Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Jegharịa N’ala Nke A”

“Jegharịa N’ala Nke A”

“Jegharịa N’ala Nke A”

“Jegharịa n’ala nke a n’ogologo ya na n’obosara ya.”—Jenesis 13:17.

1. Ntụziaka dị aṅaa na-akpali mmasị ka Chineke nyere Ebreham?

Ọ̀ NA-AMASỊ gị ịgbagharị n’ime obodo, ikekwe jiri ụgbọala na-eme nke a ná ngwụsị izu? Ndị ọzọ na-ahọrọ iji ịnyịnya ígwè eme nke a iji megaratụ ahụ́ na iji jiri ntụsara ahụ́ kirie gburugburu ha. Ndị ọzọkwa na-ahọrọ iji ụkwụ eme mkpagharị iji mara otu ebe nke ọma ma kirie ihe ndị dị na ya. Njem ndị dị otú ahụ adịghị adịtekarị aka. Ma cheedị otú obi ga-adịworị Ebreham mgbe Chineke gwasịrị ya, sị: “Bilie, jegharịa n’ala nke a n’ogologo ya na n’obosara ya; n’ihi na gị ka M ga-enye ya”!—Jenesis 13:17.

2. Mgbe ọ hapụsịrị Ijipt, ebee ka Ebreham gara?

2 Tụlee ihe ndị gbara okwu ndị ahụ gburugburu. Ebreham na nwunye ya na ndị ọzọ ebiwo nwa oge n’Ijipt. Jenesis isi 13 na-agwa anyị na ha hapụrụ Ijipt ma chịrị anụ ụlọ ha gaa “Negeb.” Ka e mesịrị, Ebreham “si na Negeb jee ná mbuli ije ya wee ruo Betel.” Mgbe nsogbu bilitere n’etiti ndị na-azụrụ ya anụ ụlọ na ndị na-azụrụ nwa nwanne ya bụ́ Lọt anụ ụlọ, ya edookwa anya na ha abụọ aghaghị ịchọ ebe ịzụ anụ dịrịta iche, Ebreham ji obi ọcha kwe ka Lọt buru ụzọ họrọ. Lọt họọrọ “Gburugburu ala nile nke Jọdan,” bụ́ ndagwurugwu jupụtara n’ahịhịa ndụ nke “dị ka ubi Jehova a gbara ogige,” ma mesịa gaa biri na Sọdọm. Chineke gwara Ebreham, sị: “Welie anya gị abụọ, si n’ọnọdụ a, ebe gị onwe gị nọ, lee anya n’Ugwu na na Ndịda na n’Ihu anyanwụ na n’Ọdịda anyanwụ.” Eleghị anya site n’ebe kpọgoro akpọgo nke dịdebere Betel, Ebreham pụrụ ịhụ akụkụ ndị ọzọ nke ala ahụ. Otú ọ dị, ọ bụghị ebe ahụ ka okwu biri. Chineke gwara ya ka o ‘jegharịa n’ala ahụ’ ma mara otú ala ahụ na ógbè ndị dị na ya dị.

3. N’ihi gịnị ka ọ pụrụ iji sie ike iji anya nke uche hụ ebe ndị Ebreham jegharịrị?

3 N’agbanyeghị ebe Ebreham pụrụ ịgaruwo tupu ya eruo Hibrọn, o doro anya na ọ maara Ala Nkwa ahụ nke ọma karịa ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime anyị. Chee echiche banyere ebe ndị a kpọtụrụ aha n’ihe ndekọ a—Negeb, Betel, Gburugburu Jọdan, Sọdọm, na Hibrọn. Ị̀ na-agbalị iji anya nke uche gị hụ ebe ógbè ndị dị otú ahụ dị? Nke a na-esiri ọtụtụ ndị ike n’ihi na ọ bụ mmadụ ole na ole n’ime ndị Jehova gatụworo ebe ndị ha na-agụ banyere ha n’ime Bible, na-ejegharị n’ogologo na n’obosara nke ala ahụ. Otú o sina dị, anyị nwere ihe mere anyị ga-eji nwee mmasị dị ukwuu n’ịmara banyere ebe ndị a kpọtụrụ aha na Bible. N’ihi gịnị?

