Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ndị Na-enye Chineke Otuto Taa?

Olee Ndị Na-enye Chineke Otuto Taa?

Olee Ndị Na-enye Chineke Otuto Taa?

“I kwesịrị ekwesị, Jehova, ọbụna Chineke anyị, ịnata otuto na nsọpụrụ na ike.”—MKPUGHE 4:11.

1, 2. (a) Ihe ndị dị aṅaa na-enye ihe atụ nke ihe ọmụmụ a na-akpọ nkà nṅomi ihe ndị dị ndụ iji mepụta ụdị ha? (b) Ajụjụ dị aṅaa na-ebilite, gịnịkwa bụ azịza ya?

OTU ụbọchị n’afọ ndị 1940, injinia bụ́ onye Switzerland bụ́ George de Mestral kpọọrọ nkịta ya gaa mkpagharị. Mgbe ha lọtara, ọ chọpụtara na agbịrịgba jupụtara n’ákwà ya nakwa n’ajị nkịta ahụ. N’ịchọ ịmatakwu banyere ha, nwoke ahụ ji ígwè microscope nyochaa agbịrịgba ndị ahụ, obere nkò ndị dị n’agbịrịgba ndị ahụ bụ́ ndị na-atapara n’ihe ọ bụla nwere ajị kpalikwara mmasị ya. N’ikpeazụ, o mepụtara ihe na-arụ ọrụ ka ya—Velcro. Ọ bụghị nanị De Mestral ṅomiri ihe e kere eke. Na United States, ụmụnne abụọ bụ́ ụmụ Wright rụpụtara ụgbọelu ka ha nyochasịrị nnụnụ ndị buru ibu na-efe efe. Injinia bụ́ onye France bụ́ Alexandre-Gustave Eiffel ji ụkpụrụ ndị bụ́ isi na-eme ka ọkpụkpụ apata ụkwụ mmadụ nwee ike ibu ahụ́ ya wuo ụlọ elu ahụ a kpọkwasịrị aha ya nke dị na Paris.

2 Ihe atụ ndị a na-egosi nnọọ ihe a na-akpọ nkà nṅomi ihe ndị dị ndụ iji mepụta ụdị ha, bụ́ ihe ọmụmụ sayensị nke na-anwa iṅomi ihe ndị a hụrụ n’ihe ndị e kere eke. Otú ọ dị, otu ajụjụ ezi uche dị na ya na-ebilite: Ugboro ole ka ndị na-echepụta ihe na-enye Onye ahụ mere obere agbịrịgba ndị ahụ, nnụnụ ndị buru ibu, ọkpụkpụ apata ụkwụ mmadụ, na ihe ndị ọzọ mara mma bụ́ ndị ụmụ mmadụ leere anya mepụta ndị nke ha, otuto? Otu ihe dị mwute nke na-eme eme bụ na n’ụwa nke taa, a dịghị enyekebe Chineke otuto ruuru ya.

3, 4. Gịnị ka okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “otuto” pụtara, gịnịkwa ka o kwesịrị ịdị na-ezo aka na ya mgbe e ji ya mee ihe n’ebe Jehova nọ?

3 Ụfọdụ pụrụ iche, sị, ‘Gịnị mere o ji dị mkpa inye Chineke otuto? Ọ̀ bụ na Chineke adịbughị mbụ dịrị ebube?’ N’ezie, Jehova bụ Onye kasị ebube n’eluigwe na n’ụwa, ma nke ahụ apụtaghị na ọ dị ebube n’anya mmadụ nile. N’ime Bible, okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “otuto” nwere echiche bụ́ isi nke “ịdị arọ.” Ọ na-ezo aka n’ihe ọ bụla na-eme ka mmadụ yie onye ukwu ma ọ bụ onye dị mkpa n’anya ndị ọzọ. Mgbe e ji ya mee ihe n’ebe Chineke nọ, ọ na-ezo aka n’ihe na-eme ka Chineke dị ukwuu n’anya mmadụ.

4 Taa, ọ bụ mmadụ ole na ole maara ihe mere Chineke ji dị ukwuu. (Abụ Ọma 10:4; 14:1) N’ezie, ya bụrụgodị na ndị a na-akwanyere ùgwù n’obodo kwetụụrụ na Chineke, ha emewo ka ndị mmadụ ghara ịdị na-akwanyere Onye Okike dị ebube nke eluigwe na ala ùgwù. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ha siworo mee otú ahụ?

