Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Mgbe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ‘na-agbazinye ihe n’anaghị ọmụrụ nwa, n’enweghị olileanya inwetaghachi ihe ọ bụla,’ ihe ọ na-ekwu ọ̀ bụ na ha ekwesịghị ịnaraghachi ọbụna ego ahụ a gbazinyere?

A na-aghọta okwu Jizọs e dekọrọ na Luk 6:35 nke ọma site n’iburu Iwu Mozis n’uche. N’ebe ahụ, Chineke nyere ụmụ Izrel iwu ibinye ụmụ Izrel ibe ha ego, bụ́ ndị nọ n’ụkọ ma chọọ enyemaka, n’anaraghị ọmụrụ nwa. (Ọpụpụ 22:25; Levitikọs 25:35-37; Matiu 5:42) Ego ndị a a gbazinyere abụghị maka azụmahịa. Kama nke ahụ, ego dị otú ahụ a gbazinyere n’anaraghị ọmụrụ nwa bụ iji belata ịda ogbenye ma ọ bụ ajọ ihe ndabara. E kwuwerị, ọ ga-abụ ihe ịhụnanya na-adịghị na ya mmadụ inweta uru site ná ndakpọ akụ̀ na ụba nke onye agbata obi ya. N’agbanyeghị nke ahụ, onye na-agbazinye ego ahụ kwesịrị inwetaghachi ego ahụ ọ gbazinyere, a na-anarakwa ihe ibe (ihe ịgba ibe maka ego ahụ a gbazinyere) mgbe ụfọdụ.—Deuterọnọmi 15:7, 8.

Ọ bụ ezie na ọ kwadoro Iwu ahụ, Jizọs jiri ya mee ihe ọbụna n’ụzọ ka saa mbara, na-ekwu na onye ahụ na-enyere ibe ya aka ekwesịghị inwe olileanya “inwetaghachi ihe ọ bụla.” Dị ka ụmụ Izrel, mgbe ụfọdụ, Ndị Kraịst na-enwe ndakpọ akụ̀ na ụba ma ọ bụ ọnọdụ ndị ọzọ pụrụ ime ka ha daa ogbenye, ọbụna nọrọ n’ụkọ. Ọ bụrụ na nwanna Onye Kraịst nke nọ n’ọnọdụ siri ike dị otú ahụ achọọ enyemaka ego, ọ́ gaghị abụ obiọma inyere ya aka? N’ezie, ezi ịhụnanya ga-akpali Onye Kraịst ịchọ inyere nwanna ya aka, bụ́ onye dabara ná nsogbu ego n’ihi ihe ọ na-abụghị ya kpatara. (Ilu 3:27) Ọ pụrụ ikwe omume inye nwanna dị otú ahụ nọ ná mkpa onyinye, ọ bụ ezie na onyinye ahụ pụrụ ịdị ala karịa ihe mmadụ pụrụ ịgbazinye agbazinye.—Abụ Ọma 37:21.

Na narị afọ mbụ O.A., e nyere Pọl onyeozi na Banabas ọrụ ibugara ụmụnna bi na Judia onyinye sitere n’aka Ndị Kraịst nọ n’Asia Minor n’ihi ụnwụ nri. (Ọrụ 11:28-30) N’otu aka ahụ taa, mgbe ọdachi mere, Ndị Kraịst na-ezigara ụmụnna ha ndị nọ ná mkpa onyinye mgbe mgbe. Site n’ime otú ahụ, ha na-agbakwara ndị ọzọ ezi àmà. (Matiu 5:16) N’ezie, e kwesịrị ịtụle àgwà na ọnọdụ nke onye ahụ na-achọ enyemaka. Gịnị mere o ji nọrọ ná mkpa? E kwesịrị iburu n’uche okwu Pọl bụ́: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọghị ịrụ ọrụ, ya gharakwa iri ihe.”—2 Ndị Tesalonaịka 3:10.

Ọ bụrụ na nwanna na-achọ ka a gbazinye ya ego anọghị n’oké mkpa ma chọọ enyemaka nanị nwa oge iji guzoroghachi n’onwe ya ka o nwesịrị mfu ego, ọ pụrụ iyi ihe kwesịrị ekwesị ịgbazinye ya ego n’anaghị ya ọmụrụ nwa. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ịgbazinye onye ahụ ego n’ebumnobi nke inwetaghachi ego ahụ a gbazinyere agaghị abụ ime ihe megidere okwu Jizọs dị na Luk 6:35. E kwesịrị ide ihe e kwekọrịtara ede, onye ahụ a na-agbazinye ego kwesịkwara ịgbalịsi ike ịkwụghachi ya dị ka e kwekọrịtara. N’ezie, ịhụnanya Ndị Kraịst kwesịrị ịkpali onye ahụ na-agbaziri ego ịkwụghachi ya dị nnọọ ka ọ kpaliri onye ahụ gbazinyere ya ego ime otú ahụ.

Ọ dịkwa onye ahụ na-atụle ịgbazinye mmadụ ego (ma ọ bụ inye onyinye) mkpa ịtụle ọnọdụ ezinụlọ nke ya. Dị ka ihe atụ, ọ̀ ga-eme ka ọ ghara ikwe ya omume igbo mkpa ndị òtù ezinụlọ ya, nke bụ́ ibu ọrụ Akwụkwọ Nsọ butere ụzọ? (2 Ndị Kọrint 8:12; 1 Timoti 5:8) N’agbanyeghị nke ahụ, Ndị Kraịst na-achọ ohere iji na-egosirịta ibe ha ịhụnanya, na-egosipụta ụdị ịhụnanya ahụ n’ụzọ ndị dị irè bụ́ ndị kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible.—Jems 1:27; 1 Jọn 3:18; 4:7-11.