arụkwaghịm dị ka onye amụma. Ka o sina dị, o cheere ‘ịhụ ihe ga-eme n’obodo ahụ.’ Ee, ọ bịara nwee àgwà ntamu na nke ichere ịhụ ihe ga-emenụ. N’ịchọpụta na ihe emeghị dị ka ọ tụrụ anya ya, o wuru ụlọ ntu, nọrọ na ndò ya ma jiri obi ọjọọ na-eche ịhụ ihe ga-emenụ. Otú ọ dị, àgwà Jona amasịghị Jehova, ya mere, o jiri ịhụnanya gbazie echiche hiere ụzọ nke onye amụma ya.—Jona 4:5, 9-11.

Ihe Mere Jehova Ji Enwe Ndidi

Ọ bụ ezie na Ninive chegharịrị, e chebekwa ya, o mesịrị laghachi n’omume ọjọọ ya. Site n’ọnụ ndị amụma bụ́ Nehum na Zefanaịa, Jehova buru amụma maka mbibi ya. N’ikwu banyere “obodo ọbara” ahụ, Jehova kwuru na ya ga-ebibi Asiria ma mee ka Ninive bụrụ mkpọmkpọ ebe. (Nehum 3:1; Zefanaịa 2:13) Na 632 T.O.A., e bibiri Ninive, e wughachighịkwa ya ọzọ.

N’ụzọ yiri nke ahụ, ikpe ịwụfu ọbara aghara aghara mara ụwa nke taa karịa nnọọ ka ọ mara Ninive oge ochie. N’ihi nke a na n’ihi ihe ndị ọzọ, Jehova ekpebiwo na ajọ usoro ihe dị ugbu a ga-abịa ná njedebe ‘n’oké mkpagbu’ nke a na-enwetụbeghị ụdị ya.—Matiu 24:21, 22.

N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova ewetabeghị mbibi ahụ e kwere ná nkwa ka ndị nwere obi eziokwu taa, dị ka ndị ahụ nwere nchegharị na Ninive, wee nwee ike ichegharị ma bụrụ ndị a ga-echebe. Pita onyeozi ji okwu ndị a zoo aka na ndidi nke Chineke: “Jehova adịghị egbu oge n’ihe banyere nkwa ya, dị ka ụfọdụ ndị si ewere igbu oge, kama ọ na-enwe ndidi n’ebe unu nọ n’ihi na ọ chọghị ka e bibie onye ọ bụla kama ọ na-achọ ka mmadụ nile ruo nchegharị.”—2 Pita 3:9, 10, 13.

Ichere n’Ụzọ Ziri Ezi

Pita gara n’ihu ikwu, sị: “Ebe a ga-esi otú a gbazee ihe ndị a nile, lee ụdị mmadụ unu kwesịrị ịbụ n’àgwà dị nsọ na omume nke ịsọpụrụ Chineke, na-echere ma na-eburu ọnụnọ nke ụbọchị Jehova n’uche!” (2 Pita 3:11, 12) Rịba ama na ka anyị na-echere ụbọchị Jehova, anyị kwesịrị ịdị na-egosipụta “àgwà dị nsọ na omume nke ịsọpụrụ Chineke”—anyị kwesịrị iji ọrụ n’aka ọ bụghị ịnọ nkịtị.

Ee, inwe àgwà nchere kwesịrị ekwesị na-egosipụta na anyị kwenyesiri ike na ụbọchị Jehova ga-abịa kpọmkwem mgbe Jehova kwuru na ọ ga-abịa. Okwukwe dị otú ahụ na-arụpụta àgwà ndị dị nsọ na omume nsọpụrụ Chineke, ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke bụkwa nke kasị pụta ìhè n’ime ha. Jizọs setịpụrụ ihe nlereanya n’ime nkwusa, o nyekwara ụmụazụ ya e tere mmanụ ntụziaka, sị: “Keenụ ihe okike n’úkwù unu, ka oriọna unu na-enwukwa enwu, unu onwe unu kwa, dịrịnụ ka ndị na-echere nna ha ukwu mgbe o si alụmdi na nwunye na-alọta, ka ọ ga-abụ na mgbe o rutere kụọ aka, ha ewee megheere ya ụzọ ozugbo. Obi ụtọ na-adịrị ndị ohu ahụ bụ́ ndị nna ha ukwu na-ahụ na ha na-eche nche mgbe o rutere!”—Luk 12:35-37.