“Ha Enweghị Ihe Ngọpụ”

5. Olee otú ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị si akọwahie ihe ndị dị ebube e kere eke?

5 Ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị na-esi ọnwụ na Chineke adịghị. Oleezi otú ha si akọwa ihe ndị dị ebube e kere eke, gụnyere ihe a kpọrọ mmadụ? Ha na-ekwu na ihe ndị a dị ebube sitere n’evolushọn, ikike na-enweghị ọgụgụ isi nke na-eme ihe ná ndabara. Dị ka ihe atụ, onye ọkà n’ozizi evolushọn bụ́ Stephen Jay Gould dere, sị: “Anyị nọ n’ebe a n’ihi na otu ụdị ìgwè azụ a na-adịghị ahụkebe nwere ụdị nku pụrụ iche nke pụrụ ịgbanwe wee ghọọ ụkwụ nye anụ ndị na-ebi n’elu ala . . . Ọ pụrụ ịgụsi anyị agụụ ike inweta azịza ‘karịrị ya’—ma ọ dịghị azịza karịrị ya dịnụ.” N’otu aka ahụ, Richard E. Leakey na Roger Lewin dere, sị: “Ma eleghị anya, agbụrụ mmadụ bụ nanị mmejọ jọgburu onwe ya nke okike.” Ọbụna ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị, bụ́ ndị na-eto ịma mma na nhazi nke ihe ndị e kere eke, adịghị enye Chineke otuto.

6. Gịnị na-eme ka ọtụtụ mmadụ ghara inye Chineke otuto ruuru ya dị ka Onye Okike?

6 Mgbe ndị gụrụ akwụkwọ na-esi ọnwụ na ozizi evolushọn bụ eziokwu, ha na-enye echiche na ọ bụ nanị ndị na-agụghị akwụkwọ jụrụ ikwere na ya. Olee otú ọtụtụ ndị si emeghachi omume n’isi ọnwụ dị otú ahụ? N’afọ ụfọdụ gara aga, otu nwoke maara ozizi evolushọn nke ọma gbara ndị kweere n’ozizi ahụ ajụjụ ọnụ. O kwuru, sị: “Achọpụtara m na ihe ka ọtụtụ ná ndị kweere n’evolushọn kweere ya n’ihi na a gwara ha na ndị nile nwere ọgụgụ isi kweere ya.” Ee, mgbe ndị gụrụ akwụkwọ na-ekwupụta echiche ha nke ekweghị na Chineke, a na-eme ka ndị ọzọ ghara inye Chineke otuto ruuru ya dị ka Onye Okike.—Ilu 14:15, 18.

7. Dị ka Ndị Rom 1:20 si kwuo, olee ihe a pụrụ ịhụ nke ọma site n’ihe ndị e kere eke a na-ahụ anya, n’ihi gịnịkwa?

7 Ndị ọkà mmụta sayensị hà kwubiri na Chineke adịghị n’ihi na ihe ndị mere eme nakwa ihe àmà ndị e nwere na-egosi na ọ dịghị? Ọ dịghị ma ọlị! Ihe àmà ndị na-egosi na e nwere Onye Okike gbara anyị gburugburu. Banyere ya, Pọl onyeozi dere, sị: “Àgwà ya ndị a na-apụghị ịhụ anya bụ ndị a na-ahụ nke ọma site n’okike nke ụwa [nke ihe a kpọrọ mmadụ] gaa n’ihu, n’ihi na a na-aghọta ha site n’ihe ndị e kere eke, ya bụ ike ebighị ebi na ịbụ Chineke ya, nke mere na ha [ndị na-ekweghị ekwe] enweghị ihe ngọpụ.” (Ndị Rom 1:20) Onye Okike tinyere ihe àmà nke ịdị adị ya n’ihe ndị o kere eke. Pọl si otú a na-ekwu na site ná mmalite nke ịdị adị nke ihe a kpọrọ mmadụ, o kwewo omume ụmụ mmadụ ‘ịghọta’ ihe àmà nke ịdị adị Chineke site n’ihe ndị e kere eke a na-ahụ anya. Olee ebe ndị ihe àmà a dị?

8. (a) Olee otú eluigwe a na-ahụ anya si agba akaebe nye ike na amamihe Chineke? (b) Olee ihe na-egosi na eluigwe na ala nwere Ihe Mbụ Kpatara Ihe?

