Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọchịchọ Inwetakwu Ihe

Ọchịchọ Inwetakwu Ihe

Ọchịchọ Inwetakwu Ihe

“Ọ bụrụ na ọ dịghị ihe na-eju anyị afọ, ọ dịghị nnọọ ihe ga-ezuru anyị.”—Akụkọ sitere n’ụlọ ọrụ Worldwatch Institute.

“GỊNỊ ka anyị chọrọ? Ihe nile. Olee mgbe anyị chọrọ ya? Ugbu a.” Echiche a bụ echiche ụfọdụ ụmụ akwụkwọ kọleji nwere n’afọ ndị 1960. Ọ pụrụ ịbụ na a dịghị anụ okwu ndị a kpọmkwem otú e si kwuo ha, ma echiche ahụ adịgidewo. N’ezie, o yiri ka ọchịchọ inwetakwu ihe ọ̀ bụ ihe e ji mara ọgbọ anyị.

Nye ọtụtụ ndị, inweta akụ̀ na ụba na ihe onwunwe abụwo ihe ka ha mkpa ná ndụ. Onye bụbu president United States, bụ́ Jimmy Carter, kwuru n’otu oge, sị: “Ihe e jizi amata mmadụ abụghị ihe ọ na-eme kama ọ bụ ihe o nwere.” È nwere ihe ndị ka mkpa karịa ihe onwunwe? Ọ bụrụ na e nwere, gịnị ka ha bụ, abamuru ndị dịkwa aṅaa ka ha ga-eweta?