4, 5. (a) Olee otú Ilu 18:15 si metụta ịma banyere na ịghọta ala ndị e kwuru okwu ha na Bible? (b) Gịnị ka Zefanaịa isi 2 na-egosi?

4 Okwu Chineke na-ekwu, sị: “Obi onye nghọta na-enweta ihe ọmụma; ọzọ, ntị ndị maara ihe na-achọ ihe ọmụma.” (Ilu 18:15) E nwere ọtụtụ isiokwu ndị mmadụ pụrụ inweta ihe ọmụma na ha, ma ezi ihe ọmụma banyere Jehova Chineke na otú o si eme ihe kasị mkpa. N’ezie, ihe anyị na-agụ na Bible dị mkpa iji nweta nke ahụ. (2 Timoti 3:16) Otú ọ dị, rịba ama na a chọrọ nghọta. Nke ahụ bụ ikike ileba anya n’okwu, iji ghọta ihe jikọrọ ya na akụkụ ya dị iche iche na ozuzu ya. Nke a bụ eziokwu banyere ebe ndị a kpọtụrụ aha na Bible. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ n’ime anyị maara ebe Ijipt dị, ma ruo ókè ha aṅaa ka anyị ghọtara okwu ahụ bụ́ na Ebreham si Ijipt “gaa Negeb,” si ya gaa Betel, ma mesịa gaa Hibrọn? Ị̀ ghọtara ihe jikọrọ ebe ndị a?

5 Ma ọ bụ, ị pụrụ ịgbasowo usoro ọgụgụ Bible nke gụnyere Zefanaịa isi 2. N’ebe ahụ ị gụtara aha obodo, ndị mmadụ, na ala dị iche iche. A kpọtụrụ Geza, Ashkelọn, Ashdọd, Ekrọn, Sọdọm, na Ninive tinyekwara Kenan, Moab, Amọn, na Asiria aha n’isiakwụkwọ ahụ. Ì jiliri anya nke uche gị hụ ebe ndị ahụ bụ́ ebe ndị mmadụ biri n’ezie, ndị keere òkè ná mmezu nke amụma sitere n’aka Chineke?

6. N’ihi gịnị ka ụfọdụ Ndị Kraịst jiworo jiri map kpọrọ ihe? (Lee igbe.)

6 Ọtụtụ ndị na-amụ Okwu Chineke eritewo uru dị ukwuu site n’ịtụle map ndị na-egosi ala ndị a kpọtụrụ aha na Bible. Ha na-eme nke a, ọ bụghị n’ihi na map na-adọrọ nnọọ mmasị ha, kama n’ihi na ha ghọtara na site n’iji map eme ihe, ha pụrụ inwekwu ihe ọmụma nke Okwu Chineke. Map pụkwara inyere ha aka ịmụba nghọta ha, ịhụ njikọ dị n’etiti ihe ndị ha mabu ama na ihe ọmụma ndị ọzọ. Ka anyị na-atụle ihe atụ ụfọdụ, ikekwe ị ga-enwekwu obi ekele n’ebe Jehova nọ ma ghọtakwuo ihe ndị a kọrọ banyere ha n’Okwu ya.—Lee igbe dị na peeji nke 14.

Ịmara Otú Ihe Dịruru Anya Na-enye Aka

7, 8. (a) Ihe dị aṅaa dị ịrịba ama ka Samsin mere na Geza? (b) Ihe ọmụma dị aṅaa pụrụ ime ka ihe Samsin mere dịkwuo ịrịba ama? (ch) Olee otú ịma banyere ihe ndekọ a metụtara Samsin na ịghọta ya pụrụ isi nyere anyị aka?

7 Ndị Ikpe 16:2, ị pụrụ ịgụta na Onyeikpe Samsin nọ na Geza. A na-anụkarị aha ahụ bụ́ Geza n’akụkọ, n’ihi ya ị pụrụ ịghọta ebe Samsin nọ mgbe ahụ, n’ókèala ndị Filistia na nso Ụsọ Oké Osimiri Mediterenian. [11] Ugbu a rịba ama ihe dị ná Ndị Ikpe 16:3: “Samsin wee dinaa ruo etiti abalị, bilie n’etiti abalị, jide ibo ọnụ ụzọ ámá obodo, jidekwa ide ya abụọ, fopụ ha, tinyere mkpọrọ, tụkwasị ha n’ubu ya abụọ, buru ha rịgoo n’elu ugwu nke dị n’ihu Hibrọn.”