8 Anyị na-ahụ ihe àmà nke ịdị adị Chineke n’eluigwe nke jupụtara na kpakpando. “Eluigwe na-akọ nsọpụrụ Chineke,” ka Abụ Ọma 19:1 na-ekwu. “Eluigwe”—anyanwụ, ọnwa, na kpakpando—na-agba akaebe nye ike na amamihe Chineke. Ọnụ ọgụgụ buru ibu nke kpakpando na-awụ anyị ibobo n’ahụ́. Ihe ndị a nile dị na mbara igwe na-agagharịkwa, ọ bụghị aghara aghara, kama n’ikwekọ n’iwu okike ndị a kapịrị ọnụ. * (Aịsaịa 40:26) Ọ̀ ga-abụ ihe ezi uche dị na ya ikwu na ịdị n’usoro dị otú ahụ bịara na mberede? N’ụzọ dị ịrịba ama, ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwu na eluigwe na ala malitere ịdị adị na mberede. N’ịkọwa ihe nke a pụtara, otu prọfesọ dere, sị: “[Ikwu na] eluigwe na ala anọgidewo na-adị adị ga-aka amasị onye na-ekweghị na Chineke ma ọ bụ onye na-amaghị ma Chineke ọ̀ dị. N’otu aka ahụ, eluigwe na ala nke malitere amalite ga-achọ inwe ihe mbụ kpatara ihe; n’ihi na ònye ga-echetụ n’echiche na eluigwe na ala agaghị enwe ezi ihe kpatara ya?”

9. Olee otú amamihe Jehova si pụta ìhè n’ụmụ anụmanụ e kere eke?

9 Anyị na-ahụkwa ihe àmà nke ịdị adị Chineke n’ụwa. Ọbụ abụ ahụ tiri mkpu, sị: “Lee ka ọrụ Gị si baa ụba nke ukwuu, Jehova! N’amamihe ka I meworo ha nile: ụwa jupụtara n’ihe I nwetara, [ma ọ bụ “rụpụtara”].” (Abụ Ọma 104:24) Ihe ndị Jehova ‘rụpụtara,’ gụnyere ụmụ anụmanụ e kere eke, na-egosi amamihe ya. Dị ka anyị hụworo ná mmalite, n’ihi otú e si mee ihe ndị dị ndụ, ndị ọkà mmụta sayensị na-achọkarị iṅomi ha. Tụlee ihe atụ ole na ole ọzọ. Ndị nchọpụta na-amụ ihe banyere mpi mgbada, na-enwe olileanya imepụta okpuígwè ndị siri ike karị; ha na-enyocha ụdị ijiji dị iche iche bụ́ ndị na-anụ ihe nke ọma, n’atụmanya ịrụpụta ihe ndị na-enyere mmadụ aka ịnụ ihe nke ọma; ha na-enyochakwa ábụ́bà nku ikwiikwii, n’echiche nke imeziwanye ụgbọelu ndị na-adịghị eme ụzụ. Ma n’agbanyeghị mgbalị ha, n’ezie ụmụ mmadụ apụghị nnọọ imepụtaghachi ihe ndị e kere eke. Akwụkwọ bụ́ Biomimicry—Innovation Inspired by Nature na-ekwu, sị: “Ihe ndị dị ndụ emewo ihe nile anyị chọrọ ime n’aṅụchapụghị mmanụ ndị dị n’ime ala, n’emetọghị mbara ala ma ọ bụ tinye ọdịnihu ha n’ihe ize ndụ.” Nke a bụ amamihe n’ezie!

10. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ezi uche na-adịghị na ya ikwu na e nweghị Onye Okike Ukwu? Nye ihe atụ.

