Ònye Bụ “Ezi Chineke ahụ na Ndụ Ebighị Ebi”?
Ònye Bụ “Ezi Chineke ahụ na Ndụ Ebighị Ebi”?
JEHOVA, Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, bụ ezi Chineke ahụ. Ọ bụ ya bụ Onye Okike, onye na-enye ndị hụrụ ya n’anya ndụ agwụghị agwụ. Nke ahụ bụ otú ọtụtụ ndị na-agụ Bible ma kwere na ya ga-esi zaa ajụjụ ahụ a jụrụ n’elu. N’ezie, Jizọs n’onwe ya kwuru, sị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”—Jọn 17:3.
Ma, ọtụtụ ndị na-aga chọọchị na-enye okwu ahụ nkọwa dị iche. Okwu ndị ahụ dị n’elu sitere na 1 Jọn 5:20, nke akụkụ ya ụfọdụ na-asị: “Anyị na ezi onye ahụ dịkwa n’otu, site n’aka Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst. Nke a bụ ezi Chineke ahụ na ndụ ebighị ebi.”
Ndị kweere n’ozizi Atọ n’Ime Otu na-ekwu na nnọchiaha ahụ bụ́ “nke a” (houʹtos) na-ezo aka na mkpọaha kasị nọrọ ya nso, bụ́ Jizọs Kraịst. Ha na-azọrọ na ọ bụ Jizọs bụ “ezi Chineke ahụ na ndụ ebighị ebi.” Otú ọ dị, nkọwa a megidere akụkụ ndị ọzọ nke Akwụkwọ Nsọ. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta a na-akwanyere ùgwù anabataghịkwa echiche Atọ n’Ime Otu a. Ọkà mmụta Mahadum Cambridge bụ́ B. F. Westcott dere, sị: “Ihe ezi uche kasị dịrị na ya [nnọchiaha ahụ bụ́ houʹtos] na-ezo aka na ya abụghị onye kasị dịrị ya nso kama onye kasị dịrị n’uche onyeozi ahụ.” Ya mere, Jọn onyeozi bu Nna Jizọs n’uche. Ọkà mmụta okpukpe bụ́ onye Germany bụ́ Erich Haupt dere, sị: “A ghaghị ịchọpụta ma [houʹtos] e ji mee ihe n’okwu na-esochi ọ̀ na-ezo aka n’onye aha ya ka dịrị okwu ahụ nso . . . ka ọ̀ bụ n’onye aha ya ka dịrị n’ebe dị anya, bụ́ Chineke. . . . Ịghọta okwu ahụ dị ka ihe na-agba akaebe nye otu ezi Chineke ahụ yiri ka ọ̀ ka kwekọọ n’ịdọ aka ná ntị mechiri isiakwụkwọ ahụ megide arụsị karịa ịghọta ya dị ka ihe na-egosi na Kraịst bụ Chineke.”
Ọbụna akwụkwọ bụ́ A Grammatical Analysis of the Greek New Testament, nke Òtù Bible nke Popu dị na Rom bipụtara, na-ekwu, sị: “[Houʹtos]: dị ka ihe e ji mechie amaokwu nke 18-20 fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ dịghị onye ọzọ ọ na-ezo aka na ya ma ọ́ bụghị Chineke, onye ahụ dị adị, nke bụ́ ezi onye, bụ́ onye na-emegide ikpere arụsị (amaokwu nke 21).”
Mgbe mgbe houʹtos, bụ́ nke a na-asụgharịkarị ịbụ “nke a” ma ọ bụ “onye a,” adịghị ezo aka n’onye kasị dịrị ya nso nke a na-ekwu banyere ya. Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ na-enye ihe atụ nke a. Na 2 Jọn 7, otu onyeozi ahụ, bụ́kwa onye dere akwụkwọ ozi mbụ ahụ, dere, sị: “Ọtụtụ ndị nduhie abawo n’ụwa, bụ́ ndị na-adịghị ekwupụta Jizọs Kraịst dị ka onye bịara n’anụ ahụ́. Nke a [houʹtos] bụ onye nduhie ahụ na onye ahụ na-emegide Kraịst.” N’ebe a, nnọchiaha ahụ apụghị ịdị na-ezo aka n’onye kasị nọrọ ya nso—Jizọs. N’ụzọ doro anya, “nke a” na-ezo aka ná ndị gọnahụrụ Jizọs. N’ozuzu, ha bụ “onye nduhie ahụ na onye ahụ na-emegide Kraịst.”