8 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ibo ọnụ ụzọ ámá na ide nke obodo e wusịrị ike dị ka Geza ga-ebu ibu ma dị arọ. Cheedị ihe ọ dị ka ya ịnwa iburu ha! Samsin mere otú ahụ, ma ebee ka o bu ha gaa, njem dịkwa aṅaa ka o mere? Geza dị n’ụsọ oké osimiri, ịdị elu ya fọkwara nke nta ka ọ ha ka nke oké osimiri. [15] Otú ọ dị, Hibrọn dị n’ebe ọwụwa anyanwụ ya n’ebe dị mita 900 n’elu—ọ bụ ugwu n’ezie! Anyị apụghị ikwu kpọmkwem ebe “ugwu nke dị n’ihu Hibrọn” dị, ma obodo ahụ dị ihe dị ka kilomita 60 site na Geza—nke dị n’elu ugwu! Ịmara otú ebe ọ gara dịruru anya na-eme ka a ghọta otú ihe Samsin mere si bụrụ nnọọ ihe siri ike, ọ́ bụghị ya? Chetakwa ihe mere Samsin pụrụ iji nwee ike ime ihe dị otú ahụ—“mmụọ Jehova wee dakwasị ya n’ike.” (Ndị Ikpe 14:6, 19; 15:14) Dị ka Ndị Kraịst taa, anyị adịghị atụ anya ka mmụọ Chineke nye anyị ike nkịtị pụrụ iche. Ma, otu mmụọ ahụ dị ike pụrụ ime ka anyị ghọtakwuo ihe ime mmụọ ndị miri emi ma mee ka anyị dị ike dị ka mmadụ anyị bụ n’ime si dị. (1 Ndị Kọrint 2:10-16; 13:8; Ndị Efesọs 3:16; Ndị Kọlọsi 1:9, 10) Ee, ịghọta akụkọ banyere Samsin na-eme ka anyị kwenyesie ike na mmụọ Chineke pụrụ inyere anyị aka.

9, 10. (a) Gịnị ka mmeri Gidiọn meriri ndị Midian gụnyere? (b) Olee otú anyị ịma ebe ndị ihe ndị a nọrọ mee pụrụ isi nyere anyị aka ịghọtakwu ihe ndekọ a?

9 Mmeri Gidiọn meriri ndị Midian bụ ihe ndekọ ọzọ na-eme ka otú ihe dịruru anya pụta ìhè. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị na-agụ Bible maara na Onyeikpe Gidiọn na ndị ikom 300 ya meriri ndị mwakpo jikọrọ aka dị 135,000—ndị Midian, ndị Amalek, na ndị ọzọ bụ́ ndị mara ụlọikwuu ha n’ala dị larịị nke Jezril, nke dịdebere ugwu More. [18] Ndị ikom Gidiọn fụrụ opi, kụwaa ite ha iji mee ka ọwa ha nwupụta ma tie mkpu, sị: “Mma agha dịrị Jehova dịkwara Gidiọn.” Nke a tinyere ndị iro ahụ n’ọgba aghara ma menye ha egwu nke na ha malitere igburịta ibe ha. (Ndị Ikpe 6:33; 7:1-22) Nke ahụ ọ̀ bụ nanị ihe merenụ, otu ihe omume mere ngwa ngwa n’abalị? Gụrụ gaa n’ihu ná Ndị Ikpe isi 7 na nke 8. Ị ga-ahụ na Gidiọn gara n’ihu ná mwakpo ahụ. A pụghị ịchọta ebe ụfọdụ n’ime ọtụtụ ebe ndị a kpọtụrụ aha dị taa, n’ihi ya, ha nwere ike ghara ịdị na map Bible. Otú o sina dị, ndị a maara ebe ha dị zuuru anyị, ka anyị wee nwee ike ịghọta ihe Gidiọn mere.