10 Ma ì lere anya n’eluigwe ma ọ bụ n’ihe okike ndị dị n’ụwa ebe a, ihe àmà nke ịdị adị nke Onye Okike na-apụta ìhè. (Jeremaịa 10:12) Anyị kwesịrị iji obi anyị nile kwenyere ndị e kere eke bi n’eluigwe, bụ́ ndị tiri mkpu, sị: “I kwesịrị ekwesị, Jehova, ọbụna Chineke anyị, ịnata otuto na nsọpụrụ na ike, n’ihi na i kere ihe nile.” (Mkpughe 4:11) N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị adịghị eji ‘anya nke obi ha’ ahụ ihe àmà ndị ahụ, ọ bụ ezie na otú e si hazie ihe ndị ha ji anya nkịtị ha ahụ pụrụ ịtụ ha n’anya. (Ndị Efesọs 1:18) Anyị pụrụ isi otú a mee ihe atụ ya: Inwe mmasị n’ịma mma na nhazi nke ihe ndị e kere eke ma na-ekwu na e nweghị Onye Okike Ukwu bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya dị ka inwe mmasị n’ihe osise mara mma ma n’otu oge ahụ na-ekwu na ọ dịghị onye sere ya, bụ́ onye mere ka ákwà e ji ese ihe nke ọ na-adịghị ihe e sere na ya ghọọ ihe osise magburu onwe ya. Ka a sịkwa ihe mere e ji kwuo na ndị jụrụ ikwere na Chineke “enweghị ihe ngọpụ”!

“Ndị Nduzi Kpuru Ìsì” Na-eduhie Ọtụtụ Ndị

11, 12. Ozizi akara aka dabeere n’echiche dị aṅaa, gịnịkwa na-egosi na ozizi a adịghị enye Chineke otuto?

11 Ọtụtụ ndị ji okpukpe kpọrọ ihe ji obi eziokwu kwere na ụdị ofufe ha na-enye Chineke otuto. (Ndị Rom 10:2, 3) Otú ọ dị, okpukpe n’ozuzu ya bụ akụkụ ọzọ nke ọha mmadụ nke gbochiworo nnọọ ọtụtụ ijeri mmadụ inye Chineke otuto. N’ụzọ dị aṅaa? Ka anyị tụlee ụzọ abụọ.

12 Nke mbụ, okpukpe na-eme ka a ghara inye Chineke otuto site n’ozizi ụgha dị iche iche. Were ozizi akara aka dị ka ihe atụ. Ozizi a dabeere n’echiche bụ́ na ebe ọ bụ na Chineke nwere ikike nke ịma ihe ga-eme n’ọdịnihu, ọ ghaghị ịbụ na ọ ma ihe ga-esi n’ihe nile pụta. Ozizi akara aka si otú a na-enye echiche na Chineke kpebiri ọdịnihu—nke ọma ma ọ bụ nke ọjọọ—nke ụmụ mmadụ ogologo oge gara aga. Dị ka ozizi a si kwuo, ọ bụ Chineke ka a na-aghaghị ịta ụta maka nhụjuanya na mmebi iwu nile dị n’ụwa nke taa. Ọ dịtụghị ewetara Chineke otuto mgbe a na-ata ya ụta e kwesịrị ịta Onye Iro ukwu ya bụ́ Setan, bụ́ onye Bible na-akpọ “onye na-achị ụwa”!—Jọn 14:30; 1 Jọn 5:19.

13. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe nzuzu iche na Chineke apụghị ịchịkwa ikike o nwere ịma ihe ga-eme n’ọdịnihu? Nye ihe atụ.

13 Akara aka bụ ozizi na-esiteghị n’Akwụkwọ Nsọ nke na-ekwutọ Chineke. Ọ na-eme ka a ghara ịma ọdịiche dị n’etiti ihe ọ pụrụ ime na ihe ọ na-eme n’ezie. Bible kwuru n’ụzọ doro anya na Chineke pụrụ ịma ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. (Aịsaịa 46:9, 10) Otú ọ dị, ọ bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya iche na ọ pụghị ịchịkwa ikike o nwere ịma ihe ga-eme n’ọdịnihu ma ọ bụ na ọ bụ ya kpatara ihe ọ bụla merenụ. Iji maa atụ: Ka e were ya na i nwere nnukwu ike ọkpụkpụ aka. Nke ahụ ọ̀ ga-eme ka ị na-achọ ibuli ihe ọ bụla dị arọ ị hụrụ? Ọ dịghị ma ọlị! N’otú aka ahụ, Chineke inwe ikike ịmata ihe ga-eme n’ọdịnihu adịghị akpali ya ịmatacha ma ọ bụ ikpebicha ihe nile. Ọ na-eji ikike o nwere ịmata ihe ga-eme n’ọdịnihu eme ihe n’ụzọ ezi uche dị na ya. * N’ụzọ doro anya, ozizi ụgha, gụnyere ozizi akara aka, adịghị enye Chineke otuto.