N’Oziọma ya, Jọn onyeozi dere, sị: “Andru nwanne Saịmọn Pita bụ otu n’ime mmadụ abụọ ahụ nụrụ ihe Jọn kwuru wee soro Jizọs. Ihe mbụ bụ na onye a [houʹtosʹ] chọtara nwanne ya, bụ́ Saịmọn.” (Jọn 1:40, 41) O doro anya na “onye a” na-ezo aka, ọ bụghị n’onye ikpeazụ a kpọrọ aha, kama n’Andru. Na 1 Jọn 2:22, onyeozi ahụ ji otu nnọchiaha ahụ mee ihe n’ụzọ yiri nke ahụ.
Luk ji nnọchiaha ahụ mee ihe n’otu ụzọ ahụ dị ka a na-ahụ n’Ọrụ 4:10, 11: “N’aha Jizọs Kraịst onye Nazaret, onye unu kpọgidere n’osisi, ma bụrụ onye Chineke si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite, site n’onye a ka nwoke a guzo n’ihu unu n’ebe a n’ahụ́ ike. Nke a [houʹtosʹ] bụ ‘nkume ahụ nke unu bụ́ ndị na-ewu ụlọ mesoro dị ka ihe na-abaghị uru, nke ghọworo isi nkuku.’” O doro anya na nnọchiaha ahụ bụ́ “nke a” adịghị ezo aka na nwoke ahụ a gwọrọ ọrịa, ọ bụ ezie na ọ bụ ya ka a kpọpụrụ aha kpọmkwem tupu houʹtos. N’ezie, “nke a” nke dị n’amaokwu nke 11 na-ezo aka na Jizọs Kraịst onye Nazaret, onye bụ́ “isi nkuku” nke e wukwasịrị ọgbakọ Ndị Kraịst na ya.—Ndị Efesọs 2:20; 1 Pita 2:4-8.
Ọrụ 7:18, 19 na-egosipụtakwa nke a: “Eze dị iche biliri ịchị Ijipt, bụ́ onye na-amaghị banyere Josef. Onye a [houʹtos] ghọrọ agbụrụ anyị aghụghọ.” “Onye a” nke kpagburu ndị Juu, abụghị Josef, kama Fero, eze Ijipt.
Amaokwu ndị dị otú ahụ na-akwado ihe ọkà mmụta bụ́ onye Gris bụ́ Daniel Wallace kwuru, bụ́ onye kwuru na a bịa na nnọchiaha Grik, “onye pụrụ ịbụ onye kasị dịrị nso na ya nwere ike ghara ịbụ onye onye dere ihe ahụ bu n’uche.”
“Ezi Onye Ahụ”
Dị ka Jọn onyeozi dere, “ezi Onye ahụ” bụ Jehova, Nna nke Jizọs Kraịst. Ọ bụ ya bụ nanị ezi Chineke ahụ, Onye Okike. Pọl onyeozi kwenyere, sị: “Nye anyị e nwere n’ezie otu Chineke bụ́ Nna, onye ihe nile si n’aka ya dịrị.” (1 Ndị Kọrint 8:6; Aịsaịa 42:8) Ihe ọzọ mere Jehova ji bụrụ “ezi onye ahụ” nke e zoro aka na ya na 1 Jọn 5:20 bụ na ọ bụ ya bụ Isi Iyi nke eziokwu. Ọbụ abụ ahụ kpọrọ Jehova “Chineke nke eziokwu” n’ihi na Ọ na-ekwesị ntụkwasị obi n’ihe nile ọ na-eme ma bụrụ Onye na-apụghị ikwu okwu ụgha. (Abụ Ọma 31:5; Ọpụpụ 34:6; Taịtọs 1:2) N’ikwu banyere Nna ya nke eluigwe, Ọkpara ahụ kwuru, sị: “Okwu gị bụ eziokwu.” Banyekwara ozizi nke ya onwe ya, Jizọs kwuru, sị: “Ihe m na-ezi abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye zitere m.”—Jọn 7:16; 17:17.
Jehova bụkwa “ndụ ebighị ebi.” Ọ bụ Isi Iyi nke ndụ, Onye na-enye ya dị ka onyinye na-erughịrị mmadụ site na Kraịst. (Abụ Ọma 36:9; Ndị Rom 6:23) N’ụzọ dị ịrịba ama, Pọl onyeozi kwuru na Chineke bụ “onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Chineke kwụghachiri Ọkpara ya ụgwọ site n’ịkpọlite ya n’ọnwụ, Nna ahụ ga-akwụghachikwa ndị ji obi ha nile na-ejere Ya ozi ụgwọ ọrụ nke ndụ ebighị ebi.—Ọrụ 26:23; 2 Ndị Kọrint 1:9.
Ya mere, gịnị kwesịrị ịbụ nkwubi okwu anyị? Na ọ bụ Jehova, ọ bụghị onye ọ bụla ọzọ, bụ “ezi Chineke ahụ na ndụ ebighị ebi.” Ọ bụ nanị ya ka o ruuru ịnara ofufe a na-ekewaghị ekewa nke ndị nile o kere.—Mkpughe 4:11.