10 Gidiọn chụụrụ ndị fọdụrụ n’usuu ndị agha ahụ jikọrọ aka gafee Bet-shita ma chụrụzie ha gaa n’ebe ndịda ruo Ebel-mehola, nke dịdebere Jọdan. (Ndị Ikpe 7:22-25) Ihe ndekọ ahụ na-ekwu, sị: ‘Gidiọn wee bịaruo Jọdan ịgabiga, ya onwe ya na narị ndị ikom atọ ndị soro ya, ha na-ada mbà, ma ha na-achụ achụ.’ Ozugbo ha gafesịrị Jọdan, ndị Izrel chụụrụ ndị iro ha gawa n’ebe ndịda ruo Sọkọt na Penuel, bụ́ ebe ndị dị nso na Jabọk ma chụrụzie ha gbagoo ugwu ruo Jọg-beha (nke dị nso n’Amman nke oge a, nke dị na Jọdan). Nke ahụ bụ ịchụ ọsọ na ibu agha ruo ihe dị ka kilomita 80. Gidiọn jidere ma gbuo ndị eze abụọ nke Midian; mesịa lọghachi n’obodo ya, bụ́ Ọfra, nke dị nso n’ebe agha ahụ malitere. (Ndị Ikpe 8:4-12, 21-27) N’ụzọ doro anya, ihe Gidiọn mere karịrị ịfụ opi, ifegharị ọwa, na iti mkpu were minit ole na ole. Cheekwa otú o si mesie okwu e kwuru banyere ndị ikom nwere okwukwe ike: “Oge ga-agwụnahụ m ma ọ bụrụ na m gaa n’ihu ịkọ banyere Gidiọn [na ndị ọzọ bụ́ ndị] site n’ọnọdụ adịghị ike bụrụ ndị e mere ka ha dị ike, bụrụ ndị dike n’agha.” (Ndị Hibru 11:32-34) Ike pụrụ ịgwụ Ndị Kraịst taa, ma ọ́ dịghị oké mkpa ka anyị nọgide na-eme uche Chineke?—2 Ndị Kọrint 4:1, 16; Ndị Galeshia 6:9.

Olee Otú Ndị Mmadụ Si Eche Echiche na Otú Ha Si Emeghachi Omume?

11. Njem ha aṅaa ka ụmụ Izrel mere tupu ha eruo na mgbe ha rusịrị Kedesh?

11 Ụfọdụ pụrụ ịsapeta map Bible iji chọta ebe dị iche iche, ma ì chere na map pụrụ inyere gị aka ịghọta otú ndị mmadụ si eche echiche? Were dị ka ihe atụ, ụmụ Izrel bụ́ ndị si n’Ugwu Saịnaị gawa Ala Nkwa ahụ. Ka ha kwụsịtụchara ugboro ole na ole n’ụzọ, ha mesịrị rute Kedesh (ma ọ bụ, Kedesh-bania). [9] Deuterọnọmi 1:2 na-akọwa nke a dị ka njem ụbọchị 11, nke dị ihe dị ka kilomita 270 n’anya. Site n’ebe ahụ, Mozis zigara ndị nledo 12 n’Ala Nkwa ahụ. (Ọnụ Ọgụgụ 10:12, 33; 11:34, 35; 12:16; 13:1-3, 25, 26) Ndị nledo ahụ tinyere isi n’ebe ugwu gafere Negeb, ikekwe gaferekwuo Bia-shiba, gafezie Hibrọn ma ruo n’ebe Ala Nkwa ahụ jedebere n’ebe ugwu. (Ọnụ Ọgụgụ 13:21-24) N’ihi na ha kweere akụkọ ọjọọ nke ndị nledo iri, ndị Izrel aghaghị ịwagharị n’ịkpa ruo afọ 40. (Ọnụ Ọgụgụ 14:1-34) Gịnị ka nke a na-ekpughe banyere okwukwe ha na ịdị njikere ha ịtụkwasị Jehova obi?— Deuterọnọmi 1:19-33; Abụ Ọma 78:22, 32-43; Jud 5.

12. Gịnị ka anyị pụrụ ikwubi banyere okwukwe nke ndị Izrel, n’ihi gịnịkwa ka nke ahụ ji bụrụ ihe anyị ga-echebara echiche?