Ndị ohu nke narị afọ mbụ ‘na-eke ihe okike n’úkwù ha’ site n’ịchịli ala ala uwe ha ma kegide ha n’ihe ike n’úkwù ha iji mee ka ọ dịkwuoro ha mfe ịrụ ọrụ ndị siri ike. N’ụzọ dị otú ahụ, Onye Kraịst aghaghị ịdị uchu, na-anụ ọkụ n’obi n’ezi ọrụ. O kwesịrị ịlụso ọchịchọ ọ bụla nke ‘ịdị umengwụ’ n’ụzọ ime mmụọ ọgụ, ma eleghị anya iji ume ya eme ihe n’ịchụso ihe ụtọ ma ọ bụ ihe onwunwe. Kama nke ahụ, o kwesịrị ‘inwe ọtụtụ ihe mgbe nile ime n’ọrụ Onyenwe anyị’ ka ọ na-echere ụbọchị Jehova nke dị ukwuu, dịkwa egwu.—Ndị Rom 12:11; 1 Ndị Kọrint 15:58.

Iji Ọrụ n’Aka Ka Ị Na-echere

Ndịàmà Jehova anọgidewo na-eji ọrụ n’aka ka ha na-echere ụbọchị Jehova. Dị ka ihe atụ, n’afọ ije ozi nke 2003, ha jiri nkezi nke awa 3,383,000 kwusaa okwu Jehova kwa ụbọchị. Cheedị echiche, otu onye ga-eme nkwusa n’akwụsịghị akwụsị afọ 386 iji rụzuo ihe a na-arụ n’otu ụbọchị!

Otú o sina dị, ọ ga-adị mma anyị ịjụ onwe anyị, sị, ‘Ụdị àgwà nchere dị aṅaa ka m nwere?’ Jizọs tụrụ otu ilu nke na-akọwa ụdị ịdị uchu a na-atụ anya ya n’aka Ndị Kraịst e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi. O kwuru banyere ndị ohu atọ, sị: “O [nna ha ukwu] nyere otu onye talent ise, nye onye nke ọzọ abụọ, nyekwa onye nke ọzọ otu, onye ọ bụla dị ka ikike ya si dị, o wee jee mba ọzọ. Ozugbo ahụ, nke natara talent ise pụrụ wee jiri ha zụọ ahịa ma rite ise ọzọ n’uru. N’otu ụzọ ahụ, onye ahụ nke natara abụọ ahụ ritere abụọ ọzọ n’uru. Ma onye ahụ nke natara nanị otu pụrụ wee gwuo ala zoo ego ọlaọcha nke nna ya ukwu. Mgbe ogologo oge gasịrị, nna ukwu nke ndị ohu ahụ lọtara, ya na ha ewee mee mpịazi.”—Matiu 25:15-19.

Ndị ohu atọ ahụ nile cheere nlọghachi nke nna ha ukwu. Mgbe nna ha ukwu lọtara, ọ gwara abụọ ahụ ji ọrụ n’aka ka ha na-echere ya, sị: “I mere nke ọma, ezi ohu na-ekwesị ntụkwasị obi!” Otú ọ dị, e mesoro onye nke nọ nkịtị na-echere n’ụzọ dị iche. Nna ya ukwu sịrị: “Tụpụkwanụ ohu a na-abaghị uru ọ bụla n’ọchịchịrị dị n’èzí.”—Matiu 25:20-30.