14. N’ụzọ dị aṅaa ka okpukpe a haziri ahazi siworo wetara Chineke nkọcha?

14 Ụzọ nke abụọ okpukpe a haziri ahazi si ewetara Chineke nkọcha bụ site n’àgwà nke ndị òtù ya. A na-atụ anya ka Ndị Kraịst na-agbaso ozizi Jizọs. Tinyere ihe ndị ọzọ, Jizọs kụziiri ụmụazụ ya ‘ịhụrịta ibe ha n’anya’ na ịnọgide ghara ịbụ “akụkụ nke ụwa.” (Jọn 15:12; 17:14-16) Gịnị banyere ndị ụkọchukwu Krisendọm? Hà agbasowo ozizi ndị ahụ n’ezie?

15. (a) Gịnị bụ ihe ndekọ ndị ụkọchukwu nwere ma a bịa n’agha nke mba dị iche iche? (b) Mmetụta dị aṅaa ka àgwà ndị ụkọchukwu nweworo n’ahụ́ ọtụtụ nde mmadụ?

15 Tụlee ihe ndekọ ndị ụkọchukwu nwere ma a bịa n’agha. Ha akwadowo, nabata, ọbụna bute ụzọ n’ọtụtụ agha nke mba dị iche iche. Ha agọziwo ndị agha, kwuokwa na ogbugbu e gburu ndị ọzọ adịghị njọ. A na-akpali anyị iche, sị, ‘Ọ̀ bụ na ọ gbatatụbeghị ndị ụkọchukwu dị otú ahụ n’obi na ndị ogbo ha nọ n’akụkụ nke ọzọ na-emekwa otu ihe ahụ?’ (Lee igbe bụ́ “Ònye Ka Chineke Dịnyeere?”) Ndị ụkọchukwu adịghị enye Chineke otuto mgbe ha na-ekwu na ọ na-akwado ha n’agha ndị a na-akwafu ọbara na ha; ha adịghịkwa enye ya otuto mgbe ha na-ekwu na ụkpụrụ Bible aghọọla ihe oge ochie ma na-agbachi nkịtị n’ụdị omume mmekọahụ rụrụ arụ ọ bụla. Lee ka ha si echetara anyị ndị ndú okpukpe ahụ Jizọs kpọrọ “ndị ọrụ mmebi iwu” na “ndị nduzi kpuru ìsì”! (Matiu 7:15-23; 15:14) Àgwà ndị ụkọchukwu emewo ka ịhụnanya ọtụtụ nde mmadụ nwere n’ebe Chineke nọ jụọ oyi.—Matiu 24:12.

Olee Ndị Na-enye Chineke Otuto n’Ezie?

16. Iji zaa ajụjụ ahụ banyere ndị na-enye Chineke otuto n’ezie, n’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji legara Bible anya?

16 Ọ bụrụ na ndị a ma ama na ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ụwa n’ozuzu ha ajụwo inye Chineke otuto, oleezi ndị na-eme otú ahụ n’ezie? Iji zaa ajụjụ ahụ, anyị aghaghị ilegara Bible anya. E kwuwerị, Chineke nwere ikike ikwu ụzọ a ga-esi nye ya otuto, o setịpụkwara ụkpụrụ ndị a ga-agbaso n’Okwu ya, bụ́ Bible. (Aịsaịa 42:8) Ka anyị tụlee ụzọ atọ e si enye Chineke otuto, na-eji nke ọ bụla n’ime ha aza ajụjụ banyere ndị na-eme otú ahụ n’ezie.

17. Olee otú Jehova n’onwe ya si gosi na inye aha ya otuto bụ akụkụ dị oké mkpa nke uche ya, ole ndị kwa taa na-eto aha Chineke n’ụwa nile?

17 Nke mbụ, anyị pụrụ inye Chineke otuto site n’ito aha ya. Ihe Jehova gwara Jizọs na-eme ka ọ pụta ìhè na ime otú ahụ bụ akụkụ dị oké mkpa nke uche Chineke. Ụbọchị ole na ole tupu ya anwụọ, Jizọs kpere ekpere, sị: “Nna, mee ka aha gị dị ebube.” Mgbe ahụ, otu olu zara, sị: “Emewo m ka ọ dị ebube, m ga-emekwa ka ọ dị ebube ọzọ.” (Jọn 12:28) Obi abụọ adịghị ya na onye kwuru okwu ahụ bụ Jehova n’onwe ya. Site ná nzaghachi ya, o doro anya na inye aha ya otuto dị ya mkpa. Oleezi ndị na-enye Jehova otuto taa site n’ime ka a mara aha ya na ito ya n’ụwa nile? Ọ bụ Ndịàmà Jehova, ha na-emekwa otú ahụ n’ala 235!—Abụ Ọma 86:11, 12.