12 Tụlee nke a na-adabere n’ebe ndị ha jeruru. A sị na ndị Izrel gosipụtara okwukwe ma gbasoo ndụmọdụ Jọshụa na Keleb, hà gaara eme ogologo njem dị otú ahụ iji ruo n’Ala Nkwa ahụ? Kedesh dị ihe dị ka kilomita 16 site na Bia-lehaị-rọị, bụ́ ebe Aịzik na Ribeka biri. [7] Isi ebe ahụ ruo Bia-shiba agaghị eru kilomita 95, bụ́ nke e kwuru na ọ dị ná ngwụsị nke ebe ndịda Ala Nkwa ahụ. (Jenesis 24:62; 25:11; 2 Samuel 3:10) N’ịbụ ndị meworo njem site n’Ijipt ruo Ugwu Saịnaị ma gaa kilomita 270 ruo Kedesh, ọ dị ka à ga-asị na ha nọ n’ọnụ ọnụ Ala Nkwa ahụ. Na nke anyị, anyị nọ n’ọnụ ọnụ Paradaịs elu ala ahụ e kwere ná nkwa. Gịnị ka anyị na-amụta? Pọl onyeozi jikọtara ọnọdụ ndị Izrel na ndụmọdụ a: “Ya mere ka anyị mee ike anyị nile ịbanye n’izu ike ahụ, ka onye ọ bụla ghara ịdaba n’ụdị ihe atụ ahụ nke nnupụisi.”—Ndị Hibru 3:16–4:11.

13, 14. (a) N’ọnọdụ dị aṅaa ka ndị Gibiọn weere nzọụkwụ dị mkpa? (b) Gịnị na-ekpughe àgwà ndị Gibiọn, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ịmụta na nke a?

13 Àgwà dị iche—nke ịtụkwasị Chineke obi na ọ ga-emezu uche ya—pụtara ìhè n’ihe ndekọ Bible banyere ndị Gibiọn. Mgbe Jọshụa durusịịrị ụmụ Izrel gafee Osimiri Jọdan banye n’ala ahụ Chineke kwere ezinụlọ Ebreham ná nkwa, oge ruru ịchụpụ ndị Kenan. (Deuterọnọmi 7:1-3) Nke ahụ gụnyere ndị Gibiọn. Ndị Izrel kwaturu Jeriko na E-aị ma maa ụlọikwuu ha na Gilgal bụ́ nke dịdebere Jeriko. Ndị Gibiọn achọghị ịnwụ dị ka ndị Kenan a bụrụ ọnụ, n’ihi ya, ha zigaara Jọshụa ndị nnọchianya na Gilgal. Ha mere ka à ga-asị na ha si n’obodo na-adịghị na Kenan ka ha na ndị Hibru wee nwee nkwekọrịta udo.

14 Ndị nnọchianya ahụ kwuru, sị: ‘Ala dị anya nke ukwuu ka ndị ohu gị si bịa n’ihi aha Jehova, bụ́ Chineke gị.’ (Joshua 9:3-9) Uwe ha na ihe oriri ha yiri ka hà kwadoro na ha si ebe dị anya, ma n’ezie, Gibiọn dị kilomita 30 site na Gilgal. [19] N’ikweta na ha si ebe dị anya, Jọshụa na ndị isi ya soro Gibiọn na obodo ndị dị nso bụ́ ndị ha na Gibiọn nwere njikọ nwee nkwekọrịta udo. Aghụghọ ndị Gibiọn ọ̀ bụ nanị iji gbanahụ mbibi? N’ụzọ megidere nke ahụ, o gosiri ọchịchọ ha inweta ihu ọma nke Chineke nke Izrel. Jehova kwetara ka ndị Gibiọn ghọọ “ndị ọwa nkụ na ndị ose mmiri banyere nzukọ Izrel, banyekwara ebe ịchụàjà Jehova,” ndị na-achịkọta nkụ maka ebe ịchụàjà. (Joshua 9:11-27) Ndị Gibiọn nọgidere na-egosipụta njikere ha dị ịrụ ọrụ ndị dị ala n’ozi Jehova. Eleghị anya, ụfọdụ n’ime ha so ná ndị Netinim bụ́ ndị si Babilọn lọta ma jee ozi n’ụlọ nsọ e wughachiri ewughachi. (Ezra 2:1, 2, 43-54; 8:20) Anyị pụrụ iṅomi àgwà ha site n’ịgbalịsi ike iso Chineke na-adị n’udo na ịdị njikere ịrụ ọbụna ọrụ ndị dị ala n’ozi ya.