Ọ bụ ezie na ilu a na-ekwu banyere Ndị Kraịst e tere mmanụ, ọ na-akụziri anyị nile ihe n’agbanyeghị olileanya anyị. Nna Ukwu ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst, na-atụ anya ka onye ọ bụla n’ime anyị jiri ịdị uchu na-arụsi ọrụ ike n’ozi ya ka anyị na-echere ọbịbịa ya n’oké ụbọchị Jehova. Ọ na-eji ọrụ onye ọ bụla na-arụ ‘dị ka ikike ya na ọnọdụ ya si dị’ akpọrọ ihe. Lee ihe obi ụtọ ọ ga-abụ ịnụ “i mere nke ọma” site n’ọnụ Nna Ukwu ahụ mgbe oge nchere ahụ mesịrị gafee!

Ndidi Onyenwe Anyị Pụtara Nzọpụta

Gịnị ma ọ bụrụ na usoro ihe a anọwo ogologo oge karịa ka anyị cheburu ma ọ bụ tụọ anya na ọ ga-anọ? E nwere ihe kpatara nke a. Pita onyeozi dere, sị: “Na-agụnụ ndidi Onyenwe anyị dị ka nzọpụta.” (2 Pita 3:15) Inwe ezi ihe ọmụma nke nzube Chineke na iji obi umeala ghọta na mmezu nke nzube Chineke dị mkpa karịa anyị onwe anyị ga-enyere anyị aka inwe ndidi ruo oge nile ndidi Jehova n’ebe usoro ihe ochie a dịruru.

Iji gbaa Ndị Kraịst ume inwe ndidi, onye so dee Bible bụ́ Jems nyere otu ihe atụ. O dere, sị: “Lee! Onye ọrụ ubi na-anọgide na-echere mkpụrụ dị oké ọnụ ahịa nke ala, na-enwere ya ndidi ruo mgbe o nwetara mmiri ozuzo mbụ na ụla mmiri ozuzo. Unu onwe unu kwa, nweenụ ndidi; meenụ ka obi sie unu ike, n’ihi na ọnụnọ nke Onyenwe anyị abịaruwo nso.”—Jems 5:7, 8.

Jehova Chineke achọghị ka ike gwụ anyị ma ọ bụ ka anyị daa mbà ka anyị na-echere. O nwere ọrụ o nyere anyị ịrụ, ọ ga-enwekwa obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị ejiri oge anyị ji na-echere jiri ịdị uchu na-arụ ọrụ ahụ. Ọ chọrọ ka anyị soro ná ndị Pọl onyeozi kọwara n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Hibru: “Anyị chọrọ ka onye ọ bụla n’ime unu na-egosi otu ịdị uchu ahụ iji wee nwee obi ike zuru ezu n’olileanya ahụ ruo ọgwụgwụ, ka unu wee ghara ịdị umengwụ, kama bụrụnụ ndị na-eṅomi ndị ahụ sitere n’okwukwe na ndidi na-eketa nkwa ndị e kwere.”—Ndị Hibru 6:11, 12.

Ya mere, ka ike ghara ịgwụ anyị. Kama nke ahụ, ka mmekọrịta anyị na Jehova Chineke, okwukwe anyị n’àjà mgbapụta Jizọs, na olileanya na-egbukepụ egbukepụ anyị nwere n’usoro ihe ọhụrụ bụrụ ihe ndị na-enye anyị ume. Dị ka ‘ezi ndị ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi’ nọ n’ilu Jizọs, ka anyị gosi na anyị ruru eru inweta ịja mma na ụgwọ ọrụ site n’ịnọgide na-eto Chineke anyị, dị ka ọbụ abụ ahụ, bụ́ onye kwuru, sị: “Ma mụ onwe m, mgbe nile ka m ga na-eche Gị, wee tụkwasị otuto n’otuto Gị nile.”—Abụ Ọma 71:14.

[Foto dị na peeji nke 21]

N’ịbụ onye nwere nkụda mmụọ, Jona cheere ịhụ ihe ga-eme Ninive

[Foto ndị dị na peeji nke 22, 23]

Ka anyị na-egosipụta àgwà nsọpụrụ Chineke ka anyị na-echere ụbọchị Jehova