18. Olee otú anyị pụrụ isi mata ndị na-efe Chineke ofufe “n’eziokwu,” oleekwa ìgwè nọgideworo na-akụzi eziokwu Bible kemgbe ihe karịrị otu narị afọ?

18 Nke abụọ, anyị pụrụ ito Chineke site n’ịkụzi eziokwu banyere ya. Jizọs kwuru na ndị na-efe ezi ofufe ‘ga-efe Chineke ofufe n’eziokwu.’ (Jọn 4:24) Olee otú anyị pụrụ isi mata ndị na-efe Chineke ofufe “n’eziokwu”? Ha aghaghị ịjụ ozizi ndị na-adabereghị na Bible na ndị na-akọwahie Chineke na uche ya. Kama nke ahụ, ha aghaghị ịkụzi eziokwu ndị sitere n’Okwu Chineke, bụ́ ndị na-agụnye ihe ndị na-esonụ: Ọ bụ nanị Jehova bụ Chineke Kasị Ihe Nile Elu, nakwa na ọ bụ nanị ya ka otuto maka ọnọdụ a ga-agara (Abụ Ọma 83:18); Jizọs bụ Ọkpara Chineke nakwa Onye Ọchịchị a họpụtara ahọpụta nke Alaeze Mezaịa nke Chineke (1 Ndị Kọrint 15:27, 28); Alaeze Chineke ga-edo aha Jehova nsọ ma mezuo nzube ya maka ụwa a na ụmụ mmadụ bi n’ime ya (Matiu 6:9, 10); a ghaghị ikwusa ozi ọma banyere Alaeze a n’ụwa nile. (Matiu 24:14) Kemgbe ihe karịrị otu narị afọ, ọ bụ nanị otu ìgwè ji ikwesị ntụkwasị obi na-akụzi eziokwu ndị dị otú ahụ dị oké ọnụ ahịa—Ndịàmà Jehova!

19, 20. (a) N’ihi gịnị ka omume dị mma nke Onye Kraịst pụrụ iji wetara Chineke otuto? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa pụrụ inyere anyị aka ịmata ndị na-enye Chineke otuto taa site n’ịnọgide na-eme omume dị mma?

19 Nke atọ, anyị pụrụ inye Chineke otuto site n’ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ya. Pita onyeozi dere, sị: “Nọgidenụ na-eme omume dị mma n’etiti mba nile, ka, ha n’ihe ndị ahụ ha na-ekwugide ùnu na ha dị ka unu bụ ndị ajọ omume, wee nye Chineke otuto n’ụbọchị nleta ya n’ihi ọrụ ọma unu nke ha ji anya ha na-ahụ.” (1 Pita 2:12) Omume Onye Kraịst na-emetụta okwukwe ya. Mgbe ndị na-ekiri ihe na-emenụ chọpụtara njikọ a—ya bụ, mgbe ha hụrụ na omume dị mma nke Onye Kraịst bụ kpọmkwem n’ihi okwukwe ya—ọ na-ewetara Chineke otuto.

20 Ole ndị taa na-enye Chineke otuto site n’ịnọgide na-eme omume dị mma? Olee òtù okpukpe nke nataworo otuto site n’aka ọtụtụ ndị ọchịchị n’ihi ịbụ ndị udo na ụmụ amaala na-erube isi n’iwu bụ́ ndị na-atụ ụtụ isi ha? (Ndị Rom 13:1, 3, 6, 7) Olee ndị a maara n’ụwa nile maka ịdị n’otu nke ha na ndị kwere ekwe ibe ha—ịdị n’otu nke ndịrịta iche nke agbụrụ na mba na-adịghị egbochi? (Abụ Ọma 133:1; Ọrụ 10:34, 35) Olee ìgwè a maara n’ụwa nile n’ihi ọrụ nkụzi Bible ha bụ́ nke na-akwalite nrubeisi nye iwu, ụkpụrụ omume ọma nke ezinụlọ, na ụkpụrụ omume ọma nke Bible? E nwere nanị otu òtù ndị omume ọma ha n’akụkụ ndị a na n’akụkụ ndị ọzọ na-agbara onwe ya akaebe—Ndịàmà Jehova!