Ime Ihe Nile Anyị Nwere Ike Ime

15. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị inwe mmasị n’ihe banyere ala ndị e kwuru okwu ha n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst?

15 Ebe ala ndị e kwuru okwu ha na Bible dị pụtara n’ihe ndekọ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, dị ka njem na ozi Jizọs na ndị nke Pọl onyeozi. (Mak 1:38; 7:24, 31; 10:1; Luk 8:1; 13:22; 2 Ndị Kọrint 11:25, 26) N’ihe ndekọ na-esonụ, gbalịa iji anya nke uche hụ njem ndị e mere.

16. Olee otú Ndị Kraịst nọ na Beria si gosi ekele maka ihe Pọl mere?

16 Na njem ozi ala ọzọ ya nke abụọ (akara na-acha odo odo na map), Pọl rutere Filipaị, nke dị na Gris ugbu a. [33] Ọ gbara àmà n’ebe ahụ, a tụọ ya mkpọrọ ma mesịa tọhapụ ya, ya agawakwa Tesalonaịka. (Ọrụ 16:6-17:1) Mgbe ndị Juu kpalitere ọgba aghara, ụmụnna ndị nọ na Tesalonaịka gbara Pọl ume ka ọ gawa Beria, ihe dị ka kilomita 65 site na Tesalonaịka. Pọl nwere ihe ịga nke ọma n’ozi ya na Beria, ma ndị Juu bịara kpalie ìgwè mmadụ ịgba aghara. N’ihi ya, “ụmụnna zipụrụ Pọl ozugbo ka ọ garuo oké osimiri,” ‘ndị na-edupụkwa Pọl kpọtara ya ruo Atens.’ (Ọrụ 17:5-15) O doro anya na ụfọdụ ndị a tọghatara ọhụrụ dị njikere ije ije kilomita 40 ruo Oké Osimiri Aegean, kwụọ ụgwọ njem ha ma soro ụgbọ mmiri ahụ gaa ihe dị ka kilomita 500. Njem dị otú ahụ pụrụ ịdị ize ndụ, ma ụmụnna ndị ahụ tinyere onwe ha n’ihe ize ndụ ndị dị otú ahụ, si otú ahụ na-anọnyekwuru onye nnọchianya a na-ejegharị ejegharị nke Chineke.

17. Gịnị ka anyị pụrụ ịghọta nke ọma karị ozugbo anyị ghọtara otú Efesọs si dịrị anya site na Maịlitọs?

17 Na njem ya nke atọ (akara na-acha ahịhịa ndụ ahịhịa ndụ na map), Pọl rutere n’ọdụ ụgbọ mmiri Maịlitọs. O ziri ozi ka a kpọọrọ ya ndị okenye nke ọgbakọ dị n’Efesọs, bụ́ ebe dị ihe dị ka kilomita 50 site n’ebe ahụ. Weregodị anya nke uche hụ ndị okenye ndị ahụ ka ha na-ahapụ ihe ndị ọzọ ha na-eme iji jekwuru Pọl. O yikarịrị ka hà ji obi ụtọ na-ekwurịta banyere nzute ahụ ha na-aga izute Pọl ka ha na-aga n’ụzọ. Mgbe ha na Pọl nọsịrị, ha anụsịakwa ekpere ya, “ịkwa ákwá dị ukwuu dara n’etiti ha nile, ha dakwasịkwara Pọl n’olu ma susuo ya ọnụ n’ụzọ dị nro.” Mgbe ahụ, “ha wee dupụruo ya n’ụgbọ mmiri” ka ọ gawa Jeruselem. (Ọrụ 20:14-38) Ha ga-enwewo ọtụtụ ihe ha ga-echebara echiche ma kwurịta ka ha na-aga Efesọs. Ọ̀ bụ na ekele ha gosipụtara site n’ije ije ruo ebe dị anya otú ahụ iji soro onyeozi a na-ejegharị ejegharị bụ́ onye pụrụ izi ha ihe na ịgba ha ume nọkọọ amasịghị gị? Ọ̀ dị ihe ị mụtara na nke a nke ị pụrụ iji mee ihe ná ndụ gị, nakwa ihe ị pụrụ ichebara echiche?

Mụta Banyere Ala ahụ na Ihe Dị n’Ihu

18. Gịnị ka anyị pụrụ ikpebisi ike ime n’ihe banyere ebe ndị a kpọtụrụ aha na Bible?

18 Ihe atụ ndị anyị tụleworo na-egosi abamuru dị n’ịmara ala ahụ Chineke nyere ụmụ Izrel nke ọma, nke ahụ dịkwa mkpa maka ọtụtụ ihe ndekọ Bible. (Anyị pụkwara iche banyere ala ndị gbara Ala Nkwa ahụ gburugburu bụ́ ndị a kpọtụrụ aha n’ihe ndekọ Bible.) Ka anyị na-amụbawanye ihe ọmụma na nghọta anyị karịsịa n’ihe banyere Ala Nkwa ahụ, anyị pụrụ iburu n’uche ihe bụ́ isi a chọrọ n’aka ụmụ Izrel ka ha wee banye n’ala “mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ” ma nụ ụtọ ya. Nke ahụ bụ ịtụ egwu Jehova na idebe ihe nile o nyere n’iwu.—Deuterọnọmi 6:1, 2; 27:3.

19. Paradaịs abụọ dị aṅaa kwesịrị ka anyị nọgide na-eche banyere ha?

19 N’ụzọ yiri nke ahụ taa, anyị kwesịrị ime òkè anyị, na-atụ egwu Jehova ma na-agbasochi ụzọ ya anya. Site n’ime otú ahụ, anyị ga-ekere òkè n’ime ka paradaịs ime mmụọ nke dị ugbu a n’ọgbakọ zuru ụwa ọnụ nke Ndị Kraịst na-agbasawanye agbasawanye ma na-amawanye mma. Anyị ga-amatakwu ihe ndị mejupụtara ya na ngọzi ndị a na-enweta na ya. Anyị makwaara na ihe ka ukwuu ka dị n’ihu. Jọshụa duuru ụmụ Izrel gafee Jọdan ma banye n’ala nke na-amị mkpụrụ ma na-eme obi ụtọ. Ugbu a, anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji jiri obi ike na-elepụ anya n’ihu maka Paradaịs nkịtị ahụ, ezi ala ahụ nke dị n’ihu anyị.

Ị̀ Na-echeta?

• N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji chọọ ịmụba ihe ọmụma na nghọta anyị banyere ala ndị a kpọtụrụ aha na Bible?

• Olee ala ndị a kpọtụrụ aha na Bible ndị a kọwara n’ụzọ zuru ezu n’isiokwu a bụ́ ndị kasị baara gị uru?

• Olee ihe ndị doworo gị anya ka ị na-amụkwu banyere ebe ndị ihe ụfọdụ nọ mee?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe/Foto dị na peeji nke 14]

‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ’

Ná mgbakọ ndị e nwere na 2003 na 2004, Ndịàmà Jehova nwere obi ụtọ inweta broshuọ bụ́ ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ.’ Map na chaatị dị iche iche ndị e ji àgwà zuru ezu see bụ́ ndị na-egosi ebe ndị a kpọtụrụ aha na Bible, karịsịa Ala Nkwa ahụ dị ka ọ dị n’oge dịgasị iche iche, jupụtara n’akwụkwọ ọhụrụ a, nke e nwere n’asụsụ 80.

Isiokwu a a na-amụ zoro aka na map dị iche iche site n’iji nọmba peeji dị iche iche dị ná mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo dị ka [15], mee ihe. Ọ bụrụ na i nwere broshuọ ọhụrụ a, wepụta oge iji mata akụkụ ya dị iche iche nke ọma bụ́ ndị pụrụ inyere gị aka ịmụba ihe ọmụma na nghọta gị nke Okwu Chineke.