Ị̀ Na-enye Chineke Otuto?

21. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji tụlee ma ànyị na-enye Jehova otuto n’onwe anyị?

21 Onye nke ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị, ‘Àna m enye Jehova otuto?’ Dị ka Abụ Ọma nke 148 si kwuo, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ihe e kere eke na-enye Chineke otuto. Ndị mmụọ ozi, eluigwe a na-ahụ anya, ụwa na anụmanụ e kere eke dị n’ime ya—ha nile na-eto Jehova. (Amaokwu nke 1-10) Lee ihe mwute ọ bụ na ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ taa adịghị eme otú ahụ! Site n’ibi ndụ n’ụzọ na-enye Chineke otuto, ị na-esonyere ihe ndị ọzọ nile e kere eke n’ito Jehova. (Amaokwu nke 11-13) Ọ dịghị ụzọ ka mma isi jiri ndụ gị mee ihe.

22. Site n’inye Jehova otuto, n’ụzọ ndị dị aṅaa ka e siworo gọzie gị, gịnịkwa kwesịrị ịbụ mkpebi gị?

22 Site n’inye Jehova otuto, a na-agọzi gị n’ọtụtụ ụzọ. Ka ị na-egosipụta okwukwe n’àjà mgbapụta Kraịst, a na-eme ka gị na Chineke dịghachi ná mma, ị na-esokwa Nna gị nke eluigwe enwe mmekọrịta udo na nke na-arụpụta ihe. (Ndị Rom 5:10) Ka ị na-achọ ihe ndị mere ị ga-eji na-enye Chineke otuto, ị na-enwekwu echiche ziri ezi na obi ekele. (Jeremaịa 31:12) Mgbe ahụ, ị nọ n’ọnọdụ nke inyere ndị ọzọ aka ibi ndụ obi ụtọ, nke na-eweta afọ ojuju, si otú ahụ na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’onwe gị. (Ọrụ 20:35) Soro ná ndị ahụ kpebisiri ike inye Chineke otuto—ugbu a nakwa ruo mgbe ebighị ebi!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere otú eluigwe a na-ahụ anya si egosi amamihe na ihe ọmụma Chineke, lee isi nke 5 na nke 17 nke akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 13 Lee Mpịakọta nke 1, peeji nke 853, nke Insight on the Scriptures, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ị̀ Na-echeta?

• N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na ndị ọkà mmụta sayensị n’ozuzu ha enyebereghị ndị mmadụ aka inye Chineke otuto?

• N’ụzọ abụọ dị aṅaa ka okpukpe a haziri ahazi siworo gbochie ndị mmadụ inye Chineke otuto?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ isi nye Chineke otuto?

• N’ihi gịnị ka i kwesịrị iji tụlee ma ị̀ na-enye Jehova otuto n’onwe gị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe dị na peeji nke 12]

“Ònye Ka Chineke Dịnyeere?”

Otu nwoke nke nọ n’Òtù Ndị Agha Ụgbọelu Germany n’oge Agha Ụwa nke Abụọ ma mesịa ghọọ otu n’ime Ndịàmà Jehova na-echeta, sị:

“Ihe kasị wute m n’afọ ndị ahụ a lụrụ agha . . . bụ ịhụ ndị ụkọchukwu nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpe nile—Katọlik, Lutheran, Episcopal, na ndị ọzọ—ka ha na-agọzi ụgbọelu na ndị nọ n’ime ha tupu ha apụọ ịga tụọ bọmbụ. Ana m echekarị, sị ‘Ònye ka Chineke dịnyeere?’

“Ndị agha Germany yi belt ndị e dere Gott mit uns (Chineke nọnyeere anyị) n’ihe e ji akpọchi ha. Ma ana m eche, sị, ‘N’ihi gịnị ka Chineke na-agaghị eji nọnyere ndị agha nọ n’akụkụ nke ọzọ bụ́ ndị nọkwa n’otu okpukpe ahụ ma na-ekpegakwara otu Chineke ahụ ekpere?’”

[Foto dị na peeji nke 10]

N’ụwa nile, Ndịàmà Jehova na-enye Chineke otuto n’ezie