(1) Ọtụtụ map gụnyere okwu nkọwa ma ọ bụ igbe nke nwere ihe ndị na-enye aka ịghọta ihe atụ ma ọ bụ akara ndị pụrụ iche dị na map ahụ [18]. (2) Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na map ndị ahụ nwere ihe na-egosi ọdịiche dị n’etiti maịl na kilomita bụ́ nke ga-enyere gị aka ịghọta otú otu ógbè hà na otú ọ dịruru n’anya [26]. (3) Dị ka ọ na-adịkarị, akụ́ e sere ese tụwara n’ebe ugwu, na-eme ka o kwe gị omume ịghọta ebe a na-aga [19]. (4) E ji àgwà zuru ezu see ọtụtụ n’ime map ndị ahụ iji gosi ebe ndị kpọgoro elu [12]. (5) N’akụkụ ya, otu map pụrụ inwe mkpụrụ akwụkwọ ma ọ bụ nọmba ka i wee nwee ike ịhụ akara ị pụrụ isoro nweta obodo ma ọ bụ aha ndị a kpọtụrụ uche [23]. (6) N’akụkụ ebe e nwere ndepụta nke aha ebe dị iche iche bụ́ nke dị peeji abụọ [34-35], ị pụrụ ịhụ nọmba peeji ná mkpụrụ akwụkwọ gbara okpotokpo, bụ́ nke akara na-egosi ebe ebe e kwuru okwu ya dị, dị ka E2, na-esochi. Mgbe i jisịrị ihe ndị a mee ihe ruo oge ụfọdụ, ọ pụrụ ịtụ gị n’anya otú ha ga-esi nyere gị aka nke ukwuu n’inwetakwu ihe ọmụma na nghọta miri emi.

[Chaatị/Map dị na peeji nke 15, 16]

CHAATỊ NKE NA-EGOSI EBE NDỊ DỊ N’ALA AHỤ

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

A. Ụsọ Osimiri Ukwu

B. Ala Dị Larịị nke Dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Jọdan

1. Ala Dị Larịị nke Asha

2. Ala Ụsọ Osimiri Dọọ nke Dị Warara

3. Ala Ahịhịa Ndụ nke Sharọn

4. Ala Dị Larịị nke Filistia

5. Ndagwurugwu Dị n’Etiti nke Si Ebe Ọwụwa Anyanwụ Gaa Ọdịda Anyanwụ

a. Ala Dị Larịị nke Megido

b. Ndagwurugwu Jezril

CH. Ugwu Ndị Dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Jọdan

1. Ugwu Nta Ndị Dị na Galili

2. Ugwu Nta Ndị Dị na Kamel

3. Ugwu Nta Ndị Dị na Sameria

4. Shefila (ugwu ndị dị ala)

5. Ala Ugwu nke Dị na Juda

6. Ọzara Juda

7. Negeb

8. Ọzara nke Peran

D. Araba (Ndagwurugwu Ebe Ala Tiwara Etiwa)

1. Ọdọ Mmiri Hula

2. Ebe Dị Gburugburu Oké Osimiri Galili

3. Ndagwurugwu Jọdan

4. Oké Osimiri Nnu (Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ)

5. Araba (n’ebe ndịda Oké Osimiri Nnu)

E. Ugwu/Mbara Ala Ndị Dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Jọdan

1. Beshan

2. Gilied

3. Amọn na Moab

4. Ala Ugwu Dị Larịị nke Idọm

F. Ugwu Ndị Dị na Lebanọn

[Map]

Ugwu Hemọn

More

Ebel-mehola

Sọkọt

Jọg-beha

Betel

Gilgal

Gibiọn

Jeruselem

Hibrọn

Geza

Bia-shiba

Sọdọm?

Kedesh

[Map/Foto dị na peeji nke 15]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

KENAN

Megido

GILIED

Dotan

Shikem

Betel (Lọz)

E-aị

Jeruselem (Selem)

Betlehem (Efrat)

Mamri

Hibrọn (Mak-pila)

Giraa

Bia-shiba

Sọdọm?

NEGEB

Rehobọt?

[Ugwu]

Moraịa

[Mmiri]

Oké Osimiri Nnu

[Osimiri]

Jọdan

[Foto]

Ebreham jegharịrị n’ala ahụ

[Map dị na peeji 18]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Troas

SAMOTRES

Niapọlis

Filipaị

Amfipọlis

Tesalonaịka

Beria

Atens

Kọrint

Efesọs

Maịlitọs

RODS